Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 30 p. 186-p. 189 para. 4
  • E Gosiri Mmasị n’Ebe Onye nke Ọzọ Nọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Gosiri Mmasị n’Ebe Onye nke Ọzọ Nọ
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Isi Mee Ka Nkà Inwe Mkparịta Ụka Ka Mma
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Mgbalị Iji Ruo n’Obi
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Mee Ka Uru Ihe Ị Na-ekwu Bara Doo Anya
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Ṅomie Nnukwu Onye Na-eme Ndị Na-eso Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 30 p. 186-p. 189 para. 4

IHE ỌMỤMỤ NKE 30

E Gosiri Mmasị n’Ebe Onye nke Ọzọ Nọ

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Gosi na ihe ndị ọzọ na-eche na-emetụ gị n’ahụ́ na ị na-echekwa banyere ọdịmma ha.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Nke a bụ otu ụzọ anyị si eṅomi ịhụnanya Jehova gosiri, ọ pụkwara ime ka anyị nwee ike iru n’obi mmadụ.

MGBE anyị so ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu Bible, ọ dị anyị mkpa ime ọ bụghị nanị ka ha jiri uche ha ghọta ihe. Anyị aghaghị iru n’obi ha. Otu ụzọ isi mee nke a bụ igosi ezi mmasị onwe onye n’ebe ndị na-ege anyị ntị nọ. A pụrụ igosipụta mmasị dị otú ahụ n’ọtụtụ ụzọ.

Tụlee Ihe Ndị Na-ege Gị Ntị Na-eche. Pọl onyeozi chebaara nzụlite na ihe ndị na-ege ya ntị na-eche echiche. Ọ kọwara, sị: “N’ebe ndị Juu nọ, adịrị m ka onye Juu, ka m wee rite ndị Juu n’uru; n’ebe ndị nọ n’okpuru iwu nọ, adịrị m ka onye nọ n’okpuru iwu, ọ bụ ezie na mụ onwe m anọghị n’okpuru iwu, ka m wee rite ndị nọ n’okpuru iwu n’uru. N’ebe ndị na-enweghị iwu nọ, adịrị m ka onye na-enweghị iwu, ọ bụ ezie na abụghị m onye na-enweghị iwu n’ebe Chineke nọ kama onye nọ n’okpuru iwu n’ebe Kraịst nọ, ka m wee rite ndị na-enweghị iwu n’uru. N’ebe ndị na-adịghị ike nọ, aghọrọ m onye na-adịghị ike, ka m wee rite ndị na-adịghị ike n’uru. Aghọwo m ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị. Ma m na-eme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka m wee bụrụ onye ya na ndị ọzọ na-ekerịta ya.” (1 Kọr. 9:20-23) Olee otú anyị pụrụ isi ‘ghọọ ihe nile n’ebe ụdị mmadụ nile nọ’ taa?

Ọ bụrụ na i nwere ohere ileru ndị ọzọ anya, ọbụna ruo nwa oge, tupu gị na ha enwee nkwurịta okwu, ị pụrụ ịhụ ihe ndị ga-egosi gị ihe na-amasị ha na ọnọdụ ha. Ị̀ maara ihe ha na-arụ? Ị̀ na-ahụ ihe àmà nke nkwenkwe okpukpe ha? Ọ̀ dị ihe na-egosi ihe bụ́ ọnọdụ ezinụlọ ha? Dabere n’ihe ndị ị hụrụ, ị̀ pụrụ ịhazigharị okwu gị iji mee ka ọ bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ karị nye ndị ga-ege gị ntị?

Ime ka ihe ị na-ekwu na-adọrọ adọrọ karị na-achọ ka i buru ụzọ chee echiche otú ị ga-esi jekwuru ndị nọ n’ókèala unu. N’ebe ụfọdụ, nke a na-agụnye ndị si n’ala ọzọ kwabata. Ọ bụrụ na ndị dị otú ahụ bi n’ókèala unu, ị̀ chọpụtawo ụzọ dị irè isi gbaara ha àmà? Ebe ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu,” mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị izi ndị nile ị na-ezute ozi Alaeze ahụ n’ụzọ na-adọrọ mmasị.—1 Tim. 2:4.

Ṅaa Ntị nke Ọma. Ọ bụ ezie na Jehova maara ihe nile, ọ na-ege ndị ọzọ ntị. Maịkaịa onye amụma hụrụ ọhụụ ebe Jehova nọ na-agba ndị mmụọ ozi ume ka ha kwupụta echiche ha banyere otú a ga-esi mee ihe banyere otu okwu. Mgbe ahụ Chineke kwere ka otu n’ime ndị mmụọ ozi ahụ mee ihe mmụọ ozi ahụ n’onwe ya tụrụ aro ya. (1 Eze 22:19-22) Mgbe Ebreham kwupụtara nchegbu ọ na-enwe banyere ikpe a ga-emezu megide Sọdọm, Jehova ji obiọma ṅaa ya ntị. (Jen. 18:23-33) N’ozi anyị, olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Jehova nke ige ntị?

Gbaa ndị ọzọ ume ikwupụta uche ha. Jụọ ajụjụ kwesịrị ekwesị, nyekwa ohere ga-ezuru ha iji zaghachi. Gee ntị n’ezie. Gị iji nchebara echiche na-ege ha ntị ga-agba ha ume ikwu ihe dị ha n’obi n’enweghị ihe mgbochi. Ọ bụrụ na nzaghachi ha egosipụta ihe ndị na-amasị ha, jiri akọ jụkwuo ajụjụ. N’emeghị ka mkparịta ụka ahụ ghọọ ịgba ajụjụ ọnụ, gbalịa ịmatakwu ha nke ọma. Jaa ha mma maka echiche ha ma ọ bụrụ na ị pụrụ iji obi eziokwu mee otú ahụ. Ọ bụrụgodị na i kwenyeghị n’echiche ha, jiri obiọma nabata ihe ha kwuru.—Kọl. 4:6.

Otú ọ dị, ọ dị mkpa ka anyị kpachara anya ka mmasị anyị nwere n’ebe ndị ọzọ nọ ghara ịgafe otú o kwesịrị. Inwe nchegbu banyere ndị ọzọ enyeghị anyị ikike inyoba anya n’ihe ndị dịịrị ha. (1 Pita 4:15) Ọ dị mkpa ka anyị lezie anya ka onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị ghara ịghọtahie mmasị obiọma anyị na-egosi. Ebe ihe a na-ewere dị ka mmasị kwesịrị ekwesị n’ebe ndị ọzọ nọ na-adị iche site n’otu ala gaa n’ọzọ, ọbụna site n’otu onye gaa n’ọzọ, ezi nghọta dị mkpa.—Luk 6:31.

Ime nkwadebe bụ ihe na-enye aka n’ịbụ onye na-ege ntị nke ọma. Mgbe ozi anyị doro anyị anya, ọ na-enyere anyị aka inwe ahụ́ iru ala nakwa ịṅa ndị ọzọ ntị otú o kwesịrị. Nke a na-eme ka ahụ́ ruo ha ala, ọ pụkwara ime ka ha nwee mmasị karị iso anyị nwee mkparịta ụka.

Anyị na-asọpụrụ ndị ọzọ site n’ige ha ntị. (Rom 12:10) Ọ bụ ihe àmà na-egosi na anyị ji echiche ha na mmetụta ha kpọrọ ihe. Ọ pụrụ ọbụna ime ka ha ṅakwuo ntị n’ihe anyị ga-ekwu. Mgbe ahụ, e nwere ezi ihe mere Okwu Chineke ji na-adụ anyị ọdụ “ịdị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu.”—Jems 1:19.

Nyere Ndị Ọzọ Aka Inwe Ọganihu. Inwe nchegbu banyere ndị ọzọ ga-eme ka anyị nọgide na-eche banyere ndị gosiri mmasị na ịgaghachi na nke ha iji soro ha kerịta eziokwu Bible ndị ga-akasị gboo mkpa ha kpọmkwem. Mgbe ị na-eche echiche ịgaghachi, buru n’uche ihe ndị ị matara banyere ha ná nleta ndị mbụ. Chịkọta ihe ọmụma n’isiokwu na-echegbu ha. Mee ka uru ihe ọmụma ahụ bara pụta ìhè, na-enyere ha aka ịhụ otú ha pụrụ isi rite uru n’ihe ha na-amụta—Aịsa. 48:17.

Ọ bụrụ na onye na-ege gị ntị ekwupụta otu ọnọdụ ma ọ bụ nsogbu nke nọworo na-echegbu ya, were ya dị ka ohere pụrụ iche iji soro ya kerịta ozi ọma ahụ. Gbasoo ihe nlereanya Jizọs, bụ́ onye na-adị njikere mgbe nile ịgụgụ ndị nọ ná nsogbu. (Mak 6:31-34) Guzogide ọnwụnwa nke ikwu ihe ngwọta ya ngwa ngwa ma ọ bụ inye ndụmọdụ elu elu. Nke a pụrụ ime ka onye ahụ chee na i nweghị ezi mmasị. Kama nke ahụ, gosi mmetụta maka onye ọzọ. (1 Pita 3:8) Mgbe ahụ mee nnyocha n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible, sorokwa ya tụlee ihe ọmụma na-ewuli elu iji nyere onye ahụ aka ime ihe banyere ọnọdụ ya. N’ezie, nchegbu ịhụnanya i nwere n’ebe onye na-ege gị ntị nọ ga-eme ka ị ghara ikpughe izu nzuzo ndị ọ kọọrọ gị ọ gwụla ma e nwere ezi ihe mere ị ga-eji mee otú ahụ.—Ilu 25:9.

Anyị kwesịrị igosi mmasị onwe onye karịsịa n’ebe ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible nọ. Site n’itinye ya n’ekpere, chee echiche banyere mkpa nke onye ọ bụla a na-amụrụ ihe, burukwa mkpa ndị ahụ n’uche wee kwadebe ọmụmụ ihe ahụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ọzọ ka ọ dị mkpa ka o mee iji nọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ?’ Jiri ịhụnanya nyere onye ahụ a na-amụrụ ihe aka ịghọta ihe Bible na mbipụta dị iche iche “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta na-ekwu banyere okwu ahụ. (Mat. 24:45) N’ọnọdụ ụfọdụ, nanị inye nkọwa nwere ike ọ gaghị ezu. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka i gosi onye ahụ a na-amụrụ ihe ụzọ isi tinye otu ụkpụrụ Bible n’ọrụ, gị na ya emekọọ otu ihe ọnụ n’ezie bụ́ nke na-egosi ụzọ isi tinye ya n’ọrụ.—Jọn 13:1-15.

Inwe nguzozi na ezi uche dị mkpa mgbe a na-enyere ndị ọzọ aka ime ka ndụ ha kwekọọ n’ụkpụrụ Jehova. A zụlitere ndị mmadụ n’ọnọdụ dịgasị iche iche, ha nwekwara ikike dịgasị iche iche, ha na-enwekwa ọganihu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche. Atụla anya ihe gabigara ókè site n’aka ndị ọzọ. (Fil. 4:5) Arụgidela ha ime mgbanwe ná ndụ ha. Kwe ka Okwu Chineke na mmụọ ya kpalie ha. Jehova chọrọ ka ndị mmadụ na-ejere ya ozi site n’ọchịchọ obi ha, ọ bụghị ná mmanye. (Ọma 110:3) Zere ikwu echiche gị ná mkpebi onwe onye ndị na-eche ha ihu, ọ bụrụgodị na ndị ọzọ agwa gị ka i mee otú ahụ, lezie anya ka ị ghara imere ha mkpebi.—Gal. 6:5.

Nye Aka n’Ụzọ Bara Uru. Ọ bụ ezie na Jizọs nwere nchegbu karịsịa banyere ọdịmma ime mmụọ nke ndị na-ege ya ntị, mkpa ha ndị ọzọ metụkwara ya n’ahụ́. (Mat. 15:32) Ọ bụrụgodị na anyị abaghị ọgaranya, ọ dị ọtụtụ ụzọ bara uru anyị pụrụ isi nye aka.

Inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ ga-akpali anyị ịdị na-echebara ha echiche. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihu igwe adịghị onye na-ege gị ntị mma n’ahụ́, gafee n’ebe ka mma ma ọ bụ mee ndokwa ịga n’ihu ná mkparịta ụka ahụ n’oge ọzọ. Ọ bụrụ na ị gara n’oge na-adabaghịrị ya, kwuo na ị ga-alaghachi n’oge ọzọ. Ọ bụrụ na onye agbata obi gị ma ọ bụ onye gosiri mmasị na-arịa ọrịa ma ọ bụ nọrọ n’ụlọ ọgwụ, gosi nchegbu gị site n’izigara ya kaadị ma ọ bụ ntakịrị akwụkwọ ozi ma ọ bụ ịga leta ya. Ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, ị pụkwara ibugara ya nri ma ọ bụ gosi ya obiọma n’ụzọ ọzọ.

Ka ndị a na-amụrụ Bible na-enwe ọganihu, ha pụrụ inwe mmetụta nke ịtọgbọ chakoo n’ihi na ha na ndị enyi ha mbụ adịkwaghị anọru otú ha na-anọbu. Meta ha enyi. Soro ha kwurịta okwu mgbe ọmụmụ Bible ha gasịrị na n’oge ndị ọzọ. Gbaa ha ume imeta ezigbo ndị enyi. (Ilu 13:20) Nyere ha aka ịga nzukọ Ndị Kraịst. Soro ha nọrọ ná nnọkọ ndị dị otú ahụ, nyekwara ha aka ilekọta ụmụ ha ka ha nile wee nwee ike irite uru n’ụzọ zuru ezu karị n’ihe a na-ekwu.

Gosi Mmasị Site n’Obi Gị. Inwe mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ abụghị nkà a na-amụta amụta, kama àgwà na-esite n’obi. Otú anyị nweruru mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ na-apụta ìhè n’ọtụtụ ụzọ. Ọ na-apụta ìhè n’otú anyị si ege ntị nakwa n’ihe anyị na-ekwu. Anyị na-egosipụta ya site n’obiọma na nchebara echiche anyị na-egosi ndị ọzọ. Ọbụna mgbe anyị na-ekwughị ma ọ bụ mee ihe ọ bụla, àgwà anyị na ọdịdị ihu anyị na-ekpughe ya. Ọ bụrụ na anyị na-eche banyere ndị ọzọ n’eziokwu, ha ga-achọpụtarịrị ya.

Ihe kasị mkpa mere anyị ga-eji na-egosi ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ bụ na site n’ime otú ahụ, anyị na-eṅomi ịhụnanya na ebere nke Nna anyị nke eluigwe. Nke a na-enye aka adọta ndị na-ege anyị ntị n’ebe Jehova nọ na n’ebe ozi o nyeworo anyị izisa dị. N’ihi ya, ka ị na-ezisa ozi ọma ahụ, gbalịsie ike ilekwasị anya “ọ bụghị n’igosi mmasị onwe onye nanị n’ihe ndị metụtara [gị], kamakwa n’igosi mmasị onwe onye n’ihe ndị metụtara ndị ọzọ.”—Fil. 2:4.

ỤZỌ ISI NA-EGOSI EZI MMASỊ

  • Ṅaa ntị mgbe onye nke ọzọ na-ekwu okwu. Kelee ya maka ikwu echiche ya na mmetụta ya. Jụọ ajụjụ iji ghọtakwuo ihe ọ na-eche.

  • Na-eche echiche banyere onye ahụ mgbe unu kwurịtasịworo okwu. Kpọtụrụ ya ọzọ ngwa ngwa.

  • Soro ya kerịta eziokwu Bible ndị ga-akasị gboo mkpa ya kpọmkwem.

  • Mee ihe iji nyere ya aka. Buru n’uche ma mkpa o nwere ugbu a ma ndị ga-adịte aka.

IHE OMUME: (1) Tupu nzukọ ọgbakọ amalite, gosi mmasị onwe onye n’onye bịaranụ. Mee ihe karịrị ịsị nnọọ. Gbalịa ịmatakwu onye ahụ. Gosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. Mee ka ọ bụrụ ihe ị na-eme mgbe nile. (2) N’ozi ubi, gosi mmasị onwe onye n’ebe onye i zutere nọ. Mee ihe karịrị nanị ịgba àmà. Mata onye ahụ. Hazigharịa ihe ị na-ekwu ma na-eme ikwekọ n’ihe ị maara banyere onye ahụ. Nọgide na-achọ ohere iji mee nke a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya