ISI NKE 21
Ọ̀ Dị Ihe Ọ Bụla Anyị Nwesịrị Iji Tuo Ọnụ?
GỊNỊ bụ itu ọnụ? Ị̀ ma ihe ọ bụ?— Lee otu ihe atụ. Ọ̀ dịtụla mgbe ị gbalịrị ime ihe ị na-amachaghị eme nke ọma? Ma eleghị anya, ị gbalịrị ịgbapụ bọl. Ma ọ bụ, ma eleghị anya, ị gbalịrị ịgba ígwè. Ọ̀ dị onye chịrị ọchị, “Ha! Ha! Ha!” wee sị, “M ga-emeta ya karịa gị”?— Onye ahụ na-etu ọnụ.
Olee otú obi na-adị gị mgbe ndị ọzọ mere otú ahụ? Obi ọ̀ na-adị gị mma?— Ya bụrụ otú ahụ, olee otú i chere obi na-adị ndị ọzọ ma ị na-etu ọnụ banyere onwe gị?— Ọ̀ dị mma ịsị onye ọzọ, “Aka m gị mma”?— Jehova ọ̀ na-enwe mmasị n’ebe ndị na-eme otú ahụ nọ?—
Onye Ozizi Ukwu ahụ ma ụfọdụ ndị bụ́ ndị chere na ha ka ndị ọzọ mma. Ha na-etu ọnụ banyere onwe ha ma na-eleda onye ọ bụla ọzọ anya. Ya mere, otu ụbọchị, Jizọs kọọrọ ha otu akụkọ iji gosi ha na ọ dịghị mma ka ha na-etu ọnụ banyere onwe ha. Ka anyị gee ntị n’akụkọ ahụ.
Akụkọ ahụ bụ banyere otu onye Farisii na otu onye ọnaụtụ. Ndị Farisii bụ ndị nkụzi nke okpukpe, ndị na-emekarị ka hà bụ ndị ezi omume ma ọ bụ ndị dị nsọ karịa ndị ọzọ. Onye Farisii ahụ Jizọs kọrọ banyere ya n’akụkọ ya gbagoro n’ụlọ nsọ Chineke dị na Jeruselem ịga kpee ekpere.
Gịnị mere Chineke ji nwee mmasị n’ebe onye ọnaụtụ ahụ nọ ma ghara inwe mmasị n’ebe onye Farisii ahụ nọ?
Jizọs sịrị na otu onye ọnaụtụ gbagokwara n’ụlọ nsọ ahụ ịga kpee ekpere. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ enweghị mmasị n’ebe ndị ọnaụtụ nọ. Ha na-eche na ndị ọnaụtụ na-egwu ha wayo. Ọ bụkwa eziokwu na ọtụtụ ndị ọnaụtụ adịghị akwụwa aka ọtọ mgbe nile.
N’ụlọ nsọ ahụ, onye Farisii ahụ malitere ikpegara Chineke ekpere na-asị: ‘Chineke, ana m ekele gị na abụghị m onye mmehie otú ndị ọzọ bụ. Anaghị m egwu ndị mmadụ wayo ma ọ bụ na-eme ihe ọjọọ ndị ọzọ. Adịghị m ka onye ọnaụtụ ahụ nọ ebe ahụ. Abụ m onye ezi omume. Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izu ka m wee nwekwuo oge iji chee echiche banyere gị. Ana m enyekwa n’ụlọ nsọ gị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe nile m nwetara.’ Onye Farisii ahụ chere n’ezie na ya ka ndị ọzọ mma, ọ́ bụghị eziokwu?— Ọ gwakwara ya Chineke.
Ma onye ọnaụtụ ahụ adịghị otú ahụ. O welidịghị anya ya elu lee eluigwe mgbe ọ na-ekpe ekpere. O guzo n’ebe dị anya, hulata isi ya ehulata. Onye ọnaụtụ ahụ kwara ụta nke ukwuu n’ihi mmehie ya, o tikwara aka n’obi ná mwute. Ọ gbalịghị ịgwa Chineke otú ya bụruru ezi mmadụ. Kama, o kpere ekpere, sị: ‘Chineke, meere mụ bụ́ onye mmehie ebere.’
Ònye n’ime mmadụ abụọ a ka i chere mere ihe dị Chineke mma? Ọ̀ bụ onye Farisii ahụ, bụ́ onye chere na ya bụ nnọọ ezi mmadụ? Ka ọ̀ bụ onye ọnaụtụ ahụ, bụ́ onye kwara ụta n’ihi mmehie ya?—
Jizọs sịrị na ọ bụ onye ọnaụtụ ahụ mere ihe dị Chineke mma. N’ihi gịnị? Jizọs kọwara, sị: ‘N’ihi na a ga-eweda onye ọ bụla nke na-eme ka o yie ka ọ ka ndị ọzọ mma ala. Ma onye dị ala n’anya onwe ya, a ga-eweli ya elu.’—Luk 18:9-14.
Gịnị ka Jizọs na-akụzi n’akụkọ ya?— Ọ na-akụzi na ọ dịghị mma iche na anyị ka ndị ọzọ mma. O nwere ike anyị agaghị ekwupụta ya ekwupụta na anyị na-eche na anyị ka ndị ọzọ mma, ma site n’otú anyị si eme omume, anyị nwere ike igosi na anyị na-eche na anyị ka ndị ọzọ mma. Ì metụla otú ahụ?— Cheedị echiche banyere Pita onyeozi.
Mgbe Jizọs gwara ndịozi ya na ha nile ga-agbahapụ ya ma e jide ya, Pita turu ọnụ, sị: ‘Ọ bụrụgodị na onye ọ bụla ahapụ gị, m gaghị ahapụ gị ma ọlị!’ Ma ihe Pita kwuru ezighị ezi. Ọ tụkwasịrị onwe ya obi gabiga ókè. N’ezie ọ gbahapụrụ Jizọs. Otú ọ dị, ọ laghachiri, dị ka anyị ga-ahụ n’Isi nke 30 n’akwụkwọ a.—Matiu 26:31-33.
Ka anyị tụlee ihe atụ ndị na-eme n’oge a. Ikekwe, a na-ajụ gị na nwa klas ibe gị ajụjụ ụfọdụ n’ụlọ akwụkwọ. Gịnị ma ọ bụrụ na i nwere ike ịza ajụjụ ndị ahụ ozugbo, ma nwa akwụkwọ nke ọzọ enweghị ike ịza ha ozugbo? N’ezie, ị na-enwe obi ụtọ mgbe ị ma azịza ha. Ma, ọ̀ ga-adị mma iji onwe gị na-atụnyere onye ahụ nke na-azaghị ya ozugbo?— Ọ̀ dị mma ibuli onwe gị elu site n’iweda onye nke ọzọ ala?—
Ọ bụ ihe onye Farisii ahụ mere. O turu ọnụ na ya ka onye ọna-ụtụ ahụ mma. Ma, Onye Ozizi Ukwu ahụ sịrị na ihe onye Farisii ahụ mere ezighị ezi. Ọ bụ eziokwu na mmadụ nwere ike ịdị na-emeta otu ihe nke ọma karịa onye ọzọ. Ma, nke ahụ apụtaghị na ọ bụ ezi mmadụ n’ezie karịa onye ahụ.
Ọ̀ na-eme ka ị bụrụ ezi mmadụ karị ma ọ bụrụ na ị ma ihe karịa onye ọzọ?
Ya mere, ọ bụrụ na anyị ma ihe karịa onye ọzọ, ọ̀ bụ ihe mere anyị ga-eji na-etu ọnụ?— Chee echiche banyere ya. Ọ̀ bụ anyị kere ụbụrụ anyị?— Ee e, ọ bụ Chineke nyere onye ọ bụla n’ime anyị ụbụrụ. Anyị mụtakwara ihe ka ukwuu n’ihe ndị anyị ma site n’aka onye ọzọ. Ma eleghị anya, anyị gụtara ha n’akwụkwọ. Ma ọ bụ, ikekwe, ọ bụ mmadụ gwara anyị ihe ndị ahụ. Ọ bụrụgodị na anyị achọpụta ihe n’onwe anyị, olee otú anyị si mee ya?— Ee, ọ bụ site n’iji ụbụrụ Chineke nyere anyị mee ihe.
Mgbe mmadụ mesiri mgbalị ike, ihe dị mma anyị kwesịrị ime bụ ikwu ihe ga-eme ka obi dị ya mma. Gwa ya na anyị nwere mmasị n’ihe o mere. Ma eleghị anya, ị pụrụ ọbụna inyere ya aka ime nke ọma karị. Ọ bụ ihe ị ga-enwe mmasị ka ndị mmadụ meere gị, ọ́ bụghị ya?—
N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-ezighị ezi itu ọnụ ma ọ bụrụ na anyị siri ike karịa onye ọzọ?
Ụfọdụ ndị siri ike karịa ndị ọzọ. Gịnị ma ọ bụrụ na i siri ike karịa nwanne gị? Ọ̀ bụ ihe ị ga-eji na-etu ọnụ?— Ee e, ọ bụghị. Ọ bụ nri anyị na-eri na-enyere anyị aka ịbụ ndị siri ike. Ọ bụkwa Chineke na-enye ìhè anyanwụ na mmiri ozuzo na ihe ndị ọzọ nile dị mkpa iji mee ka ala na-emepụta nri, ọ́ bụghị ya?— Ya bụrụ otú ahụ, ọ bụ Chineke ka anyị kwesịrị ịdị na-ekele ma ọ bụrụ na anyị siri ike.—Ọrụ 14:16, 17.
Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị na-enwe mmasị ịnụ ka mmadụ na-etu ọnụ banyere onwe ya, ka ọ̀ dị?— Ka anyị cheta ihe Jizọs kwuru: ‘Otú ahụ nnọọ ị chọrọ ka ndị ọzọ na-emeso gị, na-emeso ha otú ahụ.’ Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ọ dịghị mgbe anyị ga-adị ka onye Farisii ahụ nke na-etu ọnụ banyere onwe ya n’akụkọ ahụ Onye Ozizi Ukwu ahụ kọrọ.—Luk 6:31.
Otu oge, otu onye kpọrọ Jizọs ezi onye. Onye Ozizi Ukwu ahụ ọ̀ sịrị, ‘Ee, abụ m ezi onye’?— Ee e, o kwughị ya. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “Ọ dịghị onye bụ ezi onye, ma e wezụga otu onye, bụ́ Chineke.” (Mak 10:18) Ọ bụ ezie na Onye Ozizi Ukwu ahụ bụ onye zuru okè, o tughị ọnụ banyere onwe ya. Kama nke ahụ, o nyere Nna ya, bụ́ Jehova, otuto nile.
Ya mere, ọ̀ dị onye ọ bụla anyị pụrụ iji tuo ọnụ?— Ee, ọ dị. Anyị pụrụ iji Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, tuo ọnụ. Mgbe anyị hụrụ anyanwụ na-ada ada nke mara mma ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya e kere eke, anyị pụrụ ịsị mmadụ, ‘Ọ bụ Chineke anyị dị ebube, bụ́ Jehova, mere ihe a!’ Ka anyị dị njikere mgbe nile ikwu okwu banyere oké ihe ndị Jehova meworo na ndị ọ ga-eme n’ọdịnihu.
Olee ihe nwa okoro a ji na-etu ọnụ?
Gụọ ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere itu ọnụ, mụtakwa otú anyị kwesịrị isi zere itu ọnụ banyere onwe anyị: Ilu 16:5, 18; Jeremaịa 9:23, 24; 1 Ndị Kọrint 4:7; nakwa 1Kọ 13:4.