Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 12 p. 67-71
  • Jizọs Akụziere Anyị Ụzọ Isi Kpee Ekpere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Akụziere Anyị Ụzọ Isi Kpee Ekpere
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ekpere Ga-enyere Gị Aka Ịbịaru Chineke Nso
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ịbịaru Chineke Nso n’Ekpere
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Jiri Onyinye I Nwere Ikpe Ekpere Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 12 p. 67-71

ISI NKE 12

Jizọs Akụziere Anyị Ụzọ Isi Kpee Ekpere

Ebe Jizọs na-ekpe ekpere mgbe nanị ya nọ n’abalị

Ị̀NA-AGWA Jehova Chineke okwu?— Ọ chọrọ ka ị na-agwa ya okwu. Mgbe ị gwara Chineke okwu, a na-akpọ ya ekpere. Jizọs gwara Nna ya nke eluigwe okwu ọtụtụ ugboro. Mgbe ụfọdụ, ọ na-achọ ịnọ nanị ya mgbe ọ na-agwa Chineke okwu. Bible na-ekwu na n’otu oge, “Ọ rịgooro n’elu ugwu nanị ya ikpe ekpere. Ọ bụ ezie na chi ejiwo, ọ nọ n’ebe ahụ nanị ya.”—Matiu 14:23.

Olee ebe ị pụrụ ịga nọrọ nanị gị wee kpegara Jehova ekpere?— Ma eleghị anya, ị pụrụ ịnọ nanị gị gwa Jehova okwu tupu ị lakpuo ụra n’abalị. Jizọs kwuru, sị: ‘Mgbe ị na-ekpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ nke aka gị, mgbe i mechisịkwara ọnụ ụzọ gị, kpegara Nna gị ekpere.’ (Matiu 6:6) Ị̀ na-ekpegara Jehova ekpere n’abalị ọ bụla tupu ị lakpuo ụra?— I kwesịrị ịdị na-eme otú ahụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 67]

Jizọs kpere ekpere mgbe nanị ya nọ . . . nakwa mgbe ya na ndị ọzọ nọ

Jizọs kpekwara ekpere mgbe ya na ndị ọzọ nọ. Mgbe enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ, Jizọs kpere ekpere mgbe ya na ndị ọzọ nọ n’ebe e liri Lazarọs. (Jọn 11:41, 42) Jizọs na-ekpekwa ekpere mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya zukọrọ. Ị̀ na-aga nzukọ bụ́ ebe a na-ekpe ekpere?— N’ebe ahụ ọ na-abụkarị onye toruworo ogo mmadụ na-ekpe ekpere. Gee ntị nke ọma n’ihe ọ na-ekwu n’ihi na ọ na-agwa Chineke okwu maka gị. Mgbe ahụ, ị ga-enwe ike ịsị “Amen” mgbe e kpesịrị ekpere ahụ. Ị̀ ma ihe ịsị “Amen” mgbe e kpesịrị ekpere pụtara?— Ọ pụtara na i nwere mmasị n’ekpere ahụ. Ọ pụtara na i kwetara n’ihe e kwuru nakwa na ị chọrọ ka ọ bụrụ ekpere gị.

[Foto dị na peeji nke 68]

Gịnị mere ị ga-eji na-ege ntị nke ọma n’ekpere ndị a na-ekpe ná nzukọ?

Jizọs kpekwara ekpere n’oge nri. O kelere Jehova maka nri ọ na-achọ iri. Ị̀ na-ekpe ekpere mgbe nile tupu i riwe nri?— Ọ dị mma ka anyị kelee Jehova maka ihe oriri ahụ tupu anyị amalite riwe ya. Onye ọzọ pụrụ ikpe ekpere mgbe gị na ya na-erikọ nri. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọ bụ nanị gị na-eri nri? Ma ọ bụ, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na gị na ndị na-adịghị ekele Jehova ga-erikọ nri?— Mgbe ahụ ọ dị mkpa ka i kpee ekpere nke gị.

Ọ̀ bụ iwu na ị ga na-ekpepụta ekpere gị ekpepụta mgbe nile? Ka Jehova ọ̀ pụrụ ịnụ ekpere gị ma i kpee ya n’ime obi gị?— Anyị pụrụ ịmata azịza ya site n’ihe mere Nehemaịa. Ọ bụ onye na-efe Jehova ofufe, onye rụrụ ọrụ n’obí Eze Ataksakses nke Peasia. Otu ụbọchị, Nehemaịa nọ n’oké mwute n’ihi na ọ nụrụ na e tidawo mgbidi Jeruselem, bụ́ isi obodo ha.

[Foto ndị dị na peeji nke 69]

Olee mgbe ị pụrụ ikpe ekpere n’ime obi gị dị ka Nehemaịa mere?

Mgbe eze jụrụ Nehemaịa ihe mere ihu ya ji gbarụọ agbarụọ, Nehemaịa bu ụzọ kpee ekpere n’ime obi ya. Mgbe ahụ, Nehemaịa gwara eze ihe mere o ji nọrọ ná mwute ma rịọ ya ma ọ̀ ga-ekwe ka ya gaa Jeruselem ịga wughachi mgbidi ahụ. Gịnị mere?—

Ee, Chineke zara ekpere Nehemaịa. Eze sịrị ya gawa! Eze ọbụna nyere Nehemaịa ọtụtụ osisi ọ ga-eji wuo mgbidi ahụ. Ya mere, Chineke pụrụ n’ezie ịza ekpere anyị, ọbụna mgbe a na-ekpepụtaghị ha ekpepụta.—Nehemaịa 1:2, 3; 2:4-8.

Ugbu a, cheedị echiche. Ì kwesịrị ihulata isi gị mgbe ị na-ekpe ekpere? Ì kwesịrị igbu ikpere n’ala? Gịnị ka i chere?— Mgbe ụfọdụ Jizọs na-egbu ikpere n’ala mgbe ọ na-ekpe ekpere. Ọ na-eguzo ọtọ n’oge ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụkwa, ọ na-elewe anya n’eluigwe ma ọ na-ekpe ekpere, dị ka o mere mgbe o kpere ekpere maka Lazarọs.

Ya mere, gịnị ka nke a na-egosi?— Ee, nke a na-egosi na otú i si nọrọ abụghị ya bụ ihe dị mkpa. Mgbe ụfọdụ, ọ dị mma ihulata isi gị na imechi anya. N’oge ndị ọzọ ị pụrụ ọbụna ịchọ igbu ikpere n’ala, dị ka Jizọs mere. Ma, cheta, anyị pụrụ ikpegara Chineke ekpere n’oge ọ bụla n’ehihie ma ọ bụ n’abalị, ọ ga-anụkwa ekpere anyị. Ihe dị mkpa banyere ekpere bụ ka anyị kwere n’ezie na Jehova na-ege ntị. Ì kwere na Jehova na-anụ ekpere gị?—

[Foto dị na peeji nke 70]

Gịnị ka ị pụrụ ikpegara Chineke n’ekpere?

Gịnị ka anyị kwesịrị iwebata n’ekpere anyị na-ekpegara Jehova?— Gwagodị m: Mgbe ị na-ekpe ekpere, olee ihe ndị ị na-agwa Chineke maka ha?— Jehova na-enye anyị ọtụtụ ihe ọma, o kwesịkwara ka anyị na-ekele ya maka ha, ọ̀ bụ na o kwesịghị?— Anyị pụrụ ikele ya maka nri anyị na-eri. Ma ọ̀ dịtụwo mgbe i kelere ya ekele maka ihu ígwé na-acha anụnụ anụnụ, maka osisi ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, na maka okooko osisi ndị mara mma?— Ọ bụkwa ya kere ihe ndị ahụ.

N’otu oge, ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ ya ka ọ kụziere ha ụzọ isi na-ekpe ekpere. Ya mere, Onye Ozizi Ukwu ahụ kụziere ha ya, o gosikwara ha ihe ndị kasị mkpa a ga-ekpe ekpere maka ha. Ị̀ ma ihe ndị a?— Weta Bible gị, sapeta Matiu isi 6. N’amaokwu nke 9 ruo nke 13, anyị na-ahụ ihe ọtụtụ ndị na-akpọ Ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị. Ka anyị gụkọọ ya ọnụ.

N’ebe a anyị na-amụta na Jizọs gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere banyere aha Chineke. O kwuru ka a na-ekpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ. Gịnị bụ aha Chineke?— Ee, ọ bụ Jehova, aha ahụ kwesịkwara ịdị na-atọgbu anyị atọgbu.

Nke abụọ, Jizọs kụziere anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Alaeze a dị mkpa n’ihi na ọ ga-eme ka e nwee udo n’ụwa, meekwa ka ọ ghọọ paradaịs.

Nke atọ, Onye Ozizi Ukwu ahụ kwuru ka anyị na-ekpe ekpere ka e mee uche Chineke n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe. Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere maka nke a, mgbe ahụ anyị kwesịrị ime ihe Chineke chọrọ ka anyị mee.

Ọzọ, Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka nri anyị ga-eri n’ụbọchị nke ọ bụla. O kwukwara na anyị kwesịrị ịrịọ Chineke mgbaghara mgbe anyị mere ihe ndị na-ezighị ezi. Anyị kwesịkwara ịrịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị. Ma tupu ya agbaghara anyị, anyị aghaghị ịgbaghara ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ha emejọwo anyị. Ọ̀ na-adịrị gị mfe ime?—

N’ikpeazụ, Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Jehova Chineke chebe anyị pụọ n’aka ajọ onye ahụ, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu. Ya mere, ihe ndị a nile bụcha ihe ndị dị mma ikpegara Chineke n’ekpere.

Anyị kwesịrị ikweta na Jehova na-anụ ekpere anyị. E wezụga ịrịọ ya ka o nyere anyị aka, anyị kwesịrị ịnọgide na-ekele ya ekele. Ọ na-enwe obi ụtọ mgbe ihe anyị na-ekwu n’ekpere si anyị n’obi n’ezie na mgbe anyị na-arịọ ya ihe ndị kwesịrị ekwesị. Ọ ga-enyekwa anyị ihe ndị a. Ì kwere nke a?—

A na-achọtakwu ndụmọdụ ndị dị mma banyere ekpere ná Ndị Rom 12:12; 1 Pita 3:12; nakwa 1 Jọn 5:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya