IHE ỌMỤMỤ NKE 17
Iji Ígwè Okwu Eme Ihe
ỤMỤNNA anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst na-etinye oge na mgbalị dị ukwuu n’ịbịa nzukọ Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na ha ga-erite uru n’ihe a na-ekwu, ha aghaghị inwe ike ịnụ ya nke ọma.
N’oge Izrel oge ochie, e nweghị ígwè okwu na-eji ike eletrik eme ihe nke na-eme ka ụda dasịkwuo ike. Mgbe Mozis gwara mba Izrel okwu n’Ala Dị Larịị nke Moab tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, olee otú ndị nile na-ege ya ntị, ndị dị ọtụtụ nde n’ọnụ ọgụgụ si nwee ike ịnụ ihe ọ na-ekwu? Ma eleghị anya Mozis jiri usoro nke otu onye ikwughachiri ndị ọzọ ihe o kwuru mee ihe, bụ́ nke ndị ikom guzogasị n’ebe ndị kwesịrị ekwesị n’ọmụma ụlọikwuu ahụ dum gbasoro n’ikwughachi ihe o kwuru. (Deut. 1:1; 31:1) N’oge na-adịghị anya mgbe ụmụ Izrel malitere imeri ala dị n’ọdịda anyanwụ nke Jọdan, Jọshụa kpọkọtara mba ahụ n’ihu Ugwu Gerizim nakwa Ugwu Ibal, dị ka ihe àmà na-egosi, ndị Livaị nọ na ndagwurugwu kewara ugwu ndị ahụ. N’ebe ahụ, ndị ahụ nile nụrụ ma zaghachi ná ngọzi na nkọcha ndị sitere n’aka Chineke, bụ́ ndị e chere n’ihu ha. (Josh. 8:33-35) Ọ pụkwara ịbụ na n’oge a kwa, e ji usoro nke otu onye ikwughachiri ndị ọzọ ihe e kwuru mee ihe, ma ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụzọ magburu onwe ya okwu si ada ụda n’ebe ahụ nyekwara aka.
Ihe dị ka afọ 1,500 ka e mesịrị, mgbe ‘ìgwè mmadụ dị nnọọ ukwuu gbakọrọ’ n’akụkụ Oké Osimiri Galili ịnụ ihe Jizọs na-ekwu, ọ banyere n’ụgbọ, bamitụkwuo n’ime mmiri, wee nọdụ ala ịgwa ìgwè mmadụ ahụ okwu. (Mak 4:1, 2) N’ihi gịnị ka Jizọs ji si n’ụgbọ mmiri kwuo okwu? Dị ka ihe àmà na-egosi, ọ bụ n’ihi na olu mmadụ na-adapụta nnọọ nke ọma n’elu mmiri dị larịị.
Ruokwa ná mmalite narị afọ nke 20, ọ bụ otú ụda olu ọkà okwu hà na otú ihe ọ na-ekwu na-adapụtaru nke ọma na-ekpebikarị mmadụ ole ná ndị na-ege ntị pụrụ ịnụ ihe e kwuru. Otú ọ dị, malite n’afọ ndị 1920, ndị ohu Jehova nwere ike ịdị na-eji ígwè okwu ndị na-eji ike eletrik eme ihe nke na-eme ka ụda olu mmadụ dasikwuo ụda ike eme ihe ná mgbakọ ha.
Ígwè Okwu. Ngwá ọrụ dị otú ahụ pụrụ ime ka ụda olu onye ọkà okwu dasikwuo ụda ike ọtụtụ okpukpu ma nọgide na-ewepụta ọdịdị ụda olu ya nke ọma. Ọ naghị adị mkpa ka ọkà okwu nye akwara ụda olu ya nsogbu. Ndị na-ege ntị agaghịkwa enye onwe ha nsogbu iji nụ ihe a na-ekwu. Kama nke ahụ, ha ga-enwe ike itinye uche n’ihe a na-ekwu.
E mewo ihe dị ukwuu iji jide n’aka na a na-enwe ezigbo ígwè okwu ná mgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Ọzọkwa, ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eji ígwè okwu eme ka ụda olu nke ndị na-ekwu okwu, ndị na-eduzi nzukọ, ma ọ bụ ndị na-agụpụta ihe n’ikpo okwu dasikwuo ike. Ọgbakọ ụfọdụ nwekwara ígwè okwu ndị ndị na-ege ntị na-eji aza ajụjụ mgbe a na-enwe nzukọ. Ọ bụrụ na ọgbakọ gị nwere ngwá ọrụ dị otú ahụ, mụta iji ha eme ihe nke ọma.
Ụkpụrụ Nduzi Ụfọdụ Bụ́ Isi. Iji jiri ngwá ọrụ ahụ mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, buru isi ihe ndị na-esonụ n’uche: (1) Dị ka ọ na-adịkarị, i kwesịrị idebe ígwè okwu ahụ n’ebe dị ihe dị ka sentimita 10 ruo 15 site n’ọnụ gị. Ọ bụrụ na ígwè okwu dị gị nso gabiga ókè, e nwere ike ihe ị na-ekwu agaghị edocha anya. Ọ bụrụ na ọ dị gị anya gabiga ókè, ụda olu gị agaghị na-adapụta adapụta. (2) Ígwè okwu kwesịrị ịdị gị n’ihu, ọ bụghị n’akụkụ gị. Ọ bụrụ na i welaa isi gị n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe, kwuo okwu nanị mgbe i chere ihu n’ígwè okwu ahụ. (3) Tinyetụkwuo ume na ike n’ụda olu gị karịa otú ị ga-etinye mgbe ị na-enwe mkparịta ụka. Ma ọ dịghị mkpa iti mkpu. N’ụzọ dị mfe, ígwè okwu ga-eme ka ndị na-ege gị ntị, ndị kasị nọrọ n’ebe dị anya, nụ olu gị. (4) Ọ bụrụ na ị chọọ ịkwacha akpịrị ma ọ bụ ọ bụrụ na ụkwara ma ọ bụ uzere enuo gị, jide n’aka na i wepụrụ isi gị n’ígwè okwu.
Mgbe Ị Na-ekwu Okwu. Mgbe ị rịgooro n’elu ikpo okwu, dị ka ọ na-adịkarị, a ga-enwe nwanna nwoke ga-edozigharị ígwè okwu ahụ. Guzoro otú i si eguzo, chee ndị na-ege ntị ihu ka ọ na-eme ya. Tụkwasị ihe ndị i deturu n’ebe ọkà okwu na-atụkwasị ihe ndepụta ya, jidekwa n’aka na ígwè okwu ahụ adịghị anọchi gị ihu.
Mgbe ị malitere ikwu okwu, gee ntị n’otú olu gị si ada n’ígwè okwu. Ụda olu gị ọ̀ na-adasi ụda ike gabiga ókè, ka okwu ụfọdụ hà na-eme “pù pù” n’ígwè okwu mgbe a kpọrọ ha? O nwere ike ịdị mkpa ka ị latụkwuo azụ ihe dị ka sentimita 2.5 ma ọ bụ sentimita 5. Mgbe ị na-ele anya n’ihe ndị i deturu, cheta na i kwesịrị ịdị na-ekwu okwu ma ọ bụ na-agụ ihe nanị mgbe i chere ihu n’ígwè okwu ma ọ bụ mgbe ọnụ gị dịtụ elu karịa ya, ọ bụghị mgbe ọ dị ya n’okpuru.
Mgbe Ị Nọ n’Ikpo Okwu Na-agụpụta Ihe. Ọ kasị mma iweli Bible gị ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ elu ka i wee chee ndị na-ege ntị ihu. Ebe ọ bụ na ígwè okwu ga-adị gị n’ihu kpọmkwem ma eleghị anya, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i welatụ ihe ị na-agụ n’otu akụkụ. Nke a pụtara na isi gị kwesịrị ịdịtụ n’akụkụ nke ọzọ nke ígwè okwu. Mgbe ahụzi, ka ị na-agụ ihe olu gị ga na-abanye kpọmkwem n’ígwè okwu.
Ihe ka ukwuu n’ụmụnna ndị na-agụ ihe n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-eguzo ọtọ ma na-ekwunye okwu n’ígwè okwu guzo eguzo. Ọnọdụ a na-eme ka ha nwee ike ikute ume nke ọma karị na iji mmetụta ka ukwuu na-agụ ihe. Buru n’uche na ịgụpụta paragraf ndị a na-amụ bụ akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke nzukọ ahụ. Uru ndị na-ege ntị na-erite na-adabere ruo n’ókè dị ukwuu n’ịnụ ihe ahụ a na-agụ.
Mgbe A Na-aza Ajụjụ ná Nzukọ. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-eji ígwè okwu eme ihe maka akụkụ ndị na-ege ntị na-etinye ọnụ na ya, cheta na ọ ka dịkwa mkpa ikwu okwu n’ụzọ doro anya nakwa n’olu datụrụ ụda. Mgbe ị na-aza ajụjụ, gbalịa ijide akwụkwọ a na-amụ ma ọ bụ Bible gị n’aka gị. Nke a ga-eme ka i nwee ike ịhụ akwụkwọ ahụ nke ọma ka ị na-ekwunye okwu n’ígwè okwu.
N’ọgbakọ ụfọdụ, a na-ekenye ụmụnna nwoke ọrụ iwegara ndị a kpọrọ ịza ajụjụ ígwè okwu. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ n’ọgbakọ unu, mgbe a kpọrọ gị ịza ajụjụ, ewetula aka gị ka nwanna na-ebugharị ígwè okwu nwee ike ịhụ ebe ị nọ wee bịakwute gị ngwa ngwa. Ọ bụrụ na ígwè okwu ahụ bụ ụdị a na-ejide n’aka, dị njikere ịmatị aka were ya. Amalitela ikwu okwu ruo mgbe ígwè okwu ahụ nọ ebe o kwesịrị. Mgbe i kwuchara okwu gị, nyeghachi ya ígwè okwu ahụ ozugbo.
Mgbe I So Na-Eme Ihe Ngosi. Iji ígwè okwu eme ihe n’oge a na-eme ihe ngosi na-achọ ibu ụzọ chebara ya echiche n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụrụ na ọ dị ihe a kwụnyere ígwè okwu ahụ na ya, ị ga-enwe ike iji aka gị abụọ jide Bible na ihe ndepụta gị. Iji ígwè okwu a na-ejide n’aka eme ihe pụrụ ime ka i nwee ohere imegharị ahụ́ karị, ma ọ pụrụ ịdị mkpa ka i mee ndokwa ka onye gị na ya so jide ya. N’ụzọ dị otú ahụ ị ga-enwe ike iji aka gị abụọ jide Bible gị. Gị na onye nwe ụlọ gị kwesịrị ịmụgharị nke a ka onye gị na ya ga-eso wee mara ụzọ isi jide ya nke ọma. Chetakwa na mgbe ị nọ n’elu ikpo okwu i kwesịghị ịgbakụta ndị na-ege ntị azụ, karịsịa mgbe ị na-ekwu okwu.
N’ihe ngosi Nzukọ Ije Ozi, a pụrụ inwe ọtụtụ ndị ga-eso mee ya, ha pụkwara ịdị na-agagharị agagharị n’elu ikpo okwu. N’ihi ya, a pụrụ ịchọ ọtụtụ ígwè okwu. E kwesịrị idebe ha tupu oge eruo ma ọ bụ nye ha ndị ahụ na-eme ihe omume mgbe ha rịgooro n’elu ikpo okwu. Ijide n’aka na ígwè okwu ndị ahụ dị n’ebe kwesịrị ekwesị, n’oge kwesịrị ekwesị, na-achọ ime atụmatụ tupu oge eruo. Ịmụgharị ihe ngosi tupu e mee ha na-eme ka e nwee ohere inye ndị ga-eso mee ya ntụziaka n’ụzọ isi jiri ígwè okwu mee ihe n’ụzọ dị irè. Mgbe a na-apụghị ịnọ n’ikpo okwu mụgharịa ya, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ka ndị ga-eso mee ihe ngosi ahụ jide ụmụ obere ihe hà ka ígwè okwu n’aka iji mụgharịa ijide ya nke ọma. Mgbe e mesịrị ihe ngosi, ndị so mee ya kwesịrị iji nwayọọ debe ígwè okwu ndị a na-ejide n’aka, na-elezi anya ka ha ghara ikonye ụkwụ n’eriri ígwè okwu ndị ọzọ ka ha si n’elu ikpo okwu na-apụ.
Anyị ilebara otú e si eji ígwè okwu eme ihe anya na-emetụta kpọmkwem otu n’ime ebumnobi bụ́ isi nke nzukọ anyị, ya bụ, ime ka ibe anyị rite uru site ná ntụle anyị na-atụle Okwu Chineke. (Hib. 10:24, 25) Site n’ịmụta iji ígwè okwu eme ihe nke ọma, anyị onwe anyị pụrụ ịtụnye ụtụ n’ebumnobi a dị mkpa.