Isi Mbụ
Onye Amụma Chineke Ewetara Ihe A Kpọrọ Mmadụ Ìhè
1, 2. Olee ọnọdụ dịgasị taa ndị na-akpatara ọtụtụ ndị oké obi erughị ala?
ANYỊ na-ebi n’oge mgbe ọ fọrọ nke nta ka o yie ka mmadụ ọ pụrụ ime ihe ọ bụla. Ịga na mbara igwe, nkà na ụzụ kọmputa, nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ, na nchọpụta ọhụrụ ndị ọzọ nke nkà mmụta sayensị emewo ka agbụrụ mmadụ nwee ike ime ihe ndị ọhụrụ, na-enye olileanya maka ndụ ka mma—ma eleghị anya ọbụna nke ga-adịte aka karị.
2 Ọganihu ndị dị otú ahụ hà emewo ka ị kwụsị ịkpọchi ọnụ ụzọ gị? Hà ewepụwo iyi egwu nke agha? Hà agwọtawo ọrịa ma ọ bụ wepụ ihe mwute nke mmadụ ịbụ onye onye ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ọganihụ ụmụ mmadụ, n’agbanyeghị otú ọ dịruru ịrịba ama, bụ nke a kpaara ókè. “Anyị achọpụtawo ụzọ isi gaa n’ọnwa, mepụta ọbụna ngwongwo kọmputa ndị dị ike karị, na ụzọ isi tinyere mmadụ mkpụrụ ndụ ihe nketa onye ọzọ,” ka otu akụkọ nke ụlọ ọrụ Worldwatch Institute na-akọ. “Ma anyị enwebeghị ike inye otu ijeri mmadụ mmiri dị ọcha, belata mgbuchapụ nke ọtụtụ ụdị puku anụmanụ na ihe ọkụkụ, ma ọ bụ gboo mkpa anyị nwere maka ihe ndị na-enye ike n’emebighị ikuku.” N’ụzọ kwere nghọta, ọtụtụ ndị ji obi erughị ala na-atụ anya ọdịnihu, n’amaghị ebe a pụrụ isi nweta nkasi obi na olileanya.
3. Olee ọnọdụ dị na Juda na narị afọ nke asatọ T.O.A.?
3 Ọnọdụ anyị na-eche ihu taa yiri nke ndị Chineke na narị afọ nke asatọ T.O.A. N’oge ahụ, Chineke nyere ohu ya bụ́ Aịsaịa ọrụ izi ndị bi na Juda ozi nkasi obi, nkasi obi bụkwa nnọọ ihe dị ha mkpa. Ihe omume ndị na-akpata ọgba aghara kpara mba ahụ aka ọjọọ. Alaeze Ukwu Asiria nke nwere obi ọjọọ ga-awakpo ala ahụ n’oge na-adịghị anya, na-emenye ọtụtụ ndị ụjọ. Olee ebe ndị Chineke pụrụ iche ihu maka nzọpụta? Ha na-akpọku Jehova, ma ha nwere mmasị karị n’ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi.—2 Ndị Eze 16:7; 18:21.
Ìhè nke Na-enwu n’Ọchịchịrị
4. Olee ozi nwere akụkụ abụọ nke e nyere Aịsaịa ọrụ ịkpọsa?
4 N’ihi omume nnupụisi nke Juda, a gaje ibibi Jerusalem, a ga-adọrọkwa ndị bi na Juda n’agha gaa Babilọn. Ee, oge dị njọ na-abịa. Jehova nyere onye amụma ya bụ́ Aịsaịa ọrụ ibu amụma banyere oge ọjọọ a, kama Ọ gwakwara ya ka o kwusaa ozi ọma. Mgbe afọ 70 nke ije biri n’ala ọzọ gasịrị, a ga-atọhapụ ndị Juu na Babilọn! Ihe fọdụrụnụ, bụ́ ndị na-enwe ọṅụ, ga-alaghachi Zaịọn ma nwee ihe ùgwù nke iweghachi ezi ofufe n’ebe ahụ. Site n’ozi a na-enye obi ụtọ, Jehova mere ka ìhè nwuo n’ọchịchịrị ahụ site n’ọnụ onye amụma ya.
5. N’ihi gịnị ka Jehova ji kpughee nzube ya ogologo oge tupu ya emee?
5 E bibighị Juda ruo mgbe ihe karịrị otu narị afọ gasịrị ka Aịsaịa dekọsịrị amụma ya. Gịnịzi mere Jehova ji kpughee nzube ya ogologo oge tupu ya emee? Ọ̀ bụ na ndị ji ntị ha nụ mkpọsa nke Aịsaịa agaghị anwụworị ogologo oge tupu amụma ndị ahụ emezuo? Nke ahụ bụ eziokwu. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ihi ihe ndị Jehova kpugheere Aịsaịa, ndị ga-adị ndụ n’oge a ga-ebibi Jerusalem na 607 T.O.A. ga-enwe ihe ndekọ nke ozi amụma Aịsaịa. Nke a ga-abụ ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha nke na-egosi na Jehova bụ Onye “na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie.”—Aịsaịa 46:10; 55:10, 11.
6. Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si karịa ụmụ mmadụ nile na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu?
6 Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ikwu ihe dị otú ahụ n’ụzọ ziri ezi. Mmadụ pụrụ ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu dị nso dabere n’ihe ọ maara banyere ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nke ọha na eze dị n’oge ahụ. Ma ọ bụ nanị Jehova pụrụ ịhụ nnọọ kpọmkwem ihe ga-eme n’oge ọ bụla, ọbụna n’ọdịnihu dị anya. Ọ pụkwara inye ndị ohu ya ike ịkọ ihe ndị ga-emenụ, ogologo oge tupu ha emee. Bible na-ekwu, sị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.”—Emọs 3:7.
“Aịsaịa” Ole?
7. Olee otú ọtụtụ ndị ọkà mmụta siworo rụọ ụka banyere onye dere Aịsaịa, n’ihi gịnịkwa?
7 Okwu banyere amụma bụ otu ihe meworo ka ọtụtụ ndị ọkà mmụta rụọ ụka banyere onye dere Aịsaịa. Ndị nkatọ a na-ekwusi ike na ọ ghaghị ịbụ onye biri ndụ na narị afọ nke isii T.O.A., n’oge ije biri na Babilọn ma ọ bụ mgbe ọ gasịrị, dere akụkụ ikpeazụ nke akwụkwọ ahụ. Dị ka ha na-ekwu, e dere amụma dị iche iche banyere mbibi nke Juda mgbe ha mezusịworo, n’ihi ya kwa, ha abụghị amụma n’ezie ma ọlị. Ndị nkatọ a na-ekwukwa na mgbe isi 40 gasịrị, akwụkwọ Aịsaịa na-ekwu okwu dị ka a ga-asị na ọ bụ Babilọn bụ ike na-achị mgbe ahụ nakwa na e ji ndị Israel eji n’ebe ahụ. Ya mere, ha na-arụ ụka, na onye ọ bụla ọ bụ ya dere akụkụ ikpeazụ nke Aịsaịa aghaghị imeworị otú ahụ n’oge ahụ—na narị afọ nke isii T.O.A. È nwere ihe mgbakwasị ụkwụ siri ike maka echiche dị otú ahụ? E nweghị ma ọlị!
8. Olee mgbe inwe obi abụọ banyere onye dere Aịsaịa malitere, oleekwa otú o si gbasaa?
8 E nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere onye dere Aịsaịa ruo na narị afọ nke 12 O.A. Ọ bụ onye Juu na-enye nkọwa bụ́ Abraham Ibn Ezra gbaghara ya. “Ná nkọwa ya banyere Aịsaịa,” ka Encyclopædia Judaica na-ekwu, “[Abraham Ibn Ezra] kwuru na akụkụ nke abụọ, malite n’isi 40, bụ́ ọrụ nke onye amụma biri ndụ n’oge Ije Biri na Babilọn nakwa ná mmalite nke Nlọghachi na Zaịọn.” Na narị afọ nke 18 na nke 19, ọtụtụ ndị ọkà mmụta nakweere echiche Ibn Ezra, gụnyere Johann Christoph Doederlein, bụ́ onye Germany bụ́ ọkà mmụta okpukpe, nke bipụtara nkọwa ya nke Aịsaịa na 1775, wepụtakwa mbipụta nke abụọ ya na 1789. Akwụkwọ bụ́ New Century Bible Commentary na-ekwu, sị: “Ndị ọkà mmụta nile, e wezụga ndị na-adịtụghị agbanwe echiche ha, anakwerewo nchepụta Doederlein . . . na amụma ndị dị n’isi 40-66 nke akwụkwọ Asịaịa abụghị onye amụma ahụ nke biri ndụ na narị afọ nke asatọ, bụ́ Aịsaịa, buru ha kama na e buru ha mgbe oge ahụ gasịworo.”
9. (a) Nkerisị dị aṅaa nke akwụkwọ Aịsaịa werewooro ọnọdụ? (b) Olee otú otu onye na-akọwa Bible si chịkọta arụmụka banyere onye dere Aịsaịa?
9 Otú ọ dị, obi abụọ banyere onye dere akwụkwọ Aịsaịa akwụsịghị n’ebe ahụ. Nchepụta banyere Aịsaịa ọzọ—ma ọ bụ Aịsaịa nke Abụọ—kpalitere echiche bụ́ na a pụrụ inweworị onye nke atọ so dee ya.a Mgbe ahụ, e kerisịkwuru akwụkwọ Aịsaịa, nke na otu onye ọkà mmụta kwuru na ọ bụ onye amụma a na-amaghị onye ọ bụ dere isi nke 15 na 16, ebe onye ọzọ na-arụ ụka banyere onye dere isi 23 ruo 27. Ma onye ọzọ na-ekwu na ọ pụghị ịbụ Aịsaịa dere okwu ndị ahụ dị n’isi 34 na 35. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe odide ahụ yiri nnọọ nke dị n’isi 40 ruo 66, bụ́ nke e kwuwororịị na ọ bụ onye ọzọ, nke na-abụghị Aịsaịa ahụ dịrị ndụ na narị afọ nke asatọ, dere ya! Onye nkọwa Bible bụ́ Charles C. Torrey ji okwu ole na ole chịkọta ihe si n’usoro ntụgharị uche a pụta. “Onye ahụ bụbu nnukwute ‘Onye Amụma nke Oge Ije Biri n’Ala Ọzọ’” ka ọ na-ekwu, “adalatawo wee ghọọ onye na-adịghị mkpa, ọ fọkwara nke nta ka ọ bụrụ onye a na-amakwaghị n’ihi nkerisị nke akwụkwọ ya.” Otú ọ dị, ọ bụghị ndị ọkà mmụta nile kwenyere ná nkerisị dị otú ahụ nke akwụkwọ Aịsaịa.
Ihe Àmà nke Na-egosi na Ọ Bụ Otu Onye Dere Ya
10. Nye otu ihe atụ nke otú ojiji e ji otu ụdị okwu mee ihe n’ebe nile ọ pụtara si enye ihe àmà na ọ bụ otu onye dere Aịsaịa.
10 E nwere ihe gbara ọkpụrụkpụ mere a ga-eji kwenyesie ike na ọ bụ nanị otu onye dere akwụkwọ Aịsaịa. Otu ihe àmà metụtara ojiji e ji otu ụdị okwu mee ihe n’ebe nile ọ pụtara. Dị ka ihe atụ, nkebi ahịrịokwu bụ́ “Onye Nsọ nke Israel” pụtara ugboro 12 n’Aịsaịa isi 1 ruo 39 nakwa ugboro 13 n’Aịsaịa isi 40 ruo 66, ma nkọwa a e nyere Jehova pụtara nanị ugboro 6 n’akụkụ ndị ọzọ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ojiji e ji okwu a a na-adịghị ejikebe eme ihe mee ihe ugboro ugboro na-akwado na ọ bụ otu onye dere Aịsaịa.
11. Myirịta dịgasị aṅaa dị n’agbata isi 1 ruo 39 na isi 40 ruo 66 nke Aịsaịa?
11 E nwere myirịta ndị ọzọ dị n’agbata Aịsaịa isi 1 ruo 39 na isi 40 ruo 66. E ji otu ụdị atụmatụ okwu pụrụ iche mee ihe n’akụkụ abụọ ahụ ọtụtụ ugboro, dị ka nwanyị ime na-eme na “ụzọ,” ma ọ bụ “ụzọ a tụliri atụli.”b E zokwara aka ọtụtụ ugboro na “Zaịọn,” bụ́ okwu e ji mee ihe ugboro 29 n’isi 1 ruo 39 nakwa ugboro 18 n’isi 40 ruo 66. N’ezie, e zoro aka na Zaịọn n’Aịsaịa karịa n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ nke Bible! Ihe àmà ndị dị otú ahụ, ka The International Standard Bible Encyclopedia na-ekwu, “na-eme ka akwụkwọ ahụ pụọ iche, bụ́ nke siri ike nkọwa” ma a sị na ọ bụ mmadụ abụọ, atọ ma ọ bụ karịa dere akwụkwọ ahụ.
12, 13. Olee otú Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst si egosi na ọ bụ otu onye dere akwụkwọ Aịsaịa?
12 A na-achọta ihe àmà kasịnụ nke na-egosi na ọ bụ nanị otu onye dere akwụkwọ Aịsaịa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nke sitere n’ike mmụọ nsọ. Ihe ndị a na-egosi n’ụzọ doro anya na ndị Kraịst narị afọ mbụ kwenyere na ọ bụ otu onye dere akwụkwọ Aịsaịa. Dị ka ihe atụ, Luk na-akọ banyere onye Etiopịa, bụ́ onye na-agụ ihe dị ugbu a n’Aịsaịa isi 53, akụkụ ahụ kpọmkwem nke ndị nkatọ nke oge a na-ekwu na ọ bụ Aịsaịa nke Abụọ dere. Otú ọ dị, Luk na-ekwu na onye Etiopịa ahụ ‘na-agụ akwụkwọ Aịsaịa onye amụma.’—Ọrụ 8:26-28.
13 Ọzọkwa, cheedị banyere Matiu, bụ́ onye so dee Oziọma ndị ahụ, onye kọwara otú ozi Jọn Onye Na-eme Baptism si mezuo okwu amụma ndị anyị na-achọta ugbu a n’Aịsaịa 40:3. Ònye ka Matiu sịrị na ọ bụ ya dere amụma ahụ? Ọ̀ bụ Aịsaịa nke Abụọ a na-amaghị onye ọ bụ? Ee e, ọ kọwara onye dere ya nanị dị ka “Aịsaịa onye amụma.”c (Matiu 3:1-3) N’oge ọzọ, Jisọs gụpụtara site n’otu akwụkwọ mpịakọta, okwu ndị anyị na-achọta ugbu a n’Aịsaịa 61:1, 2. N’ịkọ ihe ahụ merenụ, Luk na-ekwu, sị: “E wee nye Ya akwụkwọ Aịsaịa onye amụma n’aka.” (Luk 4:17) N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl na-ezo aka ma n’akụkụ mbụ ma n’akụkụ ikpeazụ nke Aịsaịa, ma ọ dịtụghị mgbe o kwuru ọbụna ihe na-egosi na ọ bụ onye ọzọ ma e wezụga otu onye ahụ, bụ́ Aịsaịa, dere ya. (Ndị Rom 10:16, 20; 15:12) N’ụzọ doro anya, ndị Kraịst narị afọ mbụ ekwenyeghị na ọ bụ mmadụ abụọ, atọ, ma ọ bụ karịa dere akwụkwọ Aịsaịa.
14. Olee otú Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ si enyekwu nghọta n’okwu banyere onye dere Aịsaịa?
14 Tụleekwa ihe àmà nke Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ—ihe odide oge ochie, ndị e dere ọtụtụ n’ime ha laa azụ tupu oge Jisọs. E dere otu ihe odide nke akwụkwọ Aịsaịa, nke a maara dị ka Akwụkwọ Mpịakọta Aịsaịa, laa azụ na narị afọ nke abụọ T.O.A., ọ na-agbaghakwa nzọrọ ndị nkatọ na-eme nke bụ́ na Aịsaịa nke Abụọ weghaara ide ihe odide ahụ n’isi 40. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihe odide oge ochie a, ihe anyị maara ugbu a dị ka isi 40 malitere n’ahịrị ikpeazụ nke otu kọlụm, e detọpụkwara ahịrịokwu mbụ ya na kọlụm na-esonụ. O doro anya na onye depụtaghachiri ya amaghị banyere mgbanwe ọ bụla e chere na e nwere n’onye dere ya ma ọ bụ nkewa n’akwụkwọ ahụ n’oge ahụ.
15. Gịnị ka onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ, bụ́ Flavius Josephus, nwere ikwu banyere amụma Aịsaịa metụtara Saịrọs?
15 N’ikpeazụ, tụlee ihe àmà nke onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ, bụ́ Flavius Josephus. Ọ na-egosi, ọ bụghị nanị na e dere amụma ndị dị n’Aịsaịa banyere Saịrọs na narị afọ nke asatọ T.O.A., kama ọ na-ekwukwa na Saịrọs maara banyere amụma ndị a. “Saịrọs maara ihe ndị a,” ka Josephus dere, “site n’ịgụ akwụkwọ amụma ahụ nke Aịsaịa hapụrụ narị afọ abụọ na iri tupu mgbe ahụ.” Dị ka Josephus si kwuo, ọmụma Saịrọs maara banyere amụma ndị a pụrụ ọbụna ịtụnyeworị ụtụ n’ịdị njikere ya izighachi ndị Juu n’ala nna ha, n’ihi na Josephus dere na Saịrọs bịara “nwee agụụ na ọchịchọ siri ike ime ihe e deworo.”—Jewish Antiquities, Akwụkwọ nke Iri na Otu, isi 1, paragraf nke 2.
16. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ihe ndị nkatọ na-ekwu bụ́ na a kọwara Babilọn n’akụkụ ikpeazụ nke Aịsaịa dị ka ike ụwa na-achịnụ?
16 Dị ka e kwuru na mbụ, ọtụtụ ndị nkatọ na-ekwu na malite n’Aịsaịa isi 40 gaa n’ihu, a kọwara Babilọn dị ka ike ụwa na-achịnụ, e kwukwara banyere ndị Israel dị ka ndị nọrọwooro anọrọ n’ala ọzọ. Nke a ọ́ gaghị egosi na onye dere ya dịrị ndụ na narị afọ nke isii T.O.A.? Ọ bụchaghị otú ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọbụna tupu isi 40 nke Aịsaịa, a na-akọwa Babilọn mgbe ụfọdụ dị ka ike ụwa na-achịnụ. Dị ka ihe atụ, n’Aịsaịa 13:19, a kpọrọ Babilọn “ihe mara mma nke alaeze nile” ma ọ bụ dị ka Today’s English Version si sụgharịa ya, “alaeze kasị mma n’alaeze nile.” O doro anya na okwu ndị a bụ amụma, ebe ọ bụ na Babilọn aghọghị ike ọchịchị ụwa ruo ihe karịrị otu narị afọ n’ihu. Otu onye nkatọ “doziri” ihe a a sị na ọ bụ nsogbu nanị site n’iwere Aịsaịa isi 13 dị ka akwụkwọ onye ọzọ dere! Otú ọ dị, n’ezie, ikwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu dị ka a ga-asị na ha emeela emee bụ ihe a na-ahụkarị n’amụma Bible. Ụzọ ide ihe a na-emesi ike n’ụzọ dị irè ojiji e ji mmezu nke amụma ahụ n’aka. (Mkpughe 21:5, 6) N’ezie, ọ bụ nanị Chineke nke na-ebu ezi amụma pụrụ ikwu, sị: “Ọ bụkwa ihe ọhụrụ dị iche iche ka Mụ onwe m na-egosi: tupu ha epuo, ana m eme ka unu nụrụ ha.”—Aịsaịa 42:9.
Akwụkwọ nke Nwere Amụma A Pụrụ Ịtụkwasị Obi
17. Olee otú a pụrụ isi kọwaa mgbanwe e nwere n’ụzọ ide ihe malite n’Aịsaịa isi 40 gaa n’ihu?
17 Mgbe ahụ, ná nkwubi okwu dị aṅaa ka ihe àmà e nwere na-eduga? Na akwụkwọ Aịsaịa bụ akwụkwọ otu onye e nyere ike mmụọ nsọ dere. Akwụkwọ a dum esiwo n’otu ọgbọ gafere n’ọzọ kemgbe ọtụtụ narị afọ dị ka otu akwụkwọ, ọ bụghị abụọ ma ọ bụ karịa. N’eziokwu, ụfọdụ ndị pụru ikwu na otú e si dee akwụkwọ Aịsaịa gbanwetụrụ malite n’isi 40 gaa n’ihu. Chetakwa na Aịsaịa jere ozi dị ka onye amụma Chineke ruo afọ 46 ma ọ dịkarịa ala. N’oge ahụ, a ga-atụ anya na ozi ya, nakwa ụzọ o si ezi ozi ya, ga-agbanwe. N’ezie, ọrụ Chineke nyere Aịsaịa abụghị nanị inye ịdọ aka ná ntị siri ike banyere ikpe. Ọ ga-ekwusakwa okwu Jehova bụ́: “Kasienụ, kasienụ ndị m obi.” (Aịsaịa 40:1) Ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ ga-enweta nkasi obi n’ezie site ná nkwa ya nke bụ́ na mgbe afọ 70 nke ije biri n’ala ọzọ gasịrị, a ga-ezighachi ndị Juu n’ala nna ha.
18. Gịnị bụ isiokwu dị n’akwụkwọ Aịsaịa nke anyị ga-atụle n’akwụkwọ a?
18 Ntọhapụ nke ndị Juu n’ojiji Babilọn ji ha bụ isiokwu nke ọtụtụ n’ime isiakwụkwọ Aịsaịa ndị a tụlere n’ime akwụkwọ a.d Ọtụtụ n’ime amụma ndị a nwere mmezu ha nke oge a, dị ka anyị ga-ahụ. Ọzọkwa, anyị na-achọta amụma ndị na-akpali akpali n’ime akwụkwọ Aịsaịa, bụ́ ndị e mezuru ná ndụ—na n’ọnwụ—nke Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya. N’ezie, ịmụ amụma ndị dị mkpa dị n’akwụkwọ Aịsaịa ga-abara ndị ohu Chineke na ndị ọzọ nọ n’ụwa nile uru. Amụma ndị a bụ, n’ezie, ìhè nke dịịrị ihe nile a kpọrọ mmadụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndị ọkà mmụta na-ezo aka n’onye nke atọ ahụ a na-eche so dee ya, onye e weere na ọ bụ ya dere isi 56 ruo 66, dị ka Aịsaịa nke Atọ.
b Nwanyị ime na-eme: Aịsaịa 13:8; 21:3; 26:17, 18; 42:14; 45:10; 54:1; 66:7. “Ụzọ” ma ọ bụ “ụzọ a tụliri atụli”: Aịsaịa 11:16; 19:23; 35:8; 40:3; 43:19; 49:11; 57:14; 62:10.
c N’ihe ndekọ ndị ahụ yiri ibe ha, Mak, Luk, na Jọn ji otu nkebi ahịrịokwu ahụ mee ihe.—Mak 1:2; Luk 3:4; Jọn 1:23.
d A tụlere isi 40 mbụ nke Aịsaịa n’Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Igbe dị na peeji nke 9]
Ihe Àmà Sitere ná Nnyocha nke Mgbanwe nke Asụsụ
Ihe ọmụmụ banyere mgbanwe nke asụsụ—bụ́ nke na-enyocha mgbanwe ndị na-apụtachaghị ìhè bụ́ ndị na-ewere ọnọdụ n’asụsụ ka ọtụtụ afọ na-agafe—na-enyekwu ihe àmà na-egosi na akwụkwọ Aịsaịa bụ akwụkwọ otu onye dere. A sị na e dere otu akụkụ nke Aịsaịa na narị afọ nke asatọ T.O.A., deekwa akụkụ ọzọ afọ 200 mgbe e mesịrị, e kwesịrị inwe ọdịiche n’ụdị asụsụ Hibru e ji mee ihe ná nkebi nke ọ bụla. Ma dị ka otu nchọpụta e bipụtara na Westminster Theological Journal si gosi, “ihe àmà sitere ná nnyocha mgbanwe nke asụsụ na-akwado n’ụzọ dị ukwuu na e dere Aịsaịa isi 40-66 tupu ije biri n’ala ọzọ.” Onye dere nchọpụta ahụ na-ekwubi, sị: “Ọ bụrụ na ndị ọkà mmụta na-eme nkatọ anọgide na-esi ọnwụ na o kwesịrị ịbụ na e dere Aịsaịa n’oge ije biri n’ala ọzọ ma ọ bụ mgbe ọ gasịrị, ha aghaghị ime otú ahụ n’agbanyeghị ihe àmà na-emegide ya nke sitere ná nnyocha nke mgbanwe nke asụsụ.”
[Foto dị na peeji nke 11]
Otu akụkụ nke Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Aịsaịa. E ji akara nduzi gosi ebe isi 39 gwụsịrị
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Ihe dị ka afọ 200 tupu o mee, Aịsaịa buru amụma ntọhapụ nye ndị Juu