IHE ỌMỤMỤ NKE 17
Iji Nọgide Na-enwe Enyi, Ị Ghaghị Ịbụ Enyi
Ọbụbụenyi na-adabere n’ịhụnanya. Ka ị na-amụtakwu banyere Jehova, otú ahụ ka ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ ga na-ebuwanye ibu. Ka ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ na-ebuwanye ibu, otú a ka ọchịchọ i nwere ijere ya ozi ga na-ebuwanyekwa ibu. Nke a ga-akpali gị ịghọ onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. (Matiu 28:19) Site n’isonyere ezinụlọ na-enwe obi ụtọ nke Ndịàmà Jehova, ị pụrụ ịbụ enyi Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị ka ị na-aghaghị ime?
Ị ghaghị igosipụta ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ site n’irube isi n’iwu ya. “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.”—1 Jọn 5:3.
Tinye ihe ndị ị na-amụta n’ọrụ. Jisọs kọrọ akụkọ nke na-egosipụta nke a. Otu nwoke maara ihe wukwasịrị ụlọ ya n’elu oké nkume. Otu nwoke bụ́ onye nzuzu wukwasịrị ụlọ ya n’elu ájá. Mgbe oké ifufe bịara, ụlọ ahụ nke e wukwasịrị n’elu oké nkume adaghị, ma ụlọ ahụ e wukwasịrị n’elu ájá dakasịrị. Jisọs kwuru na ndị na-anụ ihe ndị ọ na-akụzi ma na-eme ha yiri nwoke ahụ maara ihe nke wukwasịrị ụlọ ya n’elu oké nkume. Ma ndị na-ege ntị n’ihe ndị ọ na-akụzi ma ha adịghị eme ya yiri nwoke nzuzu ahụ nke wukwasịrị ụlọ n’elu ájá. Olee nwoke nke ị ga-achọ ịdị ka ya?—Matiu 7:24-27.
Nraranye. Nke a pụtara na ị ga-agakwuru Jehova n’ekpere ma gwa ya na ị chọrọ ime uche ya ruo mgbe ebighị ebi. Ime uche Chineke na-egosi na ị bụ onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst.—Matiu 11:29.
Baptism. “Ka e mee gị baptism, sachapụkwa mmehie gị nile, na-akpọku aha Ya.”—Ọrụ 22:16.
Tinyemie onwe gị n’ijere Chineke ozi. “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ.”—Ndị Kọlọsi 3:23.