IHE ỌMỤMỤ NKE 10
Ịnụ Ọkụ n’Obi
ỊNỤ ọkụ n’obi na-eme ka okwu kpoo ọkụ. Ọ bụ ezie na ihe ọmụma nwere ihe mmụta dị mkpa, ọ bụ ikwu okwu n’ụzọ na-ekpo ọkụ, n’ịnụ ọkụ n’obi ga-enye aka dọta mmasị nke ndị na-ege ntị. N’agbanyeghị ụdị ebe ị nọ too ma ọ bụ ụdị onye ị bụ, ị pụrụ ịzụlite ịnụ ọkụ n’obi.
Jiri Mmetụta Kwuo Okwu. Mgbe ọ na-agwa nwanyị Sameria okwu, Jizọs sịrị na ndị na-efe Jehova ofufe aghaghị ife ya “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Ọ ghaghị ịbụ obi ekele na-akpali ofufe ha na-efe, bụrụkwa nke kwekọrọ n’eziokwu nke dị n’Okwu Chineke. Mgbe mmadụ nwere ekele miri emi otú ahụ, ọ ga-apụta ìhè n’otú o si ekwu okwu. Ọ ga-adị ya ọkụ n’obi ịgwa ndị ọzọ banyere ndokwa ịhụnanya nke Jehova. Ọdịdị ihu ya, mmegharị ahụ́ ya, na olu okwu ya ga-egosipụta otú ọ dị ya n’obi n’ezie.
Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere na ọkà okwu hụrụ Jehova n’anya, nke kwenyekwara n’ihe ọ na-ekwu, nwere ike ọ gaghị enwe ịnụ ọkụ n’obi mgbe ọ na-ekwu okwu? Nanị ịkwadebe ihe ọ gaje ikwu ezughị. Obi ya dum aghaghị ịdị n’okwu ya, ọ ghaghị imetụta mmetụta uche ya. Ka e were ya na e kenyere ya ikwu okwu banyere àjà mgbapụta Jizọs Kraịst. Mgbe ọkà okwu ahụ na-ekwu okwu ya, obi ya aghaghị ijupụta, ọ bụghị nanị ná nkọwa ndị ọ na-enye, kama n’ekele maka ihe àjà Jizọs pụtara nye ma ya onwe ya ma ndị na-ege ya ntị. Ọ dị ya mkpa icheta ekele o nwere n’ebe Jehova Chineke na Jizọs Kraịst nọ maka ndokwa a dị ebube. Ọ dị ya mkpa iche echiche banyere olileanya dị ebube nke ịdị ndụ nke ọ na-emeghere ihe a kpọrọ mmadụ—obi ụtọ ebighị ebi n’ahụ́ ike zuru okè n’ime paradaịs elu ụwa e weghachiri eweghachi! Ya mere, ọ dị ya mkpa ịhụ na obi ya dị na ya.
Banyere odeakwụkwọ bụ́ Ezra, bụ́ onye ozizi n’Izrel, Bible na-ekwu na o “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya, na izi ụkpụrụ Ya na ikpe Ya n’Izrel.” (Ezra 7:10) Ọ bụrụ na anyị mee otú ihe ahụ—na-akwadebe, ọ bụghị nanị ihe omume kamakwa obi anyị—anyị ga-ekwu okwu site n’obi. Ikwu okwu nke eziokwu dị otú ahụ nke sitere n’obi pụrụ inyere ndị anyị na-agwa okwu aka nke ukwuu inwe ezi ịhụnanya maka eziokwu ahụ.
Chee Echiche Banyere Ndị Na-ege Gị Ntị. Ihe ọzọ dị mkpa n’igosipụta ịnụ ọkụ n’obi bụ ikwenyesi ike na ọ dị ndị na-ege gị ntị mkpa ịnụ ihe ị chọrọ ikwu. Nke a pụtara na mgbe ị na-akwadebe okwu gị, i kwesịrị ọ bụghị nanị iwekọta ihe ọmụma bara uru kamakwa ikpegara Jehova ekpere maka nduzi ya n’iji ya mee ihe n’ụzọ ga-abara ndị ị gaje ịgwa okwu uru. (Ọma 32:8; Mat. 7:7, 8) Tụlee ihe mere o ji dị mkpa ka ndị ga-ege gị ntị nụrụ ihe ọmụma ahụ, otú ọ ga-esi baara ha uru, na otú ị pụrụ isi kwuo ya n’ụzọ ga-eme ka ha ghọta uru ọ bara.
Nọgide na-akwadebe ihe omume gị ruo mgbe i nwetara ihe na-akpali gị akpali. Ọ bụghị iwu na ọ ga-abụ ihe ọhụrụ, ma otú ị ga-esi kwuo okwu n’isiokwu ahụ pụrụ ịdị ọhụrụ. Ọ bụrụ na ị kwadebe ihe ga-enyere ndị ga-ege gị ntị aka n’ezie iwusi mmekọrịta ha na Jehova ike, inwe ekele maka ndokwa ya, ịnagide nrụgide nke ndụ n’ime usoro ihe ochie a, ma ọ bụ ịdị irè n’ozi ha, mgbe ahụ i nwere ezi ihe mere ị ga-eji nwee ịnụ ọkụ n’obi banyere okwu gị.
Gịnị ma ọ bụrụ na ihe omume gị bụ ịgụpụta ihe n’ihu ọha? Iji jiri ịnụ ọkụ n’obi gụọ ya, a chọrọ ihe karịrị ịkpọpụta okwu ndị dị na ya otú kwesịrị ekwesị na ijikọta ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Mụọ ihe ọgụgụ ahụ. Ọ bụrụ na ị gaje ịgụpụta otu akụkụ na Bible, mee nnyocha na ya. Jide n’aka na ị ghọtara ihe bụ́ isi ọ pụtara. Tụlee otú o si baara gị na ndị ga-ege gị ntị uru, jirikwa ọchịchọ nke ime ka ndị na-ege gị ntị hụ uru ndị ahụ gụọ ya.
Ị̀ na-akwadebe maka ozi ubi? Tụleghachi isiokwu ị ga-eji nwee nkwurịta okwu na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị na-eme atụmatụ iji mee ihe. Tụleekwa ihe ndị mmadụ na-eche. Gịnị ka a na-akọ n’akụkọ? Nsogbu dịgasị aṅaa ka ha na-ezute? Mgbe ị dị njikere igosi ndị mmadụ na Okwu Chineke nwere ihe ndị ga-agwọta nsogbu ndị na-echegbu ha kpọmkwem, ọ ga-adị gị ọkụ n’obi ime otú ahụ, ịnụ ọkụ n’obi na-abịakwara onwe ya.
Gosi Ịnụ Ọkụ n’Obi Site n’Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-ekpo Ọkụ. A na-egosipụtakarịsị ịnụ ọkụ n’obi n’ụzọ doro anya site n’ikwu okwu gị n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Nke a kwesịkwara ịpụta ìhè n’ọdịdị ihu gị. Okwu gị aghaghị igosi na i kwenyere n’ihe ị na-ekwu ọ bụghị ikwesi olu ike.
A chọrọ imeru ihe n’ókè. Ndị ụfọdụ pụrụ ịdị na-enwe mkpali n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ihe nile. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka e nyere ha aka ịghọta na mgbe mmadụ na-eji okwu ndị na-ada oké ụda eme ihe ma ọ bụ na-egosi mmetụta uche gabigara ókè, ndị na-ege ya ntị ga na-eche echiche banyere ya kama iche echiche banyere ihe ọ na-ekwu. N’aka nke ọzọ, ọ dị mkpa ka a gbaa ndị na-eme ihere ume ịdị na-ekwupụta okwu karị.
Ịnụ ọkụ n’obi na-efe efe. Ọ bụrụ na ị na-ele ndị na-ege ntị anya nke ọma, ọ bụrụkwa na i nwere ịnụ ọkụ n’obi banyere okwu gị, ịnụ ọkụ n’obi ahụ ga-efere ndị na-ege gị ntị. Apọlọs gosiri ikpo ọkụ n’okwu ya, a kọwakwara ya dị ka onye ọkà okwu. Ọ bụrụ na ị na-anụ ọkụ na mmụọ Chineke, okwu i ji ikpo ọkụ na-ekwu ga-akpali ndị na-ege gị ntị ime ihe.—Ọrụ 18:24, 25; Rom 12:11.
Ịnụ Ọkụ n’Obi Kwesịrị Ihe A Na-ekwu. Lezie anya ka ị ghara inwe ịnụ ọkụ n’obi gabigara ókè n’okwu gị dum nke na ike ga-agwụ ndị na-ege gị ntị. Agbamume ọ bụla ị na-enye ka e jiri ihe ị na-ekwu mee ihe ga-abanye n’otu ntị wee si na nke ọzọ pụọ. Nke a na-emesi ike mkpa ọ dị ịkwadebe ihe ọmụma nke ga-enye ohere ịdị na-eme mgbanwe n’ụzọ i si na-ekwu okwu gị. Gbalịa ka ị ghara ikwu okwu n’ụzọ ga-enye echiche na ị chọghị ịma. Ọ bụrụ na i jiri nlezianya họrọ ihe ị ga-ekwu, ị ga-enwe ezigbo mmasị na ya. Ma isi ihe ụfọdụ, n’ihi otú ha dị, na-achọ ka e jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo ha karịa ndị ọzọ, e kwesịkwara iji nkà webata ha n’okwu gị dum.
Karịsịa, e kwesiri iji ịnụ ọkụ n’obi kwuo ihe ndị bụ́ isi ihe. Okwu gị aghaghị inwe ihe ndị bụ́ isi, ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ị ga-ewukwasị ihe ndị ọzọ na ha. Ebe ha bụ isi ihe ndị dị n’okwu gị, ha ga-abụkarị isi ihe ndị a chọrọ ka ha kwalie ndị na-ege gị ntị. Ebe i meworo ka ndị na-ege gị ntị kwere, ọ dị mkpa ka ị kpalie ha, gosi ha uru ọ bara itinye ihe ndị a tụleworo n’ọrụ. Ịnụ ọkụ n’obi gị ga-enyere gị aka iru n’obi ndị na-ege gị ntị. A naghị eji ike eme ka okwu kpoo ọkụ. E kwesiri inwe ihe kpatara ya, ọ bụkwa ihe ị ga-ekwu ga-eme ka i nwee ihe ahụ ga-akpata ya.