Ụzọ Ndị Ha Na-esi Ezisa Ozi Ọma Ahụ
E NYERE ndị Kraịst iwu ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ,’ ma nke a apụtaghị na ha ga-eji nrụgide ma ọ bụ jiri ike tọghata ndị ọzọ. Ọrụ Jisọs nyere bụ “izi ndị e wedara n’ala ozi ọma,” “ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa,” “ịkasi ndị nile na-eru újú obi.” (Matiu 28:19; Aịsaịa 61:1, 2; Luk 4:18, 19) Ndịàmà Jehova na-achọ ime nke a site n’ikwusa ozi ọma sitere na Bible. Dị ka Ezikiel bụ́ onye amụma oge ochie, Ndịàmà Jehova taa na-agbalị ịchọta ndị “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme.”—Ezikiel 9:4.
Ụzọ a kasị mara ha si achọta ndị ọnọdụ ndị dị n’ụwa ugbu a na-enye nsogbu bụ site n’ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. N’ụzọ dị otú a, ha na-eme ezi mgbalị iru ọha na eze, dị nnọọ ka Jisọs mere mgbe ọ “na-agagharị n’obodo na obodo nta dị iche iche, na-ekwusa na-ezikwa ozi ọma alaeze Chineke.” Ndị mbụ na-eso ụzọ ya mekwara otú ahụ. (Luk 8:1; 9:1-6; 10:1-9) Taa, n’ebe o kwere mee, Ndịàmà Jehova na-agbalị ịkpọtụrụ ụlọ ọ bụla ọtụtụ ugboro n’afọ, na-achọ ijiri minit ole na ole soro onye nwe ụlọ kwurịta okwu n’ihe ụfọdụ na-eme n’ógbè ma ọ bụ n’ụwa, bụ́ ndị na-akpali mmasị ma ọ bụ ndị na-akpata nchegbu. A pụrụ ịtụ aro ka a tụlee otu akụkụ akwụkwọ nsọ ma ọ bụ abụọ, ọ bụrụkwa na onye nwe ụlọ egosi mmasị, Onyeàmà ahụ pụrụ ime ndokwa ịbịaghachi mgbe ga-adị mma iji nwekwuo nkwurịta okwu. A na-enyefe Bible na akwụkwọ ndị na-akọwa Bible, ọ bụrụkwa na onye nwe ụlọ chọrọ, a na-eduziri ya ọmụmụ Bible n’efu. A na-eduziri ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa ezinụlọ dị iche iche gburugburu ụwa ọtụtụ nde ọmụmụ Bible a na-enye aka mgbe nile.
Ụzọ ọzọ e si ezi ndị ọzọ “ozi ọma alaeze” ahụ bụ site ná nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè dị iche iche. Ndịàmà ahụ na-enwe nzukọ n’ebe ndị ahụ kwa izu. Otu nzukọ bụ okwu ihu ọha nke na-adabere n’otu isiokwu na-akpali mmasị n’oge ahụ, nke ihe na-esochi ya bụ ọmụmụ nke otu isiokwu ma ọ bụ amụma Bible, na-eji magazin Ụlọ Nche eme ihe dị ka ebe e si nweta ihe ọmụma. Nzukọ ọzọ bụ ụlọ akwụkwọ maka ịzụ Ndịàmà ịbụ ndị na-ekwusa ozi ọma ahụ nke ọma karị, nke ihe na-esochi ya bụ akụkụ e mere maka ikwurịta banyere ọrụ ịgba àmà ahụ n’ókèala ha. Ọzọkwa, otu ugboro n’izu, Ndịàmà na-agbakọta n’ìgwè ndị dị nta n’ụlọ ndị mmadụ, maka ọmụmụ Bible.
Ọha na eze pụrụ ịbịa nzukọ ndị a. A dịghị ana ụtụ ọ bụla. Nzukọ ndị dị otú ahụ na-abara mmadụ nile uru. Bible na-ekwu, sị: “Anyị kwesịrị ịchọ ụzọ kasị mma onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi kpalie ndị ọzọ inwe ịhụnanya na igosi ịdị mma, ọ bụghị ịdị na-ahapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama na-agbarịta ibe anyị ume karịa n’ihi na unu na-ahụ Ụbọchị ahụ na ọ na-abịaru nso.” Ọmụmụ ihe onwe onye na ime nnyocha dị mkpa, ma iso ndị ọzọ na-ezukọ na-akpali akpali: “Dị ka ígwè si amụcha ígwè, otú a ka mmadụ si amụcha ọgụgụ isi onye ọzọ.”—Ndị Hibru 10:24, 25; Ilu 27:17, The New English Bible.
Ndịàmà na-ejikwa ohere ọ bụla dapụtaranụ eme ihe n’ụzọ dị mma n’ikwu okwu banyere ozi ọma ahụ ka ha na-ezute ndị ọzọ ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị. Ọ pụrụ ịbụ okwu ole na ole e so onye agbata obi ma ọ bụ onye ya na mmadụ ji otu bọs ma ọ bụ ụgbọelu na-emekọ njem kwurịta, mkparịta ụka katụ ogologo e so enyi ma ọ bụ onye ikwu nwee, ma ọ bụ nkwurịta okwu e so onye ọrụ ibe nwee n’oge nri ehihie. Ihe dị ukwuu n’àmà ndị Jisọs gbara mgbe ọ nọ n’ụwa bụ ụdị a—mgbe ọ na-aga n’ụsọ oké osimiri, mgbe ọ nọdụrụ ala n’akụkụ ugwu, na-eri nri n’ụlọ mmadụ, mgbe ọ gara agbamakwụkwọ, ma ọ bụ jiri ụgbọ mmiri e ji akụ azụ̀ mee njem n’Oké Osimiri Galili. Ọ kụziri ihe n’ụlọ nzukọ dị iche iche na n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem. N’ebe ọ bụla ọ nọ, ọ chọtara ohere iji kwuo okwu banyere Alaeze Chineke. Ndịàmà Jehova na-agbalị ịgbaso nzọụkwụ ya n’akụkụ a kwa.—1 Pita 2:21.
IME NKWUSA SITE N’IHE NLEREANYA
Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ụzọ ndị a e si ezi gị ozi ọma ahụ ga-enwe isi n’anya gị ma ọ bụrụ na onye na-ezi gị ya adịghị etinye ihe ọ na-akụzi n’ọrụ. Ikwu ihe ọzọ mee ihe ọzọ bụ ihu abụọ, omume ihu abụọ nke okpukpe emewokwa ka ọtụtụ nde mmadụ ghara inwe mmasị na Bible. Ọ gaghị ezi ezi ịta Bible ụta. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nwere Akwụkwọ Nsọ Hibru, ma Jisọs katọrọ ha dị ka ndị ihu abụọ. O kwuru okwu banyere ọgụgụ ha na-agụ Iwu Mosis, ma gwakwuo ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke ha ga-asị unu mee, meenụ ihe ndị a, debekwa ha: ma unu emela dị ka ọrụ nile ha si dị; n’ihi na ha na-ekwu, ma ha adịghị eme.” (Matiu 23:3) Onye Kraịst ịbụ ihe nlereanya nke ibi ndụ dị mma na-eme ka ndị ọzọ kwenye karịa ọtụtụ awa nke ime nkwusa. A kọwapụtaara ndị Kraịst bụ́ nwunye, bụ́ ndị nwere di na-ekweghị ekwe nke a: “Ka e wee site n’ibi obi nwunye ha rite ha n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu; mgbe ha na-ele ibi obi unu dị ọcha.”—1 Pita 3:1, 2.
Ya mere, Ndịàmà Jehova na-agbalị isikwa n’ụzọ dị otú a mee ka ndị ọzọ nwee mmasị n’ozi ọma ahụ: site n’ịbụ ezi ndị nlereanya n’àgwà ndị Kraịst ahụ ha na-agwa ndị ọzọ banyere ya. Ha na-agbalị ‘imere ndị ọzọ ihe ha ga-achọ ka a na-emere ha.’ (Matiu 7:12) Ha na-agbalị ime otú a n’ebe mmadụ nile nọ, ọ bụghị nanị n’ebe Ndịàmà ibe ha, ndị enyi, ndị agbata obi, ma ọ bụ ndị ikwu ha nọ. Ebe ha bụ ndị na-ezughị okè, ha adịghị emezucha ya mgbe nile. Ma, ọ bụ ọchịchọ obi ha imere mmadụ nile ihe ọma ọ bụghị nanị n’izi ha ozi ọma Alaeze ahụ kamakwa n’inyere ha aka mgbe ọ bụla o kwere mee.—Jemes 2:14-17.
[Foto dị na peeji nke 19]
Hawaii
[Foto dị na peeji nke 19]
Venezuela
[Foto dị na peeji nke 19]
Yugoslavia
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị e wuru n’ụzọ kwekọrọ n’ihe a chọrọ, bụ ebe ndị a na-anọ enwe nkwurịta okwu Bible
[Foto ndị dị na peeji nke 21]
Ná ndụ ezinụlọ ha, nakwa ná mmekọrịta ha na ndị ọzọ, Ndịàmà ji ezi obi na-agbalị ime ihe ha na-ekwusa