Ọ Bụrụ na Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi Ị̀ Ga-ahọrọ Ịdị?
Ị pụrụ n’ezie ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’elu ụwa, dị ka akwụkwọ nta nke a na-egosi n’ụzọ doro anya. Nzube Chineke maka ọnọdụ ndị dị otú ahụ aghaghị imezu! Ma ị ghaghị ịhọrọ ịdị ndụ ebighị ebi.
Jisọs Kraịst kụziri na nhọrọ ahụ aghaghị ịdabere n’ezi ihe ọmụma nke Chineke. E mepụtara akwụkwọ nta a inyere gị aka inweta ihe ọmụma ahụ. A pụrụ inwetakwu enyemaka site n’aka Ndịàmà Jehova. Ha ga-enwe obi ụtọ ileta gị n’oge na ebe ga-adịrị gị mma. Ọ bụrụkwa na ị ga-achọ ka e duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, ma ọ bụ jiri adres nke ziri ezi site n’okpuru ebe a.