ISI NKE 13
Ndị Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
Ònye bụ nwoke a, oleekwa otú o si ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs?
ÒNYE bụ ohu Chineke kasị mma nke dịtụworo ndụ?— Ị zatara ya, ọ bụ Jizọs Kraịst. Ì chere na anyị nwere ike ịdị ka ya?— Bible na-ekwu na o setịpụụrụ anyị ihe nlereanya anyị ga-agbaso. Ọ na-akpọkwa anyị òkù ka anyị bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.
Ị̀ ma ihe ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs pụtara?— Ọ pụtara ọtụtụ ihe. Nke mbụ, anyị aghaghị ịmụta ihe site n’aka ya. Ma, ọ bụghị nanị nke ahụ. Anyị aghaghịkwa ikwenye n’ezie n’ihe ọ na-ekwu. Ọ bụrụ na anyị ekwenye, anyị ga-eme ihe ọ sịrị anyị mee.
Ọtụtụ ndị na-ekwu na ha kwere na Jizọs. Ì chere na ha nile bụ ndị na-eso ụzọ ya n’ezie?— Ee e, ihe ka ọtụtụ n’ime ha abụghị. Ha pụrụ ịdị na-eje ụka. Ma, ọtụtụ n’ime ha ewepụtatụbeghị oge iji mụọ ihe Jizọs kụziri. N’ezie, ọ bụ nanị ndị na-agbaso ihe nlereanya Jizọs bụ ndị na-eso ụzọ ya.
Ka anyị kwuo banyere ụfọdụ n’ime ndị bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe ọ bụ mmadụ n’ụwa. Otu onye so ná ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ bụ Filip. Filip gawara ịga chọta enyi ya bụ́ Nataniel (onye a na-akpọkwa Batọlọmiu), bụ́ onye ị na-ahụ nọ ọdụ n’okpuru osisi. Mgbe Nataniel bịakwutere Jizọs, Jizọs sịrị: ‘Lee, nwoke na-adịghị aghọ aghụghọ, bụ́ onye Izrel n’ezie.’ O juru Nataniel anya, o wee jụọ, sị: ‘Olee otú i si mara m?’
Olee ndị Jizọs na-akpọ ka ha bịa bụrụ ndị na-eso ụzọ ya?
Jizọs sịrị: “Tupu Filip akpọọ gị, mgbe ị nọ n’okpuru osisi fig ahụ, ahụrụ m gị.” O juru Nataniel anya na Jizọs ma ebe ọ nọrịị kpọmkwem, n’ihi ya Nataniel sịrị: “Ị bụ Ọkpara Chineke, ị bụ Eze Izrel.”—Jọn 1:49.
Judas Iskarịọt, Judas (onye a na-akpọkwa Tadiọs), Saịmọn
E nwere ndị ọzọ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ụbọchị bu ụzọ tupu Filip na Nataniel aghọọ ndị na-eso ụzọ. Ha bụ Andru na nwanne ya nwoke bụ́ Pita, tinyekwara Jọn na ma eleghị anya nwanne Jọn bụ́ Jems. (Jọn 1:35-51) Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, mmadụ anọ a laghachiri n’ọrụ ịkụ azụ ha. O ruru otu ụbọchị, ka Jizọs nọ na-aga n’akụkụ Oké Osimiri Galili, ọ hụrụ Pita na Andru ka ha na-awụnye ụgbụ n’oké osimiri ahụ. Jizọs kpọrọ ha, sị: “Soronụ m.”
Jems (nwa Alfiọs), Tọmọs, Matiu
Mgbe ọ gatụkwuru ntakịrị, Jizọs hụrụ Jems na Jọn. Ha na nna ha nọ n’ime ụgbọ mmiri, na-edozi ụgbụ ha ji akụ azụ. Jizọs kpọkwara ha ka ha soro ya. Gịnị ka ị gaara eme ma a sị na ọ bụ gị ka Jizọs kpọrọ? Ị̀ gaara esowe ya ozugbo?— Ụmụ nwoke ndị a ma onye Jizọs bụ. Ha ma na ọ bụ Chineke zitere ya. Ya mere, ha hapụrụ ọrụ ịkụ azụ ha ozugbo sowe Jizọs.—Matiu 4:18-22.
Nataniel, Filip, Jọn
Mgbe ụmụ nwoke ndị a ghọrọ ụmụazụ Jizọs, ọ̀ pụtara na malite mgbe ahụ gaa n’ihu ha mere ihe ziri ezi mgbe nile?— Ee e. I nwere ike icheta na ndị ikom a ọbụna rụrụ ụka n’etiti onwe ha banyere onye n’ime ha kasị ukwuu. Ma, ha gere Jizọs ntị, ha dịkwa njikere ịgbanwe. Ọ bụrụ na anyị dị njikere ịgbanwe, anyị onwe anyị kwa pụrụ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.
Jems (nwanne Jọn), Andru, Pita
Jizọs kpọrọ ụdị mmadụ nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. N’otu oge, otu onye ọchịchị bụ́ nwa okorobịa nke bara ọgaranya bịakwutere Jizọs ma jụọ ya ụzọ ọ ga-esi nweta ndụ ebighị ebi. Mgbe onye ọchịchị ahụ nke bara ọgaranya kwuru na ya anọwo na-erube isi n’iwu Chineke malite n’oge ọ bụ nwata, Jizọs kpọrọ ya, sị: ‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m.’ Ị̀ ma ihe merenụ?—
Mgbe nwoke ahụ nụrụ na e kwesịrị iwere ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs dị ka ihe dị mkpa karịa ịba ọgaranya, o wutere ya nke ukwuu. Ọ ghọghị onye na-eso ụzọ Jizọs n’ihi na ọ hụrụ ego o nwere n’anya karịa otú ọ hụrụ Chineke n’anya.—Luk 18:18-25.
Mgbe Jizọs meworo nkwusa ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ na ọkara, ọ họọrọ mmadụ 12 n’ime ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ ndịozi. Ndịozi bụ ndị ikom ọ na-ezipụ ịga rụọ ọrụ pụrụ iche. Ị̀ ma aha ha?— Ka anyị lee ma ànyị ga-amụtali aha ha. Lee anya ebe e sere ha n’ebe a, leekwa ma ị̀ pụrụ ịkpọ aha ha. Mgbe ahụ, gbalịa ịkpọ aha ha n’eleghị anya n’akwụkwọ.
Olee ndị bụ ụmụ nwanyị a nyeere Jizọs aka mgbe ọ na-eme nkwusa?
N’ikpeazụ, otu n’ime ndịozi 12 ahụ ghọrọ ajọ mmadụ. Ọ bụ Judas Iskarịọt. Ka e mesịrị, a họọrọ onye ọzọ na-eso ụzọ ka ọ ghọọ onyeozi. Ị̀ ma aha ya?— Ọ bụ Mataịas. Ka oge na-aga, Pọl na Banabas ghọkwara ndịozi, ma, ha esoghị na mmadụ 12 ahụ.—Ọrụ 1:23-26; 14:14.
Dị ka anyị mụtara n’Isi 1 nke akwụkwọ a, Jizọs nwere mmasị n’ebe ụmụntakịrị nọ. Gịnị mere o ji nwee mmasị n’ebe ha nọ?— Ọ bụ n’ihi na ọ ma na ha pụkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya. N’ezie, ọtụtụ mgbe, ụmụntakịrị pụrụ ikwu ihe n’ụzọ pụrụ ọbụna ime ka ndị dimkpa gee ntị ma chọọ ịmụtakwu ihe banyere Onye Ozizi Ukwu ahụ.
Ọtụtụ ụmụ nwanyị ghọkwara ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ya na ụfọdụ n’ime ha so mgbe ọ gara n’obodo ndị ọzọ ịga mee nkwusa. Meri Magdalin, Joana, na Suzana so ya gaa. Ọ pụkwara ịbụ na ha nyere aka siere ya nri o riri ma saara ya ákwà ya.—Luk 8:1-3.
Ị̀ chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs?— Cheta, nanị ikwu na anyị bụ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya adịghị eme ka anyị bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Anyị aghaghị ime dị ka ndị na-eso ụzọ ya n’ebe ọ bụla anyị nọ, ọ bụghị nanị mgbe anyị gara nzukọ Ndị Kraịst. Ị̀ pụrụ icheta ebe ụfọdụ ọ dị mkpa ka anyị na-eme dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs?—
Ee, anyị kwesịrị ime otú ahụ n’ụlọ. Ma, ebe ọzọ bụkwa n’ụlọ akwụkwọ. Ihe mụ na gị na-ekwesịghị ichefu echefu bụ na iji bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ezie, anyị aghaghị ịdị na-eme ihe otú o mere oge dum, kwa ụbọchị, n’agbanyeghị ebe anyị nọ.
Olee ebe ndị ọ dị mkpa ka anyị na-eme ihe dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs?
Ugbu a, gụkọọnụ ihe Bible kwuru banyere ndị na-eso ụzọ Jizọs ọnụ, na Matiu 28:19, 20; Luk 6:13-16; Jọn 8:31, 32; nakwa na 1 Pita 2:21.