Akụkọ Alaeze nke 35
Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha N’anya?
Ịhụnanya Maka Ndị Agbata Obi Ajụwo Oyi
Ọ DỊ ọtụtụ nde mmadụ ka ha enweghị enyemaka, ha na-ahụsikwa anya, n’enweghị ebe ha ga-echigharịkwuru. Otu nwanyị bụ́ ọchụnta ego laworo ezumike nká kwuru, sị: ‘Otu mgbede otu nwanyị di ya nwụrụ mụ na ya bi n’otu okpukpu ụlọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m ma sị na owu na-ama ya. Eji m ire ọma gwa ya n’ezoghị ọnụ na m ji ọrụ n’aka. Ọ rịọrọ mgbaghara maka inye m nsogbu ma pụọ.’
N’ụzọ dị mwute, n’abalị ahụ, nwanyị ahụ di ya nwụrụ gburu onwe ya. Mgbe e mesịrị, ọchụnta ego ahụ kwuru na ya enwetawo “ihe mmụta dị ike.”
Enweghị ịhụnanya maka ndị agbata obi na-ewetakarị ọdachi. N’oge ọgụ agbụrụ na Bosnia na Herzegovina, ndị bụbu akụkụ nke Yugoslavia, a chụpụrụ ihe karịrị otu nde mmadụ n’ebe obibi ha, gbuokwa ọtụtụ iri puku. N’aka olee ndị? “Ndị agbata obi anyị,” ka otu nwa agbọghọ a chụpụrụ n’obodo nta ya kwara n’arịrị. “Anyị maara ha.”
Na Rwanda e gburu ọtụtụ narị puku mmadụ, ọtụtụ mgbe n’aka ndị agbata obi ha. “Ndị Hutu na ndị Tutsi [bikọrọ] ọnụ, na-alụkọrịta nwanyị, n’ajụghị ase ma ọ bụ ọbụna n’amaghị onye bụ onye Hutu na onye bụ onye Tutsi,” ka The New York Times kọrọ. “Mgbe ahụ ihe gbanwere n’otu ntabi anya,” “igbu ndị mmadụ wee malite.”
N’otu aka ahụ, ndị Juu na ndị Arab n’Israel na-ebikọ ọnụ, ma ọtụtụ kpọrọ ibe ha asị. Otú ahụ ka ọnọdụ dịkwa n’ebe ọtụtụ ndị Katọlik na ndị Protestant na Ireland na ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ ná mba ndị ọzọ. Ọ dịbeghị mgbe ọzọ n’akụkọ ihe mere eme ụwa na-enweghị ịhụnanya otú a.
N’ihi Gịnị Ka Ịhụnanya Maka Ndị Agbata Obi Jiworo Jụọ Oyi?
Onye Okike anyị na-aza ya. Okwu ya, bụ́ Bible, na-akpọ oge anyị bi n’ime ya “mgbe ikpeazụ.” Nke a bụ oge mgbe, ka amụma Bible na-ekwu, ‘ihe mmadụ ibe ha agaghị na-atọ ndị mmadụ ụtọ.’ Banyere “oge dị oké egwu” ndị a, nke a kpọkwara n’Akwụkwọ Nsọ “ọgwụgwụ oge a,” Jisọs Kraịst buru amụma na “ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ ga-ajụkwa oyi.”—2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3, 12.
Ya mere, ụkọ ịhụnanya nke taa bụ akụkụ nke ihe àmà nke na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke ụwa a. Ọ bụ ihe obi ụtọ na ọ pụtakwara na ụwa ọhụrụ nke ezi omume nke ịhụnanya na-achị ga-anọchi ụwa a nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’isi nso.—Matiu 24:3-14; 2 Pita 2:5; 3:7, 13.
Ma ànyị nwere n’ezie ihe anyị ga-eji kwere na mgbanwe dị otú ahụ kwere omume—na mmadụ nile pụrụ ịmụta ịhụ ibe ha n’anya na iso ibe ha biri n’udo?
Ịhụnanya Maka Ndị Agbata Obi—Ihe Dị Adị
“ÒNYE bụkwa onye agbata obi m?” ka otu ọkàiwu na narị afọ mbụ jụrụ Jisọs. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ tụrụ anya ka Jisọs sị, ‘Ndị Juu ibe gị.’ Ma n’akụkọ banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi, Jisọs gosiri na ndị mba ọzọ bụkwa ndị agbata obi anyị.—Luk 10:29-37; Jọn 4:7-9.
Jisọs mesiri okwu ike na, ịhụnanya maka Chineke gasịa, ịhụnanya maka ndị agbata obi kwesịrị ịchịkwa ndụ anyị. (Matiu 22:34-40) Ma ọ̀ dịwo ìgwè ụmụ mmadụ ọ bụla hụworo ndị agbata obi ha n’anya n’eziokwu? Ndị Kraịst oge mbụ mere otú ahụ! E ji ịhụnanya ha nwere maka ndị ọzọ mara ha.—Jọn 13:34, 35.
Gịnị banyere taa? È nwere onye na-egosipụta ịhụnanya yiri nke Kraịst? Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia Canadiana na-ekwu, sị: “Ọrụ Ndịàmà Jehova bụ ntụte na nguzobeghachi nke Iso Ụzọ Kraịst ọkpụtọrọkpụ nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gbasoro . . . Ha nile bụ ụmụnna.”
Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ pụtara na Ndịàmà Jehova adịghị ekwe ka ihe ọ bụla—ma ọ̀ bụ ebo, mba, ma ọ bụ nzụlite agbụrụ—mee ka ha kpọọ ndị agbata obi ha asị. Ha agaghịkwa egbu onye ọ bụla, n’ihi na n’ụzọ ihe atụ ha akpụgharịwo mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. (Aịsaịa 2:4) N’ezie, e ji ibute ụzọ n’inyere ndị agbata obi ha aka mara Ndịàmà.—Ndị Galetia 6:10.
Ka a sịkwa ihe mere otu uche akwụkwọ akụkọ na Sacramento Union nke California ji kwuo, sị: “O zuru ezu ikwu na ọ bụrụ na ụwa nile ji ụkpụrụ okwukwe Ndịàmà Jehova ebi ndụ, mwụfu ọbara na mkpọrọmasị ga-akwụsị, ịhụnanya ga-achịkwa dị ka eze.” Otu onye na-ede ihe na magazin bụ́ Ring nke Hungary kwuru, sị: “Abịawo m ná nkwubi okwu bụ na a sị na Ndịàmà Jehova agwụla ndị bi n’elu ụwa, agha agaghị adịkwa, nanị ọrụ ndị uwe ojii ga-enwe ga-abụkwa inye nduzi n’okporo ámá na inye akwụkwọ ikike ngafe.”
Ma, ọ bụ eziokwu na a ga-achọ nnukwute mgbanwe zuru ụwa ọnụ ma ọ bụrụ na mmadụ nile gaje ịhụ ibe ha n’anya. Olee otú mgbanwe ahụ ga-esi bịa? (Biko lee peji ikpeazụ.)
Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha N’anya
OTU ekpere Jisọs Kraịst kụziri na-egosi na oké mgbanwe na-eru nso. N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jisọs kụziiri anyị ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ n’ụwa, dị ka e si eme ya n’eluigwe.”—Matiu 6:10, King James Version.
Gịnị bụ Alaeze Chineke? Ọ bụ ọchịchị n’ezie, nke na-achị site n’eluigwe. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “alaeze eluigwe.” Jisọs, “Onyeisi Udo,” abụwo onye Nna ya họpụtara ịbụ onye ọchịchị ya.—Matiu 10:7; Aịsaịa 9:6, 7; Abụ Ọma 72:1-8.
Mgbe Alaeze Chineke bịara, gịnị ga-eme ụwa a jupụtara ná mkpọrọmasị? “Alaeze” ahụ “ga-etipịa” ọchịchị nile rụrụ arụ nke ụwa a ma “mee ka ha gwụsịa.” (Daniel 2:44) Bible na-akọwa, sị: “Ụwa na-agabigakwa . . . , ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.
Banyere ụwa ọhụrụ Chineke, Bible na-asị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:9-11, 29; Ilu 2:21, 22) Lee oge dị ebube nke ahụ ga-abụ! “Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Ọbụna ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ, a ga-agbanwekwa ụwa dum ka ọ ghọọ paradaịs nkịtị.—Aịsaịa 11:6-9; 35:1, 2; Luk 23:43; Ọrụ 24:15.
Iji biri n’ụwa ọhụrụ Chineke, anyị aghaghị ịhụ ibe anyị n’anya, ọbụna dị ka Chineke na-akụziri anyị ka anyị mee. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:9) Otu onye Ọwụwa Anyanwụ na-amụ Bible kwuru, sị: “Ana m atụ anya oge mgbe, dị ka Bible na-ekwe ná nkwa, mmadụ nile ga-amụtawo ịhụ ibe ha n’anya.” Anyị pụkwara ijide n’aka na Chineke ga-emezu nkwa ya! “Ekwuwo m,” ka ọ na-ekwu, “M ga-emekwa ya.”—Aịsaịa 46:11.
Ma iji nụ ụtọ ngọzi ndị ahụ n’okpuru Alaeze Chineke, ị ghaghị ịnara ihe ọmụma Bible, dị ka ọtụtụ nde ndị obi ha ziri ezi gburugburu ụwa na-eme. (Jọn 17:3) Broshuọ ahụ dị peji 32 bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ga-enyere gị aka. Nata otu site n’idejupụta mpempe akwụkwọ dị na peji bu nke a ụzọ na iziga ya n’adres kasị nso n’ebe i bi.
□ Aga m achọ ịmata ụzọ m pụrụ isi nweta broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
□ Biko chọtanụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
Onye na-ezoro ezoro awakpo mmadụ na ememe ili ozu na Bosnia: Reuters/Corbis-Bettmann