Echiche ahụ Abanye n’Okpukpe Ndị Juu, Krisendọm, na Alakụba
“Okpukpe sokwa n’ụzọ e si eme ka ndị mmadụ kwere eziokwu ahụ bụ́ na otu ụbọchị ha aghaghị ịnwụ, ma ọ̀ bụ site ná nkwa nke ndụ ka mma mgbe a nwụsịrị, ná mmụghachi, ma ọ bụ ha abụọ.”—GERHARD HERM, ONYE GERMANY NA-EDE AKWỤKWỌ.
1. Ihe ka n’ọtụtụ okpukpe na-eme ka nkwa ha nke ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị dabere ná nkwenkwe bụ́ isi dị aṅaa?
N’IKWE nkwa nke ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile dabeere na nkwenkwe nke bụ na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nakwa na ọ na-aga n’ógbè ọzọ ma ọ bụ gafee n’ihe ọzọ e kere eke mgbe a nwụrụ. Dị ka a rịbara ama ná nkebi bu ụzọ, nkwenkwe na mmadụ adịghị anwụ anwụ abụrụwo akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke okpukpe Ebe Ọwụwa Anyanwụ site ná mmalite ha. Ma gịnị banyere okpukpe ndị Juu, Krisendọm, na Alakụba? Olee otú nkụzi a si ghọọ ihe bụ́ isi n’okpukpe ndị a?
Okpukpe Ndị Juu Anabata Echiche Ndị Gris
2, 3. Dị ka Encyclopædia Judaica si kwuo, ihe odide ndị dị nsọ nke Hibru hà na-akụzi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?
2 Mkpọrọgwụ nke okpukpe ndị Juu dịrị laa azụ n’ihe dị ka afọ 4,000 n’oge Abraham. A malitere ide ihe odide Hibru dị nsọ na narị afọ nke 16 T.O.A., e desịkwara ya n’otu oge ahụ Socrates na Plato kwalitere ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Akwụkwọ Nsọ a ọ̀ kụziri anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?
3 Encyclopædia Judaica na-aza, sị: “Ọ bụ nanị n’oge e desịrị Bible ka nkwenkwe doro anya ma kwusie ike n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi guzosiri ike . . . ghọọkwa otu n’ime ihe ndị kasị mkpa nke okpukpe ndị Juu na ndị Kraịst.” O kwukwara, sị: “N’oge Bible e weere mmadụ dị ka onye. N’ihi ya e meghị ka mkpụrụ obi guzopụ nnọọ iche n’ebe ahụ dị.” Ndị Juu oge mbụ kweere ná mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, nke a kwa “dị iche ná nkwenkwe . . . anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi,” ka akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-akọwapụta.
4-6. Olee otú nkwenkwe nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi si ghọọ “otu n’ime ihe ndị kasị mkpa” nke okpukpe ndị Juu?
4 Mgbe ahụ, olee otú nkwenkwe ahụ si ghọọ “otu n’ime ihe ndị kasị mkpa” nke okpukpe ndị Juu? Akụkọ ihe mere eme na-enye azịza ya. Na 332 T.O.A., Alexander Onye Ukwu meriri ọtụtụ ebe n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’otu ntabi anya. Mgbe o rutere na Jerusalem, ndị Juu nabatara ya nke ọma. Dị ka onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ bụ́ Flavius Josephus si kwuo, ha gosidịrị ya amụma sitere n’akwụkwọ Daniel, nke e dere ihe karịrị afọ 200 tupu mgbe ahụ, nke kọwara n’ụzọ doro anya mmeri Alexander ga-emeri dị ka “eze Gris.” (Daniel 8:5-8, 21, NW) Ndị nọchịrị Alexander gara n’ihu n’atụmatụ ya nke Mgbasa Ọdịbendị Ndị Gris, na-eji asụsụ, ọdịbendị, na nkà ihe ọmụma ndị Gris emejupụta akụkụ dum nke alaeze ukwu ahụ. A pụghi izere ngwakọta nke ọdịbendị abụọ ahụ—nke ndị Gris na nke ndị Juu.
5 Ná mmalite narị afọ nke atọ T.O.A., a malitere nsụgharị mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Grik, nke a kpọrọ Septuagint. Site na ya ọtụtụ ndị Jentaịl malitere ịmata ma na-akwanyere okpukpe ndị Juu ùgwù, ọbụna a tọghatara ụfọdụ. Ndị Juu, n’aka nke ọzọ, amarawala banyere echiche ndị Gris, ụfọdụ ghọkwara ndị ọkà ihe ọmụma, ihe bụ nnọọ ihe ọhụrụ nye ha. Philo nke Alexandria, nke narị afọ nke mbụ O.A., bụ otu onye ọkà ihe ọmụma Juu dị otú ahụ.
6 Philo sọpụụrụ Plato ma gbalịa iji nkà ihe ọmụma ndị Gris akọwa okpukpe ndị Juu. “Site n’imepụta njikọ pụrụ iche nke nkà ihe ọmụma Plato na ọdịnala Bible,” ka akwụkwọ bụ́ Heaven—A History na-ekwu, “Philo sụụrụ ndị Kraịst [tinyere ndị Juu] oge ikpeazụ na-eche echiche ụzọ.” Gịnịkwa ka Philo kweere banyere mkpụrụ obi? Akwụkwọ ahụ na-aga n’ihu na-asị: “Nye ya, ọnwụ na-eweghachi mkpụrụ obi n’ihe ọ bụbu, n’ọnọdụ ọ nọ tupu a mụọ ya. Ebe ọ bụ na mkpụrụ obi dịịrị ụwa ime mmụọ, ịdị ndụ n’ahụ na-aghọ nanị ihe omume dị mkpirikpi, nke ihe ọjọọ na-adabakarịrị.” Ndị Juu ndị ọzọ na-eche echiche bụ́ ndị kweere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi gụnyere Isaac Israeli, onye Juu bụ́ dibịa a ma ama nke narị afọ nke 10, na Moses Mendelssohn, onye Juu nke Germany bụ́ onye ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke 18.
7, 8. (a) Olee otú Talmud si akọwa mkpụrụ obi? (b) Gịnị ka akwụkwọ ihe omimi nke ndị Juu nke e mesịrị nwee kwuru banyere mkpụrụ obi?
7 Otu akwụkwọ nke nwewokwara mmetụta miri emi n’echiche na ná ndụ ndị Juu bụ Talmud—nchịkọta e dere ede nke ihe ahụ a na-akpọ iwu e nyere n’ọnụ, na okwu na nkọwa nke iwu a, bụ́ nke ndị rabaị mesịrị chịkọta site na narị afọ nke abụọ O.A., ruo Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya. “Ndị rabaị nke Talmud,” ka Encyclopædia Judaica na-ekwu, “kweere ná ndịgide nke mkpụrụ obi mgbe a nwụsịrị.” Ọbụna Talmud ahụ na-ekwu banyere ndị nwụrụ anwụ ịkpọtụrụ ndị dị ndụ. “Ikekwe n’ihi mmetụta nke ozizi Plato,” ka Encyclopædia of Religion and Ethics na-ekwu, “[ndị rabaị] kweere n’ịdịbu adị nke mkpụrụ obi.”
8 Akwụkwọ ihe omimi nke ndị Juu e mesịrị nwee bụ́ Cabala, ọbụna ruru n’ókè nke ịkụzi ịlọ ụwa. Banyere nkwenkwe a, The New Standard Jewish Encyclopedia na-ekwu, sị: “O yiri ka echiche ahụ ọ malitere n’India. . . . Na Kabbalah o bu ụzọ pụta n’akwụkwọ bụ́ Bahir, mgbe ahụ kwa, site na Zohar gaa n’ihu, ndị kwere n’ihe omimi nakweere ya karị, ebe ọ na-arụ ọrụ dị mkpa ná nkwenkwe na n’akwụkwọ ndị Hasidim.” N’Israel nke taa, a nakweere ịlọ ụwa n’ụzọ dị ukwuu dị ka nkụzi ndị Juu.
9. Gịnị bụ nguzo nke ihe ka ọtụtụ n’òtù okpukpe ndị Juu nke oge a n’ihe banyere anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?
9 Ya mere, echiche anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi banyere n’okpukpe ndị Juu site ná mmetụta nke ọkà ihe ọmụma ndị Gris, ihe ka ọtụtụ n’òtù ya na-anakwerekwa echiche ahụ taa. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere mbanye nke nkụzi ahụ banyere na Krisendọm?
Krisendọm Anabata Echiche Plato
10. Gịnị ka onye Spain a ma ama bụ́ ọkà mmụta kwubiri banyere ihe Jisọs kweere banyere anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?
10 Ezi Iso Ụzọ Kraịst ji Jisọs Kraịst malite. Banyere Jisọs, Miguel de Unamuno, onye Spain bụ́ ọkà mmụta a ma ama nke narị afọ 20, dere, sị: “O kwere ná mbilite n’ọnwụ nke anụ ahụ, dị ka ụzọ ndị Juu si dị, ọ bụghị n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, dị ka ụzọ Plato [ndị Gris] si dị. . . . A pụrụ ịhụ ihe àmà nke a n’akwụkwọ nkọwa okwu ọ bụla na-ekwu eziokwu.” O kwubiri, sị: “Anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi . . . bụ nkwenkwe nkà ihe ọmụma nke ndị na-ekpere arụsị.”
11. Olee mgbe nkà ihe ọmụma ndị Gris malitere igbebata n’Iso Ụzọ Kraịst?
11 Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka “nkwenkwe nkà ihe ọmụma nke ndị na-ekpere arụsị” a si gbebata n’Iso Ụzọ Kraịst? New Encyclopædia Britannica na-akọwapụta, sị: “Malite n’etiti narị afọ nke 2 AD ndị Kraịst nwetụrụ ọzụzụ ná nkà ihe ọmụma ndị Gris malitere iche na ọ dị mkpa igosipụta okwukwe ha n’ụzọ kwekọrọ na ya, ma n’ihi iji mejuo ọchịchọ nke ọgụgụ isi ha ma iji tọghata ndị na-ekpere arụsị gụrụ akwụkwọ. Nkà ihe ọmụma nke kasị dabara ha bụ ozizi Plato.”
12-14. Òkè dị aṅaa ka Origen na Augustine keere n’ịgwakọta nkà ihe ọmụma Plato na Iso Ụzọ Kraịst?
12 Ndị ọkà ihe ọmụma abụọ oge mbụ dị otú ahụ kpara ike dị egwu n’ozizi Krisendọm. Otu bụ Origen nke Alexandria (c. 185-254 O.A.), nke ọzọkwa bụ Augustine nke Hippo (354-430 O.A.). Banyere ha, New Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “Nanị site n’Origen nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ na St. Augustine nọkwa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ka e ji guzobe mkpụrụ obi dị ka ihe bụ́ mmụọ ma wepụta echiche nkà ihe ọmụma banyere ọdịdị ya.” Ná ndabere dị aṅaa ka Origen na Augustine si wepụta echiche ha banyere mkpụrụ obi?
13 Origen bụ nwa akwụkwọ Clement nke Alexandria, bụ́ “onye mbụ ná ndị Nna gbaziiri ihe kpọmkpem site n’ọdịnala ndị Gris banyere mkpụrụ obi,” ka New Catholic Encyclopedia na-ekwu. Echiche Plato banyere mkpụrụ obi aghaghị imetụtaworị Origen n’ụzọ miri emi. “[Origen] tinyere n’ime ozizi ndị Kraịst usoro nkụzi dị ukwuu banyere mkpụrụ obi, bụ́ nke ọ natara Plato,” ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ Werner Jaeger kwuru na The Harvard Theological Review.
14 Ndị ụfọdụ nọ na Krisendọm na-ewere Augustine dị ka onye kasị eche echiche nke oge ochie. Tupu a tọghata ya gaa ‘n’Iso Ụzọ Kraịst’ mgbe ọ dị afọ 33, Augustine nwere nnukwu mmasị na nkà ihe ọmụma, ọ ghọkwara onye kwere n’Ozizi Plato nke Ọgbara Ọhụrụ. Mgbe a tọghatasịrị ya, ọ nọgidere na-ekwere n’Ozizi Plato nke Ọgbara Ọhụrụ n’iche echiche ya. “Uche ya bụ ebe a gwakọtara okpukpe nke Agba Ọhụrụ na ọdịnala Plato nke nkà ihe ọmụma ndị Gris n’ụzọ kasị zuo ezuo,” ka The New Encyclopædia Britannica na-ekwu. New Catholic Encyclopedia na-ekweta na ‘ozizi Augustine [banyere mkpụrụ obi], nke ghọrọ ụkpụrụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ruo ná ngwụsị narị afọ nke 12, bụ n’ụzọ dị ukwuu . . . nke sitere n’ozizi Plato nke Ọgbara Ọhụrụ.’
15, 16. Mmasị e nwere ná nkụzi Aristotle na narị afọ nke 13 ọ̀ gbanwere nguzo chọọchị ná nkụzi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?
15 Na narị afọ nke 13, nkụzi Aristotle malitere iwu ewu na Europe, n’ụzọ dị ukwuu n’ihi inwe n’asụsụ Latin akwụkwọ ndị ọkà mmụta Arab bụ́ ndị kwuru okwu n’ụzọ sara mbara banyere ihe ndị Aristotle dere. Iche echiche Aristotle masịrị nnọọ onye ọkà mmụta Katọlik bụ́ Thomas Aquinas. N’ihi ihe ndị Aquinas dere, nchepụta Aristotle nwere nnukwu mmetụta ná nkụzi chọọchị karịa otú nke Plato nwere. Otú ọ dị, ihe a emetụtaghị nkụzi banyere anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi.
16 Aristotle kụziri na mkpụrụ obi na ahụ dịkọtara ọnụ n’ụzọ a na-apụghị ikewa ekewa, na ọ dịghị adịgide ndụ n’onwe ya mgbe a nwụsịrị nakwa na ọ bụrụ na ihe na-adịru ebighị ebi dị n’ime mmadụ, ọ bụ ihe a na-adịghị ahụ anya, nke na-abụghị onye nwere ọgụgụ isi. Ile mkpụrụ obi anya n’ụzọ a ekwekọghị ná nkwenkwe chọọchị nke mkpụrụ obi mmadụ ịdịgide ndụ mgbe a nwụsịrị. N’ihi ya, Aquinas gbanwegharịrị echiche Aristotle banyere mkpụrụ obi, na-ekwusi ike na a pụrụ ịnwapụta anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi site n’ịtụgharị uche. N’ihi ya, okwukwe chọọchị kweere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi dịgidere.
17, 18. (a) Mgbanwe nke narị afọ nke 16, ò webatara mgbanwe ná nkụzi banyere mkpụrụ obi? (b) Gịnị bụ nguzo nke ihe ka n’ọtụtụ òtù Krisendọm banyere anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?
17 Na narị afọ nke 14 na nke 15, ná mmalite nke Oge Ntụte, a tụtere mmasị e nwere na Plato. Ọbụna ezinụlọ Medici a ma ama n’Itali guzobere ụlọ akwụkwọ Plato na Florence iji kwalite ọmụmụ nke nkà ihe ọmụma Plato. Na narị afọ nke 16 na nke 17, mmasị e nwere n’Aristotle dalatara. Mgbanwe nke narị afọ nke 16 ewebataghịkwa mgbanwe ná nkụzi banyere mkpụrụ obi. Ọ bụ ezie na ndị Mgbanwe Protestant rụwara ozizi pọgatrị ụka, ha nakweere echiche nke ntaramahụhụ ma ọ bụ ụgwọ ọrụ ebighị ebi.
18 Nkụzi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi si otú a gbasaa n’ihe ka n’ọtụtụ òtù Krisendọm. N’ịrịba nke a ama, onye America bụ́ ọkà mmụta dere, sị: “N’ezie, nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke agbụrụ anyị, okpukpe pụtara anwụghị anwụ, ọ gwụla. Chineke bụ onye mepụtara anwụghị anwụ.”
Anwụghị Anwụ na Alakụba
19. Olee mgbe e guzobere Alakụba, ọ̀ bụkwa site n’aka onye?
19 Alakụba malitere site n’ọkpụkpọ a kpọrọ Muḥammad ịbụ onye amụma mgbe ọ dị ihe dị ka afọ 40. Ndị Alakụba kwetara n’ozuzu ha na e nyere ya mkpughe n’ime oge dị ka afọ 20 ruo afọ 23, site n’ihe dị ka 610 O.A., ruo n’ọnwụ ya na 632 O.A. E dekọrọ mkpughe ndị a na Koran, bụ́ akwụkwọ nsọ nke ndị Alakụba. Ka ọ na-erule oge Alakụba malitere dịwa, nchepụta Plato banyere mkpụrụ obi gbebatara n’okpukpe ndị Juu na Krisendọm.
20, 21. Gịnị ka ndị Alakụba kweere banyere Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
20 Ndị Alakụba kweere na okpukpe ha bụ nke ikpeazụ ya ná mkpughe e nyere ndị Hibru na ndị Kraịst oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi. Koran na-ezo aka ma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma na nke Grik. Ma n’ihe banyere nkụzi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, Koran dị iche n’ihe odide ndị a. Koran na-akụzi na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị. Ọ na-ekwukwa banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ụbọchị ikpe, na ọdịnihu ikpeazụ a kara aka nke mkpụrụ obi—ndụ n’ubi paradaịs eluigwe ma ọ bụ ntaramahụhụ na hel na-ere ọkụ.
21 Ndị Alakụba kweere na mkpụrụ obi onye nwụrụ anwụ na-aga na Barzakh, ma ọ bụ “Ebe E Kewapụrụ Iche,” “ebe ma ọ bụ ọnọdụ ndị mmadụ ga-anọ mgbe ha nwụsịrị na tupu Ikpe.” (Surah 23:99, 100, The Holy Qur-an, nkọwa ala ala peji) Mkpụrụ obi na-ama ihe na-aganụ, na-anụ ụfụ ihe a kpọrọ “Ịpịa Ụtarị nke Ili” n’ebe ahụ ma ọ bụrụ na onye ahụ abụwo onye na-eme ihe ọjọọ ma ọ bụ na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ nọwo na-ekwesị ntụkwasị obi. Ma ndị ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi aghaghịkwa inweta mmekpa ahụ ụfọdụ n’ihi mmehie ole na ole ha mere mgbe ha dị ndụ. N’ụbọchị ikpe ahụ, onye ọ bụla na-eche ọdịnihu ya a kara aka ga-adịru ebighị ebi ihu, nke na-eweta ọnọdụ nchere ahụ ná njedebe.
22. Ozizi ndị dịgasị iche dị aṅaa banyere ọdịnihu a kara aka nke mkpụrụ obi ka ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma Arab chepụtara?
22 Echiche anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi n’okpukpe ndị Juu na Krisendọm pụtara n’ihi mmetụta nke Plato, ma e tinyere nchepụta ahụ n’Alakụba site ná mmalite ya. Nke a apụtaghị na ndị ọkà mmụta Arab agbalịbeghị ịgwakọta nkụzi Alakụba na nkà ihe ọmụma ndị Gris. N’ezie, ọrụ Aristotle nwere mmetụta dị ukwuu n’ógbè Arab. Ndị ọkà mmụta Arab a makwa ama, dị ka Avicenna na Averroës, kọwara ma mee ka echiche Aristotle saa mbara. Otú ọ dị, ná mgbalị ha ime ka echiche ndị Gris na nkụzi Alakụba banyere mkpụrụ obi kwekọọ, ha chepụtara ozizi ndị dịgasị iche. Dị ka ihe atụ, Avicenna kwuru na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ. N’aka nke ọzọ, Averroës rụrụ echiche ahụ ụka. N’agbanyeghị echiche ndị a, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi ka bụ nkwenkwe ndị Alakụba.
23. Olee ebe okpukpe ndị Juu, Krisendọm, na Alakụba guzo n’okwu banyere anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?
23 Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, okpukpe ndị Juu, Krisendọm, na Alakụba na-ezicha ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi.
[Foto dị na peeji nke 14]
Mmeri nke Alexander Onye Ukwu dugara n’ịgwakọta ọdịbendị ndị Gris na ndị Juu
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Origen, n’elu, na Augustine gbalịrị ịgwakọta nkà ihe ọmụma Plato na Bible
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Avicenna, n’elu, kwupụtara na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ. Averroës rụrụ echiche ahụ ụka