Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa
Jehova enyewo anyị ibu ọrụ na ihe ùgwù dị ukwuu, na-asị: “Unu onwe unu bụkwa ndị àmà m, . . . Mụ onwe m bụkwa Chineke.” (Aịsa. 43:12) Anyị abụghị nanị ndị kwere ekwe. Anyị bụ ndị àmà, ndị na-agba àmà n’ihu ọha banyere eziokwu ndị dị oké mkpa dị n’ime Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ. Olee ozi Jehova nyere anyị izisa n’oge anyị? Ọ bụ nke na-adọrọ uche gaa n’ebe Jehova Chineke, Jizọs Kraịst, na n’Alaeze Mezaịa ahụ dị.
“TỤỌ EGWU EZI CHINEKE AHỤ, DEBEKWA IHE NILE O NYERE N’IWU”
OGOLOGO oge tupu oge Ndị Kraịst, Jehova gwara Ebreham kwesịrị ntụkwasị obi banyere otu ndokwa nke “mba nile nke ụwa” ga-esite na ya gọzie onwe ha. (Jen. 22:18) O nyekwara Solomọn ike mmụọ nsọ ide banyere otu ihe bụ́ isi a chọrọ n’aka ụmụ mmadụ nile: “Tụọ egwu [ezi Chineke ahụ, NW], debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.” (Ekli. 12:13) Ma olee otú ndị bi ná mba nile ga-esi mata ihe ndị a?
Ọ bụ ezie na a nọwo mgbe nile na-enwe ndị ụfọdụ kwenyere n’okwu Chineke, Bible na-egosi na ịgba àmà kpụ ọkụ n’ọnụ gburugburu ụwa bụ́ nke ga-eme ka ozi ọma ahụ ruo mba nile ga-ewere ọnọdụ “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” Nke a malitere na 1914. (Mkpu. 1:10) Banyere oge a, Mkpughe 14:6, 7 buru amụma na n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi, a ga-eme mkpọsa dị oké mkpa nye “mba na ebo na asụsụ na ndị ọ bụla.” A ga-agba ha ume, sị: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka ya abịawo, n’ihi ya kwa, na-efenụ Onye ahụ nke mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri dị iche iche.” Ọ bụ uche Chineke ka a kpọsaa ozi a. Anyị nwere ihe ùgwù nke ikere òkè n’ọrụ ahụ.
“Ezi Chineke Ahụ.” Mgbe Jehova sịrị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m,” ọ bụ n’ebe a nọ na-arụ ụka banyere Ịbụ Chineke ka ọ nọ kwuo ya. (Aịsa. 43:10) Ọ bụghị nanị na ndị mmadụ kwesịrị inwe okpukpe ha na-ekpe ma ọ bụ ikwere n’otu chi bụ ozi a na-aghaghị ịkpọsa. Kama, ọ dị mkpa ka e nye ha ohere ịmụta na Onye Okike nke eluigwe na ụwa bụ nanị ezi Chineke ahụ. (Aịsa. 45:5, 18, 21, 22; Jọn 17:3) Ọ bụ nanị ezi Chineke ahụ pụrụ ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu n’ụzọ a pụrụ ịdabere na ya. Ọ bụ ihe ùgwù anyị nwere ịkọwapụta na mmezu e mezuru okwu Chineke n’oge gara aga bụ ezi ihe ndabere maka inwe obi ike na ihe nile o kwere ná nkwa maka ọdịnihu ga-emezu.—Josh. 23:14; Aịsa. 55:10, 11.
N’ezie, ọtụtụ ndị anyị na-agbara àmà na-efe chi ndị ọzọ ma ọ bụ na-ekwu na ọ dịghị chi ha na-efe ma ọlị. Iji mee ka e gee anyị ntị, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị jiri ihe anyị na ha nwekọrọ mmasị na ya malite. Anyị pụrụ irite uru n’ihe nlereanya e dekọrọ n’Ọrụ 17:22-31. Rịba ama na ọ bụ ezie na Pọl onyeozi dị akọ, o kwuru n’ụzọ doro anya na mmadụ nile ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke bụ́ Onye Okike nke eluigwe na ụwa.
Ime Ka A Mara Aha Chineke. Ahapụla ime ka a mata aha ezi Chineke ahụ. Jehova hụrụ aha ya n’anya. (Ọpụ. 3:15; Aịsa. 42:8) Ọ chọrọ ka ndị mmadụ mara aha ahụ. O mere ka e denye aha ya dị ebube n’ime Bible ihe karịrị ugboro 7,000. Ọ bụ ọrụ anyị ime ka ndị mmadụ mara ya.—Deut. 4:35.
Olileanya ihe nile a kpọrọ mmadụ nwere ịdị ndụ n’ọdịnihu dabeere na ha ịmata Jehova na iji okwukwe na-akpọku ya. (Joel 2:32; Mal. 3:16; 2 Tesa. 1:8) Ma, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ amaghị Jehova. Nke ahụ na-agụnye ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu bụ́ ndị na-ekwu na ha na-efe Chineke nke Bible. Ha nwegodị Bible ma na-agụ ya, ọ ka nwere ike ha agaghị ama ahaaka Chineke n’ihi na e wepụwo ya n’ọtụtụ nsụgharị nke oge a. Nanị otú ụfọdụ ndị si mata aha Jehova bụ na ndị ndú okpukpe ha agwawo ha ka ha ghara iji ya na-eme ihe.
Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndị mmadụ mata aha Chineke? O nweghị ihe na-adị irè ka igosi ha ya n’ime Bible—Bible nke ha ma o kwe mee. Ná nsụgharị ụfọdụ, aha ahụ pụtara ọtụtụ puku ugboro. Ná ndị ọzọ, o nwere ike ịpụta nanị n’Abụ Ọma 83:18 ma ọ bụ n’Ọpụpụ 6:3-6, ma ọ bụ a pụrụ ịhụ ya n’ihe odide ala ala peeji nke Ọpụpụ 3:14, 15 ma ọ bụ Ọp 6:3. N’ọtụtụ nsụgharị, e ji aka akwụkwọ dị iche dee okwu ndị e ji dochie ya, dị ka “Onyenwe anyị” na “Chineke,” n’ebe ndị ahaaka Chineke pụtara n’asụsụ mbụ e ji dee ya. N’ebe ndị nsụgharị nke oge a wepụworo ahaaka Chineke kpam kpam, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i jiri nsụgharị Bible nke mere ochie karị gosi ndị mmadụ ihe e mere. N’ala ụfọdụ, i nwere ike izo aka n’ebe aha Chineke pụtara n’ukwe okpukpe dị iche iche ma ọ bụ n’ihe e dere n’ụlọ ọha na eze.
Ọbụna nye ndị na-efe chi ndị ọzọ, a pụrụ iji Jeremaịa 10:10-13 na New World Translation mee ihe n’ụzọ dị irè. Ọ bụghị nanị na o kwuru aha Chineke kamakwa ọ kọwara onye ọ bụ n’ụzọ doro anya.
Ejila aha ndị dị ka “Chineke” na “Onyenwe anyị” dochie aha ahụ bụ́ Jehova, dị ka Krisendọm na-eme. Nke a apụtaghị na a ghaghị iji aha ahụ mee ihe ná mmalite mkparịta ụka ọ bụla. N’ihi ajọ mbunobi, ụfọdụ ndị ga-egbubi nkwurịta okwu ahụ. Ma mgbe ị tọsịworo ntọala maka mkparịta ụka, ahapụla iji aha Chineke eme ihe.
Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Bible ji ahaaka Chineke mee ihe ọtụtụ ugboro karịa otú o ji aha ndị dị ka “Onyenwe anyị” na “Chineke” mee ihe ma a chịkọta ugboro ole e ji aha abụọ ahụ mee ihe ọnụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị so dee Bible anwaghị iwebata aha nsọ ahụ n’ahịrịokwu ọ bụla. Ha webatara ya nanị n’ebe ọ dabara adaba, n’alaghị azụ, nakwa n’ụzọ nkwanye ùgwù. Nke ahụ bụ ihe nlereanya dị mma ịgbaso.
Onye Nwe Aha Ahụ. Ọ bụ ezie na eziokwu bụ́ na Chineke nwere ahaaka bụ n’onwe ya eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, nke ahụ bụ nanị mmalite.
Iji hụ Jehova n’anya ma jiri okwukwe na-akpọku ya, ọ dị ndị mmadụ mkpa ịmata ụdị onye Chineke bụ. Mgbe Jehova gwara Mozis aha ya n’Ugwu Saịnaị, O mere ihe karịrị nanị ikwughachi okwu bụ́ “Jehova.” Ọ dọọrọ uche gaa n’àgwà Ya ụfọdụ ndị pụtara ìhè. (Ọpụ. 34:6, 7) Nke ahụ bụ ihe nlereanya anyị ga-eṅomi.
Ma ị̀ na-agbara ndị ọhụrụ nwere mmasị àmà ma ọ bụ na-ekwu okwu n’ọgbakọ, mgbe ị na-ekwu banyere ngọzi dị iche iche nke Alaeze ahụ, kọwapụta ihe ha na-egosi banyere Chineke nke kwere nkwa ndị dị otú ahụ. Mgbe ị na-ezo aka n’ihe ndị o nyere n’iwu, mesie amamihe na ịhụnanya ha na-egosipụta ike. Mee ka o doo anya na ihe Chineke chọrọ adịghị ewetara anyị ihe isi ike, kama nke ahụ, ha bụ maka abamuru anyị. (Aịsa. 48:17, 18; Maị. 6:8) Gosi otú ngosipụta nke ọ bụla nke ike Jehova si ekpughe ụdị onye ọ bụ, ụkpụrụ ya, na nzube ya. Dọrọ uche gaa ná nguzozi na-apụta ìhè n’ụzọ Jehova si egosipụta àgwà ya dị iche iche. Mee ka ndị mmadụ nụ mgbe ị na-ekwupụta echiche gị banyere Jehova. Ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ pụrụ inye aka ịkpali ndị ọzọ inwe ụdị ịhụnanya ahụ.
Ozi dị oké mkpa maka oge anyị na-agba mmadụ nile ume ka ha na-atụ egwu Chineke. Site n’ihe anyị na-ekwu, anyị kwesịrị ịgbalị ime ka e nwee ụdị egwu ahụ maka Chineke. Egwu a bụ egwu ziri ezi, ịtụ Jehova ụjọ, nsọpụrụ dị omimi maka ya. (Ọma 89:7) Ọ na-agụnye ịmata na Jehova bụ Onyeikpe kasịnụ nakwa na olileanya anyị nwere ịdị ndụ n’ọdịnihu na-adabere n’anyị inweta ihu ọma ya. (Luk 12:5; Rom 14:12) Ya mere, a na-ejikọta ụdị egwu ahụ na inwe ịhụnanya dị omimi n’ebe ọ nọ, n’ihi ya kwa, na ọchịchọ siri ike ime ihe na-atọ ya ụtọ. (Deut. 10:12, 13) Egwu Chineke na-akpalikwa anyị ịkpọ ihe ọjọọ asị, irube isi n’ihe ndị Chineke nyere n’iwu, na iji obi anyị dum na-efe ya ofufe. (Deut. 5:29; 1 Ihe 28:9; Ilu 8:13) Ọ na-echebe anyị pụọ n’ịgbalị ijere Chineke ozi mgbe anyị ka nọ na-ahụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya.—1 Jọn 2:15-17.
Aha Chineke—“Ụlọ Elu Dị Ike.” Ndị bịara mata Jehova n’ezie na-enwe nchebe dị ukwuu. Nke a abụghị nanị n’ihi na ha na-eji ahaaka ya eme ihe ma ọ bụ na ha pụrụ ikwu àgwà ya ụfọdụ. Ọ bụ n’ihi na ha na-atụkwasị Jehova n’onwe ya obi. Banyere ha, Ilu 18:10 na-ekwu, sị: “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, [e chebe ya].”
Jiri ohere ndị i nwere iji gbaa ndị ọzọ ume ịtụkwasị Jehova obi mee ihe nke ọma. (Ọma 37:3; Ilu 3:5, 6) Ntụkwasị obi dị otú ahụ na-egosi okwukwe n’ebe Jehova nọ na n’ebe nkwa ya dị. (Hib. 11:6) Mgbe ndị mmadụ ‘kpọkuru aha Jehova’ n’ihi na ha maara na ọ bụ Eze Eluigwe na Ala, hụ ụzọ ya n’anya, ma kwenye n’ụzọ zuru ezu na ezi nzọpụta pụrụ ịbịa nanị site n’aka ya, mgbe ahụ—ka Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike—a ga-azọpụta ha. (Rom 10:13, 14) Ka ị na-ezi ndị ọzọ ihe, nyere ha aka ịzụlite ụdị okwukwe ahụ n’akụkụ nile nke ndụ.
Ọtụtụ ndị na-eche nnukwute nsogbu onwe onye dị iche iche ihu. Ha nwere ike ha agaghị ahụ ngwọta ha. Gbaa ha ume ịmụta ụzọ Jehova, ịtụkwasị ya obi, na itinye ihe ha na-amụta n’ọrụ. (Ọma 25:5) Gbaa ha ume ikpesi ekpere ike maka enyemaka Chineke na ikele ya ekele maka ngọzi ya dị iche iche. (Fil. 4:6, 7) Mgbe ha bịara mata Jehova, ọ bụghị nanị site n’ịgụ ihe ụfọdụ e kwuru n’ime Bible kama sitekwa n’ịhụ mmezu nke nkwa ya dị iche iche ná ndụ ha, ha ga-amalite inwe obi iru ala nke na-abịa site n’ịghọta ihe aha Jehova pụtara n’ezie.—Ọma 34:8; Jer. 17:7, 8.
Jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe nke ọma iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta amamihe dị n’ịtụ ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, egwu na idebe ihe nile o nyere n’iwu.
“Ịgba Àmà Banyere Jizọs”
MGBE o bilitesịrị n’ọnwụ nakwa tupu ya alaghachi n’eluigwe, Jizọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka, na-asị: “Unu ga-agbakwa àmà banyere m . . . ruo n’akụkụ kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) A kọwara ndị ohu Chineke na-eguzosi ike n’ihe n’oge anyị dị ka ndị ‘nwere ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.’ (Mkpu. 12:17) Olee otú ị dịruru uchu n’ịgba àmà ahụ?
Ọtụtụ ndị, bụ́ ndị ji obi eziokwu na-ekwu na ha kwere na Jizọs, amaghị ihe ọ bụla banyere ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ. Ha amaghị na ọ bụ mmadụ n’ezie mgbe ọ nọ n’ụwa. Ha aghọtaghị ihe ya ịbụ Ọkpara Chineke pụtara. Ha maara ihe dị nnọọ nta banyere òkè ọ na-ekere ná mmezu nke nzube Chineke. Ha amaghị ihe ọ na-eme ugbu a, ha amaghịkwa otú ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu ga-esi emetụta ndụ ha. Ha pụrụ ọbụna iche n’ụzọ na-ezighị ezi na Ndịàmà Jehova ekweghị na Jizọs. Ọ bụ ihe ùgwù anyị nwere ịgbali ime ka a mata ihe bụ́ eziokwu n’okwu ndị a.
Ma ndị ọzọ ekweghị na ọ dị onye dị ka Jizọs ahụ a kọwara n’ime Bible nke dịrị ndụ n’ezie. Ụfọdụ na-ewere Jizọs nanị dị ka oké mmadụ. Ụfọdụ ekweghị n’echiche ahụ bụ́ na ọ bụ Ọkpara Chineke. “Ịgba àmà banyere Jizọs” n’etiti ndị dị otú ahụ na-achọ oké mgbalị, ndidi, na ịdị akọ.
N’agbanyeghị echiche ndị na-ege gị ntị nwere, ọ dị ha mkpa inwe ihe ọmụma banyere Jizọs Kraịst ma ọ bụrụ na ha ga-erite uru ná ndokwa Chineke mere maka ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Uche Chineke nke e kwupụtara n’ụzọ doro anya bụ na ndị nile dị ndụ aghaghị ‘ikwupụta na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị,’ ha aghaghịkwa ido onwe ha n’okpuru ịchịisi ya. (Fil. 2:9-11) Ya mere, anyị apụghị nnọọ izere okwu ahụ mgbe anyị zutere ndị kwenyesiri ike n’echiche ha bụ́ ndị na-ezighị ezi ma ọ bụ nwee ajọ mbunobi doro anya. Ọ bụ ezie na n’ọnọdụ ụfọdụ, anyị pụrụ ikwu okwu banyere Jizọs Kraịst n’enweghị ihe ndọghachi azụ—ọbụna ná nleta mbụ anyị—n’ọnọdụ ndị ọzọ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka anyị jiri akọ kwuo okwu ndị ga-enyere ndị na-ege anyị ntị aka ịmalite iche echiche n’ụzọ ziri ezi banyere ya. Ọ pụkwara ịdị mkpa ka anyị chee echiche banyere ụzọ ndị anyị pụrụ isi webata akụkụ ndị ọzọ nke okwu ahụ ná nleta anyị n’ọdịnihu. Otú ọ dị, o nwere ike ọ gaghị ekwe omume ịtụle ihe nile ọ gụnyere ruo mgbe anyị duziweere mmadụ ọmụmụ Bible.—1 Tim. 2:3-7.
Òkè Dị Mkpa Jizọs Na-ekere ná Nzube Chineke. Ọ dị anyị mkpa inyere ndị mmadụ aka ịghọta na ebe Jizọs bụ “ụzọ” ahụ, ‘ọ dịghịkwa onye na-abịakwute Nna ahụ ma ọ́ bụghị site na ya,’ ọ gaghị ekwe omume iso Chineke nwee mmekọrịta a nwapụtara anwapụta n’enweghị okwukwe na Jizọs Kraịst. (Jọn 14:6) Ọ gwụla ma mmadụ ọ matara ọrụ dị mkpa Jehova kenyere Ọkpara o bu ụzọ mụọ, ọ gaghị ekwe omume ịghọta Bible. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova mere Ọkpara ya onye bụ́ isi ná mmezu nke nzube Ya nile. (Kọl. 1:17-20) Amụma Bible hiwere isi n’eziokwu a. (Mkpu. 19:10) Jizọs Kraịst bụ onye e si n’aka ya enye ihe ngwọta maka nsogbu nile nke nnupụisi Setan na mmehie Adam kpatara.—Hib. 2:5-9, 14, 15.
Iji ghọta òkè Kraịst na-ekere, mmadụ aghaghị ịghọta na ụmụ mmadụ nọ n’ọnọdụ kwesịrị imere ebere nke ha na-apụghị ịnapụta onwe ha na ya. A nọ n’ime mmehie mụọ anyị nile. Nke a pụrụ imetụta anyị n’ụzọ dịgasị iche iche n’oge ndụ anyị. Otú ọ dị, ka oge na-aga ọ na-eduga n’ọnwụ. (Rom 3:23; 5:12) Soro ndị ị na-agbara àmà tụgharịa uche n’eziokwu ahụ. Kọwapụtazie na site n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst, Jehova ejiriwo ịhụnanya mee ka nnapụta ná mmehie na ọnwụ kwe omume nye ndị gosiri okwukwe n’onyinye ahụ. (Mak 10:45; Hib. 2:9) Nke a na-emeghere ha ụzọ ịdị ndụ ebighị ebi n’izu okè. (Jọn 3:16, 36) Ọ dịghị ụzọ ọzọ ọ ga-esi kwe omume. (Ọrụ 4:12) Dị ka onye ozizi, ma ọ̀ bụ nanị gị na otu onye nọ ma ọ̀ bụ n’ọgbakọ, mee ihe karịrị nanị ikwupụta eziokwu ndị a. N’ụzọ obiọma na ndidi, mee ka ndị na-ege gị ntị nwee ekele maka ọrụ Jizọs na-arụ dị ka Onye Mgbapụta anyị. Iji onyinye a kpọrọ ihe pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’àgwà, omume, na ihe mgbaru ọsọ mmadụ ná ndụ.—2 Kọr. 5:14, 15.
N’ezie, Jizọs jiri ndụ ya chụọ àjà nanị otu ugboro. (Hib. 9:28) Otú ọ dị, ọ na-arụsi ọrụ ike ugbu a dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà. Nyere ndị ọzọ aka ịghọta ihe nke ahụ pụtara. Hà na-enwe nrụgide, ndakpọ olileanya, nhụjuanya, ma ọ bụ nsogbu dị iche iche n’ihi na ndị gbara ha gburugburu enweghị obiọma? Mgbe Jizọs bụ mmadụ, o nwere ahụmahụ ndị a nile. Ọ maara otú ọ dị anyị. N’ihi ezughị okè, ànyị na-ahụ mkpa ebere Chineke dị? Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere wee rịọ Chineke mgbaghara na-adabere n’àjà Jizọs, Jizọs na-eje ozi dị ka “onye inyeaka nọ n’ebe Nna ahụ nọ.” O ji ọmịiko ‘na-arịọrọ anyị arịrịọ.’ (Jọn 2:1, 2; Rom 8:34) Dabere n’àjà Jizọs, sitekwa n’ozi ọ na-eje dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà, anyị nwere ike ịbịaru nso “n’ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ” nke Jehova iji nweta enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị. (Hib. 4:15, 16) Ọ bụ ezie na anyị ezughị okè, aka Jizọs na-enyere anyị dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà na-eme ka anyị nwee ike iji akọ na uche dị ọcha na-ejere Chineke ozi.—Hib. 9:13, 14.
Ọzọkwa, Jizọs nwere ike dị ukwuu dị ka onye Chineke họpụtara ịbụ Onyeisi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. (Mat. 28:18; Efe. 1:22, 23) N’ihi ya, ọ na-enye nduzi dị mkpa n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke. Mgbe ị na-akụziri ndị ọzọ ihe, nyere ha aka ịghọta na ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Onyeisi nke ọgbakọ, ọ bụghị mmadụ ọ bụla. (Mat. 23:10) Malite n’oge mbụ i zutere ndị nwere mmasị, kpọọ ha òkù ịbịa nzukọ nke ọgbakọ dị n’ógbè ahụ, bụ́ ebe anyị na-eji ihe ndị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-ewepụta na-amụ Bible. Kọwaara ha ọ bụghị nanị onye bụ́ “ohu ahụ” kamakwa onye bụ́ Nna Ukwu ahụ ka ha wee mata maka ịbụisi Jizọs. (Mat. 24:45-47) Mee ka ndị okenye mata ndị ha bụ, kọwakwaara ha iru eru Akwụkwọ Nsọ ndị okenye a na-aghaghị inwe. (1 Tim. 3:1-7; Taị. 1:5-9) Kọwapụta na ọ bụghị ndị okenye nwe ọgbakọ kama na ha na-enyere anyị aka ịga ije na nzọụkwụ Jizọs Kraịst. (Ọrụ 20:28; Efe. 4:16; 1 Pita 5:2, 3) Nyere ndị ọhụrụ a nwere mmasị aka ịhụ na e nwere òtù a haziri ahazi, nke zuru ụwa ọnụ, nke na-arụ ọrụ n’okpuru ịbụisi Kraịst.
Site n’Oziọma ndị ahụ, anyị na-amụta na mgbe Jizọs banyere Jeruselem ntakịrị oge tupu ya anwụọ, ndị na-eso ụzọ ya toro ya dị ka “Onye ahụ nke na-abịa dị ka Eze n’aha Jehova”! (Luk 19:38) Ka ndị mmadụ na-amụkwu Bible n’ụzọ miri emi karị, ha na-amụta na Jehova enyewo Jizọs ike ịchị achị ugbu a bụ́ nke na-enwe mmetụta n’ahụ́ ndị nke mba nile. (Dan. 7:13, 14) Mgbe ị na-ekwu okwu n’ọgbakọ ma ọ bụ na-eduzi ọmụmụ ihe, mee ka ha ghọta ihe ịchịisi Jizọs kwesịrị ịpụtara anyị nile.
Mesie ya ike na ụzọ anyị si ebi ndụ na-egosi ma ànyị kwenyere n’ezie na Jizọs Kraịst bụ Eze nakwa ma ànyị ji ọchịchọ obi anyị na-edo onwe anyị n’okpuru ịchịisi ya. Mee ka ọrụ Jizọs kenyere ndị na-eso ụzọ ya ịrụ, mgbe e tesịrị ya mmanụ dị ka Eze, pụta ìhè. (Mat. 24:14; 28:18-20) Tụlee ihe Jizọs, bụ́ Onye Ndụmọdụ Dị Ebube (NW), kwuru banyere ihe ndị a ga-ebute ụzọ ná ndụ. (Aịsa. 9:6, 7; Mat. 6:19-34) Dọrọ uche gaa na mmụọ Onyeisi Udo ahụ kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-egosipụta. (Mat. 20:25-27; Jọn 13:35) Lezie anya ka ị ghara iweghara ọrụ ikpe ndị ọzọ ikpe ma hà na-eme ihe nile ha kwesịrị ime, kama gbaa ha ume ịtụle ihe omume ha na-egosi banyere ha ido onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Kraịst. Ka ị na-eme otú ahụ, gosi na ọ dị gị mkpa ime otu ihe ahụ.
Iji Kraịst Mere Ntọala. Bible ji ọrụ ime onye na-eso ụzọ Kraịst tụnyere iwukwasị ihe n’elu Jizọs Kraịst dị ka ntọala. (1 Kọr. 3:10-15) Iji mezuo nke a, nyere ndị mmadụ aka ịmata Jizọs dị ka e si kọwaa ya n’ime Bible. Kpachara anya ka ha ghara ilekwasị gị anya dị ka onye ha na-eso. (1 Kọr. 3:4-7) Dọrọ uche ha gaa n’ebe Jizọs Kraịst nọ.
Ọ bụrụ na a tọrọ ntọala ahụ nke ọma, ndị a na-amụrụ ihe ga-aghọta na Kraịst hapụụrụ anyị ihe nlereanya ka anyị “wee gbasochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) Iji wukwasị ihe n’elu nke ahụ, gbaa ndị a na-amụrụ ihe ume ịgụ Oziọma ndị ahụ ọ bụghị nanị dị ka akụkọ bụ eziokwu kama dị ka ihe nlereanya a ga-agbaso. Nyere ha aka iburu àgwà na omume e ji mara Jizọs n’uche. Gbaa ha ume ịrịba ama ihe bụ́ echiche Jizọs banyere Nna ya, otú o si tachie obi n’ọnwụnwa na n’ule dị iche iche, otú o si gosi ido onwe onye n’okpuru Chineke, na otú o si mesoo ụmụ mmadụ n’ọnọdụ dịgasị iche iche. Mee ka ọrụ Jizọs kasị jiri oge ya rụọ ná ndụ ya pụta ìhè. Mgbe ahụ, mgbe mkpebi na ule ndị a na-enwe ná ndụ chere ya ihu, onye a na-amụrụ ihe ga-ajụ onwe ya, sị: ‘Gịnị ka Jizọs ga-eme n’ọnọdụ a? Ihe m ga-eme ọ̀ ga-egosi na m nwere ekele kwesịrị ekwesị maka ihe o mewooro m?’
Mgbe ị nọ n’ihu ọgbakọ na-ekwu okwu, ekwubila na ebe ọ bụ na ụmụnna gị enwewo okwukwe na Jizọs, ọ dịghị mkpa ịdọrọ uche gaa n’ebe ọ nọ n’ụzọ pụrụ iche. Ihe ị na-ekwu ga-enwe mmetụta dị ukwuu karị ma ọ bụrụ na ị dabere n’okwukwe ahụ wee nyekwuo nkọwa. Mgbe ị na-ekwu okwu banyere nzukọ, jikọta ya na ọrụ Jizọs dị ka Onyeisi nke ọgbakọ. Mgbe ị na-ekwu okwu maka ozi ubi, dọrọ uche gaa na mmụọ Jizọs gosiri mgbe ọ na-eje ozi ya, kwuokwa okwu banyere ozi ahụ na-eburu n’uche ihe Kraịst, dị ka Eze, na-eme iji chịkọta ndị mmadụ maka nchebe baa n’ime ụwa ọhụrụ ahụ.
O doro anya na a chọrọ ihe karịrị nanị ịmụta eziokwu ndị bụ́ isi banyere Jizọs. Iji ghọọ ezi Ndị Kraịst, ndị mmadụ aghaghị inwe okwukwe n’ebe ọ nọ ma hụ ya n’anya n’eziokwu. Ụdị ịhụnanya ahụ na-akpali mmadụ iji iguzosi ike n’ihe na-erube isi. (Jọn 14:15, 21) Ọ na-eme ka ndị mmadụ nwee ike iguzosi ike n’okwukwe n’oge ihe isi ike, ịnọgide na-aga ije na nzọụkwụ Kraịst ná ndụ ha nile, igosipụta na ha bụ Ndị Kraịst tozuru okè bụ́ ndị ‘gbanyesiri mkpọrọgwụ ike ma guzosie ike na ntọala ahụ.’ (Efe. 3:17) Ime otú ahụ na-ewetara Jehova, bụ́ Chineke na Nna nke Jizọs Kraịst, otuto.
“Ozi Ọma Nke A Nke Alaeze”
MGBE ọ na-enye nkọwa banyere ihe àmà nke ọnụnọ ya nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a, Jizọs buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Mat. 24:14.
Gịnị kpọmkwem bụ ozi a a ga-ezisa nnọọ ebe nile otú a? Ọ bụ ozi banyere Alaeze ahụ nke Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka ya gwa Chineke, na-asị: “Ka alaeze gị bịa.” (Mat. 6:10) Mkpughe 11:15 kọwara ya dị ka “alaeze nke Onyenwe anyị [Jehova] na nke Kraịst ya” n’ihi na ikike ịchị achị sitere n’aka Jehova, o nyefekwara ya Kraịst dị ka Eze. Otú ọ dị, rịba ama na ozi Jizọs sị na a ga-akpọsa n’oge anyị karịrị ihe ndị na-eso ụzọ ya kwusara na narị afọ mbụ. Ha gwara ndị mmadụ, sị: “Alaeze Chineke abịaruwo unu nso.” (Luk 10:9) Jizọs, bụ́ onye e tere mmanụ ịbụ Eze, nọ n’etiti ha n’oge ahụ. Ma dị ka e dekọrọ na Matiu 24:14, Jizọs buru amụma banyere mkpọsa zuru ụwa ọnụ a ga-eme banyere ihe omume ọzọ dị mkpa ná mmezu nke nzube Chineke.
E mere ka Daniel onye amụma hụ ihe omume a n’ọhụụ. Ọ hụrụ “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ,” bụ́ Jizọs Kraịst, ka ọ na-anata site n’aka “Onye ochie ahụ,” bụ́ Jehova Chineke, “ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.” (Dan. 7:13, 14) Ihe omume ahụ nke dị mkpa n’eluigwe na n’ala weere ọnọdụ n’eluigwe n’afọ 1914. Ka ọ gasịrị, a chụdatara Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. (Mkpu. 12:7-10) Usoro ihe ochie a abanyewo na mgbe ikpeazụ ya. Ma tupu e wezụga ya kpam kpam, a na-eme mkpọsa n’ụwa nile na Eze Mezaịa nke Jehova na-achị achị ugbu a site n’ocheeze ya dị n’eluigwe. A na-eme ka ndị mmadụ nọ n’ebe nile mata banyere ya. Mmeghachi omume ha na-enye ihe àmà nke ihe ha na-eche banyere Onye Kasị Elu dị ka Onye Na-achị Achị “n’alaeze nke mmadụ.”—Dan. 4:32.
N’ezie, e nwere ihe ka ukwuu ka ga-emenụ—ihe ka nnọọ ukwuu! Anyị ka na-ekpe ekpere, “Ka alaeze gị bịa,” ma ọ bụghị n’echiche bụ́ na nguzobe nke Alaeze Chineke ka ga-abụ n’ọdịnihu. Kama, ọ bụ n’echiche bụ́ na Alaeze eluigwe ahụ ga-eme ihe n’ụzọ doro anya iji mezuo amụma ndị dị ka Daniel 2:44 na Mkpughe 21:2-4. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs nke jupụtara ná ndị hụrụ Chineke na mmadụ ibe ha n’anya. Ka anyị na-ekwusa “ozi ọma nke a nke alaeze,” anyị na-ezo aka n’atụmanya ọdịnihu ndị ahụ. Ma anyị jikwa obi ike na-eme ka a mara na Jehova enyefeworị Ọkpara ya ike zuru ezu ịchị achị. Ị̀ na-emesi ozi ọma a ike mgbe ị na-agba àmà banyere Alaeze ahụ?
Ịkọwa Alaeze Ahụ. Olee otú anyị pụrụ isi rụzuo ọrụ e nyere anyị bụ́ ịkpọsa Alaeze Chineke? Anyị pụrụ ịkpali mmasị site n’ịmalite mkparịta ụka n’isiokwu dịgasị iche iche, ma n’egbughị oge anyị kwesịrị ime ka o doo anya na ozi anyị bụ banyere Alaeze Chineke.
Otu akụkụ dị mkpa nke ọrụ a na-agụnye ịgụ ma ọ bụ ihota ihe e kwuru n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-ezo aka n’Alaeze ahụ. Mgbe i zoro aka n’Alaeze ahụ, jide n’aka na ndị ị na-agwa okwu ghọtara ihe ọ bụ. A pụrụ ịchọ ihe karịrị nanị ikwu na Alaeze Chineke bụ ọchịchị. Ọ pụrụ isiri ụfọdụ ndị ike iche echiche banyere ihe a na-apụghị ịhụ anya dị ka ọchịchị. Ị pụrụ iso ha tụgharịa uche n’ụzọ dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, a pụghị ịhụ ike ndọda anya, ma ọ na-enwe mmetụta dị ike ná ndụ anyị. Anyị apụghị ịhụ Onye mere iwu ike ndọda anya, ma o doro anya na o nwere ike dị ukwuu. Bible zoro aka n’ebe ọ nọ dị ka “Eze mgbe ebighị ebi.” (1 Tim. 1:17) Ma ọ bụ ị pụrụ ikwu na ná mba buru ibu, ọtụtụ ndị agatụbeghị n’isi obodo ha ma ọ bụ hụ onye ọchịchị ha ihu na ihu. Ha na-anụ banyere ihe ndị a n’akụkọ. N’otu aka ahụ, Bible, bụ́ nke a na-ebipụta n’ihe karịrị asụsụ 2,200, na-agwa anyị banyere Alaeze Chineke; ọ na-eme ka anyị mara onye e nyefeworo ikike na ihe Alaeze ahụ na-eme. Ụlọ Nche, bụ́ nke a na-ebipụta n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ a na-ebipụta site n’oge ruo n’oge, bụ nke a na-ebipụta maka “Ikwupụta Alaeze Jehova,” dị ka e kwuru n’ihu ya.
Iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Alaeze ahụ bụ, ị pụrụ ihota ụfọdụ n’ime ihe ndị ha chọrọ ka gọọmenti meere ha: ọnọdụ akụ̀ na ụba dị mma, udo, enweghị mpụ, imeso agbụrụ nile n’otu ụzọ ahụ n’emelaraghị otu ndị, agụmakwụkwọ, na nlekọta ahụ́ ike. Gosi na a ga-emeju ọchịchọ a nile nakwa ọchịchọ ndị ọzọ nile ziri ezi nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ zuru ezu nanị site n’Alaeze Chineke.—Ọma 145:16.
Gbalịa ịkpali ndị mmadụ inwe agụụ ịghọ ndị Alaeze ahụ na-achị, bụ́ nke Jizọs Kraịst na-achị achị na ya dị ka Eze. Zoo aka n’ọrụ ebube ndị ọ rụrụ iji gosi ihe ọ ga-eme dị ka Eze eluigwe. Na-ekwu okwu mgbe nile banyere àgwà ọma ndị o gosipụtara. (Mat. 8:2, 3; 11:28-30) Kọwaa na ọ tọgbọrọ ndụ ya maka anyị nakwa na ka e mesịrị, Chineke mere ka o si n’ọnwụ bilie ịdị ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. Ọ bụ n’ebe ahụ ka o si na-achị dị ka Eze.—Ọrụ 2:29-35.
Mesie ya ike na Alaeze Chineke na-achị ugbu a site n’eluigwe. Otú ọ dị, ghọta na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ adịghị ahụ ọnọdụ ndị ha chere ga-abụ ihe àmà nke ọchịchị dị otú ahụ. Kweta nke ahụ, ma jụọ ha ma ha maara ihe Jizọs Kraịst kwuru na ọ ga-abụ ihe àmà ga-egosi ya. Mee ka akụkụ ụfọdụ nke ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara nke dị na Matiu isi 24, Mak isi 13, ma ọ bụ Luk isi 21 pụta ìhè. Jụzie ha ihe mere Kraịst ịnọkwasị n’ocheeze n’eluigwe ga-eji mee ka e nwee ụdị ọnọdụ ndị ahụ n’ụwa. Dọrọ uche gaa ná Mkpughe 12:7-10, 12.
Dị ka ihe àmà a na-ahụ anya nke ihe Alaeze Chineke na-eme, gụọ Matiu 24:14, kọwaakwa usoro ịkụzi Bible n’ụwa nile nke na-aga n’ihu ugbu a. (Aịsa. 54:13) Kọọrọ ndị mmadụ banyere ụlọ akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-erite uru na ha—ha nile dabeere na Bible, a na-aga ha nile n’akwụghị ụgwọ. Kọwaa na tụkwasị n’ozi ụlọ n’ụlọ anyị, anyị na-akụziri ndị mmadụ na ezinụlọ dị iche iche Bible n’efu n’ebe obibi ha n’ihe karịrị ala 230. Olee ọchịchị ụmụ mmadụ nwere ike inye ọ bụghị nanị ndị ọ na-achị kama ndị mmadụ nọ n’ụwa nile usoro izi ihe sara mbara dị otú ahụ? Kpọọ ndị mmadụ òkù ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ịga mgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, ịhụ ihe àmà na-egosi otú izi ihe dị otú ahụ si enwe mmetụta ná ndụ ndị mmadụ.—Aịsa. 2:2-4; 32:1, 17; Jọn 13:35.
Ma, onye nwe ụlọ ọ̀ ga-aghọta otú o si emetụta ndụ nke ya? Ị pụrụ iji akọ kọwaa na nzube i ji bịa bụ ịtụle ohere mmadụ nile nwere ịhọrọ ndụ dị ka ndị Alaeze Chineke ga-achị. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịmụta ihe Chineke na-achọ na ibi ndụ kwekọrọ na ya ugbu a.—Deut. 30:19, 20; Mkpu. 22:17.
Inyere Ndị Ọzọ Aka Ibute Alaeze ahụ Ụzọ. Ọbụna mgbe mmadụ nabatasịrị ozi Alaeze ahụ, e nwere mkpebi ndị ọ na-aghaghị ime. Olee otú ọ ga-ejiru Alaeze Chineke kpọrọ ihe ná ndụ ya? Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha ‘nọgide buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’ (Mat. 6:33) Olee otú anyị pụrụ isi nyere Ndị Kraịst ibe anyị aka ime nke ahụ? Site n’anyị onwe anyị isetịpụ ezi ihe nlereanya na ịtụlerịta ohere ndị e nwere. Mgbe ụfọdụ, site n’ịjụ mmadụ ma ò chewo echiche banyere ihe ụfọdụ ọ pụrụ inwe ike ime na ịkọrịta ahụmahụ dị iche iche iji gosi ihe ndị ọzọ na-eme. Site n’ịtụlerịta ihe ndekọ Bible n’ụzọ nke na ha ga-eme ka mmadụ hụkwuo Jehova n’anya. Site n’imesi ịdị adị n’ezie nke Alaeze ahụ ike. Site n’imesi otú ọrụ mkpọsa Alaeze ahụ dịruru ná mkpa n’ezie ike. A na-arụzukarị ihe kasị mma, ọ bụghị site n’ịgwa ndị mmadụ ihe ọ dị mkpa ka e mee, kama site n’ịkpali ha inwe ọchịchọ ime ya.
N’enweghị obi abụọ, ozi ahụ dị oké mkpa nke anyị nile na-aghaghị ịkpọsa na-adọrọ uche gaa n’ụzọ bụ́ isi n’ebe Jehova Chineke, Jizọs Kraịst, na n’Alaeze ahụ dị. A ghaghị imesi eziokwu ndị dị oké mkpa banyere ihe ndị a ike n’àmà anyị na-agbara ọha, n’ọgbakọ anyị, na ná ndụ nke anyị. Mgbe anyị na-eme nke ahụ, anyị na-egosipụta na anyị na-erite uru n’ezie ná mmụta a na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.