Isi nke Itoolu
Ike nke Olileanya Mbilite n’Ọnwụ
1. E wezụga olileanya mbilite n’ọnwụ, olileanya dị aṅaa ga-adịrị ndị nwụrụ anwụ?
Ọ̀ DỊWO ndị ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị? E wezụga mbilite n’ọnwụ, a gaghị enwe olileanya ọ bụla nke ịhụ ha anya ọzọ. Ha ga-anọgide n’ọnọdụ ahụ Bible na-akọwa mgbe o kwuru, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, . . . n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Shiol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.”—Eklisiastis 9:5, 10.
2. Atụmanya dị aṅaa magburu onwe ya ka mbilite n’ọnwụ na-eme ka o kwe omume?
2 N’obi ebere ya, Jehova emewo ka ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ukwuu bụ́ ndị nwụrụ anwụ nwee ohere dị oké ọnụ ahịa nke isi n’ọnwụ bilie ma dị ndụ ebighị ebi site ná mbilite n’ọnwụ. Nke a pụtara na ị pụrụ inwe olileanya ahụ na-enye obi ụtọ na, otu ụbọchị, n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, a ga-ejikọtaghachi gị na ndị ị hụrụ n’anya dara n’ụra ọnwụ.—Mak 5:35, 41, 42; Ọrụ 9:36-41.
3. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka mbilite n’ọnwụ siworo bụrụ ihe dị mkpa ná mmezu nke nzube Jehova? (b) Ole mgbe karịsịa ka olileanya mbilite n’ọnwụ na-abụrụ anyị isi iyi nke ike?
3 N’ihi mbilite n’ọnwụ ahụ, ọ dịghị mkpa ka anyị na-atụ ọnwụ ajọ egwu. Jehova pụrụ, n’enweghị ihe ọjọọ na-adịgide adịgide ọ ga-arụpụtara ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi, ikwe ka Setan mee ihe nile o nwere ike ime iji nwapụta ebubo obi ọjọọ ya nke bụ́ na “ihe nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya.” (Job 2:4) Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi nye Chineke ọbụna ruo ọnwụ, n’ihi ya kwa, Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ ịdị ndụ n’eluigwe. Ya mere, Jizọs nwere ike iche uru nke àjà ya dị ka mmadụ zuru okè n’ihu ocheeze Nna ya nke dị n’eluigwe, na-enwe abamuru nke na-azọpụta ndụ nye anyị. Site ná mbilite n’ọnwụ, ndị so ‘n’ìgwè atụrụ nta’ ahụ, dị ka ndị ha na Kraịst ga-eketakọ ihe, nwere olileanya nke ịbụ ndị a ga-ejikọta ha na ya n’Alaeze eluigwe. (Luk 12:32) Nye ndị ọzọ, e nwere olileanya nke mbilite n’ọnwụ gaa n’ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Abụ Ọma 37:11, 29) Ndị Kraịst nile na-achọpụta na olileanya nke mbilite n’ọnwụ bụ isi iyi nke ike “karịrị ike nkịtị” mgbe ha nọ n’ule ndị na-etinye ha n’ọnụ ọnwụ.—2 Ndị Kọrint 4:7.
Ihe Mere O Ji Dị Oké Mkpa n’Okwukwe Ndị Kraịst
4. (a) N’echiche dị aṅaa ka mbilite n’ọnwụ bụ “ozizi mmalite”? (b) Gịnị ka mbilite n’ọnwụ pụtara nye ndị ụwa n’ozuzu ha?
4 Mbilite n’ọnwụ bụ, dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 6:1, 2, “ozizi mmalite.” O so na ntọala nke okwukwe nke anyị na-apụghị ịghọ Ndị Kraịst tozuru okè ma ọlị ma e wezụga ya. (1 Ndị Kọrint 15:16-19) Otú ọ dị, ozizi Bible banyere mbilite n’ọnwụ bụ ihe ọhụrụ n’echiche ndị ụwa n’ozuzu ha. Ebe ha na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, ọnụ ọgụgụ mmadụ na-ebuwanye ibu na-ewere ndụ a dị ka nanị ndụ e nwere n’ezie. N’ihi ya, ha na-eji ndụ ha nile na-achụso ihe ụtọ. E nwekwara ndị nọ n’okpukpe ndị bụ́ isi—ma na Krisendọm ma ná ndị ọzọ—ndị na-eche na ha nwere mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ. Ma nkwenkwe ahụ na ozizi Bible banyere mbilite n’ọnwụ apụghị ikwekọ, ebe mbilite n’ọnwụ na-agaghị adị mkpa ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ. Ịgbalị ime ka echiche abụọ a kwekọọ na-akpata mgbagwoju anya kama ịdị na-enye olileanya. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị nwere obi eziokwu aka bụ́ ndị chọrọ ịmata ihe bụ́ eziokwu?
5. (a) Tupu mmadụ enwee ike ịghọta ihe mbilte n’ọnwụ bụ, gịnị ka ọ dị mkpa ka ọ mara? (b) Akụkụ Akwụkwọ Nsọ dịgasị aṅaa ka ị ga-eji kọwaa ihe bụ́ mkpụrụ obi? ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ? (ch) Gịnị ka a pụrụ ime ma ọ bụrụ na mmadụ ji nsụgharị Bible nke yiri ka ọ na-ekpuchi ihe bụ́ eziokwu eme ihe?
5 Tupu ndị dị otú ahụ enwee ike ịghọta otú mbilite n’ọnwụ si bụrụ ndokwa magburu onwe ya, ọ dị ha mkpa ịghọta n’ụzọ ziri ezi ihe bụ́ mkpụrụ obi nakwa ihe bụ́ ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ. Ọtụtụ mgbe, nanị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ole na ole ezuola iji mee ka okwu ndị a doo onye agụụ eziokwu Bible na-agụ anya. (Jenesis 2:7; Abụ Ọma 146:3, 4; Ezikiel 18:4) Otú ọ dị, nsụgharị ụfọdụ nakwa mbipụta Bible nke oge a ndị e dere n’ụdị nkọwa adịghị eme ka ihe bụ́ eziokwu banyere mkpụrụ obi pụta ìhè. Ya mere, ọ pụrụ ịdị mkpa ka a tụlee okwu ndị e ji mee ihe n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible.
6. Olee otú ị pụrụ isi nyere mmadụ aka ịghọta ihe bụ́ mkpụrụ obi?
6 Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bara uru karịsịa n’ime nke a n’ihi na ọ sụgharịrị okwu Hibru bụ́ neʹphesh nakwa okwu Grik ya na ya kwekọrọ bụ́ psy·kheʹ n’ebe nile ọ pụtara dị ka “mkpụrụ obi.” N’ihe odide ntụkwasị nke nsụgharị a, e depụtara ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ebe okwu ndị a pụtara. Ọtụtụ nsụgharị Bible ndị ọzọ asụgharịghị ya n’otu ụzọ ahụ n’ebe nile ọ pụtara kama ha pụrụ ịsụgharị otu okwu ahụ e ji mee ihe n’asụsụ mbụ e ji dee Bible ọ bụghị nanị dị ka “mkpụrụ obi” kamakwa dị ka “ihe e kere eke,” “ihe dị adị,” “onye,” nakwa “ndụ”; a pụrụ ịsụgharị “neʹphesh m” dị ka “mụ,” nakwa “neʹphesh gị,” dị ka “gị.” Iji nsụgharị Bible ndị ọzọ tụnyere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ga-enyere onye a na-amụrụ ihe nke nwere obi eziokwu aka ịmata na okwu ndị e ji mee ihe n’asụsụ mbụ e ji dee Bible, bụ́ ndị a sụgharịrị ịbụ “mkpụrụ obi,” na-ezo aka ma n’ebe ndị mmadụ nọ ma n’ebe anụmanụ nọ. Ma ọ dịghị mgbe okwu ndị a na-enye echiche bụ́ na mkpụrụ obi bụ ihe a na-adịghị ahụ anya, nke a na-apụgḥ ibitụ aka, nke pụrụ isi n’ahụ́ pụọ mgbe mmadụ nwụrụ ma nọgide na-adị ndụ dị ka ihe maara ihe n’ebe ọzọ.
7. Olee otú ị ga-esi kọwaa site na Bible ihe bụ́ ọnọdụ nke ndị nọ na Shiol? na Hedis? na Gehena?
7 Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ jikwa okwu bụ́ “Shiol” sụgharịa okwu Hibru bụ́ sheʼohlʹ n’ebe nile ọ pụtara, jirikwa “Hedis” sụgharịa okwu Grik bụ́ haiʹdes nakwa “Gehena” maka okwu Grik bụ́ geʹen·na n’ebe nile ha pụtara. “Shiol” bụ okwu ya na okwu bụ́ “Hedis” pụtara otu ihe. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 2:27) Bible mere ka o doo anya na ma Shiol ma Hedis na-ezo aka n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ, a na-ejikwa ha eme ihe n’ihe banyere ọnwụ, ọ bụghị ndụ. (Abụ Ọma 89:48; Mkpughe 20:13) Akwụkwọ Nsọ na-enyekwa olileanya nke isi n’ili nkịtị ahụ pụta site ná mbilite n’ọnwụ. (Job 14:13; Ọrụ 2:31) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ọ dịghị olileanya ọ bụla nke ịdị ndụ n’ọdịnihu, nke e nyere maka ndị na-aga Gehena, ọ dịtụghịkwa mgbe e kwuru banyere mkpụrụ obi ịdị ndụ ma mara ihe n’ebe ahụ.—Matiu 10:28.
8. Olee otú ịghọta mbilite n’ọnwụ ahụ nke ọma pụrụ isi metụta àgwà na omume mmadụ?
8 Mgbe a kọwasịrị ihe ndị ahụ n’ụzọ doro anya, a pụziri inyere mmadụ aka ịghọta ihe mbilite n’ọnwụ pụrụ ịpụtara ya. Ọ pụrụ ịmalite inwe ekele maka ịhụnanya Jehova nwere n’ime ndokwa dị otú ahụ magburu onwe ya. Atụmanya na-enye ọṅụ nke ịbụ ndị e jikọtaghachiri n’ime ụwa ọhụrụ Chineke pụrụ ibelata mwute nke ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ. Ịghọta ihe ndị a dịkwa oké mkpa iji ghọta ihe ọnwụ Kraịst pụtara. Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ghọtara na mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst dị oké mkpa n’okwukwe Ndị Kraịst, na-emeghe ụzọ maka mbilite n’ọnwụ nke ndị ọzọ. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa banyere mbilite n’ọnwụ Jizọs na olileanya ọ na-eme ka e nwee. N’otu aka ahụkwa, ndị ghọtara ma jiri mbilite n’ọnwụ ahụ kpọrọ ihe taa na-adị njikere iso ndị ọzọ kerịta eziokwu a dị oké ọnụ ahịa.—Ọrụ 5:30-32; 10:42, 43.
Iji ‘Mkpịsị Ugodi nke Hedis’ Eme Ihe
9. N’ụzọ dị aṅaa ka Jizọs si buru ụzọ jiri “mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke Hedis” na-eme ihe?
9 Ndị nile ga-esonyere Kraịst n’Alaeze eluigwe ya aghaghị imesịa nwụọ. Ma ha maara nnọọ mmesi obi ike o nyere mgbe o kwuru, sị: “Aghọkwara m onye nwụrụ anwụ, ma, lee! ana m adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi, achịkwa m mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke Hedis.” (Mkpughe 1:18) Gịnị ka o bu n’uche? Ọ na-ezo aka n’ahụmahụ nke ya. Ya onwe ya kwa nwụrụ. Ma Chineke ahapụghị ya n’ime Hedis. N’ụbọchị nke atọ, Jehova n’onwe ya kpọlitere ya n’ọnwụ ịdị ndụ dị ka onye bụ́ mmụọ ma nye ya anwụghị anwụ. (Ọrụ 2:32, 33; 10:40) Tụkwasị na nke a, Chineke chịnyere ya “mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke Hedis” ka o jiri tọhapụ ndị ọzọ n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ nakwa n’ihe dị iche iche mmehie Adam kpatara. N’ihi na ọ chị mkpịsị ugodi ndị ahụ, Jizọs nwere ikike ịkpọlite ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnwụ. O bu ụzọ na-akpọlite ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ́ ndị òtù nke ọgbakọ ya, na-enye ha onyinye dị oké ọnụ ahịa nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe, dị nnọọ ka Nna ya nyere ya.—Ndị Rom 6:5; Ndị Filipaị 3:20, 21.
10. Olee mgbe mbilite n’ọnwụ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, ga-ewere ọnọdụ?
10 Olee mgbe Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, ga-enweta mbilite n’ọnwụ ahụ gaa n’eluigwe? Bible na-egosi na ọ malitelarị. Pọl onyeozi kọwara na a ga-akpọlite ha ‘n’oge ọnụnọ Kraịst,’ bụ́ ọnụnọ nke malitere n’afọ 1914. (1 Ndị Kọrint 15:23) Mgbe ndị e tere mmanụ, ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, dịsịrị ndụ ha n’elu ala ugbu a n’oge ọnụnọ ya, ha agaghị anọgide n’ọnwụ ruo mgbe Onyenwe ha ga-alọghachi. Ozugbo ha nwụrụ, a ga-akpọlite ha na mmụọ, ‘gbanwee ha, n’ime ntakịrị oge, n’otu ntabi anya.’ Lee obi ụtọ ha ga-enwe, ebe ọ bụ na ọrụ ọma ha rụrụ “na-eso ha kpọmkwem”!—1 Ndị Kọrint 15:51, 52; Mkpughe 14:13.
11. Olee mbilite n’ọnwụ a ga-enwe maka ndị mmadụ n’ozuzu ha, oleekwa mgbe ọ ga-amalite?
11 Ma ọ bụghị nanị mbilite n’ọnwụ nke ndị nketa Alaeze ahụ gaa n’ịdị ndụ n’eluigwe bụ mbilite n’ọnwụ a ga-enwe. Eziokwu ahụ bụ́ na a kpọrọ ya “mbilite n’ọnwụ mbụ” ná Mkpughe 20:6 na-egosi na ọzọ aghaghị isochi. Ndị ga-erite uru ná mbilite n’ọnwụ nke ikpeazụ a ga-enwe atụmanya na-enye obi ụtọ nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs. Olee mgbe nke ahụ ga-ewere ọnọdụ? Akwụkwọ Mkpughe na-egosi na ọ ga-abụ mgbe e wepụsịworo “eluigwe na ala”—ajọ usoro ihe nke dị ugbu a, ya na ndị ọchịchị ya. Ọgwụgwụ ahụ nke usoro ihe ochie a dị nnọọ nso. Mgbe nke ahụ gasịrị, n’oge Chineke kara aka, mbilite n’ọnwụ nke ndị ga-ebi n’elu ala ga-amalite.—Mkpughe 20:11, 12.
12. Olee ndị ga-eso ná ndị kwesịrị ntụkwasị obi a ga-akpọlite ịdị ndụ n’elu ala, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ ji bụrụ atụmanya na-akpali mmasị?
12 Olee ndị ga-eso ná mbilite n’ọnwụ ahụ nke ndị ga-ebi n’elu ala? Ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi eri oge gboo, ndị ikom na ndị inyom, bụ́ ndị “jụrụ ịnakwere ka e jiri ihe mgbapụta ọ bụla tọhapụ ha” n’ihi okwukwe siri ike ha nwere ná mbilite n’ọnwụ ga-eso n’ime ha. Ya bụ, ha jụrụ imebi iguzosi ike n’ezi ihe ha nye Chineke ka ha wee gbanahụ ịnwụ ọnwụ ike, ịnwụchu ọnwụ. Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụrụ anyị ịmata ndị ha bụ nakwa ịnụ n’ọnụ ha n’ụzọ zuru ezu akụkọ nke ihe omume ndị a kọrọ nanị ná mkpirikpi n’ime Bible! Ndị ọzọkwa a ga-akpọlite ịdị ndụ n’elu ala bụ Ebel, bụ́ onye àmà mbụ kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova; Ịnọk na Noa, bụ́ ndị kpọsara ozi ịdọ aka ná ntị Chineke n’atụghị egwu tupu Iju Mmiri ahụ abịa; Ebreham na Sera, bụ́ ndị lere ndị mmụọ ozi ọbịa; Mozis, bụ́ onye e si n’aka ya nye Iwu ahụ n’Ugwu Saịnaị; ndị amụma nwere obi ike dị ka Jeremaịa, bụ́ onye hụrụ mbibi Jeruselem na 607 T.O.A.; nakwa Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ́ onye nụrụ mgbe Chineke n’onwe ya kọwara Jizọs dị ka Ọkpara Ya. Tụkwasị ná ndị a, a ga-enwe ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom guzosiri ike n’ihe, bụ́ ndị nwụrụ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a nke ajọ usoro ihe a.—Ndị Hibru 11:4-38; Matiu 11:11.
13, 14. (a) Gịnị ga-eme Hedis na ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya? (b) Olee ndị ga-eso ná mbilite n’ọnwụ, n’ihi gịnịkwa?
13 Ka oge na-aga, a ga-akpọlitekwa ndị ọzọ ma e wezụga ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’ọnwụ, n’adịghị onye a ga-ahapụ n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. A pụrụ ịhụ ókè a ga-emeru ka a ghara inwekwa ndị nwụrụ anwụ ga-anọ n’ime ili ahụ site n’ụzọ Jizọs ga-esi jiri ‘mkpịsị ugodi nke Hedis’ mee ihe n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. E gosiri nke a n’ọhụụ e nyere Jọn onyeozi, bụ́ nke ọ nọ na ya hụ ka ‘a tụbara Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ.’ (Mkpughe 20:14) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ pụtara na a ga-ebibi Hedis, bụ́ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ, kpam kpam. Ọ gaghị adịkwa, ebe a kpọpụtasịworo ndị nile nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, n’ihi na tụkwasị n’ime ka ndị nile kwesịrị ntụkwasị obi fere Jehova ofufe si n’ọnwụ bilie, Jizọs ga-ejikwa obi ebere kpọliteghachi ọbụna ndị ajọ omume. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15.
14 Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ajọ omume a nke a ga-akpọlite n’ọnwụ nanị ka e wee kpee ya ikpe dị ka onye kwesịrị ịnwụ ọzọ. N’ọnọdụ ezi omume a ga-enwe n’ụwa nile n’oge Alaeze Chineke ga na-achị, a ga-enyere ha aka ime ka ndụ ha kwekọọ n’ụzọ Jehova. Ọhụụ ahụ gosiri na a ga-emeghe “akwụkwọ mpịakọta nke ndụ.” N’ihi ya, ha ga-enwe ohere nke ime ka e deba aha ha n’ime ya. A ‘ga-ekpe ha ikpe n’otu n’otu dị ka omume ha si dị,’ bụ́ ndị ha mere mgbe a kpọlitesịrị ha n’ọnwụ. (Mkpughe 20:12, 13) Ya mere, ọ bụrụ na e lee ya anya site n’ihe ga-emesịa si na ya pụta, nke ha pụrụ ịbụ “mbilite n’ọnwụ nke ndụ,” ọ gaghịkwa abụ “mbilite n’ọnwụ [nke ịma ikpe ọnwụ]” n’ụzọ a na-apụghị izere ezere.—Jọn 5:28, 29.
15. (a) Olee ndị a na-agaghị akpọlite n’ọnwụ? (b) Olee otú ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere mbilite n’ọnwụ kwesịrị isi metụta anyị?
15 Otú ọ dị, ọ bụghị ndị nile dịtụworo ndụ ma nwụọ ka a ga-akpọlite n’ọnwụ. Ụfọdụ mere mmehie ndị ọ na-agaghị ekwe omume ịgbaghara ha. Ndị dị otú ahụ anọghị na Hedis, kama na Gehena, bụ́ ebe a ga-ebibi ha ruo mgbe ebighị ebi. Ndị e gburu ‘n’ime oké mkpagbu’ ahụ nke dị nso ugbu a ga-esokwa n’ime ndị a. (Matiu 12:31, 32; 23:33; 24:21, 22; 25:41, 46; 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9) N’ihi ya, ọ bụ ezie na Jehova na-egosi obi ebere na-enweghị atụ n’ịtọpụ ndị nwụrụ anwụ na Hedis, olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ abụghị ihe ga-eme ka anyị na-ebi ndụ otú masịrị anyị ugbu a. Mbilite n’ọnwụ agaghị ekwe omume maka ndị ma ụma na-enupụrụ ọbụbụeze Jehova isi. Ịmata nke a kwesịrị ịkwali anyị igosipụta na anyị nwere ekele miri emi maka obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke site n’ibi ndụ anyị dị ka uche ya si dị.
Ndị Olileanya nke Mbilite n’Ọnwụ Na-ewusi Ike
16. Olee otú olileanya nke mbilite n’ọnwụ ahụ pụrụ isi bụrụ ihe na-enye ume dị egwu?
16 Anyị, bụ́ ndị meworo ka olileanya nke mbilite n’ọnwụ bụrụ nke anyị, na-enweta ume dị egwu site na ya. Ugbu a, mgbe anyị ruru ná njedebe nke ndụ anyị, anyị ma na anyị apụghị ịnọgide na-eyigharị ọnwụ—n’agbanyeghị ụdị usoro ọgwụgwọ e ji mee ihe. (Eklisiastis 8:8) Ọ bụrụ na anyị ji iguzosi ike n’ihe jeere Jehova na nzukọ ya ozi, anyị pụrụ iji obi ike na-atụ anya ọdịnihu. Anyị maara na site ná mbilite n’ọnwụ, anyị ga-adị ndụ ọzọ, n’oge nke Chineke. Leekwa ndụ magburu onwe ya ọ ga-abụ! “Ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” dị ka Pọl onyeozi kpọrọ ya.—1 Timoti 6:19; Ndị Hibru 6:10-12.
17. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova?
17 Ịmara na e nwere mbilite n’ọnwụ nakwa ịmara Onye onyinye ahụ si n’aka, na-eme ka anyị dị ike n’okwukwe. Nke a na-ewusi anyị ike iguzosi ike n’ihe nye Chineke ọ bụrụgodị na ndị mkpagbu, bụ́ ndị na-eme ihe ike ejiri ọnwụ yie anyị egwu. Ọ dịwo anya Setan ji egwu ịnwụchu ọnwụ na-eme ka ndị mmadụ nọrọ n’ohu. Ma Jizọs atụghị ụdị egwu ahụ. O kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova ruo ọnwụ. Site n’àjà mgbapụta ọ chụrụ, Jizọs mere ka e nwee ụzọ isi tọhapụ ndị ọzọ n’ụdị egwu ahụ.—Ndị Hibru 2:14, 15.
18. Gịnị nyewooro ndị ohu Jehova aka inwe ihe ndekọ dị otú ahụ dị ịrịba ama nke iguzosi ike n’ezi ihe?
18 N’ihi okwukwe ha nwere ma n’onyinye nke àjà Kraịst ma ná mbilite n’ọnwụ, ndị ohu Jehova enwewo ihe ndekọ dị ịrịba ama nke na-egosi na ha bụ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. Mgbe a rụgidere ha, ha egosipụtawo na ‘ha ahụghị mkpụrụ obi ha n’anya’ karịa otú ha hụrụ Jehova n’anya. (Mkpughe 12:11) N’ụzọ amamihe dị na ya, ha adịghị emebi ụkpụrụ Ndị Kraịst iji zọpụta ndụ ha nke ugbu a. (Luk 9:24, 25) Ha maara na ọ bụrụgodị na ha anwụọ ugbu a n’ihi iji iguzosi ike n’ihe na-akwado ọbụbụeze Jehova, Ọ ga-enye ha ụgwọ ọrụ site ná mbilite n’ọnwụ ahụ. Ì nwere ụdị okwukwe ahụ? Ị ga-enwe ya ma ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya n’ezie, ma ọ bụrụkwa na i jiri ihe olileanya nke mbilite n’ọnwụ ahụ pụtara n’ezie kpọrọ ihe.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka mmadụ ghọta ihe bụ mkpụrụ obi na ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ tupu o nwee ike ịghọta mbilite n’ọnwụ?
• Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ, oleekwa otú ịmata nke a kwesịrị isi emetụta anyị?
• Olee otú olileanya nke mbilite n’ọnwụ si ewusi anyị ike?
[Foto dị na peeji nke 84, 85]
Jehova na-ekwe nkwa na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume