Ò Kwesịrị Ekwesị Inwe Mmetụta Dị Otú A?
OTU onye mmadụ nwụnahụrụ na-ede, sị: “Dị ka nwatakịrị n’England, a kụziiri m ịghara igosipụta mmetụta m n’ihu ọha. Apụrụ m icheta nna m, nwoke bụbu onye agha, ka ọ takpachiri eze na-agwa m, ‘Ebela ákwá!’ mgbe ihe kpataara m ihe mgbu. Apụghị m icheta ma ọ̀ dị mgbe ọ bụla nne m sutụrụ anyị ọnụ ma ọ bụ makụọ nke ọ bụla n’ime anyị bụ́ ụmụ ya (anyị dị anọ). Adị m 56 afọ mgbe nna m nwụrụ. M nwere mmetụta nke onye oké ihe funahụrụ. Ma, ná mmalite, enweghị m ike ibe ákwá.”
N’ọdịnala ụfọdụ, ndị mmadụ na-egosipụta mmetụta ha n’ụzọ pụtara ìhè. Ma hà nwere obi ụtọ ma ọ bụ mwute, ndị ọzọ maara otú ha si enwe mmetụta. N’aka nke ọzọ, n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, n’ụzọ a rịbara ama n’ebe ugwu Europe na Britain, ndị mmadụ, karịsịa ndị ikom, abụrụwo ndị a kpụziri izochi mmetụta ha, ịbịada mmetụta uche ha, ịma ọnụ akpụ n’oge ihe isi ike ma ghara igosipụta mmetụta ha n’ụzọ pụtara ìhè. Ma mgbe onye ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị, ọ̀ dị otú o si bụrụ ihe ọjọọ igosipụta iru újú gị? Gịnị ka Bible na-ekwu?
Ndị Bere Ákwá na Bible
Ndị dere Bible bụ ndị Hibru nke ógbè ọwụwa anyanwụ nke osimiri Mediterranean, ndị na-ekwupụta ihe dị ha n’obi. O nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị mmadụ gosipụtara iru újú ha n’ụzọ pụtara ìhè. Eze Devid ruru újú maka ọnwụ nke nwa ya e gburu egbu bụ́ Amnọn. N’ezie, ọ “kwara ákwá dị ukwuu hie nne.” (2 Samuel 13:28-39) O ruru újú ọbụna maka ọnwụ Absalom nwa ya bụ́ onye aghụghọ, bụ́ onye nwaworo ịnara ya ịbụeze n’ike. Ihe ndekọ nke Bible na-agwa anyị, sị: “Eze [Devid] wee maa jijiji nke ukwuu, rịgoo ruo ụlọ elu nke ọnụ ụzọ ámá, kwaa ákwá: ma otú a ka ọ sịrị mgbe ọ na-eje, Nwa m Absalom, nwa m, nwa m Absalom! ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na mụ onwe m anwụwo n’ọnọdụ gị, Absalọm, nwa m, nwa m!” (2 Samuel 18:33) Devid ruru újú dị ka nna nkịtị ọ bụla. Leekwa ọtụtụ ugbo ole ndị mụrụ ụmụ nweworo nnọọ mmasị ma a sị na ha pụrụ ịnwụworị kama ịbụ ụmụ ha! O yiri nnọọ ihe na-ekwekọghị n’okike nwatakịrị ịnwụ tupu onye mụrụ ya.
Olee otú Jisọs si meghachi omume n’ọnwụ enyi ya bụ́ Lazarọs? O bere ákwá mgbe ọ na-erute ili ya nso. (Jọn 11:30-38) E mesịa, Meri Magdalini bere ákwá mgbe o ruru nso ili Jisọs. (Jọn 20:11-16) N’eziokwu, onye Kraịst nke ghọtara olileanya mbilite n’ọnwụ nke Bible adịghị eru újú n’ụzọ a na-apụghị ịkasi ya obi, dị ka ụfọdụ na-eme bụ́ ndị na-enweghị ihe ndabere doro anya nke Bible maka nkwenkwe ha banyere ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ. Ma dị ka mmadụ nke nwere mmetụta ebumpụta ụwa, ezi onye Kraịst, ọbụna n’inwe olileanya nke mbilite n’ọnwụ, na-eru újú ma na-enwe mwute maka ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:13, 14.
Ibe Ákwá ka ọ bụ Ịghara Ibe
Gịnị banyere mmeghachi omume anyị taa? Ị̀ na-ahụ ya dị ka ihe siri ike ma ọ bụ ihe na-emechu ihu igosipụta mmetụta gị? Gịnị ka ndị ndụmọdụ na-atụ aro ya? Ọtụtụ mgbe echiche ọgbara ọhụrụ ha na-ekwupụtaghachi nanị amamihe oge ochie nke Bible nke e dere n’ike mmụọ nsọ. Ha na-ekwu na anyị kwesịrị igosipụta iru újú anyị, ọ bụghị ịbịachi ya. Nke a na-echetara anyị ndị ikom oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Job, Devid, na Jeremaịa, ndị a na-achọta ngosipụta nke iru újú ha n’ime Bible. Ha ekpuchighị mmetụta ha. N’ihi ya, ọ bụghị ihe amamihe dị na ya iwepụ onwe gị iche site n’ebe ndị ọzọ nọ. (Ilu 18:1) Otú ọ dị, a na-egosipụta iru újú n’ụzọ dị iche iche n’ọdịnala dị iche iche, na-adaberekwa na nkwenkwe okpukpe ndị a nakweere.a
Gịnị ma ọ bụrụ na ọ gụọ gị agụụ ịkwa ákwá? Ọ bụ akụkụ ebumpụta ụwa nke mmadụ ịkwa ákwá. Chetaghachi ihe mere n’ọnwụ Lazarọs, mgbe Jisọs ‘sụrụ ude n’ime mmụọ Ya, . . . anya mmiri wee pụọ ya n’anya.’ (Jọn 11:33, 35) Otú a, o gosiri na ịkwa ákwá bụ mmeghachi omume kwesịrị ekwesị nye ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya.
Ihe mere n’ọnọdụ nke otu nne, bụ́ Anne na-akwado nke a, bụ́ onye ỌMỤ (Ọnwụ Mberede Ụmụaka) gburu nwa ọhụrụ ya bụ́ Rachel. Di ya kwuru, sị: “Ihe na-atụ n’anya bụ na ma Anne ma mụ adịghị nke kwara ákwá n’ebe olili ozu. Ndị ọzọ nile na-akwa ákwá.” Banyere nke a, Anne zaghachiri, si: “Ee, ma akwawo m ákwá dị ukwuu maka anyị abụọ. Echere m na o metụtara m n’ezie izu ole na ole mgbe ihe ọdachi ahụ gasịrị, n’ikpeazụ mgbe nanị m nọ n’ụlọ otu ụbọchị. Akwara m ákwá ogologo ụbọchị nile. Ma ekwetara m na o nyeere m aka. Ahụ dịrị m mma karị n’ihi ya. M ghaghị iru újú n’ihi ọnwụ nwa m. M kwetara n’ezie na i kwesịrị ikwe ka ndị na-eru újú kwaa ákwá. Ọ bụ ezie na ọ bụ mmeghachi omume ebumpụta ụwa ndị ọzọ ịsị, ‘Akwala ákwá,’ nke ahụ adịghị enye aka n’ezie.”
Otú Ụfọdụ Si Emeghachi Omume
Olee otú ụfọdụ ndị siworo meghachi omume mgbe ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya tisasịrị ha? Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee ihe banyere Juanita. Ọ maara ihe ọ dị ka ya nwa ọhụrụ ịnwụnahụ mmadụ. Ime apụwo ya ugbo ise. Ugbu a ọ dịkwa ime ọzọ. Ya mere mgbe ihe mberede ụgbọ ala manyere ya ịbụ onye e debere n’ụlọ ọgwụ, n’ụzọ kwere nghọta o nwere nchegbu. Izu abụọ mgbe nke a gasịrị ime malitere ime ya—n’erughị eru. Nwa oge mgbe nke a gasịrị a mụrụ obere Vanessa—nke ịdị arọ ya ji nke nta karịa 0.9 kilogram. “Enwere m oké mkpali,” ka Juanita na-echeta. “N’ikpeazụ abụrụwo m nne!”
Ma obi ụtọ ya adịteghị anya. Mgbe ụbọchị anọ gasịrị Vanessa nwụrụ. Juanita na-echeta: “M nwere mmetụta nke onye tọgbọ chakoo. A napụrụ m ọnọdụ ịbụ nne m. M nwere mmetụta nke onye na-ezughị ezu. Ọ bụ ihe mwute ịlọta n’ụlọ ịbanye n’ọnụ ụlọ ahụ anyị kwadebeere Vanessa na ilekwasị anya n’obere uwe ndị ahụ m zụtawooro ya. Ruo ọnwa ole na ole ndị sochirinụ, m chetaghachiri ụbọchị ọmụmụ ya. Achọghị m isoro onye ọ bụla mekọọ ihe ọ bụla.”
Ọ̀ bụ mmeghachi omume gabigara ókè? Ọ pụrụ isiri ndị ọzọ ike ịghọta, ma ndị ahụ nweworo ahụmahụ ya, dị ka Juanita, na-akọwa na ha ruuru nwa ọhụrụ ha újú dị nnọọ ka ha ga-eruru onye dịworo ndụ ruo oge ụfọdụ. Ogologo oge tupu a mụọ nwatakịrị, ka ha na-ekwu, ndị mụrụ ya ahụwo ya n’anya. E nwere njikọ pụrụ iche dị n’etiti ya na nne ya. Mgbe nwa ọhụrụ ahụ nwụrụ, nne na-enwe mmetụta na onye bụ mmadụ n’ezie anwụwo. Ọ bụkwa nke ahụ ka ọ dị mkpa ka ndị ọzọ ghọta.
Otú Iwe na Ikpe Ọmụma Pụrụ Isi Metụta Gị
Nne ọzọ gosipụtara mmetụta ya mgbe a gwara ya na nwa ya nwoke dị afọ isii anwụwo na mberede n’ihi nsogbu obi o nwere site na mgbe a mụrụ ya. “M nwere ọtụtụ usoro mmeghachi omume—ekwughị okwu, ịjụ ikweta n’ihe merenụ, ikpe ọmụma, na iwe megide di m na onye dọkịta n’ihi amataghị otú ọnọdụ ya si bụrụ nke siri ike.”
Iwe pụrụ ịbụ ihe mgbaàmà ọzọ nke iru újú. Ọ pụrụ ịbụ iwesa ndị dọkịta na ndị nọọsụ iwe, na-eche na ha kwesịrị ime karịa otú ha mere n’ilekọta onye ahụ nwụrụ anwụ. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ iwe megide ndị enyi na ndị ikwu ndị o yiri ka ha na-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe na-ezighị ezi. Ụfọdụ na-ewesa onye ahụ hapụrụ ahapụ iwe maka ileghara ahụ ike ya anya. Stella na-echeta: “M na-echeta iwesa di m iwe n’ihi na m maara na ihe merenụ nwere ike ọ garaghị eme. Ọ rịasiwo ọrịa ike, ma o legharawo ịdọ aka ná ntị nke ndị dọkịta anya.” Mgbe ụfọdụkwa a na-ewesa onye hapụrụ ahapụ iwe n’ihi ibu dị iche iche nke ọnwụ ya na-atụkwasị onye nke dị ndụ.
Ụfọdụ na-enwe mmetụta ikpe ọmụma n’ihi iwe—ya bụ, ha pụrụ ịma onwe ha ikpe n’ihi na ha na-ewe iwe. Ndị ọzọ na-ata onwe ha ụta n’ihi ọnwụ nke onye ha hụrụ n’anya. “Ọ garaghị anwụ,” ka ha na-arụgide onwe ha ikweta, “ma ọ bụrụ nanị na m mere ka o jekwuru dọkịta ozugbo ozugbo” ma ọ bụ “mee ka ọ hụ dọkịta ọzọ” ma ọ bụ “mee ya ka o lekọta ahụ ike ya anya n’ụzọ ka mma.”
Maka ndị ọzọ ikpe ọmụma ahụ na-akarị nke ahụ, karịsịa ọ bụrụ na onye ha hụrụ n’anya nwụrụ na mberede, mgbe a na-atụghị anya ya. Ha na-amalite icheta mgbe ndị ha wesaworo onye ahụ hapụrụ ahapụ iwe ma ọ bụ soro ya rụọ ụka. Ma ọ bụ ha pụrụ iche na ha abụghị n’ezie ihe nile ha kwesịrị ịbụwororị onye ahụ nwụrụ anwụ.
Usoro iru újú dị ogologo nke ọtụtụ ndị bụ́ nne na-akwado ihe ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu, na ọnwụ nke nwa na-ahapụ oghere na-adịgide adịgide ná ndụ nke ndị mụrụ ụmụ, karịsịa nne.
Mgbe Di ma ọ bụ Nwunye Gị Nwụrụ
Ọnwụ onye òtù ọlụlụ bụ ụdị ọzọ nke ihe na-akpata uche mgbasasị, karịsịa ma ọ bụrụ na ha abụọ bikọrọ ndụ ha ọnụ nke ọma. Ọ pụrụ ịpụta ọgwụgwụ nke otu ụdị ịdị ndụ nke ha nwekọrọ ọnụ, nke ime njem, ọrụ, ntụrụndụ, na ịdabererịta n’onwe ha.
Eunice na-akọwa ihe mere mgbe di ya nwụrụ na mberede n’ihi ọrịa obi nkụchi. “N’izu nke mbụ, anọ m n’ọnọdụ nke ahụ nkụnwụ n’ụzọ mmetụta uche, dị ka à ga-asị na ahụ m akwụsịwo ịrụ ọrụ. Apụghị m ọbụna ịnụ ụtọ ihe ma ọ bụ ịnụ ísìsì ihe. Otú ọ dị, echiche uche m nọgidere na-arụrụ onwe ya ọrụ. N’ihi na mụ na di m nọ mgbe ha nọ na-anwa ime ka iku ume ya dị n’usoro na-eji usoro ịbịa aka n’obi na ọgwụ na-eme ihe, enweghị m mgbaàmà ịjụ ikweta bụ́ nke a na-enwekarị. Otú o sina dị, enwere m mmetụta siri ike nke obi nkoropụ, dị ka à ga-asị na m nọ na-ele ụgbọ ala ka o si n’ebe dị elu na-amapụ ma ọ dịghị ihe m pụrụ ime banyere ya.”
Ọ̀ kwara ákwá? “N’ezie akwara m, karịsịa mgbe m gụrụ ọtụtụ narị kaadị ọmịiko m nwetaworo. M kwara ákwá na nke ọ bụla. O nyeere m aka iche ihe fọdụrụ n’ụbọchị ahụ ihu. Ma ọ dịghị ihe pụrụ inye aka mgbe a jụrụ m ọtụtụ ugbo otú m dị. N’ụzọ doro anya, ahụjuru m anya.”
Gịnị nyeere Eunice aka ịnagide iru újú ya? “N’aghọtaghị ya, m kpebiri n’echeghị ya eche ịga n’ihu na-adị ndụ m,” ka ọ na-ekwu. “Otú ọ dị, ihe ka na-ewute m bụ mgbe m chetara na di m, onye hụrụ ndụ n’anya nke ukwuu, anọghị n’ebe a ịnụ ụtọ ya.”
“Ekwela Ka Ndị Ọzọ Tụziere . . .”
Ndị dere akwụkwọ bụ́ Leavetaking—When and How to Say Goodbye na-enye ndụmọdụ, sị: “Ekwela ka ndị ọzọ tụziere gị otú i kwesịrị isi mee omume ma ọ bụ nwee mmetụta. Usoro iru újú na-arụ ọrụ n’ụzọ dịgasị iche iche n’ebe onye ọ bụla nọ. Ndị ọzọ pụrụ iche—ma mee ka ị mara na ha na-eche na—ị na-eru újú gabiga ókè ma ọ bụ na ị naghị eru újú ruo ókè zuru ezu. Gbaghara ha ma chefuo banyere ya. Site n’ịmanye onwe gị ikwekọ n’ọnọdụ ndị ọzọ ma ọ bụ ọha mmadụ n’ozuzu tụpụtara, ị na-ebelata uto gị gaa n’ọnọdụ ahụ ike mmetụta uche e weghachiri n’ọnọdụ dị mma.”
Otú ọ dị, ndị dị iche iche na-eme ihe banyere iru újú ha n’ụzọ dịgasị iche iche. Anyị adịghị anwa ịtụ aro na otu ụzọ dị nnọọ mma karịa nke ọzọ maka mmadụ nile. Otú ọ dị, ihe ize ndụ na-ebilite mgbe ọnọdụ na-achọghị ịdị mma, mgbe onye na-eru újú na-enweghị ike ịnakwere ịbụ eziokwu nke ọnọdụ ahụ. Mgbe ahụ ọ pụrụ ịdị mkpa ndị enyi nwere ọmịiko inye aka. Bible na-ekwu, sị: “Ná mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” Ya mere atụla egwu ịchọ enyemaka, ikwu okwu, na ịkwa ákwá.—Ilu 17:17.
Iru újú bụ mmeghachi omume kwesịrị ekwesị n’oge mmadụ nwụrụ, ọ bụghịkwa ihe ọjọọ ma ọ bụru na iru újú gị abụrụ ihe ndị ọzọ matara. Ma e nwere ajụjụ ndị ọzọ ọ dị mkpa ịza: ‘Olee otú m pụrụ isi nagide iru újú m? Ọ̀ bụ ihe kwesịrị ekwesị inwe mmetụta nke ikpe ọmụma na iwe? Olee otú m ga-esi nagide mmeghachi omume ndị a? Gịnị pụrụ inyere m aka ịtachi obi n’ọnwụ na iru újú ahụ?’ Nkebi na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị ahụ na ndị ọzọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka ihe atụ, ndị Yoruba nke Nigeria nwere nkwenkwe ọdịbendị n’ịlọ ụwa nke mkpụrụ obi. Ya mere mgbe nwa nwụnahụrụ nne, a na-enwe oké iru újú ma ọ na-abụ nanị ruo nwa oge, n’ihi na dị ka okwu ndị e ji ekwe egwú ndị Yoruba na-ekwu: “Ọ bụ mmiri ka a kwafuru. Ebele ahụ etiwabeghị.” Dị ka ndị Yoruba na-ekwu, nke a pụtara na ebele ahụ nke mmiri dị na ya, bụ́ nne, pụrụ ịmụtakwa nwa ọzọ—ma eleghị anya onye ahụ nwụrụ anwụ ịlọ ụwa. Ndịàmà Jehova adịghị agbaso ọdịbendị ọ bụla dabeere na nkwenkwe ụgha dị iche iche bụ́ ndị sitere n’echiche ụgha dị iche iche nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na ịlọ ụwa, bụ́ ndị na-enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ na Bible.—Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4, 20.
Ajụjụ Ndị A Ga-echere Echiche
Olee otú ọdịnala si emetụta iru újú nke ụfọdụ ndị?
Ihe atụ ndị dị aṅaa ka anyị nwere n’ime Bible banyere ndị ruru újú n’ụzọ pụtara ìhè?
Olee otú ụfọdụ ndị siworo meghachi omume banyere ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya? Olee otú i siworo meghachi omume n’ọnọdụ ndị yiri ya?
Gịnị na-eme ka ọnwụ nke di ma ọ bụ nwunye bụrụ ụdị ahụmahụ dị iche?
Olee otú usoro iru újú si arụ ọrụ? Ọ̀ bụ ihe na-ezighị ezi iru újú?
Gịnị bụ akụkụ ụfọdụ nke usoro iru újú? (Lee igbe dị na peji nke 9.)
Ọnọdụ ndị dị aṅaa pụrụ iche na-emetụta ndị mụrụ ụmụ n’ọnwụ mberede ụmụaka? (Lee igbe dị na peji nke 12.)
Olee otú ime ọpụpụ ma ọ bụ ịmụ nwa nwụrụ anwụ si emetụta ọtụtụ ndị bụ nne? (Lee igbe dị na peji nke 10.)
Igbe dị na peeji nke 9]
Usoro Iru Újú
Okwu ahụ bụ́ “usoro” adịghị egosi na iru újú nwere usoro ime ihe a kara aka. Mmeghachi omume iru újú pụrụ ịgafere ókè ma wee ogologo oge dị iche iche, na-adabere n’onye ọ bụ. Usoro ndepụta nke a ezughị ezu. A pụkwara igosipụta mmeghachi omume ndị ọzọ. Ihe na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ihe mgbaàmà nke iru újú nke mmadụ pụrụ inwe ahụmahụ ya.
Mmeghachi omume ndị mbụ: Obi mmapụ nke mbụ; ịjụ n’ikweta n’ihe merenụ, ịgọpụ ịbụ eziokwu nke ihe merenụ; ahụ nkụnwụ n’ụzọ mmetụta uche; mmetụta ikpe ọmụma; iwe.
Oké iru újú pụrụ ịgụnye: Nchefu ihe na ehighị ụra nke ọma; oké ike ọgwụgwụ; mgbanwe mberede ná mmetụta uche; mkpebi na iche echiche nwere ntụpọ; ịkwa ákwá ọtụtụ mgbe; mgbanwe n’inwe agụụ nri, nke pụrụ ịkpata ịta ahụ ma ọ bụ ibu ibu; mgbaàmà dị iche iche nke nsogbu ahụ ike; inwe mmetụta nke ike ọgwụgwụ; ikike ịrụ ọrụ belatara ebelata; ịmụ anya arọ nrọ—inwe mmetụta, ịnụ olu, ịhụ onye ahụ nwụrụ anwụ; n’ọnwụ nwa, ịkpọ di ma ọ bụ nwunye gị asị na-enweghị isi.
Oge inwetaghachi onwe onye: Iwe, ya na ọchịchọ ịlaghachi n’ọnọdụ gara aga; ncheta ndị dị ụtọ karị banyere onye ahụ nwụrụ anwụ, ọbụna nke a gwara ihe ndị na-akpa ọchị.
Igbe dị na peeji nke 10]
Ime Ọpụpụ na Ịmụ Nwa Nwụrụ Anwụ—Ndị Nne Na-eru Újú
Ọ bụ ezie na ọ mụworị ụmụntakịrị ndị ọzọ, Monna na-atụsi anya ike ịmụ nwa ya na-esonụ. Ọbụna tupu ọ mụọ nwa ahụ, ọ bụ nwa ọhụrụ o “gwusara egwu, gwa okwu, ma rọọ nrọ banyere ya.”
Usoro njikọ dị n’etiti nne na nwa a na-amụbeghị amụ siri ike. Ọ na-aga n’ihu: “Rachel Anne bụ nwa ọhụrụ na-eji ụkwụ agbapụ akwụkwọ ndị m tụkwasịrị n’elu afọ m, na-eme ka m mụrụ anya n’abalị. M ka pụrụ icheta obere ịgba ụkwụ ndị mbụ, dị ka inu aka dị nro, nke ịhụnanya. Mgbe ọ bụla o megharịrị ahụ, ụdị ịhụnanya pụrụ iche na-ejupụta m n’ime. M maara ya nke ọma nke na m matara mgbe ọ nọ n’ihe mgbu, mgbe ọ na-arịa ọrịa.”
Monna na-aga n’ihu n’akụkọ ya: “Dọkịta ekwetaghị n’ihe m na-ekwu ruo mgbe oge gabigara. Ọ gwara m ka m kwụsị inye onwe m nsogbu. M kwetara na m nwere mmetụta mgbe ọ na-anwụ. Ná mberede, ọ tụgharịrị nnọọ n’ike. Ọ nwụrụ n’ụbọchị na-esonụ.”
Ahụmahụ Monna abụghị ihe omume pụrụ iche. Dị ka ndị na-ede akwụkwọ bụ́ Friedman na Gradstein kwuru n’akwụkwọ ha bụ́ Surviving Pregnancy Loss, ihe dị ka otu nde ndị inyom kwa afọ na United States nanị na-ata ahụhụ afọ ime na-enweghị ihe ịga nke ọma. Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ e nwere n’ụwa dum dị ukwuu karị.
Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ adịghị aghọta na ime ọpụpụ ma ọ bụ ịmụ nwa nwụrụ anwụ bụ ọdachi nye nwanyị, bụrụkwa nke ọ na-echeta—ma eleghị anya ná ndụ ya nile. Dị ka ihe atụ, Veronica, onye metụworo agadi ugbu a, na-echeta ime ndị pụrụ ya, karịsịakwa ọ na-echeta nwa ọhụrụ dị ọnwa itoolu tupu ọ nwụọ e wee mụọ ya, ịdị arọ ya dịkwa kilogram isii mgbe a mụrụ ya. Ọ nwụwo n’ime izu abụọ ikpeazụ o buru ya n’afọ. O kwuru, sị: “Ịmụ nwa ọhụrụ nwụrụ anwụ bụ ihe dị oké njọ nye onye bụ́ nne.”
Ọ bụghị mgbe nile ka a na-aghọta mmeghachi omume dị iche iche nke ndị nne ndị a nwere obi nkoropụ, ọbụna n’akụkụ ndị nne ndị ọzọ. Otu nwanyị nwa ya nwụrụ site n’ime ọpụpụ dere, sị: “Ihe m mụtaworo n’ụzọ kasị egbu mgbu bụ na tupu nke a emee m, n’ezie amaghị m ma ọlị ihe ọ dịworo mkpa ka ndị enyi m die. Abụwo m onye na-enweghị mmetụta na onye na-amaghị ihe na-aganụ n’ebe ha nọ dị ka m na-eche ugbu a na ndị mmadụ enweghị n’ebe m nọ.”
Nsogbu ọzọ onye bụ nne na-eru újú nwere bụ echiche ahụ bụ na ọ pụrụ ịbụ na di ya adịghị enwe mmetụta nke ọnwụ ahụ dị ka ọ na-enwe. Otu nwunye kwupụtara ya n’ụzọ nke a: “N’oge ahụ enwere m mmechuihu n’ebe di m nọ. Otú ọ dị ya, n’ezie ọ dịghị mgbe e nwere afọ ime. Ọ pụghị inwe ahụmahụ iru újú m na-enwe. O nwere oké ọmịiko maka egwu m ma ọ bụghị maka iru újú m.”
Ma eleghị anya mmeghachi omume nke a bụ dị ka e si kee onye bụ́ di—ọ dịghị enwe otu ụdị njikọ anụ ahụ na nke mmetụta uche nke nwunye ya dị ime na-enwe. Otú o sina dị, ọnwụ ahụ na-ewute ya. Ọ bụkwa ihe dị mkpa di na nwunye ịghọta na ha na-atakọ ahụhụ ọnụ, ọ bụ ezie na ọ bụ n’ụzọ ndị dị iche. Ha kwesịrị irukọ újú ha ọnụ. Ọ bụrụ na di ezochie ya, nwunye ya pụrụ iche na ihe adịghị emetụta ya. Ya mere bekọọnụ ákwá, chekọọ echiche ma makụrịta onwe unu. Gosi na unu dịrịta ibe unu mkpa otú ọ na-adịtụbeghị ná mbụ. Ee, ndị bụ di, gosinụ ọmịiko unu.
Igbe dị na peeji nke 12]
Ọnwụ Mberede Ụmụaka—Iche Iru Újú Ya Ihu
Ọnwụ mberede nke nwa ọhụrụ bụ ọdachi na-agbasasị isi. Otu ụbọchị nwa ọhụrụ ọ na-adịghị ihe na-eme ya, nke ji ahụ etetaghị n’ụra. Nke a bụ kpam kpam ihe a na-atụghị anya ya, n’ihi na ònye chere na nwatakịrị ma ọ bụ nwa ga-ebu ndị mụrụ ya ụzọ nwụọ? Nwa ọhụrụ nke ghọworo ebe bụ isi nke ịhụnanya a na-akparaghị ókè nke onye bụ nne bụ ná mberede ebe bụ isi nke iru újú ya a na-akparaghị ókè.
Mmetụta dị iche iche nke ikpe ọmụma na-amalite ịsọbata. Ndị mụrụ ya pụrụ iche na ọ bụ ha kpatara ọnwụ ahụ, dị ka à ga-asị na ọ bụ n’ihi nleghara anya ụfọdụ. Ha na-ajụ onwe ha, ‘Olee ihe anyị pụwororị ime iji gbochie ya?’b N’ọnọdụ ụfọdụ di, n’enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ, pụrụ ọbụna ịta nwunye ya ụta n’echeghị ya eche. Mgbe o jewere ọrụ, nwa ọhụrụ ahụ dị ndụ ma nwee ahụ ike. Mgbe ọ lọtara ụlọ, ọ nwụwo n’elu àkwà nwa ọhụrụ ya! Gịnị ka nwunye ya nọ na-eme? Ebee ka ọ nọ n’oge ahụ? A ghaghị ime ka ajụjụ ndị a na-enye nsogbu doo anya ka ha ghara itinye ihe isi ike n’ime alụmdi na nwunye.
Ọnọdụ mere ná ndabara na ndị a na-apụghị ibu ụzọ hụ kpatara ọdachi ahụ. Bible na-ekwu, sị: “M laghachiri, hụ n’okpuru anyanwụ, na ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ̀ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị; kama mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.”—Eklisiastis 9:11.
Olee otú ndị ọzọ pụrụ isi nye aka mgbe nwa ọhụrụ nwụnahụrụ ezinụlọ? Otu nne nwa nwụnahụrụ zaghachiri, sị: “Otu enyi m bịara ma hichasịa ụlọ m, n’enweghị okwu ọ bụla m kwuru. Ndị ọzọ siiri anyị nri. Ụfọdụ nyere nnọọ aka site n’ịmakụ m—e kwughị okwu ọ bụla, nanị mmakụ. Achọghị m ikwu okwu banyere ya. Achọghị m ịdị na-akọwa ihe merenụ ọtụtụ ugbo. Achọghị m ajụjụ ndị e ji ajụpụta ihe, dị ka à ga-asị na ọ dị ihe m na-emeghị. Abụ m nne ya; m gaara eme ihe ọ bụla iji zọpụta nwa ọhụrụ m.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
b Ọnwụ Mberede Ụmụaka (ỌMỤ), bụ́ nke na-emekarị ụmụ ọhụrụ gbara otu ọnwa ruo ọnwa isii, bụ okwu e ji eme ihe mgbe ụmụ ọhụrụ nwere ahụ ihe ike nwụrụ ná mberede n’enweghị ihe a pụrụ ịkọwa dị ka ihe kpatara ya. N’ọnọdụ ụfọdụ e kwetara na a pụrụ izere ya ime ma ọ bụrụ na e mere ka nwa ọhụrụ chee ihu n’elu mgbe ọ na-ehi ụra ma ọ bụ jiri akụkụ dinara ma ọ bụghị ikpudo ihu n’ala. Otú ọ dị, ọ dịghị ọdịdị ihi ụra ọ bụla ga-egbochi ụdị nile nke ỌMỤ.
[Foto dị na peeji nke 8]
Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị iru újú na ịkwa ákwá mgbe onye a hụrụ n’anya nwụrụ
[Foto dị na peeji nke 11]
Ọnwụ nke nwatakịrị bụ ihe na-akpata ajọ uche mgbasasị—ezi ọmịiko na ebere pụrụ inyere ndị mụrụ ụmụ aka