Isi nke Iri Abụọ na Isii
“Tegharịakwanụ Egwú Ọṅụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi n’Ihi Ihe nke Mụ Onwe M Na-eke”
1. Okwu dị aṅaa na-emesi obi ike ka Pita onyeozi deturu, ajụjụ dịkwa aṅaa na-ebilite?
Ọ̀ DỊ mgbe anyị ga-ahụ nkwụsị nke ikpe na-ezighị ezi na nhụjuanya? Ihe karịrị afọ 1,900 gara aga, Pita onyeozi deturu okwu ndị a na-emesi obi ike, sị: “Dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Pita na ọtụtụ ndị ohu Chineke ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’ọtụtụ narị afọ ndị gafeworonụ lere anya oké ụbọchị ahụ mgbe mmebi iwu, mmegbu, na ime ihe ike ga-akwụsị, mgbe ezi omume ga-abakwa ụba. Ànyị pụrụ ijide n’aka na a ga-emezu nkwa a?
2. Olee onye amụma kwuru okwu banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” mmezu dịgasịkwa aṅaa ka amụma oge ochie ahụ nwere?
2 Ee, anyị pụrụ! Mgbe Pita kwuru banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” ọ dịghị ewebata echiche ọhụrụ. Ihe dị ka afọ 800 tupu mgbe ahụ, Jehova kwuru ihe ndị yiri ya site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma. Nkwa mbụ ahụ nwere mmezu dị nta na 537 T.O.A. mgbe a tọhapụrụ ndị Juu ná ndọrọ n’agha Babilọn, mee ka ha nwee ike ịlaghachi ala nna ha. Ma amụma Aịsaịa na-enwe mmezu dị ukwuu taa, anyị na-atụkwa anya mmezu na-akpali akpali ọbụna karị n’ime ụwa ọhụrụ na-abịanụ nke Chineke. N’ezie, amụma ahụ na-enye obi ụtọ e si n’ọnụ Aịsaịa kwupụta na-egosi ụfọdụ n’ime ngọzi ndị Chineke kwadebewooro ndị hụrụ ya n’anya.
Jehova Arịọọ ‘Ndị Isi Ike’ Arịrịọ
3. Ajụjụ dị aṅaa ka a zara anyị n’Aịsaịa isi 65?
3 Cheta na ekpere amụma Aịsaịa n’ihi ndị Juu bi na Babilọn dị n’Aịsaịa 63:15–64:12. Dị ka okwu Aịsaịa mere ka o doo anya, ọtụtụ ndị Juu ejighị obi ha dum na-efe Jehova, ma ụfọdụ echegharịwo wee laghachikwute ya. Jehova ọ̀ ga-eweghachi mba ahụ ugbu a n’ihi ihe ahụ fọdụrụ nwere nchegharị? Anyị na-achọta azịza ya n’Aịsaịa isi 65. Ma tupu o kwupụta nkwa nnapụta maka mmadụ ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi, Jehova kọwara ikpe na-echere ọtụtụ ndị na-enweghị okwukwe.
4. (a) N’ụzọ dị iche n’ebe ndị ya na-enupụ isi nọ, olee ndị ga-achọ Jehova? (b) Olee otú Pọl onyeozi si jiri Aịsaịa 65:1, 2 mee ihe?
4 Jehova anọwo na-edi nnupụisi nke ndị ya nọgidere na-enupụ. Otú ọ dị, oge ga-eru mgbe ọ ga-ahapụ ha n’aka ndị iro ha ma jiri obiọma kpọbata ndị ọzọ n’ihu ọma ya. Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-ekwu, sị: “Ekwere m ka ndị na-ajụghị ajụjụ chọọ m; ekwere m ka ndị na-achọsighị m ike chọta m: asịrị m otu mba nke na-akpọkughị aha m, Lekwa m, lekwa m.” (Aịsaịa 65:1) Ọ bụ ihe dị mwute ikwu banyere ndị ha na Jehova nọ n’ọgbụgba ndụ, na ndị mba ọzọ ga-abịakwute Jehova ma Juda dị isi ike n’ozuzu ya ajụ ime otú ahụ. Ọ bụghị nanị Aịsaịa bụ onye amụma buru amụma na Chineke ga-emesịa họrọ ndị a na-amabughị. (Hosea 1:10; 2:23) Pọl onyeozi hotara site na Septuagint, ihe e kwuru n’Aịsaịa 65:1, 2, iji gosi na ndị mba ọzọ ga-enweta “ezi omume ahụ nke si n’okwukwe pụta” ọ bụ ezie na ndị Juu n’anụ ahụ jụrụ ime otú ahụ.—Ndị Rom 9:30; 10:20, 21.
5, 6. (a) Olee ọchịchọ siri ike Jehova gosipụtaworo, ma olee otú ndị ya siworo meghachi omume? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’otú Jehova si mesoo Juda?
5 Jehova na-akọwa ihe mere ọ ga-eji kwe ka ọdachi dakwasị ndị ya: “Agbasawo m aka m abụọ ogologo ụbọchị nile nye otu ndị nke na-ewezụga onwe ha, ndị na-eje ije n’ụzọ na-adịghị mma, na-eso echiche nile nke aka ha.” (Aịsaịa 65:2) Mmadụ ịgbasapụ aka ya na-egosi ịkpọ òkù ma ọ bụ arịrịọ. Jehova agbasawo aka ya, ọ bụghị nanị ruo nwa oge, kama ogologo ụbọchị nile. Ihe ọ chọrọ site n’ala ala obi ya bụ ka Juda laghachikwute ya. Ma, ndị a dị isi ike egeghị ntị.
6 Lee ihe mmụta na-enye obi ụtọ anyị na-enweta site n’ihe Jehova kwuru! Ọ chọrọ ka anyị bịaruo ya nso n’ihi na ọ bụ Chineke a pụrụ ịbịaru nso. (Jemes 4:8) Okwu ndị a na-egosikwa anyị na Jehova dị umeala n’obi. (Abụ Ọma 113:5, 6) E kwuwerị, ọ nọgidere na-agbasa aka ya n’ụzọ ihe atụ, na-arịọ ndị ya ka ha laghachite n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ́ na isi ike ha ‘ewutewo’ ya. (Abụ Ọma 78:40, 41) Ọ bụ nanị mgbe ọ rịọworo ha ruo ọtụtụ narị afọ ka ọ hapụrụ ha n’aka ndị iro ha. Ọbụna otú ahụ, ọ jụghị ndị dị umeala n’obi n’etiti ha.
7, 8. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị Jehova dị isi ike siworo kpasuo ya iwe?
7 Ndị Juu dị isi ike akpasuwo Jehova iwe ugboro ugboro site n’omume ha na-eme ihere. Jehova na-akọwa omume ha na-akpasu iwe, sị: “Ndị ahụ nke na-akpasu m iwe n’ihu m mgbe nile, na-achụ àjà n’ubi nile a gbara ogige, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu brik nile; ndị na-anọdụ n’etiti ili, na-anọkwa ọnọdụ abalị n’ebe nile e chebeworo na nzuzo; ndị na-eri anụ ezì, ofe nke ihe arụ dị iche iche dịkwa n’ihe isi ite nile ha; ndị na-asị, Guzooro onwe gị iche, abịarula nso m, n’ihi na edowo m gị ihe nsọ: ndị a bụ anwụrụ ọkụ n’imi m, ọkụ nke na-ere ogologo ụbọchị nile.” (Aịsaịa 65:3-5) Ndị a yiri ka ha dị nsọ na-akpasu Jehova iwe ‘n’ihu ya’—okwu nke pụrụ ịpụta nleda anya na enweghị nkwanye ùgwù. Ha adịghị emetụ mgbalị izochi arụ ha na-eme. Ọ́ bụghị ihe jọgburu onwe ya karịsịa ime mmehie kpọmkwem n’ihu Onye e kwesịrị ịsọpụrụ ma rubere isi?
8 Ndị mmehie a bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha na-agwa ndị Juu ndị ọzọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: ‘Abịarula nso m, n’ihi na adị m nsọ karịa gị.’ Lee omume ihu abụọ nke ahụ bụ! Ndị a “dị nsọ” na-achụrụ chi ụgha dị iche iche àjà, na-esurekwara ha ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, nke Iwu Chineke katọrọ. (Ọpụpụ 20:2-6) Ha na-anọdụ ala n’etiti ebe a na-eli ozu, nke na-eme ka ha bụrụ ndị rụrụ arụ dị ka Iwu ahụ kwuru. (Ọnụ Ọgụgụ 19:14-16) Ha na-eri anụ ezì, bụ́ anụ rụrụ arụ.a (Levitikọs 11:7) Ma, ihe omume okpukpe ha na-eme ka ha chee na ha dị nsọ karịa ndị Juu ndị ọzọ, ha chọkwara ka ndị ọzọ ghara ịbịaru ha nso ka e wee ghara ido ndị ahụ nsọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma ọ bụ mee ka ha dị ọcha nanị site n’iso ha kpakọrịta. Ka o sina dị, ọ bụghị otú ahụ ma ọlị ka Chineke nke chọrọ “ofufe a na-ekewaghị ekewa” si ele ihe anya!—Deuterọnọmi 4:24, NW.
9. Olee otú Jehova si ele ndị mmehie ahụ bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha anya?
9 Kama iwere ndị a bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha ná ndị dị nsọ, Jehova na-ekwu, sị: “Ndị a bụ anwụrụ ọkụ n’imi m.” A na-ejikarị okwu Hibru maka “imi” ma ọ bụ “oghere imi” eme ihe n’ụzọ ihe atụ maka iwe. A na-ejikọtakwa anwụrụ ọkụ na iwe Jehova nke dị ọkụ. (Deuterọnọmi 29:20) Ikpere arụsị na-asọ oyi nke ndị ya dabaworo n’ime ya akpatawo iwe Jehova nke dị ọkụ.
10. Olee otú Jehova ga-esi kwụghachi ndị bi na Juda ụgwọ maka mmehie ha?
10 N’ikpe ziri ezi ya, Jehova agaghị ekwe ka ndị mmehie a ghara inweta ntaramahụhụ. Aịsaịa na-ede, sị: “Lee, ọ bụ ihe e deworo n’akwụkwọ n’ihu m: M gaghị agba nkịtị, kama M ga-akwụghachi, ee, M ga-akwụghachi n’obi ha, ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndị bụ́ nna unu n’otu, ka Jehova sịrị, bụ́ ndị sureworo ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ugwu nile, taakwa m ụta n’elu ugwu nta nile: M ga-ebukwa ụzọ tụọ ọrụ ha n’obi ha.” (Aịsaịa 65:6, 7) Site n’itinye aka n’ofufe ụgha, ndị Juu a atawo Jehova ụta. Ha emewo ka o yie ka ọ bụ na ofufe nke ezi Chineke adịghị mma karịa nke mba ndị gbara ha gburugburu. ‘N’ihi ajọ omume nile ha,’ gụnyere ikpere arụsị na ime mgbaasị, Jehova ga-akwụghachi ha ụgwọ “n’obi ha.” Ihe àmà na-egosi na okwu bụ́ ‘obi’ na-ezo aka n’ebe fụkọrọ afụkọ n’uwe elu bụ́ nke na-aghọ akpa ebe ndị na-ere ihe pụrụ ịwunye ihe a tụrụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. (Luk 6:38) Nye ndị Juu si n’ezi ofufe dapụ, ihe ọ pụtara doro anya—Jehova ga-atụ ‘nkwụghachi,’ ma ọ bụ ntaramahụhụ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nye ha. Chineke nke ikpe ziri ezi ga-enye ha ụgwọ ọrụ ha. (Abụ Ọma 79:12; Jeremaịa 32:18) Ebe Jehova na-adịghị agbanwe agbanwe, anyị pụrụ inwe obi ike na n’oge nke ya, n’otu aka ahụ, ọ ga-atụ ntaramahụhụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nye ajọ usoro ihe a.—Malakaị 3:6.
“N’ihi Ndị Ohu M”
11. Olee otú Jehova si gosi na ya ga-azọpụta ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi?
11 Jehova ọ̀ ga-emere ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’etiti ndị ya ebere? Aịsaịa na-akọwa, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, Dị ka a na-achọta mmanya vine ọhụrụ n’ụyọkọ mkpụrụ vine, e wee sị, Ebibila ya, n’ihi na ngọzi dị n’ime ya: otú a ka M ga-eme n’ihi ndị ohu m, ka M wee ghara ibibi ha nile. M ga-emekwa otu mkpụrụ ka o si na Jekọb pụta, na otu onye nnweta nke ugwu m nile ka o si na Juda pụta: ndị M họpụtaworo ewee nweta ya, ndị ohu m ga-ebikwa n’ebe ahụ.” (Aịsaịa 65:8, 9) N’iji ndị ya tụnyere ụyọkọ mkpụrụ vine, Jehova ji ihe atụ ha ga-aghọta ngwa ngwa mee ihe. Mkpụrụ vine juru eju n’ala ahụ, mmanya sikwa ná mkpụrụ vine bụ ngọzi nye ihe a kpọrọ mmadụ. (Abụ Ọma 104:15) Echiche ọ na-enye pụrụ ịbụ ụyọkọ nke ụfọdụ n’ime mkpụrụ vine ya, ọ bụghị ha nile, dị mma. Ma ọ bụ echiche dị na ya nwere ike ịbụ na otu ụyọkọ dị mma, ebe ụyọkọ ndị ọzọ bụ ndị na-achaghị acha ma ọ bụ ndị mebiri emebi. Nke ọ bụla ọ bụ, onye ọrụ ubi vine agaghị ebibi mkpụrụ vine ndị dị mma. Jehova si otú a mesie ndị ya obi ike na ya agaghị ebibi mba ahụ kpam kpam kama na ya ga-echebe ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi. O kwuru na ihe fọdụrụ nwere ihu ọma ya ga-enweta “ugwu” ya, ya bụ, Jerusalem na ala Juda, mba bụ́ ugwu ugwu nke Jehova weere dị ka nke ya.
12. Ngọzi dịgasị aṅaa na-echere ihe fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi?
12 Ngọzi dịgasị aṅaa na-echere ihe a fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi? Jehova na-akọwa, sị: “Sherọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke ìgwè ewu na atụrụ, ndagwurugwu Ekoa ga-aghọkwa ebe ìgwè ehi na-amakpu amakpu, dịịrị ndị m chọworo m.” (Aịsaịa 65:10) Ìgwè atụrụ dị oké mkpa ná ndụ ọtụtụ ndị Juu, ebe ịta nri buru ibu na-emekwa ka e nwee ọganihu n’oge udo. Jehova zoro aka na nsọtụ abụọ nke ala ahụ iji kọwaa udo na ọganihu ga-adị na ya. Ala Dị Larịị nke Sherọn, nke e ji ịma mma na imepụta nri mara dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ, n’ogologo Ụsọ Oké Osimiri Mediterranean. Ndagwurugwu Ekoa so n’ókèala ọwụwa anyanwụ nke ebe ugwu ala ahụ. (Joshua 15:7) N’oge ije biri n’ala ọzọ ahụ na-abịanụ, ebe ndị a ga-atọgbọ chakoo, tinyere akụkụ ndị ọzọ nke ala ahụ. Otú ọ dị, Jehova na-ekwe nkwa na mgbe ije biri n’ala ọzọ ahụ gasịrị, ha ga-aghọrọ ihe ahụ fọdụrụ na-alọta alọta ebe ịta nri mara mma.—Aịsaịa 35:2; Hosea 2:15.
Ịtụkwasị “Chi Isi Ọma” Obi
13, 14. Olee omume ndị na-egosi na ndị Chineke ahapụwo ya, gịnịkwa ga-eme ha n’ihi ya?
13 Amụma Aịsaịa laghachiri ugbu a n’ebe ndị ahụ hapụworo Jehova ma nọgide na-ekpere arụsị nọ. Ọ na-ekwu, sị: “Unu onwe unu ndị na-ahapụ Jehova, ndị na-echezọ ugwu nsọ m, ndị na-edoro [chi Isi Ọma, NW] tebụl n’usoro, ndị na-agbajuru [chi Akara Aka, NW] mmanya gwara ọgwa.” (Aịsaịa 65:11) Site n’ido tebụl nri na mmanya n’usoro n’ihu “chi Isi Ọma” na “chi Akara Aka,” ndị Juu a na-adaghachi azụ etinyewo aka n’omume ikpere arụsị nke mba ndị ọgọ mmụọ.b Gịnị ga-eme onye ọ bụla ji n’ihi amaghị ihe tụkwasị chi ndị a obi?
14 Jehova dọrọ ha aka ná ntị n’ezoghị ọnụ, sị: “M ga-agụkọta unu nye mma agha, unu nile ga-ehurukwa ala ka e wee gbuo unu; n’ihi na akpọrọ m unu òkù, ma unu azaghị m; ekwuru m okwu, ma unu anụghị; unu wee mee ihe jọrọ njọ n’anya m abụọ, ọ bụkwa ihe nke na-atọghị m ụtọ ka unu họpụtara.” (Aịsaịa 65:12) N’iji aha chi Akara Aka n’asụsụ Hibru e ji dee ya na mbụ eme ihe n’ụzọ ọzọ, Jehova kwuru na ndị na-efe chi ụgha a bụ ndị ‘a ga-agụkọta nye mma agha,’ ya bụ, mbibi. Jehova akpọwo ndị a òkù ugboro ugboro site n’ọnụ ndị amụma ya ka ha chegharịa, ma ha elegharawo ya anya ma jiri ikwesi olu ike kpebie ime ihe ha maara na ọ dị njọ n’anya ya. Lee nlelị ha na-elelị Chineke! Ná mmezu nke ịdọ aka ná ntị Chineke, oké ọdachi ga-adakwasị mba ahụ na 607 T.O.A. mgbe Jehova ga-ekwe ka Babilọn bibie Jerusalem na ụlọukwu ya. N’oge ahụ, “chi Isi Ọma” agaghị echebe ndị na-efe ya ofufe nọ na Juda na Jerusalem.—2 Ihe E Mere 36:17.
15. N’ụzọ dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst taa si aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ dị n’Aịsaịa 65:11, 12?
15 Taa, ezi ndị Kraịst na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ dị n’Aịsaịa 65:11, 12. Ha ekweghị ‘n’Isi Ọma,’ dị ka a ga-asị na ọ bụ ike karịrị mmadụ nke nwere ike ime ihe ọma. N’ịjụ imefusị ihe onwunwe ha n’ime ka obi jụrụ “chi Isi Ọma,” ha na-ezere ụdị ịgba chaa chaa nile. Ha kwenyere na ndị na-arara onwe ha nye chi a ga-emesịa gbara aka, n’ihi na Jehova na-agwa ndị dị otú ahụ, sị: “M ga-agụkọta unu nye mma agha.”
“Lee, Ndị Ohu M Ga-aṅụrị Ọṅụ”
16. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova ga-esi gọzie ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, ma gịnị ga-eme ndị hapụworo ya?
16 N’ịdọ ndị hapụworo Jehova aka ná ntị, amụma ahụ na-akọwa ihe dịgasị iche ga-abịakwasị ndị ji obi eziokwu na-efe Chineke na ndị ji ihu abụọ na-eme otú ahụ: “N’ihi nke a ka Onyenwe anyị Jehova ji kwuo otú a, sị, Lee, ndị ohu m ga-eri ihe, ma agụụ ga-agụ unu onwe unu: lee, ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma akpịrị ga-akpọ unu onwe unu nkụ: lee, ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ, ma ihere ga-eme unu onwe unu: lee, ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma, ma unu onwe unu ga-eti mkpu site n’ihe mgbu nke obi, unu ga-esitekwa ná ntiwa nke mmụọ unu kwasie ákwá ike.” (Aịsaịa 65:13, 14) Jehova ga-agọzi ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. Ha ga-eti mkpu site n’obi nke jupụtara n’ọṅụ. Iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ịṅụrị ọṅụ bụ okwu ndị na-egosi na Jehova ga-egbo mkpa nke ndị na-efe ya ofufe n’ụba. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, agụụ ga-agụ ndị kpebiworo ịhapụ Jehova, akpịrị ga-akpọkwa ha nkụ n’ụzọ ime mmụọ. A gaghị egbo mkpa ha. Ha ga-eti mkpu, kwasiekwa ákwá ike n’ihi ihe mgbu na ahụhụ ga-abịakwasị ha.
17. N’ihi gịnị ka ndị Chineke taa ji nwee ezi ihe mere ha ga-eji na-eti mkpu ọṅụ?
17 Ihe Jehova kwuru na-akọwa nke ọma ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ji nanị ọnụ na-ekwu na ha bụ ndị Chineke taa. Otú ọ dị, ka ọtụtụ nde ndị nọ na Krisendọm na-enwe ntiwa mmụọ, ndị na-efe Jehova ofufe na-eti mkpu ọṅụ. Ha nwekwara ezi ihe mere ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ. Ha na-eriju afọ n’ụzọ ime mmụọ. Jehova na-enye ha nri ime mmụọ n’ụba site ná mbipụta ndị dabeere na Bible nakwa mgbakọta ndị Kraịst. N’ezie, eziokwu na-ewuli elu na nkwa ndị na-akasi obi ndị dị n’Okwu Chineke na-eme ka anyị nwee ‘obi dị mma’!
18. Gịnị ga-afọdụrụ ndị hapụworo Jehova, gịnịkwa ka iji aha ha aṅụ iyi pụrụ ịpụta?
18 Jehova nọgidere na-agwa ndị hapụworo ya okwu, sị: “Unu ga-ahapụ aha unu n’azụ ịghọrọ ndị M họpụtaworo ihe ọgbụgba iyi, Onyenwe anyị Jehova ga-emekwa ka ị nwụọ; ma Ọ ga-akpọ ndị ohu Ya aha ọzọ: onye ahụ nke na-agọzi onwe ya n’ụwa ewee gọzie onwe ya n’ime Chineke nke eziokwu; onye ahụkwa nke na-aṅụ iyi n’ụwa ga-eji Chineke nke eziokwu ṅụọ; n’ihi na e chezọwo ahụhụ mbụ nile, na n’ihi na e zonahụwo ha n’anya m abụọ.” (Aịsaịa 65:15, 16) Nanị ihe ga-afọdụrụ ndị hapụworo Jehova bụ aha ha, bụ́ nke a ga-eji na-eme ihe nanị n’ịṅụ iyi, ma ọ bụ n’ọbụbụ ọnụ. Nke a pụrụ ịpụta na ndị chọrọ inwe njikọ siri ike site n’ịṅụ iyi pụrụ ikwu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ emezughị nkwa a, ka ntaramahụhụ ahụ dakwasịrị ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ dakwasị m.’ Ọ pụrụ ọbụna ịpụta na a ga-eji aha ha na-ama atụ, dị ka Sọdọm na Gọmọra, dị ka ihe atụ nke ntaramahụhụ Chineke na-enye ndị ajọ omume.
19. Olee otú a ga-esi kpọọ ndị ohu Chineke aha ọzọ, n’ihi gịnịkwa ka ha ga-eji nwee obi ike na Chineke nke na-ekwesị ntụkwasị obi? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)
19 Lee otú ihe ga-abịara ndị ohu nke Chineke ga-esi dị iche! A ga-akpọ ha aha ọzọ. Nke ahụ na-egosi ọnọdụ a gọziri agọzi na nsọpụrụ ha ga-enwe mgbe ha laghachiri n’ala nna ha. Ha agaghị achọ ngọzi site n’aka chi ụgha ọ bụla ma ọ bụ jiri arụsị ọ bụla na-adịghị ndụ ṅụọ iyi. Kama nke ahụ, mgbe ha na-agọzi onwe ha ma ọ bụ na-aṅụ iyi, ha ga-eji Chineke nke na-ekwesị ntụkwasị obi mee otú ahụ. (Aịsaịa 65:16, ihe odide ala ala peeji NW) Ndị bi n’ala ahụ ga-enwe ihe mere ha ga-eji nwee obi ike zuru ezu na Chineke, n’ihi na ọ ga-egosipụtaworị na ya na-emezu nkwa ya.c N’ịbụ ndị nọ n’udo n’ala ha, ndị Juu ga-echezọ n’oge na-adịghị anya ahụhụ mbụ ha nile.
“M Gaje Ike Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ”
20. Olee otú e si mezuo nkwa Jehova banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” na 537 T.O.A.?
20 Ugbu a Jehova nyekwuru nkọwa banyere nkwa ya nke iweghachi ihe fọdụrụ nwere nchegharị mgbe ha lọtara site na Babilọn. Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-ekwu, sị: “Lee, M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịsaịa 65:17) Nkwa mweghachi Jehova kwere aghaghị imezu, n’ihi ya, ọ na-ekwu banyere mweghachi ahụ ga-enwere ọnọdụ n’ọdịnihu dị ka a ga-asị na o meela emee. E mezuru amụma a na mbụ na 537 T.O.A. mgbe e weghachiri ndị Juu fọdụrụ na Jerusalem. Gịnị mejupụtara “eluigwe ọhụrụ” n’oge ahụ? Ọ bụ ịchịisi Zerubabel nke Onyeisi Nchụàjà Joshua kwadoro, nke hiwekwara isi na Jerusalem. Ndị Juu ahụ fọdụrụ e weghachiri eweghachi mejupụtara “ụwa ọhụrụ,” bụ́ ọha mmadụ e mere ka ha dị ọcha, ndị doro onwe ha n’okpuru ịchịisi dị otú ahụ, ndị nyekwara aka n’iguzobeghachi ofufe dị ọcha n’ala ahụ. (Ezra 5:1, 2) Ọṅụ nke mweghachi ahụ karịrị ahụhụ mbụ nile; e chetadịghị ahụhụ mbụ ndị ahụ.—Abụ Ọma 126:1, 2.
21. Olee eluigwe ọhụrụ nke malitere ịdị na 1914?
21 Otú ọ dị, cheta na Pita kwughachiri ihe e kwuru n’amụma Aịsaịa ma gosi na ọ ga-emezu n’ọdịnihu. Onyeozi ahụ dere, sị: “Dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Na 1914, eluigwe ọhụrụ ahụ a tụwara anya ya eri oge malitere ịdị. Alaeze Mesaịa ahụ a mụrụ n’afọ ahụ na-achị site n’eluigwe kpọmkwem, Jehova enyewokwa ya ikike ịchị ụwa nile. (Abụ Ọma 2:6-8) Ọchịchị Alaeze a, nke dị n’aka Kraịst na 144,000 ndị ha na ya na-achị, bụ eluigwe ọhụrụ.—Mkpughe 14:1.
22. Olee ndị ga-emejupụta ụwa ọhụrụ ahụ, oleekwa otú e si na-akwadebe ndị mmadụ ọbụna ugbu a ịghọ akụkụ bụ́ isi ná ndokwa ahụ?
22 Gịnị banyere ụwa ọhụrụ? N’ịgbaso ụkpụrụ o ji mezuo n’oge ochie, ihe ga-emejupụta ụwa ọhụrụ ahụ ga-abụ ụmụ mmadụ ndị ji obi ụtọ na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi nke ọchịchị eluigwe ọhụrụ ahụ. Ọbụna ugbu a, ọtụtụ nde ndị obi ha ziri ezi na-edo onwe ha n’okpuru ọchịchị a ma na-agbalịsi ike ịgbaso iwu ya dị ka ha dị na Bible. Ndị a si ná mba nile, asụsụ nile, agbụru nile, ha na-arụkọkwa ọrụ ọnụ n’ijere Eze Jisọs Kraịst ahụ na-achị achị ozi. (Maịka 4:1-4) Mgbe ajọ usoro ihe dị ugbu a gabigasịrị, ìgwè a ga-aghọ akụkụ bụ́ isi nke ụwa ọhụrụ ahụ nke ga-emesịa bụrụ ọha mmadụ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-atụ egwu Chineke ndị ga-eketa ógbè elu ala nke Alaeze Chineke.—Matiu 25:34.
23. Ihe ọmụma dị aṅaa ka anyị na-achọta n’akwụkwọ Mkpughe banyere “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” oleekwa otú a ga-esi mezuo amụma a?
23 Akwụkwọ Mkpughe na-akọwa ọhụụ Jọn onyeozi hụrụ banyere ụbọchị Jehova nke na-abịanụ, bụ́ mgbe a ga-ewepụ usoro ihe a. Mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-atụba Setan n’abyss. (Mkpughe 19:11–20:3) Mgbe o nyesịrị nkọwa ahụ, Jọn kwughachiri okwu amụma nke Aịsaịa, na-ede, sị: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” Amaokwu ndị na-esonụ n’ihe ndekọ banyere ọhụụ a dị ebube na-akọ banyere oge mgbe Jehova Chineke ga-agbanwe kpam kpam ọnọdụ ndị dị n’ụwa a ka ha ka mma. (Mkpughe 21:1, 3-5) N’ụzọ doro anya, nkwa Aịsaịa maka “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ga-enwe mmezu dị ebube n’ụwa ọhụrụ Chineke! N’okpuru ọchịchị eluigwe ọhụrụ ahụ, ọha mmadụ ọhụrụ ndị nọ n’ụwa ga-enweta paradaịs nke bụ́ ma nke ime mmụọ ma nke anụ ahụ. Nkwa ahụ bụ́ na “a gaghị echetakwa ihe mbụ nile [ọrịa, ahụhụ, na ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ ụmụ mmadụ na-eche ihu], ha agaghị abatakwa n’obi” na-enye nkasi obi n’ezie. Ihe ọ bụla anyị nwere ike icheta mgbe ahụ agaghị ewetara anyị oké mwute, ma ọ bụ ihe mgbu, bụ́ ndị na-enye ọtụtụ ndị nsogbu n’obi ugbu a.
24. N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji ṅụrịa ọṅụ ná mweghachi nke Jerusalem, gịnịkwa ka a na-agakwaghị anụ n’ámá obodo ahụ?
24 Amụma Aịsaịa gara n’ihu: “Ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke: n’ihi na, lee, M na-eke Jerusalem ịbụ ihe ntegharị egwu ọṅụ, ndị ya kwa, ịbụ ihe obi ụtọ. M ga-etegharịkwa egwú ọṅụ n’ahụ Jerusalem, obi ga-atọkwa m ụtọ n’ahụ ndị m: a gaghị anụkwa olu ịkwa ákwá n’ime ya ọzọ, ma ọ bụ olu iti mkpu.” (Aịsaịa 65:18, 19) Ọ bụghị nanị na ndị Juu ga-aṅụrị ọṅụ maka ịbụ ndị e weghachiri n’ala nna ha kama Chineke n’onwe ya ga-aṅụrị ọṅụ, n’ihi na ọ ga-eme ka Jerusalem maa mma—ghọghachi ebe bụ́ isi maka ezi ofufe n’ụwa. A gakwaghị anụ olu ịkwa ákwá n’ihi ọdachi, bụ́ nke a nụrụ n’ámá obodo ahụ ọtụtụ iri afọ tupu mgbe ahụ.
25, 26. (a) N’oge anyị, olee otú Jehova si mee ka Jerusalem bụrụ “ihe ntegharị egwú ọṅụ”? (b) Olee otú Jehova ga-esi jiri Jerusalem Ọhụrụ mee ihe, n’ihi gịnịkwa ka anyị pụrụ iji tegharịa egwú ọṅụ taa?
25 Taakwa, Jehova na-eme ka Jerusalem bụrụ “ihe ntegharị egwú ọṅụ.” N’ụzọ dị aṅaa? Dị ka anyị hụwororịị, eluigwe ọhụrụ ahụ nke malitere ịdị na 1914 ga-emesịa gụnye 144,000 ndị ga-eso chịa, ndị ga-ekere òkè n’ọchịchị eluigwe ahụ. A kọwara ndị a n’ụzọ amụma dị ka “Jerusalem Ọhụrụ.” (Mkpughe 21:2) Ọ bụ banyere Jerusalem Ọhụrụ ka Chineke kwuru, sị: “Lee, M na-eke Jerusalem ịbụ ihe ntegharị egwú ọṅụ.” Chineke ga-eji Jerusalem Ọhụrụ mee ihe n’ịwụkwasị ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ngọzi n’ụba. A gakwaghị anụ olu ịkwa ákwá ma ọ bụ iti mkpu n’ihi ihe mgbu, n’ihi na Jehova ga-enye anyị “ihe nile obi [anyị] na-arịọ.”—Abụ Ọma 37:3, 4.
26 N’ezie, e nwere ezi ihe ndị mere anyị ga-eji na-etegharị egwú ọṅụ taa! N’isi nso Jehova ga-edo aha ya dị ebube nsọ site n’ibibi ndị mmegide nile. (Abụ Ọma 83:17, 18) Mgbe ahụ eluigwe ọhụrụ ga-enwe ike zuru ezu. Lee ihe ndị magburu onwe ha ha bụ mere a ga-eji tegharịa egwú ọṅụ, ṅụrịakwa ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe Chineke na-eke!
Nkwa Maka Ọdịnihu Dị Nchebe
27. Olee otú Aịsaịa si kọwaa nchebe nke ndị Juu ahụ na-alọtanụ ga-enwe n’ala nna ha?
27 Ná mmezu mbụ ya, olee otú ndụ gaje ịdịrị ndị Juu ahụ na-alọta alọta n’okpuru eluigwe ọhụrụ ahụ? Jehova na-ekwu, sị: “Ọ dịghị nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu ga-esitekwa n’ebe ahụ ọzọ, ma ọ bụ agadi nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya: n’ihi na nwata ga-anwụ mgbe ọ gbara [otu narị afọ], a ga-akọchakwa onye mmehie mgbe ọ gbara [otu narị afọ].” (Aịsaịa 65:20) Lee nkọwa mara mma ọ bụ banyere nchebe nke ndị ahụ si n’ije biri n’ala ọzọ na-alọta ga-enwe n’ala nna ha e weghachiri eweghachi! N’ikpeazụ, nwa ọhụrụ nke dịrị ndụ nanị ụbọchị ole na ole agakwaghị anwụ. Agadi nke na-anọzubeghị afọ ndụ ya agaghịkwa anwụ.d Lee ka okwu Aịsaịa si bụrụ ihe na-emesi obi ike nye ndị Juu ahụ ga-alaghachi na Juda! N’ịbụ ndị nọ n’udo n’ala ha, ọ dịghị ha mkpa ichegbuwe onwe ha na ndị iro ga-atọrọ ụmụ ọhụrụ ha ma ọ bụ gbuo ndị ikom ha.
28. Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe Jehova kwuru banyere ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ n’okpuru Alaeze ya?
28 Gịnị ka ihe Jehova kwuru na-eme ka anyị mata banyere ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ? N’okpuru Alaeze Chineke, ụmụaka nile ga-enwe ohere nke inwe ọdịnihu dị nchebe. Ọ dịghị mgbe onye na-atụ egwu Chineke ga-anwụ n’uju ndụ ya. Kama nke ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-anọ n’udo, ná nchebe, nwee ike ịnụ ụtọ ndụ. Gịnị banyere ndị ọ bụla kpebiri inupụrụ Chineke isi? Ihe ùgwù nke ịdị ndụ ga-efunahụ ndị dị otú ahụ. Ọ bụrụgodị na onye mmehie ahụ na-enupụ isi dị “otu narị afọ,” ọ ga-anwụ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ ga-abụ “nwata” ma e jiri ya tụnyere ihe ọ gaara aghọ—onye na-adị ndụ agwụghị agwụ.
29. (a) Ọṅụ dị aṅaa ka ndị Chineke na-erube isi ga-enwe n’ala Juda e weghachiri eweghachi? (b) N’ihi gịnị ka osisi ji bụrụ ihe atụ dabara adaba nke ịdị ogologo ndụ? (Lee ihe odide ala ala peeji.)
29 Jehova gara n’ihu ná nkọwa ya banyere ọnọdụ ndị ga-adị n’ala Juda ahụ e weghachiri eweghachi, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.” (Aịsaịa 65:21, 22) Mgbe ha laghachiri n’ala Juda ahụ tọgbọrọ chakoo, nke obi abụọ na-adịghị na ya na ụlọ na ubi vine adịghị n’ime ya, ndị Chineke na-erube isi ga-enwe ọṅụ nke ibi n’ụlọ nke ha na iri mkpụrụ sitere n’ubi vine ha. Chineke ga-agọzi ọrụ ha, ha ga-adịkwa ogologo ndụ—dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị—nke ha ga-anụ ụtọ ihe ndị sitere ná mgbalị ha n’ime ya.e
30. Olee ọnọdụ na-enye obi ụtọ ndị ohu Jehova na-anụ ụtọ ya taa, gịnịkwa ka ha ga-anụ ụtọ ya n’ime ụwa ọhụrụ?
30 N’oge anyị, amụma a emezuwo. Ndị Jehova si n’ije biri n’ala ọzo n’ụzọ ime mmụọ lọta na 1919 ma malite iwughachi “ala” ha, ma ọ bụ ógbè ịrụ ọrụ na ife ofufe ha. Ha guzobere ọgbakọ dị iche iche ma mịa mkpụrụ ime mmụọ. N’ihi ya, ọbụna ugbu a, ndị Jehova na-anụ ụtọ paradaịs ime mmụọ nakwa udo nke sitere n’aka Chineke. Anyị pụrụ ijide n’aka na udo dị otú ahụ ga-adịgide baa na Paradaịs nkịtị. Anyị apụghịdị ichetụ n’echiche ihe Jehova ga-arụzu n’ime ụwa ọhụrụ ahụ site n’aka ndị na-efe ya ofufe ndị dị njikere ka e jiri ha mee ihe. Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụ ịrụ ụlọ nke gị, birikwa n’ime ya! N’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ, ọrụ na-eweta afọ ojuju agaghị adị ụkọ. Lee ihe na-enye afọ ojuju ọ ga-abụ mgbe nile ‘ịhụ ezi ihe’ n’ihi ndọgbu ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ! (Eklisiastis 3:13) Ànyị ga-enwe oge ga-ezunụ iji nụ ụtọ ihe aka anyị rụpụtara n’ụzọ zuru ezu? Ee, anyị ga-enwe! Ndụ na-enweghị ọgwụgwụ nke ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-enwe ga-adị ka “ụbọchị nile nke osisi”—ọtụtụ puku afọ, tụkwasịkwa ihe n’elu ya!
31, 32. (a) Ngọzi dịgasị aṅaa ka ndị ahụ si ala ọzọ na-alọta ga-enweta? (b) N’ime ụwa ọhụrụ, ohere dị aṅaa ka ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-enwe?
31 Jehova na-akọwa ngọzi ndị ọzọ na-echere ndị ahụ si n’ije biri n’ala ọzọ na-alọta: “Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri: n’ihi na mkpụrụ nke ndị Jehova gọziworo ka ha bụ, ha na ụmụ ga-esi n’ahụ ha pụta.” (Aịsaịa 65:23) Jehova ga-agọzi ndị Juu ahụ e weghachiri eweghachi, n’ihi ya, ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu. Ndị nne na nna agaghị amụ ụmụ nanị ka ha nwụchuo ọnwụ. Ọ bụghị nanị ndị ahụ bibu n’ala ọzọ ga-enweta ngọzi nke mweghachi ahụ; ụmụ ha ga-eso ha nweta ya. Chineke chọsiri ike igbo mkpa nke ndị ya nke na ọ na-ekwe nkwa, sị: “Ọ ga-erukwa na, tupu ha akpọọ, Mụ onwe m ga-aza; mgbe ha onwe ha nọ na-ekwu okwu, Mụ onwe m ga-anụ.”—Aịsaịa 65:24.
32 Olee otú Jehova ga-esi mezuo nkwa ndị a n’ime ụwa ọhụrụ na-abịanụ? Anyị aghaghị ichere hụ ya. Jehova akọwachaghị ihe nile, ma anyị pụrụ ijide n’aka na ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi agakwaghị “adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu” ma ọlị. Oké ìgwè mmadụ ahụ lanarịrị Amagedọn na ụmụ ọ bụla ha pụrụ ịmụ ga-enwe ohere nke ịdị nnọọ ogologo ndụ, nke na-eju afọ—ndụ ebighị ebi! Ndị a kpọlitere n’ọnwụ, ndị kpebikwara ịdị ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke ga-enwekwa ọṅụ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Jehova ga-ege ha ntị ma gbooro ha mkpa ha, ọbụna buru ụzọ mara ha. N’ezie, Jehova ga-asaghe aka ya werekwa ihe kwesịrị ekwesị “dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ” mee ka afọ ju ya.—Abụ Ọma 145:16.
33. Mgbe ndị Juu laghachiri n’ala nna ha, n’echiche dị aṅaa ka ụmụ anụmanụ ga-anọ n’udo?
33 Olee otú udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ahụ e kwere ná nkwa ga-aharu? Jehova mechiri akụkụ a nke amụma ahụ, na-asị: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-atakọ nri n’otu, ọdụm ga-atakwa ahịhịa dị ka ehi: ma agwọ, ájá ga-abụ nri ya. Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile, ka Jehova sịrị.” (Aịsaịa 65:25) Mgbe ndị Juu fọdụrụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi laghachiri n’ala nna ha, Jehova ga na-elekọta ha. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka ehi, n’ihi na ọdụm agaghị emerụ ndị Juu ma ọ bụ anụ ụlọ ha ahụ. Nkwa a bụ nke e ji n’aka n’ihi na o ji okwu bụ́ “ka Jehova sịrị,” mechie. Ihe o kwuru na-emezukwa mgbe nile!—Aịsaịa 55:10, 11.
34. Olee mmezu na-akpali akpali nke okwu Jehova na-enwe taa nakwa nke ọ ga-enwe n’ime ụwa ọhụrụ?
34 Ihe Jehova kwuru na-enwe mmezu na-akpali akpali n’etiti ndị na-efe ezi ofufe taa. Kemgbe 1919, Chineke agọziwo ala ime mmụọ nke ndị ya, mee ka ọ ghọọ paradaịs ime mmụọ. Ndị na-abata na paradaịs ime mmụọ a na-eme mgbanwe ndị dị ịrịba ama ná ndụ ha. (Ndị Efesọs 4:22-24) Site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ụmụ mmadụ ndị nweburu àgwà yiri nke anụ ọhịa—ma eleghị anya, ndị rigbuworo ma ọ bụkwanụ gwuo mmadụ ibe ha wayo—na-aga n’ihu n’ịkwụsị àgwà ndị na-adịghị mma. N’ihi ya, ha so ndị kwere ekwe ibe ha na-adị n’udo ma na-efekọ ofufe ọnụ. Ngọzi ndị Jehova na-enwe ugbu a na paradaịs ime mmụọ ha ga-adịrị banye n’ime Paradaịs nkịtị, bụ́ ebe ụmụ mmadụ ga-adị n’udo n’etiti onwe ha dịkwa ka ọ ga-adị n’etiti ha na ụmụ anụmanụ. Anyị pụrụ ijide n’aka na n’oge nke Chineke, a ga-arụzu ọrụ mbụ o nyere ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị: “Buda [ụwa] n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.”—Jenesis 1:28.
35. Gịnị mere anyị ji nwee ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji ‘tegharịa egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi’?
35 Lee ekele anyị nwere maka nkwa Jehova kwere ike “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ”! Nkwa ahụ mezuru na 537 T.O.A., ọ na-enwekwa mmezu ọzọ taa. Mmezu abụọ a na-ezo aka n’ọdịnihu dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Jehova ejiriwo obiọma mee ka anyị hụperetụ site n’amụma Aịsaịa ihe ọ kwadebewooro ndị hụrụ ya n’anya. N’ezie, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji ṅaa ntị n’okwu Jehova bụ́: “Tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke”!—Aịsaịa 65:18.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọtụtụ ndị na-eche na ndị mmehie a nọ n’ebe ndị a na-eli ozu na-anwa iso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu. A pụrụ ijikọta oriri ha na-eri anụ ezì na ikpere arụsị.
b Ka ọ na-ekwu okwu banyere amaokwu a, Jerome, bụ́ onye nsụgharị Bible (nke a mụrụ na narị afọ nke anọ O.A.) kọrọ banyere omenala oge ochie nke ndị na-ekpere arụsị n’ụbọchị ikpeazụ nke ọnwa ikpeazụ n’afọ ha. O dere, sị: “Ha na-edebe tebụl nke a dọkwasịrị ụdị nri dị iche iche na mmanya a gwakọtara ya na mmanya dị ụtọ, n’elu ya, iji jide n’aka na ha ga-enweta ihe ndabara ọma n’ọmụmụ nke afọ gara aga ma ọ bụ nke afọ na-abịanụ.”
c Dị ka Aịsaịa 65:16 si kwuo n’ihe odide Hibru nke ndị Masorete, Jehova bụ “Chineke Amen.” “Amen” pụtara “ka ọ dị otú ahụ,” ma ọ bụ “kpọmkwem,” ọ bụkwa nkwado ma ọ bụ mmesi obi ike na ihe bụ eziokwu ma ọ bụ na ọ ghaghị ime. Site n’imezu ihe nile o kwere ná nkwa, Jehova na-egosi na ihe o kwuru bụ eziokwu.
d The Jerusalem Bible sụgharịrị Aịsaịa 65:20 ịgụ, sị: “A gakwaghị ahụ nwa ọhụrụ dịrị ndụ nanị ụbọchị ole na ole, ma ọ bụ agadi nwoke nke na-anọzughị afọ ndụ ya.”
e Osisi bụ ihe atụ dabara adaba nke ịdị ogologo ndụ n’ihi na ha so n’ihe ndị dị ndụ a maara kasị anọte aka. Dị ka ihe atụ, osisi olive na-amị mkpụrụ ruo ọtụtụ narị afọ, ha pụkwara ịdị ndụ ruo ọtụtụ puku afọ.
[Foto dị na peeji nke 389]
N’ụwa ọhụrụ Chineke, anyị ga-enwe oge ga-ezunụ iji nụ ụtọ ihe aka anyị rụpụtara