ISI NKE 22
Ihe Mere Anyị Na-ekwesịghị Iji Na-agha Ụgha
KA E were ya na otu nwatakịrị nwanyị gwara nne ya, sị: “Ee, m ga-alọta ozugbo a gbasara akwụkwọ.” Ma mgbe a gbasara akwụkwọ, ya anọrọ ma soro ndị enyi ya na-egwuri egwú, mgbe e mesịziri, ya agwa nne ya, sị: “Ọ bụ onye nkụzi anyị mere na mụ alọtaghị mgbe a gbasara akwụkwọ.” Ikwu ihe dị otú ahụ ò ziri ezi?—
Olee ihe ọjọọ nwatakịrị nwoke a mere?
Ma ọ bụ ikekwe, otu nwatakịrị nwoke gwara nna ya, sị: “Ee e, agbaghị m bọl n’ime ụlọ.” Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ n’ezie na ọ gbara bọl n’ime ụlọ? Ọ̀ dị njọ ma ọ sị na ya agbaghị?—
Onye Ozizi Ukwu ahụ gosiri anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ọ sịrị: ‘Nanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, Ee e unu abụrụ Ee e; n’ihi na ihe ọ bụla ọzọ sitere n’aka ajọ onye ahụ.’ (Matiu 5:37) Gịnị ka Jizọs bu n’uche?— O bu n’uche na anyị kwesịrị ịdị na-eme ihe anyị na-ekwu.
E nwere otu akụkọ dị n’ime Bible nke na-egosi otú o si dị mkpa ịdị na-ekwu eziokwu. Ọ bụ akụkọ banyere mmadụ abụọ ndị sịrị na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ka anyị lee ihe merenụ.
Ihe na-erughị ọnwa abụọ mgbe Jizọs nwụsịrị, ọtụtụ ndị si n’ebe ndị dị anya bịa Jeruselem maka otu ememe dị oké mkpa ndị Juu na-eme nke a na-akpọ Pentikọst. Pita onyeozi kwuru okwu dị ịrịba ama bụ́ nke o ji gwa ndị mmadụ banyere Jizọs, bụ́ onye Jehova kpọlitere n’ọnwụ. Nke a bụ nke mbụ ọtụtụ n’ime ndị ahụ bịara Jeruselem na-anụ banyere Jizọs. Ugbu a, ha chọrọ ịmatakwu banyere ya. Ya mere, gịnị ka ha mere?
Ha nọrọ ọdụ karịa otú ha tụrụ anya ịnọ. Ma mgbe ntakịrị oge gasịrị, ego ụfọdụ n’ime ha ji gwụrụ, enyemaka dịkwa ha mkpa iji nwee ike ịdị na-azụta ihe oriri. Ndị na-eso ụzọ nọ na Jeruselem chọrọ inyere ndị ọbịa ahụ aka. Ya mere, ọtụtụ n’ime ha rere ihe ndị ha nwere ma wetara ndịozi Jizọs ego ha retara. Ndịozi ahụ nyeziri ndị ọ dị mkpa ego ahụ.
Ananaịas na nwunye ya, bụ́ Safaịra, ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Jeruselem, rere otu ubi ha nwere. Ọ dịghị onye gwara ha ree ya. Ha kpebiri nke ahụ n’onwe ha. Ma ihe ahụ ha mere abụghị n’ihi na ha hụrụ ndị ọhụrụ na-eso ụzọ Jizọs n’anya. N’ezie, Ananaịas na Safaịra chọrọ ime ka ndị mmadụ chee na ha bụ ndị ezi mmadụ karịa otú ha bụ n’ezie. Ya mere, ha kpebiri ikwu na ha na-enyecha ego nile ha retara iji nyere ndị ọzọ aka. N’ezie, ha nyere nanị ụfọdụ n’ime ya ma kwuo na ha na-enyecha ha nile. Gịnị ka i chere banyere nke ahụ?—
Ananaịas gakwuuru ndịozi ahụ. O nyere ha ego ahụ. N’ezie, Chineke ma na ọ bụghị ego ahụ nile ka ọ na-enye ha. Ya mere, Chineke mere ka Pita onyeozi mara na ihe Ananaịas na-ekwu abụghị eziokwu.
Olee ụgha Ananaịas na-aghara Pita?
Mgbe ahụ, Pita kwuru, sị: ‘Ananaịas, n’ihi gịnị ka i ji kwe ka Setan mee gị ka i mee ihe a? Ubi ahụ bụ nke gị. Ọ bụghị iwu na ị ga-ere ya. Ọbụna mgbe i resịrị ubi ahụ, ọ dị gị n’aka ikpebi ihe ị ga-eji ego ya mee. Ma n’ihi gịnị ka i ji na-eme ka a ga-asị na ọ bụ ego ahụ nile ka ị na-enye ebe ọ bụ nanị ụfọdụ n’ime ya ka ị na-enye? Site n’ime nke a ị na-agha ụgha, ọ bụghị nanị nye anyị, kamakwa nye Chineke.’
Ọ bụghị obere ihe. Ananaịas na-agha ụgha! Ọ naghị eme ihe ọ sị na ya na-eme. Ọ na-eme nanị ka a ga-asị na ọ na-eme ya. Bible na-agwa anyị ihe mezirinụ. Ọ na-ekwu, sị: ‘Mgbe ọ nụrụ ihe Pita kwuru, Ananaịas dara n’ala nwụọ.’ Chineke mere ka Ananaịas nwụọ! Mgbe nke ahụ mesịrị, e bupụrụ ozu ya n’èzí gaa lie.
Gịnị mere Ananaịas n’ihi na ọ ghara ụgha?
Ihe dị ka awa atọ mgbe nke ahụ mesịrị, Safaịra batara. Ọ maghị ihe mere di ya. Ya mere, Pita jụrụ ya, sị: ‘Ọ̀ bụ ego ole a unu nyere anyị ka unu abụọ rere ubi ahụ?’
Safaịra zara, sị: ‘Ee, ọ bụ nanị ego ole ahụ ka anyị rere ubi ahụ.’ Ma nke ahụ bụ ụgha! Ha debeere onwe ha ụfọdụ n’ime ego ahụ ha retara n’ubi ha. Ya mere, Chineke mekwara ka Safaịra nwụọ.—Ọrụ 5:1-11.
Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta site n’ihe mere Ananaịas na Safaịra?— Ọ na-akụziri anyị na Chineke adịghị enwe mmasị n’ebe ndị na-agha ụgha nọ. Ọ na-achọ mgbe nile ka anyị na-ekwu eziokwu. Ma ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ịgha ụgha. Ì chere na ihe ndị ahụ na-ekwu bụ eziokwu?— Ị̀ ma na ọ bụ otu ụgha kpatara ọrịa nile, ihe mgbu nile, na ọnwụ nile dị n’ụwa?—
Ònye ka Jizọs sị na ọ bụ ya ghara ụgha mbụ, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
Cheta na Ekwensu ghaara nwanyị mbụ, bụ́ Iv, ụgha. Ọ gwara ya na ọ gaghị anwụ ma ọ bụrụ na o nupụrụ Chineke isi ma rie mkpụrụ osisi ahụ Chineke kwuru na o kwesịghị iri. Iv kwetara ihe Ekwensu kwuru ma rie mkpụrụ osisi ahụ. O mekwara ka Adam rie ya. Ugbu a, ha bụ ndị mmehie, ụmụ nile ha ga-amụ ga-abụkwa ndị mmehie. Ebe ha onwe ha bụkwa ndị mmehie, ụmụ Adam nile na-ata ahụhụ, na-anwụkwa anwụ. Olee otú nsogbu a nile si malite?— Ọ bụ otu ụgha kpatara ha.
Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji sị na Ekwensu “bụ onye ụgha, bụrụkwa nna nke ụgha”! Ọ bụ ya bụ onye mbụ ghara ụgha. Mgbe mmadụ ghara ụgha, ọ na-eme ihe Ekwensu bu ụzọ mee. Anyị kwesịrị ichebara nke a echiche mgbe ọ bụla ọ dị anyị ka ọ bụ anyị ghaa ụgha.—Jọn 8:44.
Olee mgbe ọ pụrụ ịdị gị ka ọ bụ gị ghaa ụgha?— Ọ́ bughị mgbe i mere ihe ọjọọ?— Ị pụrụ imebi otu ihe, ọ bụ ezie na i zubeghị ime otú ahụ. Ọ bụrụ na a jụọ gị onye mebiri ya, ì kwesịrị ịsị na ọ bụ nwanne gị? Ka ì kwesịrị ime dị ka a ga-asị na ị maghị otú o si mee?—
Olee mgbe ọ pụrụ ịdị gị ka ọ̀ bụ gị ghaa ụgha?
Gịnị ma ọ bụrụ na i mechaghị ihe omume e kenyere gị ka i mee n’ụlọ? Ì kwesịrị ikwu na i mechara ha nile, ọ bụrụgodị na i mechaghị ha?— Anyị kwesịrị icheta Ananaịas na Safaịra. Ha ekwughị ihe nile merenụ. Chineke gosikwara otú nke ahụ dịruru ná njọ site n’ime ka ha nwụọ.
Ya mere, ihe ọ sọkwara anyị mee, mgbe nile, ịgha ụgha ga-eme ka ọ ka njọ, anyị ekwesịghịkwa ọbụna ikwu ihe na-abụchaghị eziokwu. Bible na-ekwu, sị: ‘Na-ekwunụ eziokwu.’ Ọ na-ekwukwa, sị: “Unu adịla na-aghara ibe unu ụgha.” Jehova na-ekwu eziokwu mgbe nile, ọ na-atụkwa anya ka anyị na-eme otú ahụ.—Ndị Efesọs 4:25; Ndị Kọlọsi 3:9.
Anyị kwesịrị ịdị na-ekwu eziokwu mgbe nile. Nke ahụ bụ isi ihe e kwuru n’Ọpụpụ 20:16; Ilu 6:16-19; 12:19; 14:5; 16:6; nakwa ná Ndị Hibru 4:13.