Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 4 p. 6-7
  • Otú Ị Pụrụ Isi Mụta Banyere Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Pụrụ Isi Mụta Banyere Chineke
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Chineke?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Akwụkwọ Ozi nke Si n’Aka Chineke Na-ahu n’Anya
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ònye Bụ Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Onye Kere Ihe Nile
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 4 p. 6-7

IHE ỌMỤMỤ NKE 4

Otú Ị Pụrụ Isi Mụta Banyere Chineke

Ị pụrụ ịmụta banyere Jehova site n’ịgụ Bible. Ogologo oge gara aga Chineke họọrọ ụfọdụ ụmụ mmadụ idetu echiche ya. A na-akpọ ihe ndị ahụ e deturu Bible. Taa anyị na-amụta banyere Chineke site n’ịgụ Bible. Ebe ọ bụ na ihe ndị Jehova kwuru, ma ọ bụ ozi ya, dị n’ime Bible, a na-akpọkwa ya Okwu Chineke. Anyị pụrụ ikwere ihe Bible na-ekwu n’ihi na Jehova adịghị agha ụgha. ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ (Ndị Hibru 6:18) Eziokwu ahụ dị n’ime Okwu Chineke.—Jọn 17:17.

Ebe otu ezinụlọ na-agụ Baịbụl

Bible bụ otu n’ime onyinye ndị kachasị oké ọnụ ahịa Chineke nyere anyị. O yiri akwụkwọ ozi nke nna na-ahụ n’anya degaara ụmụ ya. Ọ na-agwa anyị banyere nkwa Chineke kwere ịgbanwe ụwa ka ọ ghọọ ebe mara nnọọ mma ibi—paradaịs. Ọ na-agwa anyị ihe o mere n’oge gara aga, ihe ọ na-eme ugbu a, na ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu maka ụmụ ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ na-enyekwara anyị aka ịgwọta nsogbu anyị na inweta obi ụtọ.—2 Timoti 3:16, 17.

Ndịàmà Jehova bụ ndị enyi Chineke; ha ga-enyere gị aka ịghọta ihe Bible na-akụzi. Nanị gwa ha na ị chọrọ ịmụ Bible. Ha adịghị ana ego iji mee nke a. (Matiu 10:8) Tụkwasị na nke ahụ, ị pụrụ ịga nzukọ ndị Kraịst. A na-enwe ya n’ebe ndị a na-anọ efe ofufe a na-akpọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na ị na-aga nzukọ ndị Kraịst, ihe ọmụma gị banyere Chineke ga-amụba ngwa ngwa.

Ị pụrụ ịmụta banyere Chineke site n’ihe ndị o mere. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu, sị: “Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) Mgbe Jehova kere “eluigwe,” o kere anyanwụ. Ugbu a gịnị ka nke ahụ na-agwa anyị banyere Chineke? Ọ na-agwa anyị na Jehova nwere ike dị ukwuu. Ọ bụ nanị ya pụru ime ihe dị ike dị ka anyanwụ. Ọ na-agwakwa anyị na Jehova maara ihe, ebe ọ bụ na amamihe dị mkpa iji mee anyanwụ, bụ́ nke na-ewepụta okpomọkụ na ìhè ma bụrụ nke na-adịghị anyụ anyụ.

Ihe ndị Jehova kere na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Cheedị echiche banyere ụdị mkpụrụ osisi dị iche iche dị n’ụwa. Jehova pụrụ inyeworị anyị nanị otu ụdị mkpụrụ osisi—ma ọ bụ gharadị inye anyị nke ọ bụla. Kama nke ahụ, Jehova nyere anyị ọtụtụ ụdị mkpụrụ osisi ndị na-ahaghị nhata, ndị nwere ọdịdị, ụcha na ụdị ụtọ dịgasị iche. Nke a na-egosi na Jehova abụghị nanị Chineke na-ahụ n’anya kamakwa nke na-emesapụ aka nke ukwuu, onye na-echebara ndị ọzọ echiche ma nwee obiọma.—Abụ Ọma 104:24.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya