Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • rq ihe ọmụmụ 5 p. 10-11
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
  • Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụwa Anyị A?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Olee ebe Paradaịs Baịbụl kwuru okwu ya dị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ndụ Nwere Nzube Dị Ebube
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
rq ihe ọmụmụ 5 p. 10-11

Ihe Ọmụmụ nke 5

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

N’ihi gịnị ka Jehova ji kee ụwa? (1, 2)

Gịnị mere na ụwa abụghị paradaịs ugbu a? (3)

Gịnị ga-eme ndị ajọ omume? (4)

N’ọdịnihu, gịnị ka Jisọs ga-emere ndị ọrịa? ndị agadi? ndị nwụrụ anwụ? (5, 6)

Iji kere òkè ná ngọzi ọdịnihu ndị ahụ, gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee? (7)

1. Jehova kere ụwa a ka ụmụ mmadụ wee nwee ike inwe obi ụtọ ibi na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ chọrọ ka ụwa bụrụ mgbe nile ihe ndị ezi omume na-enwe obi ụtọ bijupụtara. (Abụ Ọma 115:16; Aịsaịa 45:18) A gaghị ebibi ụwa mgbe ọ bụla; ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 104:5; Eklisiastis 1:4.

2. Tupu Chineke emee mmadụ, Ọ họọrọ otu akụkụ dị nta nke ụwa ma mee ya paradaịs mara mma. Ọ kpọrọ ya ogige Iden. Ọ bụ n’ebe a ka o tinyere nwoke na nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Adam na Iv. Chineke zubere ka ha mụọ ụmụ, jupụtakwa ụwa nile. Nke nta nke nta ha ga-emeworị ka ụwa dum ghọọ paradaịs.—Jenesis 1:28; 2:8, 15.

3. Adam na Iv mehiere site n’ịkpachara anya mebie iwu Chineke. Ya mere Jehova chụpụrụ ha n’ogige Iden. A tụfuru paradaịs. (Jenesis 3:1-6, 23) Ma Jehova echefubeghị nzube ya maka ụwa a. O na-ekwe nkwa ime ya ka ọ bụrụ paradaịs, ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. Olee otú ọ ga-esi mee nke a?—Abụ Ọma 37:29.

4. Tupu ụwa a enwee ike ịghọ paradaịs, a ghaghị iwepụ ndị ajọ omume. (Abụ Ọma 37:38) Nke a ga-eme n’Amagedọn, nke bụ agha Chineke iji weta ajọ omume ná njedebe. Mgbe nke a gasịrị, a ga-atụ Setan mkpọrọ 1,000 afọ. Nke a pụtara na a gaghị ahapụ ndị ajọ omume ọ bụla imebi ụwa. Nanị ndị Chineke ga-alanarị.—Mkpughe 16:14, 16; 20:1-3.

5. Mgbe ahụ Jisọs Kraịst ga-achị dị ka Eze n’elu ụwa a ruo 1,000 afọ. (Mkpughe 20:6) Ọ ga-eji nke nta nke nta wepụ mmehie n’uche na n’ahụ anyị. Anyị ga-aghọ ụmụ mmadụ zuru okè dị nnọọ ka Adam na Iv zuru okè tupu ha emehie. Mgbe ahụ a gaghị enwekwa ọrịa, ịka nká, na ọnwụ ọzọ. A ga-agwọ ndị ọrịa, ndị agadi ga-aghọkwa ndị na-eto eto ọzọ.—Job 33:25; Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:3, 4.

6. N’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs, ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-arụ ọrụ ime ka ụwa nile ghọọ paradaịs. (Luk 23:43) Ọzọkwa, a ga-akpọliteghachi ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ gaa ná ndụ mmadụ n’elu ala. (Ọrụ 24:15) Ọ bụrụ na ha emee ihe Chineke chọrọ n’aka ha, ha ga-anọgide na-adị ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi. Ma ọ́ bụghị ya, a ga-ebibi ha ruo ebighị ebi.—Jọn 5:28, 29; Mkpughe 20:11-15.

7. Nzube mbụ nke Chineke maka ụwa ga-esi otú a gaa nke ọma. Ọ̀ ga-amasị gị ikere òkè ná ngọzi ọdịnihu ndị a? Ya bụrụ otú ahụ, ọ dị gị mkpa ịnọgide na-amụ banyere Jehova ma na-erubere ihe ọ chọrọ isi. Ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova nke dị n’ógbè gị ga-enyere gị aka ime otú ahụ.—Aịsaịa 11:9; Ndị Hibru 10:24, 25.

[Foto dị na peeji nke 10]

Paradaịs furu efu

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Amagedọn gasịa, a ga-eme ụwa ka ọ ghọọ paradaịs

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya