Isi nke Iri Abụọ na Anọ
Ọ Dịghị Enyemaka A Ga-enweta Site n’Ụwa A
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ndị bi na Jerusalem ji nọrọ n’ụjọ? (b) N’ihi ọnọdụ ọjọọ Jerusalem nọ na ya, ajụjụ dịgasị aṅaa dabara adaba?
NDỊ bi na Jerusalem nọ n’ụjọ—e nwekwara ezi ihe kpatara ya! Asiria, bụ́ alaeze ukwu kachasị ike n’oge ahụ, awakpowo “obodo nile e wusiri ike nke Juda, were ha.” Ugbu a, usuu ndị agha Asiria na-eyi isi obodo Juda egwu. (2 Ndị Eze 18:13, 17) Gịnị ka Eze Hezekaịa na ndị ọzọ bi na Jerusalem ga-eme?
2 Ebe ọ bụ na e meriwo obodo ndị ọzọ dị n’ala ya, Hezekaịa maara na ike Jerusalem na nke ndị agha dị ike nke Asiria ahaghị. Ọzọkwa, a ma ndị Asiria ama maka obi ọjọọ na ime ihe ike ha na-enweghị atụ. Ndị agha nke mba ahụ na-emenye mmadụ ụjọ nke na ndị iro ha na-agba ọsọ mgbe ụfọdụ n’alụghịdị ọgụ! N’ihi ọnọdụ ọjọọ Jerusalem nọ na ya, olee ebe ndị bi n’ime ya ga-aga maka enyemaka? À pụrụ ịgbanahụ ndị agha Asiria? Oleekwa otú ndị Chineke si banye n’ọnọdụ dị otú ahụ? Iji zaa ajụjụ ndị a, anyị ga-eleghachi anya azụ ma hụ otú Jehova si mesoo mba ya na ya nọ n’ọgbụgba ndụ ihe n’afọ ndị gafere tupu mgbe ahụ.
Ndapụ n’Ezi Ofufe n’Israel
3, 4. (a) Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka e si kewaa mba Israel ịghọ alaeze abụọ? (b) Olee otú Jeroboam si duru alaeze ebo iri nke ebe ugwu ahụ banye n’ụzọ dị njọ?
3 Malite n’oge Israel hapụrụ Ijipt ruo mgbe nwa Devid bụ́ Solomọn nwụrụ—ihe ji ntakịrị ihe gafee afọ 500—ebo 12 nke Israel dị n’otu dị ka otu mba. Mgbe Solomọn nwụsịrị, Jeroboam duuru ebo iri dị n’ebe ugwu nupụrụ ụlọ Devid isi, malitekwa mgbe ahụ gaa n’ihu, e kewara mba ahụ ịghọ alaeze abụọ. Nke a bụ n’afọ 997 T.O.A.
4 Jeroboam bụ eze mbụ chịrị alaeze ebe ugwu nke Israel, o dukwaara ndị ọ na-achị si n’ezi ofufe dapụ site n’iji ndị nchụàjà iwu na-akwadoghị nakwa ofufe nke nwa ehi dochie ndị nchụàjà sitere n’eriri Erọn na ezi ofufe Jehova nke iwu kwadoro. (1 Ndị Eze 12:25–33) Nke a bụ ihe Jehova kpọrọ asị. (Jeremaịa 32:30, 35) N’ihi ihe a na ihe ndị ọzọ, o kwere ka Asiria merie Israel. (2 Ndị Eze 15:29) Eze Hoshea gbalịrị isi n’aka Asiria nwere onwe ya site n’isoro Ijipt gbaa izu, ma atụmatụ ahụ kụrụ afọ n’ala.—2 Ndị Eze 17:4.
Israel Echigharịkwuru Ebe Mgbaba Ụgha
5. Ònye ka Israel gakwuuru maka enyemaka?
5 Jehova chọrọ ime ka ndị Israel ghọta onwe ha.a N’ihi ya, o zipụrụ Aịsaịa onye amụma ịga nye ịdọ aka ná ntị a: “Ahụhụ ga-adịrị ndị ahụ ndị na-arịda n’Ijipt ka e wee nyere ha aka, ndị na-adaberekwa ịnyịnya, tụkwasị obi n’ụgbọala, n’ihi na ha dị ọtụtụ, tụkwasịkwa obi ná ndị ịnyịnya, n’ihi na ha nwere ume nke ukwuu; ma ha eleghị Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghịkwa Jehova!” (Aịsaịa 31:1) Lee ihe mwute ọ bụ! Israel tụkwasịrị ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya obi karịa Chineke dị ndụ, bụ́ Jehova. N’ụzọ Israel si eche echiche dị ka ndị anụ ahụ na-achị, ịnyịnya Ijipt dị ọtụtụ, dịkwa ike. N’ezie, Ijipt ga-abụ mba bara uru a ga-eso jikọọ aka megide ndị agha Asiria! Otú ọ dị, ndị Israel ga-achọpụta n’oge na-adịghị anya na njikọ aka ụmụ mmadụ bụ́ anụ ahụ nke ha na Ijipt abaghị uru.
6. N’ihi gịnị ka Israel ịgakwuru Ijipt ji egosi oké enweghị okwukwe n’ebe Jehova nọ?
6 Site n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ndị bi ma n’Israel ma na Juda so Jehova na-enwe mmekọrịta dị ka ndị raara onwe ha nye ya. (Ọpụpụ 24:3–8; 1 Ihe E Mere 16:15–17) Site n’ịgakwuru Ijipt maka enyemaka, Israel gosipụtara enweghị okwukwe n’ebe Jehova nọ na ejighị iwu ndị dị n’ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ kpọrọ ihe. N’ihi gịnị? N’ihi na nkwa Jehova kwere ichebe ndị ya ma ọ bụrụ na ha efee ya ofufe a na-ekewaghị ekewa so n’ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ ahụ. (Levitikọs 26:3–8) N’imezu nkwa ahụ, Jehova egosiwo ugboro ugboro na ya bụ ‘ebe siri ike na mgbe mkpa.’ (Abụ Ọma 37:39; 2 Ihe E Mere 14:2, 9–12; 17:3–5, 10) Ọzọkwa, site n’ọnụ Mosis, bụ́ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, Jehova gwara ndị eze ga-achị Israel n’ọdịnihu ka ha ghara ịmụbara onwe ha ịnyịnya. (Deuterọnọmi 17:16) Irube isi n’iwu a ga-egosi na ndị eze a na-adabere n’ebe “Onye Nsọ nke Israel” nọ maka nchebe. N’ụzọ dị mwute, ndị ọchịchị Israel enweghị ụdị okwukwe ahụ.
7. Gịnị ka ndị Kraịst taa pụrụ ịmụta site n’enweghị okwukwe nke Israel?
7 E nwere ihe ndị Kraịst taa ga-amụta site na nke a. Israel dabeere n’enyemaka a na-ahụ anya sitere n’aka Ijipt kama ịdabere n’enyemaka ka ike sitere n’aka Jehova. N’otu aka ahụ taa, a pụrụ ịnwa ndị Kraịst ịtụkwasị obi n’ihe nchebe ụmụ mmadụ—ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, ọkwá, ịma mmadụ n’ụwa—kama ịbụ n’ebe Jehova nọ. N’eziokwu, ndị Kraịst bụ́ ndị isi ezinụlọ ji ibu ọrụ ha nke inye ezinụlọ ha ihe na-akpa ha n’ụzọ anụ ahụ akpọrọ ihe. (1 Timoti 5:8) Ma ha adịghị atụkwasị obi ha n’ihe onwunwe. Ha na-anọkwa na nche megide ụdị “anyaukwu ọ bụla.” (Luk 12:13–21) Ọ bụ Jehova Chineke bụ nanị “ụlọ elu nke dịịrị mgbe nile nke mkpa.”—Abụ Ọma 9:9; 54:7.
8, 9. (a) Ọ bụ ezie na atụmatụ Israel pụrụ iyi ihe ezi uche dị na ya, gịnị ga-esi n’ime ya pụta, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee ọdịiche dị ná nkwa ụmụ mmadụ na nkwa Jehova?
8 Ya bụ, Aịsaịa na-akwa ndị ndú Israel bụ́ ndị chepụtara isoro Ijipt nwee nkwekọrịta emo, sị: “Ya onwe ya makwaara ihe, wee mee ka ihe ọjọọ bịa, O wezụgakwaghị okwu Ya nile: ma O biliwo imegide ụlọ ndị na-eme ihe ọjọọ na imegide inye aka nke ndị na-arụ ajọ ihe.” (Aịsaịa 31:2) Ndị ndú Israel pụrụ ịdị na-eche na ha maara ihe. Ma, ọ̀ bụ na Onye Okike nke eluigwe na ala akachaghị mara ihe? N’elu elu, ezi uche dị n’atụmatụ Israel bụ́ ịrịọ Ijipt maka enyemaka. Ka o sina dị, inwe njikọ aka ọchịchị dị otú ahụ bụ ịkwa iko ime mmụọ n’anya Jehova. (Ezikiel 23:1–10) N’ihi ya, Aịsaịa na-ekwu na Jehova ‘ga-eme ka ihe ọjọọ bịa.’
9 Nkwa ụmụ mmadụ bụ ihe a ma ama na a pụghị ịdabere na ha, e jighịkwa nchebe ụmụ mmadụ n’aka. N’aka nke ọzọ, ọ dịghị mkpa ka Jehova ‘wezụga okwu ya.’ Ọ ghaghị imezu ihe o kwere ná nkwa. Okwu ya adịghị alaghachikwute ya n’emezughị emezu.—Aịsaịa 55:10, 11; 14:24.
10. Gịnị ga-eme ma Ijipt ma Israel?
10 Ndị Ijipt hà ga-abụrụ Israel ihe nchebe a pụrụ ịdabere na ya? Ee e. Aịsaịa gwara Israel, sị: “Ndị Ijipt bụ mmadụ, ha abụghị Chineke; ịnyịnya ha bụkwa anụ ahụ, ha abụghị mmụọ: Jehova ga-esetịkwa aka Ya, onye na-enye aka ewee sụọ ngọngọ, onye a na-enyere aka adaakwa, ọ bụkwa n’otu ka ha nile ga-agwụsị.” (Aịsaịa 31:3) Ma onye na-enye aka (Ijipt) ma onye a na-enyere aka (Israel) ga-asụ ngọngọ, daa, ma gwụsịa mgbe Jehova ga-esetị aka ya imezu ihe o kpere n’ikpe site n’aka Asiria.
Ọdịda Sameria
11. Olee ihe ndekọ mmehie nke Israel nwere, gịnịkwa si na ya pụta?
11 N’ebere ya, ọtụtụ ugboro Jehova zipụrụ ndị amụma ije gbaa Israel ume ichegharị na ịlaghachi n’ofufe dị ọcha. (2 Ndị Eze 17:13) N’agbanyeghị nke a, Israel tụkwasịrị ihe ná mmehie ya nke ife nwa ehi site n’itinye aka n’ịjụ ndị mmụọ ase, ofufe rụrụ arụ nke Beal, na iji Ashera na ebe ndị dị elu na-eme ihe. Ndị Israel ọbụna mere ka “ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom gabiga n’ime ọkụ,” jiri mkpụrụ nke afọ ha na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà. (2 Ndị Eze 17:14–17; Abụ Ọma 106:36–39; Emọs 2:8) Iji kwụsị ajọ omume Israel, Jehova nyere iwu, sị: “[A ga-eme] ka Sameria laa n’iyi, ya na eze ya, dị ka irighiri osisi n’elu mmiri.” (Hosea 10:1, 7) Na 742 T.O.A., ndị agha Asiria wakporo Sameria, bụ́ isi obodo Israel. Mgbe a nọchibidosịrị ya ruo afọ atọ, Sameria dara, na 740 T.O.A., alaeze ebo iri ahụ kwụsịkwara ịdị adị.
12. Ọrụ dị aṅaa ka Jehova nyeworo iwu ka a rụọ taa, gịnịkwa ga-eme ndị leghaara ịdọ aka ná ntị ahụ anya?
12 N’oge anyị, Jehova enyewo iwu ka a rụọ ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ iji dọọ ‘ụmụ mmadụ aka ná ntị ka ha nile chegharịa n’ebe nile.’ (Ọrụ 17:30; Matiu 24:14) Ndị jụrụ ụzọ Chineke si enye nzọpụta ga-adị ka “irighiri osisi,” bụrụ ndị e bibiri dị ka mba Israel si n’ezi ofufe dapụ. N’aka nke ọzọ, ndị na-ele anya Jehova “ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya izere ihie ụzọ nke alaeze Israel oge ochie! Ka anyị nwee obi ike zuru ezu n’ebe Jehova nọ maka nzọpụta.
Ike Nzọpụta Jehova
13, 14. Okwu dị aṅaa na-akasi obi ka Jehova nwere ịgwa Zaịọn?
13 Jerusalem, bụ́ isi obodo Juda, dị kilomita ole na ole site n’ókèala Israel n’ebe ndịda. Ndị bi na Jerusalem maara nnọọ nke ọma ihe mere Sameria. Ugbu a, otu ndị iro ahụ na-emenye ụjọ, bụ́ ndị bibiri ndị agbata obi ha nọ n’ebe ugwu, na-eyi ha egwu. Hà ga-amụta ihe site n’ihe mere Sameria?
14 Ihe ọzọ Aịsaịa kwuru bụ ihe nkasi obi nye ndị bi na Jerusalem. O mesiri ha obi ike na Jehova ka hụrụ ndị ya na ha nọ n’ọgbụgba ndụ n’anya, na-asị: “Otú a ka Jehova sịrị m, Dị ka ọdụm ma ọ bụ nwa ọdụm, nke a na-akpọkọta ìgwè ndị ọzụzụ atụrụ imegide ya, si ede inwù n’elu anụ ọ dọgbutara, ọ dịghị atụ ụjọ olu ha, ọ dịghị ewedakwa onwe ya n’ala n’ihi ụ̀zụ̀ ha: otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-arịdata ibuso ugwu Zaịọn na ibuso ugwu nta ya agha.” (Aịsaịa 31:4) Dị ka nwa ọdụm nke guzo n’ihu anụ ọ dọgbutara, Jehova ga-eji ekworo chebe obodo nsọ ya, bụ́ Zaịọn. Ọ dịghị itu ọnụ, okwu iyi egwu, ma ọ bụ ọgba aghara ọ bụla ọzọ sitere n’aka ndị agha Asiria nke ga-eme ka Jehova ghara imezu nzube ya.
15. Olee otú Jehova si mesoo ndị bi na Jerusalem ihe n’ụzọ ịhụnanya na ọmịiko?
15 Ugbu a, rịba ama ụzọ ịhụnanya na ọmịiko Jehova ga-esi mesoo ndị bi na Jerusalem ihe: “Dị ka ụmụ nnụnụ na-efe efe, otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-egbochi Jerusalem; na-egbochi na-anapụta; na-agabiga na-eme ya ka o wepụga onwe ya.” (Aịsaịa 31:5) Nne nnụnụ na-anọ na nche mgbe nile ichebe ụmụ ya. Ọ na-agbasapụ nku ya wee na-efegharị n’elu ụmụ ya, ọ na-ejikwa anya dị nkọ achọ ihe àmà ọ bụla nke ihe ize ndụ. Ọ bụrụ na anụ na-eri ibe ya abịa nso, ọ na-efedata ozugbo ichebe ụmụ ya. N’otu aka ahụ, Jehova ga-eji ịhụnanya lekọta ndị bi na Jerusalem n’ihi ndị Asiria na-abịa ịwakpo ha.
‘Laghachinụ’
16. (a) Arịrịọ ịhụnanya dị aṅaa ka Jehova rịọrọ ndị ya? (b) Olee mgbe nnupụisi ndị Juda pụtara ìhè karịsịa? Kọwaa.
16 Ugbu a, Jehova chetaara ndị ya na ha emehiewo ma gbaa ha ume ka ha hapụ ụzọ mmehie ha: “Laghachikwutenụ Onye ahụ Nke ụmụ Israel siri n’aka Ya wezụga onwe ha nke ukwuu.” (Aịsaịa 31:6) Ọ bụghị nanị alaeze ebo iri nke Israel nupụrụ isi. Ndị Juda, ndị bụkwa ‘ụmụ Israel, ewezụgawo onwe ha nke ukwuu.’ Nke a pụtara ìhè karịsịa mgbe nwa Hezekaịa, bụ́ Manase ghọrọ eze, ntakịrị oge mgbe Aịsaịa zisịrị ozi amụma ya. Dị ka ihe ndekọ Bible si kwuo, “Manase wee mee ka Juda na ndị bi na Jerusalem sihie ụzọ, ime ihe ọjọọ karịa mba ọzọ, bụ́ ndị Jehova kpochapụrụ.” (2 Ihe E Mere 33:9) Cheedị ya! Jehova kpochapụrụ mba ndị na-ekpere arụsị n’ihi na omume ha na-asọ oyi, ma, ndị bi na Juda, bụ́ ndị ha na Jehova nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ, ka ọbụna ndị nọ ná mba ndị ahụ njọ.
17. N’ụzọ dị aṅaa ka ọnọdụ ndị dị taa si yie ndị dị na Juda n’okpuru Manase?
17 Ná mmalite narị afọ nke 21, n’ọtụtụ ụzọ, ọnọdụ dịnụ yiri ndị dị na Juda n’oge Manase. Ịkpọasị okpukpe, nke agbụrụ, na nke ebo anọgidewo na-ekewa ụwa. Omume ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ bụ́ igbu ọchụ, mmekpọ ọnụ, ndina n’ike, na ihe a sị na ọ bụ mkpocha agbụrụ emetụtawo ọtụtụ nde mmadụ. Obi abụọ adịghị ya na ndị mmadụ na mba dị iche iche—karịsịa mba Krisendọm—‘ewezụgawo onwe ha nke ukwuu.’ Otú ọ dị, anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova agaghị ekwe ka ajọ omume dịgide ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi gịnị? N’ihi ihe mere n’oge Aịsaịa.
A Napụta Jerusalem
18. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Rabshake nyere Hezekaịa?
18 Ndị eze Asiria kelere chi ha maka mmeri ndị ha na-enwe n’ọgbọ agha. Akwụkwọ bụ́ Ancient Near Eastern Texts nwere ihe odide nke Ashurbanipal, bụ́ eze Asiria onye zọọrọ na ọ bụ “Ashur, Bel, Nebo, bụ́ chi ndị dị ukwuu, ndị nwe [ya], bụ́ ndị na-anọ [ya] n’akụkụ (mgbe nile), [mgbe o] meriri ndị agha (nwere ahụmahụ) n’ịlụ agha . . . n’otu nnukwute agha a lụrụ ihu na ihu,” na-eduzi ya. N’oge Aịsaịa, Rabshake, bụ́ onye nọchitere anya Eze Senakerib nke Asiria, gosipụtara na o nwere nkweta yiri nke ahụ, bụ́ na chi dị iche iche na-etinye aka n’agha ụmụ mmadụ, mgbe ọ gwara Eze Hezekaịa okwu. Ọ dọrọ eze ndị Juu ahụ aka ná ntị ka ọ ghara ịdabere na Jehova maka nzọpụta, kọwapụtakwa na chi nke mba ndị ọzọ echebelighị ndị nke ha pụọ n’aka usuu ndị agha dị ike nke Asiria.—2 Ndị Eze 18:33–35.
19. Gịnị ka Hezekaịa mere banyere ịkwa emo Rabshake?
19 Gịnị ka Eze Hezekaịa mere? Ihe ndekọ Bible na-ekwu, sị: “Mgbe eze, bụ́ Hezekaịa, nụrụ ya, [ọ] dọwara uwe ya nile, were ákwà mkpe kpuchie onwe ya, baa n’ụlọ Jehova.” (2 Ndị Eze 19:1) Hezekaịa ghọtara na e nwere nanị otu Onye pụrụ inyere ya aka n’ọnọdụ a na-emenye ụjọ. O wedara onwe ya ala ma dabere n’ebe Jehova nọ maka nduzi.
20. Gịnị ka Jehova ga-eme n’ihi ndị bi na Juda, gịnịkwa ka ha kwesịrị ịmụta site na nke a?
20 Jehova nyere ya nduzi ọ rịọrọ. Site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma, o kwuru, sị: “N’ụbọchị ahụ ha ga-ajụ, onye ọ bụla ọ jụ ihe efu ọlaọcha ya nile na ihe efu ọlaedo ya nile, nke aka unu mere nye onwe unu, ịbụ mmehie.” (Aịsaịa 31:7) Mgbe Jehova ga-alụrụ ndị ya ọgụ, a ga-eme ka ihe chi dị iche iche nke Senakerib bụ pụta ìhè—ihe efu. Nke a bụ ihe mmụta nke ndị bi na Juda ga-eburu n’uche. N’agbanyeghị ikwesị ntụkwasị obi nke Eze Hezekaịa, e jiriwo arụsị mejupụta ala Juda, dị ka Israel. (Aịsaịa 2:5–8) Nye ndị bi na Juda, ịmaliteghachi mmekọrịta ha na Jehova ga-achọ ha ichegharị ná mmehie ha na ‘onye ọ bụla ịjụ ihe efu ya nile.’—Lee Ọpụpụ 34:14.
21. Olee otú Aịsaịa si kọwaa n’ụzọ amụma ọrụ mmezu ihe e kpere n’ikpe nke Jehova megide Asiria?
21 Ugbu a Aịsaịa kọwara n’ụzọ amụma ọrụ mmezu ihe e kpere n’ikpe nke Jehova megide onye iro dị egwu nke Juda, sị: “Asiria ga-adakwa site ná mma agha nke na-abụghị nke mmadụ dị elu: mma agha nke na-abụghị nke mmadụ dị ala ga-erichapụkwa ya: ọ ga-esikwa n’ihu mma agha gbalaga, ụmụ okorobịa ya ga-aghọkwa usuu ndị na-efe ofufe.” (Aịsaịa 31:8) Mgbe ọgụ ahụ malitere, ọ dịdịghị mkpa ka ndị bi na Jerusalem mịpụta mma agha ha n’ọbọ ya. Mma agha Jehova, ọ bụghị nke mmadụ, richapụrụ ndị agha kasị mma nke Asiria. Banyere Eze Asiria bụ́ Senakerib, “ọ ga-esikwa n’ihu mma agha gbalaga.” Mgbe mmụọ ozi Jehova gbusịrị mmadụ 185,000 n’ime ndị agha ya, ọ laghachiri n’ụlọ ya. Mgbe e mesịrị, ka ọ nọ na-akpọrọ chi ya bụ́ Nisrok isiala, ụmụ ya ndị ikom gburu ya.—2 Ndị Eze 19:35–37.
22. Gịnị ka ndị Kraịst taa pụrụ ịmụta site n’ihe omume ndị metụtara Hezekaịa na ndị agha Asiria?
22 Ọ dịghị onye ọ bụla, gụnyere Hezekaịa, pụrụ ịhụ otú Jehova ga-esi napụta Jerusalem n’aka ndị agha Asiria tupu o mee. Otú o sina dị, ụzọ Hezekaịa si mee ihe banyere nsogbu ahụ bụ ihe nlereanya magburu onwe ya nye ndị na-eche ule ihu taa. (2 Ndị Kọrint 4:16–18) N’ihi ọmụma a ma ndị Asiria ahụ na-eyi Jerusalem egwu maka obi ọjọọ ha, n’ụzọ kwere nghọta ụjọ jidere Hezekaịa. (2 Ndị Eze 19:3) Ma, o nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, ọ rịọkwara maka nduzi Ya, ọ bụghị nke mmadụ. Lee ngọzi ọ bụụrụ Jerusalem na o mere otú ahụ! Ndị Kraịst na-atụ egwu Chineke taa pụkwara inwe oké nchegbu mgbe ha nọ ná nrụgide. N’ọtụtụ ọnọdụ, a pụrụ ịghọta ihe mere a ga-eji tụọ ụjọ. Ma, ọ bụrụ na anyị ‘atụkwasị Jehova nchegbu anyị nile,’ ọ ga-elekọta anyị. (1 Pita 5:7) Ọ ga-enyere anyị aka imeri ụjọ anyị, ọ ga-ewusikwa anyị ike ịnagide ọnọdụ ahụ na-akpata nchegbu.
23. N’ụzọ dị aṅaa ka Senakerib, ọ bụghị Hezekaịa, si bụrụ onye ụjọ jidere?
23 N’ikpeazụ, ọ bụ Senakerib, ọ bụghị Hezekaịa, bụ onye ụjọ ji. Ònye ka ọ pụrụ ịgakwuru? Aịsaịa buru amụma, sị: “Nkume ya nke dị elu ga-agabiga site n’ụjọ, ndị isi ya ga-atụkwa ụjọ ọkọlọtọ, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, Onye ìhè O nwere dị na Zaịọn, ite ọkụ ukwu O nwere dịkwa na Jerusalem.” (Aịsaịa 31:9) Chi dị iche iche nke Senakerib—“nkume” ya, ebe mgbaba ọ tụkwasịrị obi—enyeghịrị ya aka. Ha ‘gabigara n’ụjọ,’ dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọzọkwa, ọbụna ndị isi Senakerib enyechaghị aka. Egwu jikwa ha.
24. Olee ihe doro anya a pụrụ ịmụta site n’ihe mere ndị Asiria?
24 Akụkụ a nke amụma Aịsaịa na-enye onye ọ bụla ga-emegide Chineke ihe mmụta doro anya. Ọ dịghị ngwá agha, ike, na atụmatụ ọ bụla pụrụ ịkpaghasị nzube Jehova. (Aịsaịa 41:11, 12) N’otu mgbe ahụ, ndị na-ekwu na ha na-efe Chineke ma na-ahapụ ya aga achọ nchebe n’ihe anụ ahụ ga-enweta mmechuihu. Onye ọ bụla nke ‘na-elegaraghị Onye Nsọ nke Israel anya’ ga-ahụ mgbe Jehova ‘ga-eme ka ihe ọjọọ bịa.’ (Aịsaịa 31:1, 2) N’ezie, nanị Jehova Chineke bụ ezi ebe mgbaba nke na-adịgide adịgide.—Abụ Ọma 37:5.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a O yiri ka ọ bụ Israel ka a gwara ihe ndị e dere n’amaokwu atọ ndị mbụ nke Aịsaịa isi nke 31 n’ụzọ bụ́ isi. Amaokwu isii ndị ikpeazụ yiri ka ọ bụ Juda ka ha metụtara.
[Foto dị na peeji nke 319]
Ndị na-atụkwasị obi ha n’ihe onwunwe ga-enweta mmechuihu
[Foto dị na peeji nke 322]
Dị ka ọdụm nke na-echebe anụ ọ dọgbutara, Jehova ga-echebe obodo nsọ ya
[Foto ndị dị na peeji nke 324]
Ịkpọasị okpukpe, nke agbụrụ, na nke ebo na-ekewasị ụwa
[Foto dị na peeji nke 326]
Hezekaịa gara n’ụlọ Jehova maka enyemaka