NKEBI NKE 3
“O Nwere Obi nke Maara Ihe”
Ezi amamihe bụ otu n’ime akụ̀ ndị kasị oké ọnụ ahịa ị pụrụ ịchọ. Ọ bụ nanị Jehova na-enye ya. Ná nkebi a anyị ga-elerukwu anya n’amamihe na-enweghị nsọtụ nke Jehova Chineke, bụ́ onye nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job kwuru banyere ya, sị: “O nwere obi nke maara ihe.”—Job 9:4.