Isi nke Asatọ
Okpukpe Ụgha—A Hụ Mbibi Ya Dị Ịrịba Ama Tupu O Mee
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka o ji yie ụfọdụ ndị ka ihe na-agaghị eme eme na a ga-enwe oké mgbanwe n’isi nso n’ọnọdụ nke okpukpe n’ụwa? (b) Olee otú anyị si mara na ihe ndị e kwuru n’Aịsaịa isi 47 ga-emezu n’ọdịnihu? (ch) N’ihi gịnị ka “Babilọn Ukwu” ji bụrụ aha kwesịrị ekwesị maka okpukpe ụgha nile?
“OKPUKPE Alaghachite.” Nke ahụ bụ ozi a kpọsara n’otu isiokwu dị na The New York Times Magazine. Isiokwu ahụ gosiri na okpukpe yiri ka ọ ka jisiri obi na uche nke ọtụtụ nde mmadụ aka ike. N’ihi ya ọ pụrụ isi ike ikweta na a na-aga inwe oké mgbanwe n’ọnọdụ nke okpukpe n’ụwa. Ma e zoro aka ná mgbanwe dị otú ahụ n’isi 47 nke akwụkwọ Aịsaịa.
2 Ihe Aịsaịa kwuru mezuru n’afọ 2,500 gara aga. Otú ọ dị, e hotara okwu ndị ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 47:8 n’akwụkwọ Mkpughe ma jiri ha mee ihe dị ka ihe ga-eme n’ọdịnihu. N’ebe ahụ Bible buru amụma banyere mbibi nke nzukọ ahụ yiri nwanyị na-akwa iko nke a kpọrọ “Babilọn Ukwu ahụ”—alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 16:19) Aha ahụ bụ́ “Babilọn” nke bụ́ maka okpukpe ụgha ndị dị n’ụwa kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na Babilọn oge ochie ka okpukpe ụgha malitere. O si ebe ahụ gbasaa gaa n’akụkụ anọ nke ụwa. (Jenesis 11:1-9) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile, tinyere Krisendọm, na-ezicha ozizi okpukpe ndị malitere na Babilọn, dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ọkụ ala mmụọ, na ife chi atọ n’ime otu ofufe.a Amụma Aịsaịa ọ̀ na-enye nghọta ọ bụla banyere ihe ga-eme okpukpe n’ọdịnihu?
E Wedaruo Babilọn n’Ájá
3. Kọwaa ịdị ukwuu nke Ike Ọchịchị Ụwa bụ́ Babilọn.
3 Ṅaa ntị ná mkpọsa a na-akpali akpali nke sitere n’aka Chineke: “Rịdaa, wee nọdụ n’ájá, gị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, bụ́ ada Babilọn; nọdụ n’ala ghara inwe ocheeze, gị ada ndị Kaldea: n’ihi na ị gaghị abụkwa onye ha na-akpọ nwanyị dị nro nke dịkwa pekepeke.” (Aịsaịa 47:1) Ruo ọtụtụ afọ Babilọn anọkwasịwo n’ocheeze dị ka ike ọchịchị ụwa na-achịnụ. Ọ nọwo na-abụ “ihe mara mma nke alaeze nile”—isi ọnọdụ okpukpe, nke azụmahịa, na nke agha, bụ́ nke bara ọgaranya. (Aịsaịa 13:19) Mgbe Babilọn nọ n’újú ya, alaeze ukwu ya gbasaruru ebe ndịda ruo n’ókèala nke Ijipt. Mgbe o merikwara Jerusalem na 607 T.O.A., o yiri ka Chineke n’onwe ya apụghị ịkwụsị mmeri ndị ọ na-enwe! N’ihi ya, o weere onwe ya dị ka “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke,” onye ọ na-adịghị mgbe ndị si mba ọzọ ga-awakpo ya.b
4. Gịnị ga-eme Babilọn?
4 Otú ọ dị, a ga-akwatu “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke” nke a dị mpako n’ocheeze ya dị ka ike ọchịchị ụwa na-enweghị onye na-ama ya aka ma mee ka ọ “nọdụ n’ájá” n’ụzọ mweda n’ala. (Aịsaịa 26:5) A gakwaghị na-ele ya anya dị ka onye “dị nro nke dịkwa pekepeke,” dị ka eze nwanyị a na-apa apa. N’ihi ya Jehova nyere iwu, sị: “Were nkume igwe nri gwee ụtụ ọka: kpupụ ákwà mkpuchi gị, yipụ uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị, gabiga osimiri dị iche iche.” (Aịsaịa 47:2) Mgbe o mesịworo ka mba Juda dum bụrụ ndị ohu, a ga-emesozi Babilọn n’onwe ya dị ka ohu! Ndị Midia na ndị Peasia, bụ́ ndị chụturu ya n’ọkwá ọchịchị ya, ga-amanye ya ịrụrụ ha ọrụ na-eweda n’ala.
5. (a) Olee otú a ga-esi kpupụ Babilọn ‘ákwà mkpuchi na uwe mwụda ya’? (b) Gịnị ka iwu ahụ bụ́ ka ọ “gabiga osimiri dị iche iche” pụrụ ịdị na-ezo aka na ya?
5 A ga-esi otú a kpupụ Babilọn ‘ákwà mkpuchi na uwe mwụda’ ya, na-anapụ ya ebube na ùgwù nile o nweburu. Ndị na-amanye ya ịrụ ọrụ ga-enye ya iwu ka ọ “gabiga osimiri dị iche iche.” Ma eleghị anya, a ga-enye ụfọdụ ndị Babilọn iwu kpọmkwem ka ha rụọ ọrụ dị ka ndị ohu n’èzí. Ma ọ bụkwanụ amụma ahụ pụrụ ịpụta na a ga-akpụrụ ụfọdụ gabiga osimiri dị iche iche mgbe a kpụ ha na-aga ije biri n’ala ọzọ. Ka o sina dị, Babilọn agakwaghị na-eme njem n’ụzọ dị ebube dị ka eze nwanyị nke a na-eji oche ma ọ bụ ụgbọ ịnyịnya ebufe n’iyi. Kama nke ahụ, ọ ga-adị ka ohu nke na-aghaghị ileghara ihere anya, chịlie uwe mwụda ya elu, na-ekpughe ụkwụ ya iji jiri ụkwụ gafere osimiri. Lee ka o si bụrụ ihe mweda n’ala!
6. (a) N’echiche dị aṅaa ka a ga-esi kpughee ọtọ Babilọn? (b) Olee otú Chineke na-agaghị esi “ezute mmadụ”? (Lee ihe odide ala ala peeji nke NW.)
6 Jehova gara n’ihu n’emo ọ na-akwa ya: “A ga-ekpughe ọtọ gị, ee, a ga-ahụ ịta ụta gị: ọ́bọ̀ ka M ga-abọ, M gaghị ezute mmadụ.” (Aịsaịa 47:3)c Ee, a ga-emenye Babilọn ihere, lelịakwa ya anya. A ga-agba omume ọjọọ ọ na-emeso ndị Chineke na obi ọjọọ o nwere n’ebe ha nọ n’anwụ. Ọ dịghị mmadụ pụrụ igbochi ịbọ ọ́bọ̀ Chineke!
7. (a) Olee otú ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ ga-esi meghachi omume mgbe ha nụrụ akụkọ banyere ọdịda Babilọn? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova ga-esi gbapụta ndị ya?
7 Mgbe e jichiworo ha ruo afọ 70 na Babilọn ahụ dị ike, ndị Chineke ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ọdịda ya. Ha ga-eti mkpu, sị: “Onye mgbapụta anyị, Jehova nke usuu nile nke ndị agha bụ aha Ya, bụ́ Onye Nsọ nke Israel.” (Aịsaịa 47:4) N’Iwu Mosis, ọ bụrụ na onye Israel erenye onwe ya n’ịbụ ohu iji kwụchapụ ụgwọ o ji, onye mgbapụta (onye ikwu ya nke ya na ya bụ otu ọbara) pụrụ ịzụta ya, ma ọ bụ gbapụta ya, n’ịbụ ohu. (Levitikọs 25:47-54) Ebe ọ bụ na a ghaghị irenyeworịị ndị Juu n’ịbụ ohu nye Babilọn, ọ ga-adị mkpa ịgbapụta ha, ma ọ bụ ịtọhapụ ha. Nye ndị ohu, mmeri na-abụkarị nanị ịgbanwe nna ukwu. Ma Jehova ga-akpali Eze Saịrọs nke na-enwe mmeri ime ka ndị Juu nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu. A ga-enye Saịrọs Ijipt, Etiopia, na Seba dị ka “ihe mgbapụta” n’ọnọdụ ndị Juu. (Aịsaịa 43:3) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, a kpọrọ Onye Mgbapụta Israel “Jehova nke usuu nile nke ndị agha.” Usuu ndị agha Babilọn, bụ́ ndị yiri ndị dị ike, adịghị ike ma e jiri ha tụnyere usuu ndị mmụọ ozi a na-adịghị ahụ anya nke Jehova.
Ihe Obi Ọjọọ Na-akpata
8. N’echiche dị aṅaa ka Babilọn ga-esi “baa n’ọchịchịrị”?
8 Jehova maliteghachiri nkatọ amụma ọ na-akatọ Babilọn: “Nọdụ duu, baa n’ọchịchịrị, gị ada ndị Kaldea: n’ihi na ị gaghị abụ onye ha na-akpọ, Nwanyị nwe alaeze dị iche iche.” (Aịsaịa 47:5) Nanị ihe na-echere Babilọn bụ ọchịchịrị na enweghị olileanya. Ọ gakwaghị na-achị alaeze ndị ọzọ dị ka nwanyị nwenụ nke nwere obi ọjọọ.—Aịsaịa 14:4.
9. N’ihi gịnị ka Jehova ji wee iwe megide ndị Juu?
9 N’ihi gịnị ka e jidịrịị kwe ka Babilọn merụọ ndị Chineke ahụ? Jehova na-akọwa, sị: “Ewesara m ndị m iwe, emere m ihe nketa m ka ọ ghara ịdị nsọ, M wee nye ha n’aka gị.” (Aịsaịa 47:6a) Jehova nwere ezi ihe mere ọ ga-eji wesa ndị Juu iwe. Na mbụ, ọ dọrọ ha aka ná ntị na ịnupụ isi n’Iwu ya ga-eme ka a chụpụ ha n’ala ahụ. (Deuterọnọmi 28:64) Mgbe ha dabara n’ikpere arụsị na mmekọahụ rụrụ arụ, Jehova ji ịhụnanya ziga ndị amụma iji nye aka weghachi ha n’ofufe dị ọcha. Ma ha nọgidere “na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.” (2 Ihe E Mere 36:16) Ya mere Chineke kwere ka e metọọ ihe nketa ya bụ́ Juda, mgbe Babilọn wakporo ala ahụ ma merụọ ụlọukwu Ya dị nsọ.—Abụ Ọma 79:1; Ezikiel 24:21.
10, 11. N’ihi gịnị ka Jehova ji na-ewesa Babilọn iwe, ọ bụ ezie na ọ bụ uche ya ka o merie ndị ya?
10 N’ihi nke ahụ, ọ́ bụghị nanị imezu uche Chineke ka Babilọn na-emezu mgbe o mere ka ndị Juu bụrụ ohu? Ee e, n’ihi na Chineke na-ekwu, sị: “I nweghị obi ebere n’ahụ ha; n’ahụ agadi ka i meworo ka yoke nke gị dị arọ nke ukwuu. I wee sị, Ruo mgbe ebighị ebi ka m ga-abụ nwanyị nwenụ: i wee ghara ịtụkwasị ihe ndị a n’obi gị, i chetaghị ikpeazụ ya.” (Aịsaịa 47:6b, 7) Chineke enyeghị Babilọn iwu iji obi ọjọọ gafere ókè mee ihe, n’emereghị ọbụna “ndị okenye” amara. (Abụ Ákwá 4:16; 5:12) Ọ gbaghịkwa ha ume inwe obi ụtọ arụrụala site n’ịkwa ndị Juu ha ji eji emo.—Abụ Ọma 137:3.
11 Babilọn aghọtaghị na ojiji o ji ndị Juu bụ ruo nwa oge. O legharawo ịdọ aka ná ntị Aịsaịa anya, nke bụ́ na ka oge na-aga, Jehova ga-atọhapụ ndị ya. Ọ na-eme omume dị ka a ga-asị na e nyere ya ikike ịchị ndị Juu ruo mgbe ebighị ebi na ịnọgide na-abụ nwanyị nwenụ nke mba ndị nọ n’okpuru ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ṅaghị ntị n’ozi ahụ bụ́ na ọchịchị obi ọjọọ ya ga-abịaru ‘n’ikpeazụ’ ya!
E Buo Ọdịda Babilọn n’Amụma
12. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Babilọn ‘nwanyị na-eme ka o si tọọ ya ụtọ’?
12 Jehova na-ekwu, sị: “Ugbu a nụrụ nke a, gị nwanyị na-eme ka o si tọọ gị ụtọ, gị onye na-anọ ná ntụkwasị obi, nke na-asị n’obi gị, Mụ onwe m nọ, ọ dịghịkwa otu efu ọzọ dị ma e wezụga nanị mụ onwe m; m gaghị anọ dị ka nwanyị di ya nwụrụ, m gaghị amakwa ọgbụgba aka ụmụ.” (Aịsaịa 47:8) A ma nnọọ Babilọn ama maka ịchọ ihe ụtọ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke ise T.O.A. bụ́ Herodotus na-akọ banyere “omenala kasị eme ihere” nke ndị Babilọn, nke bụ́, na a na-achọ ka ụmụ nwanyị nile gbaa akwụna iji sọpụrụ chi nwanyị ha nke ịhụnanya. Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke oge ochie bụ́ Curtius kwukwara n’otu aka ahụ, sị: “Ọ dịghị mmerụ pụrụ ịkarị àgwà obodo ahụ; ọ dịghị ụdị mmerụ a haziri ahazi pụrụ ịbụ ihe mkpali na ihe ndọrọ maka ibi ndụ ịla n’iyi karịa ya.”
13. Olee otú mmasị Babilọn nwere n’ịchọ ihe ụtọ ga-esi mee ka ọdịda ya bịakwuo ọsọ ọsọ?
13 Mmasị Babilọn nwere n’ịchọ ihe ụtọ ga-eme ka ọdịda ya bịakwuo ọsọ ọsọ. N’uhuruchi ụbọchị ahụ e meriri ya, eze ya na ndị isi ya na-eme oriri, na-aṅụnye onwe ha nzuzu. N’ụzọ dị otú a, ha agaghị aṅa ndị agha Medo-Peasia na-awakpo obodo ahụ ntị. (Daniel 5:1-4) ‘N’ịnọ ná ntụkwasị obi,’ Babilọn ga-eche na mgbidi ya nke yiri ihe a na-apụghị ịgafe agafe nakwa ekpe ya ga-echebe ya ka a ghara ịwakpo ya. Ọ na-agwa onwe ya na ‘ọ dịghịkwa onye ọzọ’ nke pụrụ ịnọchi ya n’ọkwá kasị elu. O chetụdịghị n’echiche na ya pụrụ ịghọ “nwanyị di ya nwụrụ,” onye onye ọchịchị alaeze ukwu ya na “ụmụ” ya, ma ọ bụ ndị bi n’ime ya nwụnahụrụ. Ka o sina dị, ọ dịghị mgbidi pụrụ ichebe ya pụọ n’ogwe aka nke ịbọ ọ́bọ̀ nke Jehova Chineke! Jehova ga-emesịa kwuo, sị: “A sị na Babilọn arịgoruo eluigwe, a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya ike, ma na Mụ ka ndị na-apụnara ya ihe ga-esi bịaruo ya ahụ.”—Jeremaịa 51:53.
14. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Babilọn ga-esi ‘gbara aka ụmụ ma bụrụ nwanyị di ya nwụrụ’?
14 Gịnị ka ọ ga-arụpụtara Babilọn? Jehova gara n’ihu, sị: “Ma ihe abụọ ndị a ga-abịakwute gị n’otu ntabi anya n’otu ụbọchị, bụ́ ọgbụgba aka ụmụ na ọnọdụ nwanyị di ya nwụrụ: dị ka izu okè ha si dị ka ha bịakwasịworo gị, n’ọtụtụ mgbaasị gị, na n’inwebiga ume ókè nke ọrụ dibịa nrafu nile ị na-arụ.” (Aịsaịa 47:9) Ee, Babilọn ịkasị elu dị ka ike ọchịchị ụwa ga-abịa ná njedebe na mberede. N’ala ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge ochie, ịghọ nwanyị di ya nwụrụ na ụmụ mmadụ ịnwụnahụ ya bụ ọdachi kachasịnụ pụrụ ịdakwasị nwanyị. Anyị amaghị “ụmụ” ole nwụnahụrụ Babilọn n’abalị ahụ ọ dara.d Otú ọ dị, mgbe oge ruru, a ga-agbahapụ obodo ahụ kpam kpam. (Jeremaịa 51:29) Ọ ga-aghọkwa nwanyị di ya nwụrụ n’ihi na a ga-achụtu ndị eze ya n’ọchịchị.
15. Tụkwasị n’obi ọjọọ Babilọn nwere n’ebe ndị Juu nọ, gịnị ọzọ mere Jehova ji na-eweso ya iwe?
15 Otú ọ dị, ọ bụghị nanị mmeso ọjọọ Babilọn mesoro ndị Juu mere Jehova ji wee iwe. ‘Ọtụtụ mgbaasị ya’ sokwa kpasuo ya iwe. Iwu Chineke nyere Israel katọrọ ime mgbaasị; otú ọ dị, Babilọn na-achụsosi anwansi ike. (Deuterọnọmi 18:10-12; Ezikiel 21:21) Akwụkwọ bụ́ Social Life Among the Assyrians and Babylonians na-ekwu na ndụ ndị Babilọn “jupụtara n’ịtụ oké ìgwè ndị mmụọ ọjọọ bụ́ ndị ha kwenyere gbara ha gburugburu egwu mgbe nile.”
Ịtụkwasị Obi n’Ihe Ọjọọ
16, 17. (a) Olee otú Babilọn si ‘atụkwasị obi n’ihe ọjọọ ya’? (b) N’ihi gịnị ka a na-apụghị iji gbochie mbibi Babilọn?
16 Ndị dibịa afa nke Babilọn hà ga-azọpụta ya? Jehova na-aza, sị: “I wee tụkwasị obi n’ihe ọjọọ gị; ị sịwo, Ọ dịghị onye na-ahụ m; amamihe gị na ihe ọmụma gị, nke ahụ emewo ka ị laghachi azụ: i wee sị n’obi gị, Mụ onwe m nọ, ọ dịghịkwa otu efu ọzọ dị ma e wezụga nanị mụ onwe m.” (Aịsaịa 47:10) Babilọn na-eche na site n’amamihe okpukpe ya na nke na-emetụtaghị okpukpe, ike agha ya, na obi ịkpọ nkụ aghụghọ ya, na ya pụrụ ịnọgide n’ọkwá ya dị ka ike ọchịchị ụwa. Ọ na-eche na ọ dịghị onye pụrụ ‘ịhụ’ ya, ya bụ, mee ka ọ zaa ajụjụ maka omume ọjọọ ya nile. Ọ dịghịkwa ahụ na onye ọzọ nke ga-ama ya aka na-abịa. Ọ na-agwa onwe ya na “ọ dịghịkwa otu efu ọzọ dị ma e wezụga nanị mụ onwe m.”
17 Otú ọ dị, site n’ọnụ onye amụma ya ọzọ, Jehova na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla ga-ezobe onwe ya n’ebe ọ bụla dị nzuzo, Mụ onwe m wee ghara ịhụ ya anya?” (Jeremaịa 23:24; Ndị Hibru 4:13) Ya mere Jehova na-ekwu, sị: “Ihe ọjọọ abịakwasịwo gị; ị gaghị ama [anwansi megide ya, NW]: mbibi ga-adakwasịkwa gị; ị gaghị enwe ike ikpuchi anya ya: ịla n’iyi ga-abịakwasịkwa gị na mberede, nke ị na-amaghị.” (Aịsaịa 47:11) Ma chi dị iche iche nke Babilọn ma ‘anwansi’ nke ndị ya na-eme mgbaasị na-eme enweghị nke pụrụ igbochi ọdachi ahụ na-abịanụ—nke ihe yiri ya na-emetụbeghị ya!
Ndị Ndụmọdụ nke Babilọn Akụọ Afọ n’Ala
18, 19. Olee otú ndabere Babilọn na-adabere ná ndị ndụmọdụ ya ga-esi bụrụ ọdachi?
18 N’okwu mkparị na-agba agba n’ahụ, Jehova nyere iwu, sị: “Guzo n’ọrụ dibịa nrafu nile ị na-arụ, na n’ọtụtụ mgbaasị gị, nke ị dọgbuworo onwe gị n’ọrụ n’ime ha site na mgbe ị nọ na nwata; eleghị anya ị ga-enwe ike ịba uru, eleghị anya ị ga-eme ka mmadụ maa jijiji.” (Aịsaịa 47:12) A mara Babilọn aka ‘iguzo,’ ma ọ bụ ịnọgidesi ike n’agbanweghị agbanwe, ná ndabere ọ na-adabere ná mgbaasị. E kwuwerị, dị ka otu mba, ọ rụsịwo ọrụ ike n’iwulite nkà mgbaasị ya malite n’oge ọ bụ “nwata.”
19 Ma Jehova na-akwa ya emo, na-asị: “Ike agwụwo gị n’ọtụtụ ndụmọdụ gị: biko, ka ha guzo ọtọ, wee zọpụta gị, bụ́ ndị na-eke eluigwe, ndị na-elegide kpakpando, ndị na-eme ka a mara kwa ọnwa ihe ga-eme, n’ihe ga-abịakwasị gị.” (Aịsaịa 47:13)e Babilọn ga-ahụ ajọ ọdịda nke ndị ndụmọdụ ya. N’eziokwu, ọ ghaghị iweworị ọtụtụ narị afọ nke ikiri mbara igwe iji wulite nkà mmụta ịgụ kpakpando nke Babilọn. Ma n’abalị ahụ ọ ga-ada, ajọ ọdịda nke ndị ya na-agụ kpakpando ga-ada ga-egosi na ịjụ ndị mmụọ ase abaghị uru.—Daniel 5:7, 8.
20. Gịnị ga-adakwasị ndị ndụmọdụ nke Babilọn?
20 Jehova mechiri akụkụ a nke amụma ahụ site n’ikwu, sị: “Lee, ha dị ka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ; ọkụ erewo ha; ha agaghị anapụta onwe ha n’aka ire ọkụ: ọ bụghị icheku ọkụ na-ere ere iji nyaa ọkụ, ọ bụghịkwa ọkụ ịnọdụ n’ihu ya. Otú a ka ha dịịrị gị, bụ́ ihe nke ị dọgbuworo onwe gị n’ọrụ n’ime ha: ndị gị na ha na-azụ ahịa site na mgbe ị dị na nwata awagharịwo, onye ọ bụla ruo ofe nke ya; ọ dịghị onye na-azọpụta gị.” (Aịsaịa 47:14, 15) Ee, oge ndị yiri ọkụ na-aga ịbịakwasị ndị ndụmọdụ ụgha a. Ọ gaghị abụ ọkụ dị ụtọ nke ndị mmadụ pụrụ ịgba gburugburu wee nyara ọkụ, kama ọkụ na-ebibi ma na-erepịa ihe, nke ga-egosi na ndị ndụmọdụ ụgha ahụ abaghị n’ihe dị nnọọ ka ahịhịa ọka. Ka a sịkwanụ ihe mere ndị ndụmọdụ Babilọn ga-eji gbaa ọsọ n’ihi ụjọ! Ebe ihe nkwado ikpeazụ nke Babilọn na-adịkwaghị, ọ dịghị onye ga-azọpụta ya. Ihe ahụ ọ ga-emeworị ka ọ bịakwasị Jerusalem ga-abịakwasịkwa ya.—Jeremaịa 11:12.
21. Ole mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka okwu amụma Aịsaịa si mezuo?
21 N’afọ 539 T.O.A., okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ malitere imezu. Ndị agha Midia na Peasia n’okpuru idu ndú Saịrọs meriri obodo ahụ, gbuo eze ya nke bi n’ime ya, bụ́ Belshaza. (Daniel 5:1-4, 30) E ji otu abalị chụtuo Babilọn n’ọkwá ya dị ka onye na-achị ụwa. Otú a ka ọchịchị nke ụmụ Shem nke nọruworo ọtụtụ narị afọ si bịa ná njedebe, ụwa banyekwara ugbu a n’aka ndị Aryan. Babilọn n’onwe ya banyere n’oge ọdịda nke dịruru ọtụtụ narị afọ. Ka ọ na-erule na narị afọ nke anọ O.A., ọ ghọrọ nanị “obo ihe obo ihe.” (Jeremaịa 51:37) E si otú a mezuo amụma Aịsaịa n’ụzọ zuru ezu.
Babilọn nke Oge A
22. Olee ihe ọdịda Babilọn na-akụziri anyị banyere mpako?
22 Amụma Aịsaịa nwere ọtụtụ ihe a ga-echebara echiche. Otu ihe bụ na ọ na-emesi ihe ize ndụ nke mpako na nganga ike. Ọdịda Babilọn ahụ dị mpako dara na-eme ihe atụ nke ilu Bible bụ́: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.” (Ilu 16:18) Mgbe ụfọdụ, mpako na-achịkwa ọdịdị na-ezughị okè anyị, ma ịbụ onye ‘mpako fụliri elu’ pụrụ iduga n’ịbanye “n’ịta ụta, ya na ịma n’ọnyà ekwensu.” (1 Timoti 3:6, 7) Ya bụrụ otú ahụ, anyị ga-eme nke ọma ịṅa ntị na ndụmọdụ Jemes, bụ́: “Wedanụ onwe unu n’ihu Onyenwe anyị, Ọ ga-ewelikwa unu elu.”—Jemes 4:10.
23. Amụma Aịsaịa na-enyere anyị aka inwe obi ike dị aṅaa?
23 Okwu amụma ndị a na-enyekwara anyị aka inwe obi ike n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye dị ike karịa ndị nile na-emegide ya. (Abụ Ọma 24:8; 34:7; 50:15; 91:14, 15) Nke a bụ ihe ncheta na-enye nkasi obi n’oge ndị a siri ike. Inwe obi ike n’ebe Jehova nọ na-eme ka mkpebi anyị ịnọgide na-abụ ndị a na-apụghị ịta ụta n’anya ya sikwuo ike, ebe anyị maara na “ọdịnihu dịịrị onye udo.” (Abụ Ọma 37:37, 38) Ọ bụ ihe amamihe dị na ya mgbe nile ilegara Jehova anya ma ghara ịdabere n’ike nke onwe anyị n’agbanyeghị “ọrụ aghụghọ” dị iche iche nke Setan.—Ndị Efesọs 6:10-13, ihe odide ala ala peeji nke NW.
24, 25. (a) N’ihi gịnị ka ezi uche na-ejighị dịrị n’ịgụ kpakpando, ma gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-etinye aka na ya? (b) Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị mere ndị Kraịst ji ezere nkwenkwe ụgha?
24 N’ụzọ kwesịrị ịrịba ama, a na-adọ anyị aka ná ntị megide omume mgbaasị, karịsịa ịgụ kpakpando. (Ndị Galetia 5:20, 21) Mgbe Babilọn dara, ndị mmadụ akwụsịghị ịgụ kpakpando. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, akwụkwọ bụ́ Great Cities of the Ancient World na-ekwu na ìgwè kpakpando ndị ahụ ndị Babilọn kewasịrị “agbanwewo” pụọ n’ebe ha nọgasị n’oge ochie, “na-eme ka echiche dum [nke ịgụ kpakpando] bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya.” N’agbanyeghị nke ahụ, ịgụ kpakpando ka na-aga n’ihu, ọtụtụ akwụkwọ akụkọ na-ebukwa akụkụ ndị na-eme ka ndị na-agụ ha nwee ike inweta nkọwa akara eluigwe ngwa ngwa.
25 Gịnị na-eme ka ndị mmadụ—ndị ọtụtụ n’ime ha gụrụ ezigbo akwụkwọ—na-agụ kpakpando ma ọ bụ na-etinye aka n’omume nkwenkwe ụgha ndị ọzọ ndị ezi uche na-adịghị na ha? Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ma eleghị anya nkwenkwe ụgha ga-anọgide na-abụ otu akụkụ nke ndụ a na-adị ma ọ bụrụhaala na ndị mmadụ anọgide na-atụ ibe ha egwu ma na-enwe obi abụọ banyere ọdịnihu.” Egwu na inwe obi abụọ pụrụ ịkpali ndị mmadụ ikwenye na nkwenkwe ụgha. Otú ọ dị, ndị Kraịst na-ezere nkwenkwe ụgha. Ha adịghị atụ mmadụ egwu—Jehova bụ onye na-akwado ha. (Abụ Ọma 6:4-10) Ha anọghịkwa n’obi abụọ banyere ọdịnihu; ha maara nzube Jehova e kpughere ekpughe, ha enweghịkwa obi abụọ na “ndụmọdụ Jehova na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 33:11) Ime ka ndụ anyị kwekọọ na ndụmọdụ Jehova na-eme ka ọdịnihu obi ụtọ, nke na-adịte aka bụrụ nke e ji n’aka.
26. Olee otú “ihe ndị maara ihe na-atụle n’obi ha” siworo bụrụ “ihe efu”?
26 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ụfọdụ agbalịwo iji usoro ndị ka bụrụ “nke sayensị” chọpụta ihe ọdịnihu ga-abụ. E nwere ọbụna ngalaba ihe ọmụmụ a kpọrọ nkà mmụta banyere ọdịnihu, bụ́ nke a kọwara dị ka “ihe ọmụmụ banyere ihe ndị pụrụ ime n’ọdịnihu dabere n’ihe ndị na-eme ugbu a.” Dị ka ihe atụ, laa azụ na 1972 otu ìgwè ndị mmụta na ndị oji ego achụ ego a maara dị ka Club of Rome buru amụma na mgbe ọ na-erule afọ 1992, ọlaedo, ọla mercury, ọla zinc, na mmanụ petrol dị n’ụwa, bụ́ ndị a na-egwupụtabeghị egwupụta ga-agwụsị. Otú ọ dị, ụwa echewo nsogbu ndị na-emenye ụjọ ihu kemgbe 1972, ma amụma ahụ kụrụ afọ n’ala n’ụzọ nile. Ụwa ka nwere ọlaedo, ọla mercury, ọla zinc, na mmanụ petrol a na-egwupụtabeghị egwupụta. N’ezie, mmadụ akpataworo onwe ya ike ọgwụgwọ site n’ịnwa ịkọ ihe ga-eme n’ọdịnihu, ma ịkọ nkọ ya na-abụ mgbe nile nke a na-apụghị ịtụkwasị obi. N’eziokwu, “ihe ndị maara ihe na-atụle n’obi ha . . . bụ ihe efu”!—1 Ndị Kọrint 3:20.
Mbibi Na-abịanụ nke Babilọn Ukwu Ahụ
27. Ole mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Babilọn Ukwu ahụ si daa ọdịda yiri nke Babilọn dara na 539 T.O.A.?
27 Okpukpe dị iche iche nke oge a emewo ka ọtụtụ ozizi nke Babilọn oge ochie dịgide. Ya mere, n’ụzọ dabara adaba a kpọrọ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 17:5) Njikọ okpukpe ahụ zuru ụwa ọnụ adaalarị ọdịda yiri nke ahụ Babilọn oge ochie dara na 539 T.O.A. (Mkpughe 14:8; 18:2) Na 1919 ihe fọdụrụ n’ime ụmụnna Kraịst si n’ịbụ ndị e ji eji n’ụzọ ime mmụọ pụta ma nwere onwe ha pụọ ná mmetụta okpukpe nke Krisendọm, bụ́ akụkụ bụ́ isi nke Babilọn Ukwu ahụ. Kemgbe ahụ, Krisendọm enwekwaghị mmetụta buru ibu n’ọtụtụ ala ebe ndị ọ gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na mbụ.
28. Olee ọnụ Babilọn Ukwu ahụ na-etu, ma gịnị na-echere ya?
28 Otú ọ dị, ọdịda ahụ bụ nanị ihe na-ebute mbibi ikpeazụ nke okpukpe ụgha ụzọ. N’ụzọ na-adọrọ mmasị, amụma nke Mkpughe banyere mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ na-echetara anyị okwu amụma ndị ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa 47:8, 9. Dị ka Babilọn oge ochie, Babilọn Ukwu nke oge a na-ekwu, sị: “Ana m anọdụ dị ka eze nwanyị, abụghịkwa m nwanyị di ya nwụrụ, ọ dịghịkwa iru újú m ga-ahụ ma ọlị.” Ma “n’otu ụbọchị ka ihe otiti ya nile ga-abịa, bụ́ ọnwụ, na iru újú, na ụnwụ; a ga-erechapụkwa ya n’ọkụ; n’ihi na Ọ dị ike, bụ́ Onyenwe anyị Chineke, Onye kpere ya ikpe.” Ya mere okwu amụma ndị ahụ e dekọrọ n’Aịsaịa isi 47 bụ ịdọ aka ná ntị nye ndị ha na okpukpe ụgha ka nwere njikọ. Ọ bụrụ na ha ga-ezere iketa òkè ná mbibi ya, ka ha ṅaa ntị n’iwu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́: “Sinụ n’ime ya pụta”!—Mkpughe 18:4, 7, 8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nweta ihe ọmụma zuru ezu banyere otú ozizi dị iche iche nke okpukpe ụgha si gbasaa, lee akwụkwọ bụ́ Mankind’s Search for God, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b N’asụsụ Hibru “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, bụ́ ada Babilọn” bụ akpaala okwu nke na-ezo aka n’ebe Babilọn dị ma ọ bụ n’ebe ndị bi na Babilọn nọ. Ọ bụ “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke” n’ihi na onye mmeri akwakọrọbeghị ihe ya kemgbe ọ ghọrọ ike ọchịchị ụwa.
c Ndị ọkà mmụta akọwawo okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “M gaghị ezute mmadụ” dị ka “nkebi ahịrịokwu sibigara ike ókè” ịsụgharị. New World Translation tinyere okwu bụ́ “n’obiọma” iji nye echiche bụ́ na ọ dịghị onye si ebe ọzọ a ga-ekwe ka ọ gbatara Babilọn ọsọ enyemaka. Otu nsụgharị nke òtù bụ́ Jewish Publication Society mere sụgharịrị nkebi okwu a ịbụ: “M gaghị . . . ekwe ka onye ọ bụla rịọchitere ya arịrịọ.”
d Akwụkwọ bụ́ Nabonidus and Belshazzar, nke Raymond Philip Dougherty dere, na-ekwu na ọ bụ ezie na Ihe Ndekọ Nabonidus na-ekwu na ndị wakporo Babilọn banyere “n’alụghị ọgụ,” onye Gris bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Xenophon na-egosi na ọ pụrụ ịbụ na a kwafuru ọbara buru ibu.
e Dị ka ihe àmà na-egosi, okwu ahụ bụ́ “ndị na-eke eluigwe na-ezo aka n’omume nke ikewa eluigwe ná nkebi ná nkebi iji nye nkọwa nke akara eluigwe. New World Translation sụgharịrị okwu Hibru ahụ dị ka “ndị na-efe eluigwe.”
[Foto ndị dị na peeji nke 111]
A ga-ewedaru Babilọn nke na-achọ ihe ụtọ n’ájá
[Foto dị na peeji nke 114]
Ndị Babilọn na-agụ kpakpando agaghị enwe ike ibu amụma ọdịda ya
[Foto dị na peeji nke 116]
Kalenda ịgụ kpakpando nke Babilọn, narị afọ iri nke mbụ T.O.A.
[Foto ndị dị na peeji nke 119]
N’isi nso Babilọn nke oge a agaghị adịkwa