Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wt isi 2 p. 14-22
  • Bulie Jehova Elu Dị Ka Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bulie Jehova Elu Dị Ka Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke Ahụ
  • Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Chineke Bụ Ịhụnanya”
  • Igosi Ndị Ọzọ Ịhụnanya
  • ‘Na-ejegharị n’Aha Jehova’
  • Hụ Chineke nke Hụrụ Gị n’Anya n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Nke Kachasị n’Ihe Ndị A Bụ Ịhụnanya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
wt isi 2 p. 14-22

Isi nke Abụọ

Bulie Jehova Elu Dị Ka Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke Ahụ

1. Ònye bụ nanị ezi Chineke ahụ?

BIBLE na-ekwu na n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ndị bụ́ ndị a na-ele anya dị ka chi, “nye anyị e nwere n’ezie otu Chineke bụ́ Nna.” (1 Ndị Kọrint 8:5, 6) “Otu Chineke” ahụ bụ Jehova, Onye Okike nke ihe nile. (Deuterọnọmi 6:4; Mkpughe 4:11) Jizọs zoro aka n’ebe ọ nọ dị ka “Chineke m na Chineke unu.” (Jọn 20:17) O kwenyere n’ihe Mozis kwuru, bụ́ onye kwuru tupu mgbe ahụ, sị: “Jehova, Ya onwe ya bụ Chineke; ọ dịghị onye ọzọ ma ọ bụghị Ya.” (Deuterọnọmi 4:35) Jehova karịrị nnọọ ihe ọ bụla a na-efe ofufe, dị ka arụsị, ụmụ mmadụ ndị a na-efe ka chi, ma ọ bụ onye iro ya bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrint 4:3, 4) N’adịghị ka ndị a nile, Jehova bụ, dị ka Jizọs kpọrọ ya, “nanị ezi Chineke ahụ.”—Jọn 17:3.

2. Ka anyị na-amụta banyere Chineke, olee otú o kwesịrị isi emetụta ndụ anyị?

2 Ndị nwere obi ekele, bụ́ ndị na-amụta banyere àgwà Chineke ndị na-enye obi ụtọ nakwa ihe o mewooro anyị na ihe ọ ka ga-emere anyị, na-abịaru ya nso. Ka ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ na-ebukwu ibu, a na-akpali ha ibuli ya elu. N’ụzọ dị aṅaa? Otu ụzọ bụ site n’ịkọrọ ndị ọzọ banyere ya. “Ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta,” ka Ndị Rom 10:10 na-ekwu. Ụzọ ọzọ bụ site n’iṅomi ya n’okwu ọnụ na n’omume. “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya,” ka Ndị Efesọs 5:1 na-ekwu. Iji mee nke ahụ n’ụzọ zuru ezu karị, ọ dị anyị mkpa ịmata Jehova otú ọ dị n’ezie.

3. Olee àgwà ndị bụ́ isi Chineke nwere?

3 N’ime Bible dum, e nwere ọtụtụ ihe e kwuru bụ́ ndị na-eme ka a mata àgwà Chineke ndị pụtara ìhè. Àgwà ya anọ ndị bụ́ isi bụ amamihe, ikpe ziri ezi, ike, na ịhụnanya. ‘N’aka Ya ka amamihe dị.’ (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche; Job 12:13) “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche; Deuterọnọmi 32:4) O nwere “ume n’ike.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche; Aịsaịa 40:26) “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Otú ọ dị, n’ime àgwà anọ ndị bụ́ isi Chineke nwere, olee nke kasị pụta ìhè, nke kasị egosipụta ụdị Chineke ọ bụ?

“Chineke Bụ Ịhụnanya”

4. Olee nke n’ime àgwà Chineke kpaliri ya ike eluigwe na ala na ihe nile dị ndụ?

4 Chee echiche ihe kpaliri Jehova ike eluigwe na ala nakwa ndị mmụọ na ụmụ mmadụ e kere eke nwere ọgụgụ isi. Ọ̀ bụ amamihe ya ka ọ̀ bụ ike ya? Ee e, n’ihi na ọ bụ ezie na Chineke ji ha mee ihe, ọ bụghị ha kpaliri ya. Ikpe ziri ezi ya emeghịkwa ka ọ bụrụ iwu na ọ ga-eso ndị ọzọ kerịta onyinye nke ndụ. Kama nke ahụ, oké ịhụnanya Chineke nwere kpaliri ya iso ndị ọzọ kerịta ọṅụ nke ịdị ndụ dị ka onye nwere ọgụgụ isi. Ịhụnanya kpaliri ya izube na ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-adị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. (Jenesis 1:28; 2:15) Ịhụnanya mere ka o mee ndokwa maka iwepụ ikpe ọmụma nke njehie Adam wetaara ihe a kpọrọ mmadụ.

5. Dị ka Bible si kwuo, Jehova bụ àgwà dị aṅaa n’onwe ya, n’ihi gịnịkwa?

5 Ya mere, n’ime àgwà nile nke Chineke, nke kasị pụta ìhè bụ ịhụnanya ya. Ọ bụ ihe ọ bụ, ma ọ bụ ọdịdị ya. N’agbanyeghị otú amamihe, ikpe ziri ezi, na ike ya dịruru ná mkpa, ọ dịtụghị mgbe Bible kwuru na Jehova bụ nke ọ bụla n’ime ha. Ma o kwuru na ọ bụ ịhụnanya. Ee, Jehova n’onwe ya bụ ịhụnanya. Nke a bụ ịhụnanya nke ụkpụrụ, ọ bụghị nke mmetụta uche, na-achịkwa. Ịhụnanya Chineke bụ nke ụkpụrụ nke eziokwu na ezi omume na-achịkwa. Ọ bụ ụdị ịhụnanya kasị mma, dị ka e gosipụtara ihe atụ ya n’ebe Jehova Chineke n’onwe ya nọ. Ịhụnanya dị otú ahụ bụ ngosipụta nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị ma ọlị, ya na ọrụ ndị bụ́ ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ bụ́ ndị na-egosipụta ya na-esokwa mgbe nile.

6. Gịnị na-eme ka o kwe anyị omume iṅomi Chineke, ọ bụ ezie na ọ ka anyị?

6 Ọ bụ àgwà ịhụnanya a magburu onwe ya na-eme ka anyị nwee ike iṅomi Chineke dị otú ahụ. Dị ka ụmụ mmadụ dị ala, ndị na-ezughị okè, ndị na-emehiekarị ihe, anyị nwere ike iche na ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe ike ime otú ahụ. Ma lee ihe atụ ọzọ nke oké ịhụnanya Jehova: Ọ maara erughị eru anyị, ọ dịghịkwa achọ izu okè n’aka anyị. Ọ maara na anyị ezughị okè ma ọlị ugbu a. (Abụ Ọma 51:5) Ọ bụ ya mere Abụ Ọma 130:3, 4 ji na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo? Ma n’aka Gị ka mgbaghara dị.” Ee, Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere.” (Ọpụpụ 34:6) “Gị onwe gị, Onyenwe anyị, dị mma, Ị bụkwa onye na-agbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Lee ka o si na-enye nkasi obi! Lee ka o si na-enye ume ọhụrụ bụ́ ijere Chineke a dị ebube ozi na ịbụ onye o ji ịhụnanya na ebere ya na-elekọta!

7. Olee otú a pụrụ isi hụ ịhụnanya Jehova n’ihe ndị o kere eke?

7 A pụkwara ịhụ ịhụnanya Jehova n’ihe ndị o kere eke. Chee echiche banyere ọtụtụ ezi ihe Jehova nyeworo anyị iji mee ka anyị nwee obi ụtọ, dị ka ugwu, oké ọhịa, ọdọ mmiri, na oké osimiri ndị mara mma. O nyewo anyị ihe oriri n’ọtụtụ ụdị dịgasị iche iche ka ha na-atọ anyị ụtọ ma na-akwado anyị. Jehova enyewokwa anyị ọtụtụ ụdị okooko osisi dị iche iche mara mma ndị na-esikwa ísì ọma, tinyere ụmụ anụmanụ ndị na-adọrọ mmasị. O kere ihe ndị ga na-enye ụmụ mmadụ obi ụtọ, ọ bụ ezie na iwu ejighị ya ime otú ahụ. N’eziokwu, anyị apụghị ịnụ ụtọ ihe ndị o kere n’ụzọ zuru ezu mgbe anyị ka na-ebi n’ime ajọ ụwa a ma nọrọ n’ọnọdụ ezughị okè nke anyị nọ na ya ugbu a. (Ndị Rom 8:22) Ma cheedị echiche ihe Jehova ga-emere anyị na Paradaịs! Ọbụ abụ ahụ na-emesi anyị obi ike, sị: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe [kwesịrị ekwesị] dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—Abụ Ọma 145:16.

8. Gịnị bụ ihe atụ kasị pụta ìhè nke ịhụnanya Jehova n’ebe anyị nọ?

8 Gịnị bụ ihe atụ kasị pụta ìhè nke ịhụnanya Jehova n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ? Bible na-akọwa, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ọ̀ bụ n’ihi ịdị mma mmadụ ka Jehova ji mee nke a? Ndị Rom 5:8 na-aza, sị: “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya nke ya n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ maka anyị.” Ee, Chineke zitere Ọkpara ya zuru okè n’ụwa inye ndụ ya ịbụ àjà mgbapụta iji napụta anyị n’ikpe ọmụma nke mmehie na ọnwụ. (Matiu 20:28) Nke a megheere ndị hụrụ Chineke n’anya ụzọ inweta ndụ ebighị ebi. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ịhụnanya Chineke na-agụnye ndị nile chọrọ ime uche ya, n’ihi na Bible na-agwa anyị, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.

9. Olee otú eziokwu ahụ bụ́ na Jehova enyewo Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka anyị kwesịrị isi emetụta anyị?

9 Olee otú eziokwu ahụ bụ́ na Jehova enyewo Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka anyị, na-emeghe ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi, kwesịrị isi emetụta ụzọ anyị si eji ndụ anyị eme ihe ugbu a? O kwesịrị ime ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, nọ mikwuo emi. N’otu oge ahụ, o kwesịrị ime ka anyị chọọ ige Jizọs ntị, bụ́ onye na-anọchite anya Chineke. “[Jizọs] nwụkwara maka mmadụ nile ka ndị dị ndụ wee ghara ịdị ndụ ọzọ maka onwe ha, kama maka onye ahụ nke nwụrụ maka ha.” (2 Ndị Kọrint 5:15) Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịgbaso nzọụkwụ Jizọs, n’ihi na ọ bụ ezi ihe nlereanya n’iṅomi ịhụnanya na ọmịiko Jehova! E gosipụtara nke a site n’ihe Jizọs gwara ndị dị umeala n’obi: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ndị a na-ebogbu n’ibu, m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na enwere m obi dị nwayọọ, m dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwara mkpụrụ obi unu ume ọhụrụ. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.

Igosi Ndị Ọzọ Ịhụnanya

10. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gosi Ndị Kraịst ibe anyị ịhụnanya?

10 Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere n’ebe Ndị Kraịst ibe anyị nọ ụdị ịhụnanya ahụ Jehova na Jizọs nwere n’ebe anyị nọ? Rịba ama ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrịrị ajọ omume ọṅụ, kama ọ na-aṅụrịrị eziokwu ọṅụ. Ọ na-edi ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-enwe olileanya ihe nile, na-atachiri ihe nile obi. Ịhụnanya adịghị ada ada.”—1 Ndị Kọrint 13:4-8; 1 Jọn 3:14-18; 4:7-12.

11. Olee ndị ọzọ anyị kwesịrị igosi ịhụnanya, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

11 Olee ndị ọzọ anyị kwesịrị igosi ịhụnanya, n’ụzọ dịkwa aṅaa? Jizọs kwuru, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha na-edebe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Nke a na-agụnye iso ndị na-aghọbeghị Ndị Kraịst ibe anyị kerịta ozi ọma banyere ụwa ọhụrụ na-abịanụ nke Chineke, nke ga-abụ paradaịs. Jizọs gosiri n’ụzọ doro anya na ịhụnanya anyị ekwesịghị ịbụ nanị n’ebe ndị anyị na ha kwere n’otu ihe nọ, n’ihi na ọ sịrị: “Ọ bụrụ [nanị] ndị na-ahụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee ụgwọ ọrụ unu nwere? Ọ̀ bụ na ndị ọnaụtụ adịghị eme otu ihe ahụ? Ọ bụrụkwa na unu na-ekele nanị ụmụnne unu, olee oké ihe unu na-eme? Ọ̀ bụ na ndị mba ọzọ adịghị emekwa otu ihe ahụ?”—Matiu 5:46, 47; 24:14; Ndị Galeshia 6:10.

‘Na-ejegharị n’Aha Jehova’

12. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị Chineke pụrụ ịza aha ya?

12 Akụkụ ọzọ dị mkpa nke ibuli ezi Chineke ahụ elu bụ ịmata, ịkpọ, na ịkụziri ndị ọzọ aha ya pụrụ iche, nke bụ́ Jehova. Ọbụ abụ ahụ kwupụtara ọchịchọ a si ya n’obi, sị: “Ka ha wee mara na Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18) Aha ahụ bụ́ Jehova pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Ọ bụ Onye Ukwu Na-ezube Ihe, nke na-emezu nzube ya mgbe nile n’ụzọ nwere ihe ịga nke ọma. Ọ bụkwa nanị ezi Chineke ahụ pụrụ ịza aha ahụ n’ụzọ ziri ezi, n’ihi na ọ dịtụghị mgbe ụmụ mmadụ pụrụ ijide n’aka na mgbalị ha na-eme ga-enwe ihe ịga nke ọma. (Jems 4:13, 14) Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ịsị na ihe o kwuru ‘ga-aga nke ọma’ n’ihe o zigara ya. (Aịsaịa 55:11) Ọtụtụ mmadụ na-enwe obi ụtọ dị ukwuu mgbe mbụ ha hụrụ aha Chineke n’ime Bible ha ma mata ihe ọ pụtara. (Ọpụpụ 6:3) Ma ihe ọmụma a ga-abara ha uru nanị ma ha ‘na-ejegharị n’aha Jehova ruo mgbe ebighị ebi.’—Maịka 4:5.

13. Gịnị ka ịmara aha Jehova na ijegharị n’aha ya na-agụnye?

13 Banyere aha Chineke, Abụ Ọma 9:10 na-ekwu, sị: “Ndị maara aha Gị ga-atụkwasị Gị obi.” Nke a na-agụnye ihe karịrị nanị ịma aha ahụ bụ́ Jehova, bụ́ nke na-adịghị apụta ịtụkwasị ya obi n’emeghị mgbalị ọ bụla. Ịmara aha Chineke pụtara ịghọta ụdị Chineke Jehova bụ, ịkwanyere ịbụisi ya ùgwù, irube isi n’iwu ya, ịtụkwasị ya obi n’ihe nile. (Ilu 3:5, 6) N’otu aka ahụ, ijegharị n’aha Jehova na-apụta ịrara onwe onye nye ya na ịnọchite ya dị ka otu n’ime ndị na-efe ya ofufe, iji ndụ anyị na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke n’eziokwu. (Luk 10:27) Ị̀ na-eme nke ahụ?

14. Ọ bụrụ na anyị gaje ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi, gịnị ka a chọrọ anyị n’aka ma e wezụga ịma na ọ bụ ọrụ dịịrị anyị?

14 Ọ bụrụ na anyị ga-ejere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi, anyị ekwesịghị ịdị na-eme ya nanị n’ihi na ọ bụ ọrụ dịịrị anyị. Pọl onyeozi gbara Timoti, bụ́ onye nọworo na-ejere Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ, ume, sị: “Jiri nsọpụrụ Chineke na-azụ onwe gị dị ka nzube gị.” (1 Timoti 4:7) Nsọpụrụ na-esite n’obi nke jupụtara n’ekele maka onye ahụ a na-asọpụrụ. “Nsọpụrụ Chineke” na-enye echiche nke inwe nsọpụrụ miri emi maka Jehova n’onwe ya. Ọ na-egosipụta iji ịhụnanya na-arapara n’ebe ọ nọ n’ihi ịkwanyere ya na ụzọ ya ùgwù miri emi. Ọ na-eme anyị ịchọ ka onye ọ bụla na-akwanyere aha ya ùgwù nke ukwuu. Anyị aghaghị ịzụlite nsọpụrụ Chineke ná ndụ anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-ejegharị n’aha Jehova, onye nanị ya bụ ezi Chineke, ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:4; 2 Pita 3:11.

15. Olee otú anyị pụrụ isi na-enye Chineke ofufe anyị a na-ekewaghị ekewa?

15 Iji jeere Chineke ozi n’ụzọ ọ na-anabata, anyị aghaghị ife ya ofufe a na-ekewaghị ekewa, ebe ọ bụ “Chineke ekworo.” (Ọpụpụ 20:5) Anyị apụghị ịhụ Chineke n’anya ma n’otu mgbe ahụ na-ahụ ajọ ụwa, nke Setan bụ chi ya, n’anya. (Jems 4:4; 1 Jọn 2:15-17) Jehova maara kpọmkwem ụdị mmadụ onye ọ bụla n’ime anyị na-agbalị ịbụ. (Jeremaịa 17:10) Ọ bụrụ na anyị hụrụ ezi omume n’anya n’ezie, ọ na-ahụ ya, ọ ga-enyekwara anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị. Site n’iji mmụọ nsọ ya dị ike na-akwado anyị, ọ ga-eme ka anyị nwee ike imeri ajọ omume nke juru ebe nile n’ụwa a. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọ ga-enyekwara anyị aka ịnọgide na-enwe olileanya siri ike maka ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Lee atụmanya dị ebube nke ahụ bụ! Anyị kwesịrị iji ya kpọrọ ihe nke ukwuu ma jiri ọchịchọ obi na-ejere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ozi, bụ́ onye mere ka o kwe omume.

16. Gịnị ka i kwesịrị ịchọ iso ọtụtụ nde ndị ọzọ mee?

16 Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile ejiriwo obi ụtọ nakwere òkù ọbụ abụ ahụ kpọrọ bụ́ onye dere, sị: “[Soronụ] m mee ka Jehova dị ukwuu, ka anyị buliekwa aha Ya elu n’otu.” (Abụ Ọma 34:3) Jehova na-akpọ gị isonye n’oké ìgwè mmadụ na-amụba amụba nọ ná mba nile bụ́ ndị na-eme nke a.

Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu

• Ụdị onye dị aṅaa ka Jehova bụ? Olee otú anyị si erite uru site n’ịghọta àgwà ya dị iche iche n’ụzọ doro anya?

• Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke?

• Gịnị ka ịmara aha Jehova na ijegharị n’aha ya na-agụnye?

[Foto ndị dị na peeji nke 14]

Jehova ga-eji oké ịhụnanya ya ‘saghee aka Ya ma were ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya