Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be p. 71-p. 73 para. 3
  • Iji Akwụkwọ Ozi Na-ezirịta Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Akwụkwọ Ozi Na-ezirịta Ozi
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Akwụkwọ Ozi Na-agba Àmà
  • Okwu Dị Mkpirikpi Banyere Otú Ọ Ga-adị
  • Olu Okwu nke Kwesịrị Ekwesị
  • Akwụkwọ Ozi Ị Ga-elere Anya Dee nke Gị
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—Otú E Si Ede Akwụkwọ Ozi Dị Mma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2002
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be p. 71-p. 73 para. 3

Iji Akwụkwọ Ozi Na-ezirịta Ozi

AKWỤKWỌ ozi emewo ka ndụ na akparamàgwà nke ọtụtụ nde mmadụ ka mma. Ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụ akwụkwọ ozi na mbụ. Anyị onwe anyị taa pụrụ ide akwụkwọ ozi iji wulie ndị ọhụrụ kwere ekwe elu, iji soro ndị enyi anyị na-ezirịta ozi, iji gbaa ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị nwetara ibu ọrụ ndị pụrụ iche ume, iji wusie ndị na-eche ihe isi ike dị iche iche ihu ike, ma gbasaa ihe ọmụma dị mkpa iji hụ maka ihe omume ọgbakọ.—1 Tesa. 1:1-7; 5:27; 2 Pita 3:1, 2.

Ide akwụkwọ ozi bụkwa ụzọ dị irè nke isi gbaa àmà. N’ebe ụfọdụ, a pụrụ inwe ụlọ na ebe obibi ndị anyị na-apụghị ịbanye otú o si masị anyị gaa gbaa àmà. Ụfọdụ adịghị anọ n’ụlọ ọtụtụ mgbe, ya mere anyị anaghị ahụ ha mgbe anyị na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ndị ọzọ bi n’ebe dịpụrụ adịpụ.

Ọrịa, ọnọdụ ihu igwe na-adịghị mma, ma ọ bụ iwu onye apụla èzí pụrụ ime mgbe ụfọdụ ka ị ghara inwe ike isi n’ụlọ gị pụọ. Ì nwere ike ide akwụkwọ ozi iji gbakwuoro onye ikwu gị ma ọ bụ onye ị gwara okwu na mberede, àmà? Otu n’ime ndị ị na-amụrụ Bible ọ̀ kwagawo ebe ọzọ? Akwụkwọ ozi i dere nwere ike ịbụ nanị ihe dị ya mkpa iji mee ka mmasị o nwere n’ihe ime mmụọ dịgide. Ma ọ bụ ikekwe gị na ndị lụrụ di na nwunye na nso nso a, ndị mụrụ nwa mbụ ha, ma ọ bụ ndị onye ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ pụrụ ịtụlerịta ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ ndị kwesịrị ekwesị.

Iji Akwụkwọ Ozi Na-agba Àmà

Mgbe ị na-ede akwụkwọ ozi iji gbaara onye ị na-ezutetụbeghị àmà, buru ụzọ kọwaa onye ị bụ. I nwere ike ịkọwa na ị na-ekere òkè n’ọrụ afọ ofufo a na-arụ ná mba nile. Ọ bụrụ na o yie ihe kwesịrị ekwesị ime otú ahụ, kwuo na ị bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mee ka onye ahụ mara ihe mere i ji ede akwụkwọ ozi kama ịga leta ya n’onwe gị. Dee ya ka à ga-asị na ị na-agwa ya okwu ihu na ihu. Ma, n’ikwekọ ná ntụziaka ahụ bụ́ “gosipụtanụ na unu bụ ndị dị akọ dị ka agwọ ma bụrụkwa ndị aka ha dị ọcha dị ka nduru,” chesie echiche ike banyere otú ihe ị ga-ekpughere ya banyere onwe gị ga-aha.—Mat. 10:16.

Denye n’akwụkwọ ozi ahụ ihe ị gaara agwa onye ahụ ma a sị na ị gara ileta ya. I nwere ike ime ka okwu mmeghe gị kwekọọ ná ndị dị n’akwụkwọ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible ma ọ bụ i jiri ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke sitere ná mbipụta ọhụrụ nke Ozi Alaeze Anyị mee ihe. I nwere ike ịjụ otu ajụjụ ma gbaa onye ahụ ume ka o chebara ya echiche. Nanị ihe ndị nkwusa ụfọdụ na-eme bụ ịkọwa na anyị nwere usoro ihe omume maka ịza ajụjụ dị iche iche dabeere na Bible n’efu, mgbe ahụkwa zoo aka n’ụfọdụ n’ime isiokwu nke isiakwụkwọ ndị dị n’otu n’ime ihe ndị anyị ji amụ ihe. Na peeji nke 73, e nwere akwụkwọ ozi ihe nlereanya e dere iji gbaa àmà. Ị pụrụ isi na ya mụta ihe ụfọdụ, ma ọ dị mma ka ị na-agbanwe ihe e dere na ya. Ma ọ́ bụghị ya, ka oge na-aga, ndị mmadụ pụrụ ịdị na-enweta otu akwụkwọ ozi ahụ ugboro ugboro.

Ụfọdụ ndị adịghị enwe mmasị ịgụ akwụkwọ ozi dị ogologo nke ọ bụ onye ha na-amabughị dere. Ya mere ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ime ka akwụkwọ ozi gị dị nkenke. Mechie akwụkwọ ozi gị tupu ike ịgụ ya agwụ onye ị na-edegara ya. Ọ ga-ekwesị ekwesị itinye n’ime ya mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ị pụrụ itinye otu traktị, broshuọ, ma ọ bụ otu mbipụta Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! n’ime ya ma kọwaa na ọ pụrụ ịdị na-enweta ha mgbe mgbe ma ọ chọọ. Ma ọ bụ ị pụrụ ịjụ onye a na-edegara ya ma à pụrụ ịbịa leta ya n’ụlọ ya iji soro ya kwurịtakwuo okwu n’isiokwu ahụ unu tụlere.

Okwu Dị Mkpirikpi Banyere Otú Ọ Ga-adị

Igbe dị na peeji nke 73

Ugbu a lee anya n’akwụkwọ ozi ihe nlereanya ahụ. Rịba ihe ndị na-esonụ ama: (1) Ọ dị mma n’anya, e dekọjughị ihe na ya n’ụzọ na-adịghị mma n’anya. (2) Ọ bụrụgodị na a makwaghị ebe e debere envelopu e ji zite ya, onye e degaara akwụkwọ ozi ahụ ka ga-enwe aha onye zitere ya na adres o ji anata ozi site na post ọfịs. (3) E kwupụtara nzube nke akwụkwọ ozi ahụ n’ụzọ dị mfe nakwa n’ụzọ doro anya na paragraf nke mbụ. (4) E lebara echiche nke ọ bụla bụ́ isi anya na paragraf dị iche. (5) N’ihi nzube e ji dee ya, akwụkwọ ozi ahụ eyichaghị nke e degaara onye mmadụ maara nke ọma, o yichaghịkwa nke e degaara onye mmadụ na-amaghị ma ọlị.

N’akwụkwọ ozi na-abụghị nke enyi na-edegara enyi ya, dị ka nke odeakwụkwọ ọgbakọ nwere ike izigara alaka ụlọ ọrụ, a na-edenye aha ọgbakọ, denyekwa aha odeakwụkwọ, adres o ji anata ozi site na post ọfịs, na akara ụbọchị. A ga-edekwa aha na adres nke onye ma ọ bu òtù a na-ezigara akwụkwọ ozi ahụ. Ekele kwesịrị ekwesị na-esochi nke a. Iji mechie akwụkwọ ozi ahụ, a na-ede n’asụsụ ụfọdụ okwu dị ka “Abụ m” ma ọ bụ “Ọ bụ m” n’akụkụ ebe a na-abịanye aka. A ga-eji aka nkịtị bịanye aka na ya.

N’akwụkwọ ozi ọ bụla, lezie anya maka nsụpe okwu ziri ezi, ụtọ asụsụ, akara edemede, nakwa ịdị mma n’anya. Ime nke ahụ ga-eme ka akwụkwọ ozi gị na ozi dị n’ime ya nwee ùgwù.

N’azụ envelopu, na-edenye mgbe nile adres a ga-eji zighachitere gị ozi—ọ ka mma ma ọ bụrụ adres i ji anata ozi site na post ọfịs. Ọ bụrụ na i chee na ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya inye ndị ị na-amabughị adres gị mgbe i ji akwụkwọ ozi na-agba àmà, jụọ ndị okenye ma hà ga-ekwe ka i jiri adres e ji ezite ozi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze unu mee ihe. A gaghị eji adres Watch Tower Society mee nke a ma ọlị, ebe ọ bụ na nke a ga-egosi n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị na e si n’ọfịs Society zipụ akwụkwọ ozi gị, ọ ga-akpatakwa mgbagwoju anya. Ọ bụrụ na i tinye akwụkwọ n’ime ya ma i deghị adres i ji anata ozi site na post ọfịs, nke a pụkwara ime ka e chee n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ bụ Society zitere ya.

Hụ na ị mapanyere stamp ego ole kwesịrị ekwesị, karịsịa ma ọ bụrụ na i tinyere akwụkwọ n’ime ya. Ọ bụrụ na stamp erughị ihe a chọrọ, a pụrụ ịgwa onye ga-anata ya ka ọ kwụọ ego fọdụrụnụ, nke a ga-ewedakwa ozi gị ala. Cheta na n’ọtụtụ mba, mgbe e tinyere broshuọ ma ọ bụ magazin n’akwụkwọ ozi, ego e ji ezipụ ya site na post ọfịs na-akarị nke e ji ezipụ akwụkwọ ozi nkịtị.

Olu Okwu nke Kwesịrị Ekwesị

Ozugbo i desịrị akwụkwọ ozi gị, gụọ ya iji tụlee ihe i dere. Olee otú o si ada? Ọ̀ na-ada ka ihe enyi na-edegara enyi ya nakwa nke e ji akọ dee? Ịhụnanya na obiọma so n’àgwà ndị anyị na-agbalị igosipụta mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe. (Gal. 5:22, 23) Ọ bụrụ na ị chọpụta na otú i si kwuo okwu na ya adịghị mma ma ọ bụ na ọ na-egositụ enweghị nchekwube, dezigharịa okwu gị.

Akwụkwọ ozi pụrụ ịgaru ebe ị na-apụghị ịgaru. Nanị eziokwu nke a na-eme ka ọ bụrụ ngwá ọrụ dị mkpa n’ozi anyị. Ebe ọ bụ na akwụkwọ ozi gị na-anọchite anya gị nakwa ihe ndị i kwenyere na ha, chebara ihe ọ na-ekwu, otú ọ dị n’ile anya, na otú o si ada echiche. Ọ pụrụ ịbụ nanị ihe dị mkpa iji mee ka mmadụ malite, wusie ya ike ma ọ bụ gbaa ya ume ịga ije n’ụzọ na-eduga ná ndụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya