Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 4 p. 26-31
  • Chineke Nwere Aha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Nwere Aha
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-akwanyere Aha Ukwu Jehova Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ịmata Ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Otú Ị Pụrụ Isi Mara Aha Chineke
    Teta!—2004
  • Osisi Na-enwu Ọkụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 4 p. 26-31

ISI NKE 4

Chineke Nwere Aha

GỊNỊ bụ ihe mbụ ị na-ajụkarị mmadụ mgbe mbụ gị na ya zutere?— Ee, ị na-ajụ ya aha ya. Anyị nile nwere aha. Chineke nyere nwoke mbụ biri n’ụwa aha. Ọ kpọrọ ya Adam. A kpọrọ nwunye Adam, Iv.

Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị mmadụ nwere aha. Chee echiche banyere ihe ndị ọzọ nwekwara aha. Ọ bụrụ na mmadụ azụta nkịta, ọ na-enye ya aha, ọ́ bụghị ya?— Ee, inwe aha dị oké mkpa.

Lelie anya elu n’abalị ma hụ ọtụtụ kpakpando e nwere. Ì chere na ha nwere aha?— Ee, Chineke nyere kpakpando nke ọ bụla dị n’ígwé aha. Bible na-agwa anyị, sị: “Ọ na-agụta ọnụ ọgụgụ kpakpando; ha nile ka Ọ na-akpọ aha.”—Abụ Ọma 147:4.

[Foto dị na peeji nke 27]

Ị̀ ma na kpakpando nile nwere aha?

Ònye ka ị ga-asị na ọ bụ ya kasị ukwuu n’eluigwe na ụwa?— Ee, ọ bụ Chineke. Ì chere na o nwere aha?— Jizọs sịrị na O nwere aha. N’otu oge mgbe ọ na-ekpe ekpere Jizọs sịrị Chineke: ‘Emewo m ka ndị na-eso ụzọ m mara aha gị.’ (Jọn 17:26) Ị̀ ma aha Chineke?— Chineke n’onwe ya gwara anyị ihe bụ́ aha ya. O kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m.” Ya mere, aha Chineke bụ JEHOVA.—Aịsaịa 42:8.

Olee otú ọ na-adị gị mgbe ndị ọzọ chetara aha gị?— Ị na-enwe obi ụtọ, ọ́ bụghị ya?— Jehova chọkwara ka ndị mmadụ mara aha ya. Ya mere, anyị kwesịrị iji aha Jehova na-eme ihe mgbe anyị na-ekwu banyere Chineke. Onye Ozizi Ukwu ahụ ji aha Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe mgbe ọ na-agwa ndị mmadụ okwu. Jizọs kwuru n’otu oge, sị: “Ị ghaghịkwa iji obi gị dum . . . hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—Mak 12:30.

Jizọs maara na “Jehova” bụ aha dị oké mkpa. Ya mere, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha jiri aha Chineke na-eme ihe. Ọ kụziiri ha ọbụna ka ha na-ekwu okwu banyere aha Chineke mgbe ha na-ekpe ekpere. Jizọs maara na Chineke chọrọ ka mmadụ nile mara aha Ya, bụ́ Jehova.

Ogologo oge gara aga, Chineke gosiri nwoke ahụ bụ́ Mozis, bụ́ otu n’ime ụmụ Izrel, mkpa aha Ya dị. Ụmụ Izrel biri n’ala a kpọrọ Ijipt. A maara ndị bi n’ala ahụ dị ka ndị Ijipt. Ha mere ụmụ Izrel ndị ohu, ha mesokwara ha mmeso ọjọọ. Mgbe Mozis tolitere, ọ gbalịrị inyere otu n’ime ndị obodo ya aka. Nke a kpasuru Fero, bụ́ eze Ijipt, iwe. Ọ chọrọ igbu Mozis! N’ihi ya, Mozis si n’Ijipt gbapụ.

Mozis gbagara ala ọzọ. Ọ gbagara ala Midian. Mozis nọ n’ebe ahụ lụọ nwanyị, malitekwa ịmụ ụmụ. Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye ọzụzụ atụrụ, na-elekọta atụrụ. Otu ụbọchị, Mozis nọ na-elekọta atụrụ ya n’ebe dịdewere otu ugwu mgbe ọ hụrụ otu ihe na-eju anya. Otu osisi ogwu nta nọ na-ere ọkụ, ma ọ dịghị erepịa! Mozis garukwuru nso ka ọ hụ ya nke ọma.

Ị̀ ma ihe merenụ?— Mozis nụrụ ka otu olu si n’etiti osisi ogwu nta ahụ na-ere ọkụ kpọọ ya òkù. Olu ahụ kpọrọ ya òkù, sị, ‘Mozis! Mozis!’ Ònye na-ekwu okwu ahụ?— Ọ bụ Chineke na-ekwu okwu! Chineke nwere ọtụtụ ọrụ ọ chọrọ ka Mozis rụọ. Chineke sịrị: ‘Bịa ka m ziga gị ka i jekwuru Fero, bụ́ eze Ijipt, meekwa ka ndị m, bụ́ ụmụ Izrel, si n’Ijipt pụta.’ Chineke kwere nkwa inyere Mozis aka ime nke a.

[Foto dị na peeji nke 28]

Olee ihe dị mkpa Mozis mụtara n’ebe ahụ osisi ogwu nta na-ere ọkụ dị?

Ma Mozis sịrị Chineke: ‘Ọ bụrụkwanụ na mụ abịakwute ụmụ Izrel n’Ijipt ma gwa ha na ọ bụ Chineke zitere m. Ha jụọkwanụ m, sị, “Gịnị bụ aha Ya?” Gịnị ka m ga-asị ha?’ Chineke gwara Mozis ka ọ gwa ụmụ Izrel, sị: ‘Jehova ezitewo m n’ebe unu nọ. Jehova bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi.’ (Ọpụpụ 3:1-15) Nke a na-egosi na Chineke ga-anọgide na-aza aha ahụ bụ́ Jehova. Ọ dịghị mgbe ọ ga-agbanwe ya. Chineke chọrọ ka e jiri aha ya bụ́ Jehova mara ya ruo mgbe ebighị ebi.

[Foto dị na peeji nke 29]

Olee otú Chineke si mee ka a mara aha ya n’Oké Osimiri Uhie?

Mgbe Mozis gaghachiri n’Ijipt, ndị Ijipt chere na Jehova bụ nanị ntakịrị chi nke ụmụ Izrel. Ha echeghị na ọ bụ Chineke nke kere ụwa dum. Ya mere, Jehova gwara eze Ijipt, sị: ‘M ga-eme ka a mara aha m n’ụwa nile.’ (Ọpụpụ 9:16) Jehova mere n’ezie ka a mara aha ya. Ị̀ ma otú o si mee ya?—

O mere ka Mozis dupụta ụmụ Izrel n’Ijipt. Mgbe ha rutere n’Oké Osimiri Uhie, Jehova mere ka e nwee ụzọ bụ́ ala akọrọ nke gafere kpọmkwem n’etiti ya. Ụmụ Izrel ji ụkwụ gafere ya n’ala akọrọ n’enweghị ihe ọ bụla mere ha. Ma mgbe Fero na ndị agha ya nile banyesịrị n’ala akọrọ nke ala oké osimiri ahụ, mmiri ahụ nke dị n’akụkụ ya abụọ bịakwasịrị ndị Ijipt, ha nile nwụkwara.

N’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ nọ ebe nile n’ụwa malitere ịnụ akụkọ ihe Jehova mere n’Oké Osimiri Uhie. Olee otú anyị si mara na ha nụrụ ya?— Ọ dị mma, ihe dị ka afọ 40 ka ọ gasịrị, ụmụ Izrel bịara Kenan, bụ́ ala ahụ Jehova kwere nkwa inye ha. N’ebe ahụ, nwanyị ahụ na-akatabeghị ahụ́ bụ́ Rehab gwara ndị ikom abụọ bụ́ ndị Izrel, sị: “Anyị anụwo otú Jehova [si mee] ka mmiri Oké Osimiri Uhie takọrọ n’ihu unu, mgbe unu siri n’Ijipt pụta.”—Joshua 2:10.

Taa, ọtụtụ ndị yiri nnọọ ndị Ijipt ahụ. Ha ekweghị na Jehova bụ Chineke nke kere ụwa dum. N’ihi ya, Jehova chọrọ ka ndị nke ya kọọrọ ndị ọzọ banyere ya. Nke a bụ ihe Jizọs mere. Mgbe ndụ ya n’ụwa na-abịaru ná njedebe, ọ gwara Jehova n’ekpere, sị: ‘Emewo m ka ha mara aha gị.’—Jọn 17:26.

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Jizọs mere ka a mara aha Chineke. Ị̀ pụrụ igosi m ebe aha Chineke dị n’ime Bible?

Ị̀ chọrọ ịdị ka Jizọs? Ọ bụrụ otú ahụ, na-akọrọ ndị ọzọ na aha Chineke bụ Jehova. Ị pụrụ ịhụ na ọtụtụ ndị amaghị. Ya mere, ma eleghị anya ị pụrụ igosi ha ihe Bible kwuru n’Abụ Ọma 83:18. Ka anyị weta Bible ugbu a ma gụkọọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ ọnụ. Ọ na-ekwu, sị: “Ka ha wee mara na Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.”

Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe a anyị gụrụ?— Ee, anyị na-amụta na Jehova bụ aha kasị mkpa e nwere. Ọ bụ aha nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, Nna Jizọs na Onye kere ihe nile. Chetakwa, Jizọs sịrị na anyị kwesịrị iji obi anyị dum hụ Jehova bụ́ Chineke n’anya. Ị̀ hụrụ Jehova n’anya?—

Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya— Otu ụzọ bụ site n’ịmata ya dị ka Enyi anyị. Ụzọ ọzọ bụ site n’ịkọrọ ndị ọzọ aha ya. Anyị pụrụ igosi ha kpọmkwem n’ime Bible na aha ya bụ Jehova. Anyị pụkwara ikwu okwu banyere ihe ndị dị ebube Jehova kere na ihe ọma ndị o meworo. Nke a na-eme ka Jehova nwee obi ụtọ dị ukwuu n’ihi na ọ chọrọ ka ndị mmadụ mata banyere ya. Anyị pụrụ ikere òkè n’ime nke ahụ, ọ̀ bụ na anyị apụghị?—

Ọ bụghị mmadụ nile ga-achọ ige ntị mgbe anyị na-ekwu okwu banyere Jehova. Ọtụtụ ndị egeghị ntị ọbụna mgbe Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, kwuru banyere Ya. Ma, nke ahụ emeghị ka Jizọs kwụsị ikwu okwu banyere Jehova.

Ya mere, ka anyị mee dị ka Jizọs. Ka anyị nọgide na-ekwu okwu banyere Jehova. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Jehova Chineke ga-enwe obi ụtọ n’ebe anyị nọ n’ihi na anyị na-egosi na anyị hụrụ aha ya n’anya.

Ugbu a gụkọọnụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ole na ole ndị ọzọ dị n’ime Bible ọnụ, bụ́ ndị na-egosi mkpa aha Chineke dị: Aịsaịa 12:4, 5; Matiu 6:9; Jọn 17:6; nakwa Ndị Rom 10:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya