N’ihi Gịnị Ka Anyị Ji Anwụ Anwụ?
“Elu ugwu nile dị jụụ ugbu a, ị naghị anụtụdị pịm n’elu osisi nile; ụmụ nnụnụ na-ehi ụra n’elu osisi: chere; n’oge na-adịghị anya ị ga-ezu ike dị ka ndị a.”—JOHANN WOLFGANG VON GOETHE, ONYE GERMANY NA-EDE URI.
1, 2. (a) È kere ụmụ mmadụ inwe ọchịchọ dị aṅaa? (b) Ụdị ndụ dị aṅaa ka di na nwunye mbụ dịrị?
CHINEKE kere ụmụ mmadụ inwe agụụ ịdị ndụ ebighị ebi. N’ezie, Bible na-ekwu na o tinyere “echiche nke mgbe ebighị ebi n’obi ha.” (Eklisiastis 3:11, Beck) Ma Chineke mere ihe karịrị inye ụmụ mmadụ ọchịchọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. O nyekwara ha ohere ime otú ahụ.
2 E kere nne na nna mbụ anyị, bụ́ Adam na Iv, ịbụ ndị zuru okè, n’enweghị ntụpọ n’uche ma ọ bụ n’ahụ. (Deuterọnọmi 32:4) Cheedị echiche—ihe mgbu na ahụ ụfụ na-adịghị ala ala adịghị, ụjọ na-akụnwụ ahụ ma ọ bụ nchegbu adịghị! Ọzọkwa, Chineke debere ha n’ebe obibi paradaịs mara mma. Chineke zubere na mmadụ ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi nakwa na ka oge na-aga ụmụ ya zuru okè ga-ejupụta ụwa. (Jenesis 1:31; 2:15) N’ihi gịnịzi ka anyị ji anwụ anwụ?
Nnupụisi Eweta Ọnwụ
3. Ndụ agwụghị agwụ maka Adam na Iv dabeere na gịnị?
3 Chineke nyere Adam iwu, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na n’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Ya mere ndụ agwụghị agwụ maka Adam na Iv nwere ebe ọ dabeere; ọ dabeere ná nrubeisi ha nye Chineke.
4. Mgbe Adam na Iv mehiere, n’ihi gịnị ka ha ji tụfuo olileanya nke ibi na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi?
4 Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, Adam na Iv nupụrụ isi n’iwu Chineke. (Jenesis 3:1-6) N’ime otú ahụ, ha ghọrọ ndị mmehie, n’ihi na ‘mmehie bụ mmebi iwu.’ (1 Jọn 3:4) N’ihi ya, Adam na Iv enweghịzi olileanya nke ịdị ndụ agwụghị agwụ. N’ihi gịnị? N’ihi na “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ya mere, mgbe ọ na-ama Adam na Iv ikpe, Chineke kwuru, sị: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” E wee chụpụzie nne na nna mbụ anyị n’ebe obibi ha bụ́ Paradaịs. N’ụbọchị ahụ ha mehiere, Adam na Iv malitere usoro ịnwụ anwụ na-aga nwayọọ nwayọọ ma na-adịgide adịgide.—Jenesis 3:19, 23, 24.
‘Ọnwụ Wee Gabiga Ruo Mmadụ Nile’
5. Olee otú ọnwụ si gabiga ruo agbụrụ mmadụ nile?
5 Ugbu a mmehie gbamiri mkpọrọgwụ ná mkpụrụ ndụ ihe nketa Adam na Iv. N’ihi ya, ha apụghị ịmụta ụmụ zuru okè, dịkwa ka ihe e ji akpụ ihe nwere ntụpọ na-enweghị ike ịkpụpụta ihe zuru okè. (Job 14:4) N’ezie, nwa ọ bụla a mụrụ na-akwado na nne na nna mbụ anyị tụfuru ahụ ike zuru okè na ndụ agwụghị agwụ maka ha onwe ha na ụmụ ha. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”—Ndị Rom 5:12; tụlee Abụ Ọma 51:5.
6. N’ihi gịnị ka anyị ji na-anwụ anwụ?
6 Taa ndị ọkà mmụta sayensị amaghị nnọọ ihe mere ụmụ mmadụ ji aka nka ma na-anwụ anwụ. Otú ọ dị, Bible na-akọwa na anyị na-anwụ anwụ n’ihi na a mụrụ anyị dị ka ndị mmehie, ebe anyị ketaworo ọnọdụ a site n’aka nne na nna mbụ anyị. Ma gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?