Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ed p. 27-30
  • Òkè nke Ndị Nne na Nna

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Òkè nke Ndị Nne na Nna
  • Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ, Ọ Bụghị Ndị Na-ama Aka
  • Nsogbu Ndị Dị n’Ụlọ Akwụkwọ Taa
  • Mkpịsị Ugodi nke Mmụta Dị Mma
    Teta!—1996
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ụmụ Anyị—ihe Nketa Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ
ed p. 27-30
Foto dị na peeji nke 26-27

Òkè nke Ndị Nne na Nna

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịzụlite ụmụaka ịghọ ndị toro eto a haziri nke ọma n’ọha mmadụ nke taa abụghị ọrụ dị mfe.

ỤLỌ Ọrụ Mba Maka Ahụ Ike Ụbụrụ na United States bipụtara ihe sitere n’otu nnyocha e mere ndị nne na nna e lere anya na ha nwere ihe ịga nke ọma​—⁠ndị ụmụ ha, bụ́ ndị gafeworo 21 afọ, “bụcha ndị toro eto na-arụpụta ihe a na-ahụ anya bụ́ ndị ihe àmà na-egosi na ha na-adaba nke ọma n’ọha mmadụ anyị.” A jụrụ ndị nne na nna ndị a sị: ‘Na-adabere n’ahụmahụ nke gị, gịnị bụ okwu ndụmọdụ kasị mma ị pụrụ inye ndị nne na nna ndị ọzọ?’ Nzaghachi a kasị nweta bụ ndị a: ‘Hụ n’anya nke ukwuu,’ ‘nye ọzụzụ n’ụzọ dị irè,’ ‘na-anọkọ ọnụ,’ ‘kụziere ụmụ gị ọdịiche dị n’etiti ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi,’ ‘wulite nkwanyerịta ùgwù,’ ‘na-aṅa ha ntị n’ezie,’ ‘nye nduzi kama ikwu ogologo okwu,’ na ‘nwee ezi uche.’

Foto dị na peeji nke 28

Ndị nkụzi na-ekere òkè dị mkpa n’ịzụlite ndị ntorobịa a haziri nke ọma

Otú ọ dị, ndị nne na nna adịghị arụ ọrụ nanị ha iji zụlite ndị ntorobịa a haziri nke ọma. Ndị nkụzi na-ekerekwa òkè dị mkpa na nke a. Otu onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ nweworo ahụmahụ kwuru, sị: “Ihe mgbaru ọsọ bụ isi nke agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ bụ iji kwado ndị nne na nna n’ịzụlite ndị ntorobịa ga-abara onwe ha uru bụ́ ndị tolitere nke ọma n’ọgụgụ isi, n’anụ ahụ, na ná mmetụta uche.”

Ya mere ndị nne na nna na ndị nkụzi na-ekerịta otu ihe mgbaru ọsọ​—⁠ịzụlite ndị ntorobịa ndị ga-emesịa ghọọ ndị toro eto tozuru okè na ndị a haziri ahazi bụ́ ndị na-anụ ụtọ ndụ ma nwee ike ịchọta ọnọdụ ha n’ọha mmadụ ha bi na ya.

Ndị Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ, Ọ Bụghị Ndị Na-ama Aka

Otú ọ dị, nsogbu na-ebilite mgbe ndị nne na nna na-ekwenyereghị ndị nkụzi. Ụfọdụ ndị nne na nna, dị ka ihe atụ, achọdịghị ịma ma ọlị maka agụmakwụkwọ ụmụ ha; ndị ọzọ na-anwa ịma ndị nkụzi aka. N’ịtụle ọnọdụ a, otu akwụkwọ akụkọ France sịrị: “Ọ bụkwaghị nanị onye nkụzi bụ onye isi ọkwọ ụgbọ mmiri. Ndị nne na nna, ndị ihe ịga nke ọma ụmụ ha na-agba ara, na-atụchagharị akwụkwọ ndị e ji eje akwụkwọ, na-akatọsị ụzọ ndị e si akụzi ihe, na-ejikwa iwe emeghachi omume ngwa ngwa maka ihe mbụ nwa ha dara.” Omume ndị dị otú ahụ pụrụ ịkpaghasị usoro ihe ndị ka mkpa nye ndị nkụzi.

Foto dị na peeji nke 29

Ndịàmà Jehova na-eche na a na-emere ụmụ ha ihe ọma karị mgbe ndị nne na nna so ndị nkụzi na-emekọ ihe ọnụ, na-enwe ezi mmasị nke na-enye aka n’agụmakwụkwọ ụmụ ha

Ndịàmà Jehova na-eche na a na-emere ụmụ ha ihe ọma karị mgbe ndị nne na nna so ndị nkụzi na-emekọ ihe ọnụ, na-enwe ezi mmasị nke na-enye aka n’agụmakwụkwọ ụmụ ha. Mmekọ ihe ọnụ dị otú ahụ, ka ha kwenyere, dịkarịsịrị mkpa n’ihi na ọrụ nke onye nkụzi anọwo na-esiwanye ike.

Nsogbu Ndị Dị n’Ụlọ Akwụkwọ Taa

N’igosipụta ọha mmadụ nke ha bụ akụkụ ya, e kpuchighị ụlọ akwụkwọ pụọ ná nsogbu ndị ọha mmadụ n’ozuzu ya na-enwe. Nsogbu ọha na eze esiwanyewo ike n’ụzọ dị ngwa n’afọ ndị na-agafenụ. Ịkọwa ọnọdụ ndị dị n’otu ụlọ akwụkwọ na United States, akwụkwọ akụkọ The New York Times kọrọ, sị: “Ụmụ akwụkwọ na-ehi ụra n’ime klas, ha na-eji okwu ndị e dekwasịrị n’elu paseji ụlọ akwụkwọ eyi ibe ha egwu, ha na-elelị ụmụ akwụkwọ na-eme nke ọma. . . . Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụ akwụkwọ nile na-anagide nsogbu ndị dị ka ilekọta ụmụ ọhụrụ, imeso ndị nne na nna e ji eji ihe na ịlanarị ime ihe ike ndị òtù ọjọọ. N’ụbọchị ọ bụla, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ime ụzọ ise na-agha akwụkwọ.”

Nke kasị na-akpata ụjọ bụ nsogbu ime ihe ike n’ụlọ akwụkwọ nke na-arị elu ná mba dị iche iche. Ọgụ a na-alụ site n’oge ruo n’oge ndị na-agụnye ịkwa aka na inu aka abụrụwo nke e ji ịgbarịta égbè na ịma mma dochie. Ngwá agha juru ebe nile, mwakpo na-adịwanye njọ, ka ụmụaka na-echigharịkwuru ime ihe ike ngwa ngwa karị na n’afọ ndụ dị ala karị.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụghị mba ọ bụla na-eche ọnọdụ ndị jọgburu onwe ya otú ahụ ihu. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nkụzi gburugburu ụwa na-ezute ọnọdụ e hotara n’akwụkwọ akụkọ France a na-ebipụta kwa izu bụ́ Le Point: “A dịkwaghị akwanyere onye nkụzi ùgwù; o nweghị ikike ọ bụla.”

Foto dị na peeji nke 30

Ndị nne na nna na-enwe ihe ịga nke ọma na-eso ụmụ ha anọkọ

Ụdị enweghị nkwanye ùgwù dị otú ahụ maka ịbụisi na-eche ụmụaka nile ajọ ihe ize ndụ n’ihu. Ya mere Ndịàmà Jehova na-agbalị ịkụbanye n’ime ụmụ ha nrubeisi na nkwanye ùgwù maka ịbụisi, àgwà ndị na-adịkarị ụkọ n’ụlọ akwụkwọ taa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya