Isi nke Abụọ
Okwu Amụma Nkasi Obi Ndị Metụtara Gị
1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’amụma Aịsaịa?
AỊSAỊA dere akwụkwọ ahụ bu aha ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 3,000 gara aga, ma ọ baara anyị ezigbo uru taa. Anyị pụrụ ịmụta ụkpụrụ ndị dị mkpa site n’ihe ndị mere eme o dekọrọ. Anyị pụkwara iwulite okwukwe anyị site n’ịmụ amụma ndị o deturu n’aha Jehova. Ee, Aịsaịa bụ onye amụma nke Chineke dị ndụ. Jehova kpaliri ya idekọ akụkọ ihe mere eme tupu ha emee—ịkọwa ihe dị iche iche tupu ha emee. Jehova si otú ahụ gosi na ya pụrụ ikwu na ịkpụzi ọdịnihu. Mgbe ha mụsịrị akwụkwọ Aịsaịa, ezi ndị Kraịst na-ekwenyesi ike na Jehova ga-emezu ihe nile o kwere ná nkwa.
2. Olee ọnọdụ dị na Jerusalem mgbe Aịsaịa dere akwụkwọ amụma ya, mgbanwe dịkwa aṅaa ga-ewere ọnọdụ?
2 Ka ọ na-erule mgbe Aịsaịa desịrị amụma ya, Jerusalem alanarịwo iyi egwu Asiria. Ụlọ nsọ ahụ adabeghị, ndị mmadụ nọkwa na-emere onwe ha ihe ndị dịịrị ha kwa ụbọchị dị ka ha nọworo na-eme eri ọtụtụ narị afọ. Otú ọ dị, ọnọdụ ahụ ga-agbanwe. Oge ga-abịa mgbe a ga-ebukọrọ akụ̀ na ụba nke ndị eze ndị Juu gaa Babilọn, ndị Juu na-eto eto ga-abụkwa ndị ọnaozi n’obodo ahụ.a (Aịsaịa 39:6-7) Nke a ga-eme mgbe ihe karịrị 100 afọ gasịrị.—2 Ndị Eze 24:12-17; Daniel 1:19.
3. Ozi dị aṅaa dị n’Aịsaịa isi 41?
3 Otú ọ dị, ozi Chineke ziri site n’ọnụ Aịsaịa abụghị nanị ozi mbibi. Isi 40 nke akwụkwọ ya ji okwu bụ́ ‘Nkasi obi’ malite.b Ndị Juu ga-enweta nkasi obi site ná mmesi obi ike ahụ bụ́ na ha ma ọ bụ ụmụ ha ga-enwe ike ịlaghachi n’ala nna ha. Isi 41 gara n’ihu n’ozi nkasi obi ahụ ma buo amụma na Jehova ga-akpọlite otu eze dị ike iji mezuo uche ya. Okwu mmesighachi obi ike dị n’ime ya ma na-agba ume ka a tụkwasị Chineke obi. Ọ na-ekpughekwa chi ụgha, ndị ndị si ná mba dị iche iche na-atụkwasị obi, dị ka ndị na-adịghị ike. N’ihe a nile, e nwere ọtụtụ ihe ga-ewusi okwukwe ike ma n’oge Aịsaịa ma n’oge anyị.
Jehova Amaa Mba Dị Iche Iche Aka
4. Okwu ndị dị aṅaa ka Jehova ji maa mba dị iche iche aka?
4 Jehova na-ekwu site n’ọnụ onye amụma ya, sị: “Gbanụ nkịtị gee m ntị, unu àgwàetiti; ka ndị nile dị iche iche gbanweekwa ike ha: ka ha bịaruo nso; ka ha kwuo okwu: ka anyị bịaruo onwe anyị nso ikpe ikpe.” (Aịsaịa 41:1) Jehova ji okwu ndị a maa mba dị iche iche na-emegide ndị ya aka. Ka ha guzoro n’ihu ya ma dị njikere ikwu okwu! Dị ka anyị ga-ahụ ka oge na-aga, Jehova kwuru, dị ka a ga-asị na ọ bụ ọkàikpe nọ n’ụlọikpe, ka mba ndị a nye ihe àmà na-egosi na arụsị ha dị iche iche bụ chi n’ezie. Chi ndị a, hà pụrụ ibu amụma nzọpụta maka ndị na-efe ha ma ọ bụ nke ikpe ọmụma megide ndị iro ha? Ọ bụrụ otú ahụ, hà pụrụ imezu amụma ndị ahụ? Azịza ya bụ ee e. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ime ihe ndị a.
5. Kọwaa otú amụma ndị Aịsaịa buru si nwee ihe karịrị otu mmezu.
5 Ka anyị na-atụle amụma Aịsaịa, ka anyị buru n’uche na dị ka ọ dị n’ọtụtụ amụma Bible, okwu ya nwere ihe karịrị otu mmezu. Na 607 T.O.A., Juda ga-eje biri n’ala ọzọ na Babilọn. Otú ọ dị, amụma Aịsaịa na-ekpughe na Jehova ga-agbapụta ndị Israel e ji eji n’ebe ahụ. Nke a mere na 537 T.O.A. Ntọhapụ ahụ nwere ihe yiri ya ná mmalite narị afọ nke 20. N’oge Agha Ụwa Mbụ, ndị ohu Jehova e tere mmanụ, bụ́ ndị nọ n’ụwa, nwere mkpagbu. Na 1918, nrụgide nke sitere n’ụwa Setan—nke Krisendọm kpaliri dị ka akụkụ bụ́ isi nke Babilọn Ukwu ahụ—fọrọ nke nta ka ọ kwụsị ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ a haziri ahazi. (Mkpughe 11:5-10) A tụrụ ụfọdụ ndị ọrụ nọ n’isi nke Watch Tower Society mkpọrọ n’ihi ebubo ụgha. Dị ka o yiri, ụwa emeriwo n’agha ọ na-ebuso ndị ohu Chineke. Mgbe ahụ, dị ka o mere laa azụ na 537 T.O.A., n’ụzọ a na-atụghị anya ya, Jehova mere ka a tọhapụ ha. Na 1919, a tọhapụrụ ndị ọrụ ahụ a tụrụ mkpọrọ, e mesịkwara kagbuo ebubo ndị ahụ e boro ha. Otu mgbakọ e nwere na Cedar Point, Ohio, na September 1919 mere ka ndị ohu Jehova nwetaghachi ike iji maliteghachi ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ. (Mkpughe 11:11, 12) Malite mgbe ahụ ruo ugbu a, ọrụ nkwusa ahụ amụbawo nke ukwuu. Ọzọkwa, ọtụtụ n’ime ihe Aịsaịa kwuru ga-enwe mmezu dị ebube n’ime ụwa Paradaịs ahụ gaje ịbịa. N’ihi ya, ihe Aịsaịa kwuru ogologo oge gara aga na-emetụta mba nile na ndị nile taa.
A Kpọọ Onye Mgbapụta
6. Olee otú onye amụma ahụ si kọwaa onye mmeri ga-abịa n’ọdịnihu?
6 Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova buru amụma maka onye mmeri, onye ga-azọpụta ndị Chineke site na Babilọn ma mezuo ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị iro ha. Jehova na-ajụ, sị: “Ònye kpọteworo otu onye site n’ọwụwa anyanwụ, onye Ọ kpọrọ n’ezi omume ịbịarute ụkwụ Ya? Ọ na-ewere mba dị iche iche nye n’ihu ya, Ọ na-emekwa ya ka o nwee ike n’ahụ ndị eze: Ọ na-ewere ha nye mma agha ya dị ka ájá, dị ka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ nke a na-efepụ efepụ, otú a ka Ọ na-ewere ha nye ụta ya. Ọ na-achụ ha, gabiga n’udo; o jighị ụkwụ ya aba n’ụzọ. Ònye rụworo ya, mee ya, na-akpọ ọgbọ nile site na mgbe mbụ? Ọ bụ Mụ Onwe m, bụ́ Jehova, Onye mbụ, Nke nọnyekwaara ndị ikpeazụ, Mụ onwe m bụ Onye ahụ.”—Aịsaịa 41:2-4.
7. Ònye bụ onye mmeri ahụ na-abịanụ, gịnịkwa ka ọ rụzuru?
7 Ònye bụ onye ahụ a ga-akpọte site n’ọwụwa anyanwụ, site n’akụkụ ọwụwa anyanwụ? Mba Midia na Peasia na Ilam dịcha Babilọn n’akụkụ ọwụwa anyanwụ. N’ebe ahụ ka Saịrọs onye Peasia na usuu ndị agha ya dị ike si zọlie ije. (Aịsaịa 41:25; 44:28; 45:1-4, 13; 46:11) Ọ bụ ezie na Saịrọs adịghị efe Jehova ofufe, ọ rụrụ ọrụ kwekọrọ n’uche Jehova, bụ́ Chineke nke ezi omume. Saịrọs meriri ndị eze, a chụsakwara ndị a n’ihu ya dị ka ájá. Iji nweta mmeri, o si n’okporo ụzọ ndị a na-adịghị agakebe na ha gabiga “n’udo,” ma ọ bụ n’enweghị nsogbu ọ bụla, na-emeri ihe mgbochi nile. Ka ọ na-erule afọ 539 T.O.A., Saịrọs ruru n’obodo ukwu ahụ bụ́ Babilọn ma merie ya. N’ihi ya, a tọhapụrụ ndị Chineke ka ha wee nwee ike ịlaghachi Jerusalem iji guzobeghachi ofufe dị ọcha.—Ezra 1:1-7.c
8. Olee ihe ọ bụ nanị Jehova pụrụ ime?
8 Ya mere, site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova buru amụma banyere mbilite nke Saịrọs ogologo oge tupu a mụọ eze ahụ. Ọ bụ nanị ezi Chineke ahụ pụrụ ibu ihe dị otú ahụ n’amụma n’ụzọ ziri ezi. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime chi ụgha nke mba dị iche iche nke ya na Jehova hà. E nwere ezi ihe mere Jehova ji kwuo, sị: “M gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m.” Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Mụ onwe m bụ onye mbụ, Mụ onwe m bụkwa onye ikpeazụ; ọ dịghịkwa Chineke ọ bụla dị ma e wezụga nanị Mụ onwe m.”—Aịsaịa 42:8; 44:6, 7.
Ndị Ụjọ Ji Atụkwasị Arụsị Obi
9-11. Olee otú mba dị iche iche si meghachi omume n’ọbịbịa nke Saịrọs?
9 Ugbu a, Aịsaịa na-akọwa mmeghachi omume nke mba dị iche iche n’ebe onye a ga-enwe mmeri n’ọdịnihu nọ, sị: “Àgwàetiti nile hụrụ, wee tụọ egwu; nsọtụ nile nke ụwa na-ama jijiji: ha bịaruru nso, wee bịa. Ha nyerịtaara onwe ha aka n’otu n’otu; onye ọ bụla n’ime ha na-asị nwanne ya, Dị ike. Onye ọkà wee mee ka onye nnụcha ọla dị ike, onye ji òtùtù akwọ ihe mụrụmụrụ mere ka onye na-etu osiama dị ike, na-ekwu okwu banyere mkpụkọta, sị, Nke ahụ dị mma: o were ntú kpọgidesie ya ike ka e wee ghara iwezụga ya n’ọnọdụ ya.”—Aịsaịa 41:5-7.
10 N’ilepụ anya n’ọdịnihu ruo ihe dị ka afọ 200, Jehova nyochara ọnọdụ ụwa. Usuu ndị agha dị ike, ndị nọ n’okpuru Saịrọs na-eji ọsọ aga, na-emeri ndị nile na-eguzogide ha. Ndị dị iche iche—ọbụna ndị bi n’àgwàetiti dị iche iche, ndị dị n’ebe kasị dị anya—na-ama jijiji mgbe ọ bịara. N’ụjọ, ha na-ejikọ aka imegide onye Jehova kpọworo site n’ọwụwa anyanwụ imezu ihe o kpere n’ikpe. Ha na-agbalị ịgbarịta ibe ha ume, na-asị: “Dị ike.”
11 Ndị ọkà na-arụkọ ọrụ ọnụ iji kpụọ chi arụsị dị iche iche iji napụta ndị ahụ. Onye ọkwa nkà na-eji osisi rụọ ebe a ga-etinye ihe ma na-agbazi onye na-akpụ ọlaedo ume ka o jiri ọla machite ya, ikekwe ọlaedo. Onye na-akpụ ihe ji òtùtù mee ka ọla ahụ na-akwọ mụrụmụrụ ma kwuo na mkpụkọta ahụ dị mma. Ma eleghị anya ọ bụ ịma njakịrị mere e ji kwuo okwu iji ntú kpọgidesie ya ike ka a ghara iwezụga ya n’ọnọdụ ya ma ọ bụ ka o gosi na o sighị ike, dị ka arụsi bụ́ Degọn gosiri, bụ́ nke dara n’ihu igbe Jehova.—1 Samuel 5:4.
Atụla Egwu!
12. Mmesighachi obi ike dị aṅaa ka Jehova nyere Israel?
12 Ugbu a, Jehova chere ihu n’ebe ndị ya nọ. N’adịghị ka mba ndị na-atụkwasị arụsị ndị na-adịghị ndụ obi, ọ dịghị mkpa ka ndị tụkwasịrị ezi Chineke obi tụọ egwu mgbe ọ bụla. Mmesighachi obi ike nke Jehova nyere ji ihe ncheta bụ́ na Israel bụ ụmụ nke enyi ya bụ́ Abraham wee malite. N’akụkụ okwu nke gosipụtara oké mmetụta ọmịiko, Aịsaịa kọrọ ihe Jehova kwuru, sị: “Gị onwe gị, Israel, ohu m, Jekọb onye M họpụtara, mkpụrụ Abraham, bụ́ onye na-ahụ m n’anya; gị onye M jidesiworo ike site ná nsọtụ nile nke ụwa, ọ bụkwa n’akụkụ ya nile ka M kpọpụtara gị, wee sị gị, Ohu m ka ị bụ, ahọpụtawo m gị, ajụghị m gị ajụ: atụla egwu, gị ka M nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, M ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.”—Aịsaịa 41:8-10.
13. N’ihi gịnị ka ihe Jehova kwuru ga-eji bụrụ ihe nkasi obi nye ndị Juu ahụ e ji eji?
13 Lee ka okwu ndị a ga-esi bụrụ ihe nkasi obi nye ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi e ji eji n’ala ọzọ! Lee ihe agbamume ọ ga-abụ ịnụ ka Jehova kpọrọ ha “ohu m” mgbe ha ka nọ n’ala ọzọ, bụrụ ndị ohu nke eze Babilọn! (2 Ihe E Mere 36:20) Ọ bụ ezie na Jehova ga-enye ha ntaramahụhụ n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ha, ọ gaghị ajụ ha. Ọ bụ Jehova nwe Israel, ọ bụghị Babilọn. Ọ dịghị ihe ọ bụla ga-eme ka ndị ohu Chineke maa jijiji n’ihi ọbịbịa nke Saịrọs ahụ na-enwe mmeri. Jehova ga-anọnyere ndị ya inyere ha aka.
14. Olee otú ihe Jehova gwara Israel si akasi ndị ohu Chineke obi taa?
14 Okwu ndị ahụ emesighachiwo ndị ohu Chineke obi ike ma wusie ha ike ọbụna ruo n’oge anyị. Laa azụ na 1918, ọ gụsiri ha agụụ ike ịmata ihe bụ uche Jehova banyere ha. Agụụ mgbapụta pụọ n’ọnọdụ ha nke ịbụ ndị e ji eji n’ụzọ ime mmụọ gụsiri ha ike. Taa, ọ na-agụsi anyị agụụ ike inwere onwe anyị pụọ ná nrụgide nile nke Setan, ụwa, na ezughị okè nke anyị, na-ewetara anyị. Ma anyị ghọtara na Jehova maara kpọmkwem mgbe na otú ọ ga-esi mee ihe n’ihi ndị ya. Dị ka obere ụmụaka, anyị na-ejidesi aka ya dị ike ike, na-enwe obi ike na ọ ga-enyere anyị aka ịnagide. (Abụ Ọma 63:7, 8) Jehova ji ndị na-ejere ya ozi kpọrọ ihe. Ọ na-akwado anyị taa dịkwa ka ọ kwadoro ndị ya gabiga oge ahụ siri ike bụ́ 1918-1919, nakwa dị ka ọ kwadoro ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi ogologo oge gara aga.
15, 16. (a) Gịnị ga-eme ndị iro Israel, n’ụzọ dịgasịkwa aṅaa ka Israel si yie idide? (b) N’ihi mwakpo dị aṅaa na-eru nso ka ihe Jehova kwuru ji bụrụ ihe na-agba ume taa karịsịa?
15 Tụlee ihe ọzọ Jehova kwuru site n’ọnụ Aịsaịa: “Lee, ihere ga-eme ndị ahụ nile ndị iwe ha dị ọkụ n’ahụ gị, a ga-etinye ha n’ọnọdụ ihere: ha ga-adị ka ihe na-abụghị ihe, wee laa n’iyi, bụ́ ndị na-alụso gị ọgụ. Ị ga-achọ ha, ma ị gaghị achọta ha, bụ́ ndị gị na ha na-ese okwu: ha ga-adị ka ihe na-abụghị ihe na dị ka ihe efu, bụ́ ndị na-ebuso gị agha. N’ihi na Mụ onwe m, Jehova, Chineke gị, na-ejidesi aka nri gị ike, bụ́ Onye na-asị gị, Atụla egwu, Mụ onwe m enyeworo gị aka. Atụla egwu, gị idide, bụ́ Jekọb, unu ndị ikom Israel; Mụ onwe m enyeworo gị aka, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, ọzọ, Onye mgbapụta gị bụ Onye Nsọ nke Israel.”—Aịsaịa 41:11-14.
16 Ndị iro Israel agaghị emeri. Ihere ga-eme ndị na-ewesa Israel iwe dị ọkụ. Ndị na-alụso ya ọgụ ga-ala n’iyi. Ọ bụ ezie na ndị Israel e ji eji yiri ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị ihe nchebe dị ka idide nke na-agba rịkọ rịkọ n’ájá, Jehova ga-enyere ha aka. Lee ihe agbamume nke a bụworo eri “mgbe ikpeazụ” a, ka ezi ndị Kraịst cheworo ajọ ibu iro nke ọtụtụ ndị nọ n’ụwa ihu! (2 Timoti 3:1) Leekwa ka nkwa Jehova si bụrụ ihe na-ewusi ike n’ihi mwakpo na-eru nso nke Setan ga-eme, bụ́ onye e zoro aka n’ebe ọ nọ n’amụma dị ka “Gọg, nke ala Megọg”! Mgbe Gọg ga na-awakpo ha mwakpo kpụ ọkụ n’ọnụ, ndị Jehova ga-eyi ndị na-enweghị ihe nchebe dị ka idide—ndị “bi n’ebe na-enweghị mgbidi,” ndị na-enweghịkwa ọbụna “ihe ntụchi ma ọ bụ ibo ọnụ ụzọ.” Ma, ọ gaghị adị mkpa ka ndị na-ele anya Jehova maa jijiji n’ihi ụjọ. Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’onwe ya ga-ebu agha iji napụta ha.—Ezikiel 38:2, 11, 14-16, 21-23; 2 Ndị Kọrint 1:3.
Nkasi Obi Maka Israel
17, 18. Olee otú Aịsaịa si kọwaa onyinye e nyere Israel ume, mmezu dịkwa aṅaa ka anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-enwe?
17 Jehova gara n’ihu ịkasi ndị ya obi, sị: “Lee, emewo m ka ị ghọọ ihe mkpọre e ji azọcha ọka, bụ́ ihe dị nkọ dị ọhụrụ nwere ezé: ị ga-azọcha ugwu, zọpịa ha, ị ga-emekwa ugwu nta ka ha dị ka igbogbo ọka. Ị ga-afụcha ha, ifufe ga-efepụkwa ha, oké ifufe ga-efesakwa ha: ma gị onwe gị ga-etegharị egwú ọṅụ na Jehova, n’Onye Nsọ nke Israel ka ị ga-anya isi.”—Aịsaịa 41:15, 16.
18 A ga-enye Israel ume ime ihe, n’ụzọ ime mmụọ kwa, nye ha ume iji merie ndị iro ya yiri ugwu. Mgbe Israel ga-esi n’ije biri n’ala ọzọ lọta, ọ ga-aṅụrị ọṅụ n’isi ndị iro ya bụ́ ndị na-anwa igbochi mwughachi nke ụlọukwu ahụ na mgbidi Jerusalem. (Ezra 6:12; Nehemaịa 6:16) Otú ọ dị, a ga-emezu n’ụzọ dị ebube ihe Jehova kwuru, n’ebe “Israel nke Chineke” nọ. (Ndị Galetia 6:16) Jisọs kwere ndị Kraịst e tere mmanụ nkwa, sị: “Onye na-emeri emeri, na onye na-edebe ọrụ m nile ruo ọgwụgwụ ihe nile, ya ka M ga-enyekwa ike ịchị mba nile: ọ ga-ewerekwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ, dị ka a na-akụjisi ite nke ọkpụite; dị ka Mụ onwe m natawokwara n’aka Nna m.” (Mkpughe 2:26, 27) Oge ga-abịa n’ezie mgbe ụmụnna Kraịst, bụ́ ndị e si n’ọnwụ kpọlite gaa n’ebube eluigwe, ga-ekere òkè n’ibibi ndị iro Jehova Chineke.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8; Mkpughe 20:4, 6.
19, 20. Gịnị ka Aịsaịa dere banyere iweghachi Israel n’ebe mara mma, oleekwa otú e si mezuo nke a?
19 N’okwu ihe atụ, Jehova mesiziri nkwa ya ike nke bụ́ inyere ndị ya aka. Aịsaịa na-ede, sị: “Ndị e wedara n’ala na ụmụ ogbenye na-achọ mmiri ma ọ dịghị nke dịnụ, ire ha kpọsịrị nkụ n’ihi akpịrị kpọrọ nkụ; Mụ onwe m, bụ́ Jehova, ga-aza ha, Mụ, bụ́ Chineke Israel, M gaghị ahapụ ha. M ga-akwaghe osimiri n’elu ugwu dị iche iche ọhịa na-adịghị, na isi iyi n’etiti ndagwurugwu dị iche iche: M ga-eme ka ọzara ghọọ ọdọ mmiri jupụtara ná mmiri, meekwa ka ala ọkpọ nkụ ghọọ ebe mmiri na-asụpụta. M ga-akụ n’ọzara osisi cedar na osisi acacia na osisi myrtle na osisi mmanụ; M ga-amakọta n’ala ihe na-adịghị osisi fir na osisi pine na osisi cypress: ka ha wee hụ, mara, tụkwasị obi, nwee uche ịghọta n’otu, na aka Jehova mere nke a, na Onye Nsọ nke Israel kere ya.”—Aịsaịa 41:17-20.
20 Ọ bụ ezie na ndị Israel e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bi n’isi obodo nke ike ọchịchị ụwa bara ọgaranya, nye ha o yiri ọzara mmiri na-adịghị na ya. Ha nwere ụdị mmetụta Devid nwere mgbe ọ na-ezonahụ Eze Sọl. Na 537 T.O.A., Jehova megheere ha ụzọ ka ha laghachi Juda wee wughachi ụlọukwu ya dị na Jerusalem, si otú a weghachi ofufe dị ọcha. N’aka nke ya, Jehova gọziri ha. N’amụma o buru ka e mesịrị, Aịsaịa kwuru, sị: “Jehova akasiwo Zaịọn obi: Ọ kasiwo mkpọmkpọ ebe ya nile, mee ka ọzara ya dị ka Iden, mee ka ala ya nke ihe na-adịghị dị ka ubi Jehova a gbara ogige.” (Aịsaịa 51:3) Nke a mezuru n’ezie mgbe ndị Juu laghachisịrị n’ala ha.
21. Mweghachi dị aṅaa weere ọnọdụ n’oge a, gịnịkwa ga-eme n’ọdịnihu?
21 Ihe yiri nke ahụ mere n’oge a mgbe Saịrọs Ka Ukwuu, bụ́ Kraịst Jisọs, tọhapụrụ ụmụazụ ya e tere mmanụ site n’ịbụ ndị e ji eji n’ụzọ ime mmụọ ka ha wee nwee ike ịrụ ọrụ iji weghachi ofufe dị ọcha. E ji paradaịs ime mmụọ mara mma, nke bụ́ ogige Iden ihe atụ, gọzie ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. (Aịsaịa 11:6-9; 35:1-7) N’isi nso, mgbe Chineke ga-ebibi ndị iro ya, a ga-eme ka ụwa nile ghọọ paradaịs a na-ahụ anya, dị nnọọ ka Jisọs kwere onye mmebi iwu ahụ nọ n’elu osisi ná nkwa.—Luk 23:43.
Ihe Ịma Aka Nye Ndị Iro Israel
22. Olee ihe Jehova kwuru iji maa mba dị iche iche aka ọzọ?
22 Jehova gaghachiri ugbu a n’esemokwu nke ya na mba dị iche iche na chi arụsị ha, sị: “Wetanụ okwu ikpe unu nso, ka Jehova na-asị; butenụ ihe nile unu dabeere nso, ka Eze Jekọb na-asị. Ka ha bute ha nso, gosi anyị ihe ahụ nke ga-eme: gosinụ ihe nile e mere na mgbe mbụ, ihe ha bụ, ka anyị wee tụkwasị ha obi anyị, wee mara ikpeazụ ha; ma ọ bụ meenụ ka anyị nụrụ ihe ahụ nile nke na-abịa. Gosinụ ihe ahụ nile nke ga-abịa n’ọdịnihu, ka anyị wee mara na chi ka unu bụ: ee, meenụ ezi ihe, ma ọ bụ meenụ ihe ọjọọ, ka anyị wee lerịta onwe anyị anya gburugburu n’ụjọ, hụ ya n’otu. Lee, unu onwe unu sitere n’ihe na-abụghị ihe, ọrụ unu sitekwara n’ihe efu: ihe arụ ka onye na-ahọpụta unu bụ.” (Aịsaịa 41:21-24) Chi nke mba dị iche iche, hà ga-enwe ike ibu amụma ziri ezi wee si otú a gosi na ha nwere ihe ọmụma karịrị nke mmadụ? Ọ bụrụ na ha ga-enwe ike ime ya, n’ezie e kwesịrị inwe ihe ụfọdụ ga-esi na ya pụta, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ, iji kwadoo nzọrọ ha. Otú ọ dị, n’ezie, chi arụsị dị iche iche agaghị enwe ike imezu ihe ọ bụla, ha yikwara ihe na-adịghị adị.
23. N’ihi gịnị ka Jehova, site n’ọnụ ndị amụma ya, ji katọọ ikpere arụsị n’akwụsịghị akwụsị?
23 N’oge anyị, ụfọdụ pụrụ ịdị na-eche ihe mere Jehova, site n’ọnụ Aịsaịa na ndị amụma ibe ya, ji tinye oge dị ukwuu n’ịkatọ nzuzu nke ikpere arụsị. Abaghị n’ihe nke arụsị mmadụ mere pụrụ iyi ihe doro anya nye ọtụtụ ndị taa. Otú ọ dị, ozugbo usoro nkwenkwe ụgha gbanyere mkpọrọgwụ, a nakwerekwa ya ebe nile, ọ na-esi ike iwepụ ya n’uche ndị kwere na ya. Ọtụtụ nkwenkwe ndị e nwere taa abaghị n’ihe dịkwa ka ikwere na ihe oyiyi ndị na-adịghị ndụ bụ chi n’ezie na-abaghị. Ma, ndị mmadụ na-araparasi ike na nkwenkwe ndị dị otú ahụ n’agbanyeghị arụmụka ndị na-eme ka a gbanwee echiche ndị e nwere megide ha. Ọ bụ nanị site n’ịnụ eziokwu ahụ ugboro ugboro ka ụfọdụ ndị ji abụ ndị a kpaliri ịhụ amamihe dị n’ịtụkwasị Jehova obi.
24, 25. Olee otú Jehova si zoo aka ọzọ n’ebe Saịrọs nọ, amụma ọzọ dịkwa aṅaa ka nke a na-echetara anyị?
24 Jehova zoro aka ọzọ n’ebe Saịrọs nọ, na-asị: “Akpọtewo m otu onye site n’Ugwu, o wee bịa; otu onye site n’ọwụwa anyanwụ nke ga-akpọku aha m: ọ ga-abịakwasịkwa ndị nọchiri anya eze dị ka a ga-asị na ha bụ ụrọ, na dị ka ọkpụite si azọ ájá.” (Aịsaịa 41:25)d N’ụzọ dị iche na chi nke mba dị iche iche, Jehova pụrụ ịrụpụta ihe. Mgbe o si “n’ọwụwa anyanwụ” kpọta Saịrọs, Chineke ga-egosipụta ikike o nwere ibu amụma na ịkpụzi ọdịnihu iji mezuo ihe o buru n’amụma.
25 Okwu ndị a na-echetara anyị otú Jọn onyeozi si kọwaa n’ụzọ amụma, ndị eze a ga-akpọte ime ihe n’oge anyị. Ná Mkpughe 16:12, anyị na-agụ na a ga-edoziri “ndị eze ahụ ndị si n’ọwụwa anyanwụ bịa” ụzọ. Ndị eze a abụghị ndị ọzọ ma e wezụga Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. Dị nnọọ ka Saịrọs gbapụtara ndị Chineke ogologo oge gara aga, ndị eze a dị nnọọ ike karị ga-ebibi ndị iro Jehova ma duru ndị ya gabiga oké mkpagbu ahụ banye n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume.—Abụ Ọma 2:8, 9; 2 Pita 3:13; Mkpughe 7:14-17.
Jehova Kasị Elu!
26. Olee ajụjụ Jehova jụrụ ugbu a, à zakwara ya?
26 Ọzọ, Jehova kwupụtara eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ nanị ya bụ ezi Chineke. Ọ na-ajụ, sị: “Ònye gosiworo ya site na mbụ, ka anyị wee mara? na site na mgbe gara aga, ka anyị wee sị, Ọ bụ onye ezi omume? ee, ọ dịghị onye na-egosi, ee, ọ dịghị onye na-eme ka anyị nụrụ, ee, ọ dịghị onye na-anụ okwu ọnụ unu.” (Aịsaịa 41:26) Ọ dịghị chi arụsị ọ bụla mara ọkwa ọbịbịa nke onye mmeri iji tọhapụ ndị na-atụkwasị ya obi. Chi nile dị otú ahụ adịghị ndụ, ha dara ogbi. Ha abụghị chi ma ọlị.
27, 28. Eziokwu dị aṅaa dị mkpa ka e mesiri ike n’amaokwu ndị ikpeazụ nke Aịsaịa isi 41, nanị ole ndị kwa na-akpọsa nke a?
27 Mgbe ọ kọsịrị okwu amụma ndị a na-akpali akpali ndị Jehova kwuru, Aịsaịa mesiri otu eziokwu dị mkpa ike, sị: “Abụ m onye mbụ ịsị Zaịọn, Lee, lee ha: M ga-enyekwa Jerusalem onye na-ezisa ozi ọma. M wee lee, ma ọ dịghị onye M hụrụ; n’etiti ndị a kwa, ma ọ dịghị onye ndụmọdụ dị, ka M wee jụọ ha ajụjụ, ha wee zaghachi m okwu. Lee, ha nile bụ ajọ ihe; ihe efu ka ọrụ nile ha bụ: ifufe na ebe tọgbọrọ n’efu ka arụsị nile ha a wụrụ awụ bụ.”—Aịsaịa 41:27-29.
28 Jehova bụ onye mbụ. Ọ kasị elu! Ọ bụ ezi Chineke ahụ, bụ́ onye na-ama ọkwa mgbapụta nke ndị ya, na-ewetara ha ozi ọma. Ọ bụkwa nanị Ndịàmà ya na-akpọsa ịdị ukwuu ya nye mba dị iche iche. N’ụzọ ịkwa emo, Jehova na-akatọ ndị na-atụkwasị obi n’ife arụsị, na-akatọ arụsị ha dị ka “ifufe na ebe tọgbọrọ n’efu.” Lee ihe gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji rapagidesie ike n’ebe ezi Chineke ahụ nọ nke a bụ! Ọ bụ nanị Jehova ka anyị kwesịrị ịtụkwasị obi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
c Saịrọs Ka Ukwuu, bụ́ onye tọhapụrụ “Israel nke Chineke” na 1919 site n’ịbụ ndị e ji eji n’ụzọ ime mmụọ, abụghị onye ọzọ ma e wezụga Jisọs Kraịst, bụ́ onye nọdụworo dị ka Eze nke Alaeze eluigwe nke Chineke kemgbe 1914.—Ndị Galetia 6:16.
d Ọ bụ ezie na obodo a mụrụ Saịrọs dị Babilọn n’akụkụ ọwụwa anyanwụ, mgbe o mere mwakpo ikpeazụ ya n’obodo ahụ, o si n’ebe ugwu bịa, n’Asia Minor.
[Foto dị na peeji nke 19]
A họọrọ Saịrọs ịrụ ọrụ Chineke, ọ bụ ezie na ọ bụ onye na-ekpere arụsị
[Foto dị na peeji nke 21]
Mba dị iche iche na-atụkwasị arụsị ndị na-adịghị ndụ obi
[Foto ndị dị na peeji nke 27]
Israel, dị ka “ihe mkpọre e ji azọcha ọka,” “ga-azọcha ugwu”