Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 36 p. 187-191
  • Olee Ndị A Ga-akpọlite n’Ọnwụ? Ebee Ka Ha Ga-ebi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị A Ga-akpọlite n’Ọnwụ? Ebee Ka Ha Ga-ebi?
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Akụkọ Otu Onye Omekome?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • “Mụ na Gị Ga-anọ na Paradaịs”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • “Anyị Ga-ahụ na Paradaịs!”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 36 p. 187-191

ISI NKE 36

Olee Ndị A Ga-akpọlite n’Ọnwụ? Ebee Ka Ha Ga-ebi?

N’ISIAKWỤKWỌ abụọ bu nke a ụzọ, mmadụ ole ka anyị gụrụ na a kpọlitere n’ọnwụ?— Mmadụ ise. Mmadụ ole n’ime ha bụ ụmụaka?— Atọ. A kpọrọ onye nke anọ nwa okorobịa. Olee ihe i chere nke a na-egosi?—

Ọ na-egosi na Chineke hụrụ ụmụaka na ndị ntorobịa n’anya. Ma ọ ga-akpọlitekwa ọtụtụ ndị ọzọ n’ọnwụ. Ọ̀ bụ nanị ndị mere ezi ihe ka Chineke ga-akpọlite n’ọnwụ?— Anyị nwere ike iche otú ahụ. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị amụtụbeghị eziokwu banyere Jehova Chineke na Ọkpara ya. Ya mere, ha mere ihe ọjọọ n’ihi na a kụziiri ha ihe ndị na-ezighị ezi. Ì chere na Jehova ga-akpọlite ndị dị otú ahụ?—

Bible na-ekwu, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Gịnị mere a ga-eji kpọlite ndị na-abụghị ndị ezi omume, ma ọ bụ ndị na-emeghị ezi ihe n’ọnwụ?— Ọ bụ n’ihi na ọ dịghị mgbe ha nwere ohere iji mụọ banyere Jehova nakwa ihe ọ chọrọ ka ndị mmadụ mee.

[Foto dị na peeji nke 187]

Gịnị mere Chineke ga-eji kpọlite ndị na-emeghị ihe ziri ezi n’ọnwụ?

Olee mgbe i chere a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ?— Chee echiche laa azụ mgbe ahụ Lazarọs nwụrụ, bụ́kwa mgbe Jizọs kwere nwanne ya nwanyị bụ́ Mata, nkwa, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Mata zara ya, sị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:23, 24) Gịnị ka Mata bu n’obi mgbe ọ sịrị na Lazarọs ga-ebili “n’ụbọchị ikpeazụ”?—

[Foto dị na peeji nke 188]

Ebee ka Paradaịs ahụ Jizọs nọ na-agwa nwoke ahụ banyere ya dị?

Mata anụwo banyere nkwa ahụ Jizọs kwere nke bụ́: ‘Ndị nile nọ n’ili ncheta ga-apụta.’ (Jọn 5:28, 29) Ya mere, ‘ụbọchị ikpeazụ’ bụ mgbe a ga-eme ka ndị nile Chineke na-echeta dị ndụ ọzọ. Ụbọchị ikpeazụ a abụghị ụbọchị nke dị awa 24. Ọ ga-adị otu puku afọ. Bible na-ekwu na ‘Chineke ga-ekpe ndị nọ n’ụwa ikpe’ n’ụbọchị ahụ. Ndị ọ ga-ekpe ikpe ga-agụnye ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ.—Ọrụ 17:31; 2 Pita 3:8.

Cheedị echiche ụbọchị magburu onwe ya nke ahụ ga-abụ! N’ụbọchị a nke ga-adị otu puku afọ, a ga-eme ka ọtụtụ nde mmadụ ndị nwụworonụ dị ndụ ọzọ. Jizọs kpọrọ ebe ha ga-ebi mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ Paradaịs. Ka anyị lee ebe Paradaịs ga-adị nakwa otú ebe ahụ ga-adị.

Ihe dị ka awa atọ tupu Jizọs anwụọ n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ gwara otu nwoke a kpọgidere n’elu osisi n’akụkụ ya banyere Paradaịs. A kpọgidere nwoke ahụ n’elu osisi ka ọ nwụọ n’ihi mpụ ndị o meworo. Ma, ka onye omekome a nọ na-ekiri Jizọs ma na-anụ ihe a na-ekwu banyere Ya, ọ malitere inwe okwukwe na Jizọs. Ya mere, onye omekome ahụ sịrị: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Jizọs zara ya, sị: “N’ezie asị m gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”—Luk 23:42, 43.

[Foto dị na peeji nke 189]

Mgbe anyị gụrụ banyere Paradaịs, gịnị ka anyị kwesịrị iji uche anyị see onyinyo ya?

Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru nke a? Ebee ka Paradaịs dị?— Cheedị echiche banyere ya. Ebee ka Paradaịs dị na mbụ?— Cheta, Chineke nyere nwoke mbụ, bụ́ Adam, na nwunye ya paradaịs ka ha biri na ya n’ụwa a. A kpọrọ ya ogige Iden. E nwere anụmanụ n’ogige ahụ, ma ha emerụghị onye ọ bụla ahụ́. E nwekwara osisi ndị na-amị ọtụtụ mkpụrụ na-atọ ụtọ, nakwa nnukwute osimiri. Ọ bụ ebe mara nnọọ mma obibi!—Jenesis 2:8-10.

Ya mere, mgbe anyị gụrụ banyere onye omekome ahụ ịnọ na Paradaịs, anyị kwesịrị iji uche anyị see onyinyo otú ụwa a ga-adị mgbe a ga-eme ka ọ ghọọ ebe mara mma ibi. Jizọs ọ̀ ga-eso onye ahụ bụbu onye omekome nọrọ n’elu ala ebe a na Paradaịs?— Ee e. Ị̀ ma ihe mere na ọ gaghị anọ ebe a?—

Ọ bụ n’ihi na Jizọs ga-anọ n’eluigwe na-achị dị ka Eze na Paradaịs ahụ nke ga-adị n’ụwa. Ya mere, Jizọs na nwoke a ga-anọ n’echiche bụ́ na Jizọs ga-akpọlite ya n’ọnwụ ma na-egboro ya mkpa ya. Ma gịnị mere Jizọs ga-eji kwe ka onye bụbu onye omekome biri na Paradaịs?— Ka anyị lee ma ànyị ga-achọpụtali ihe kpatara ya.

Tupu onye omekome ahụ agwa Jizọs okwu, ọ̀ maara banyere nzube Chineke?— Ee e, ọ maghị. O mere ihe ọjọọ dị iche iche n’ihi na ọ maghị eziokwu banyere Chineke. Na Paradaịs, a ga-akụziri ya nzube Chineke. Mgbe ahụ, ọ ga-enwe ohere igosi na ya hụrụ Chineke n’anya n’ezie site n’ime uche Ya.

Jesus in his heavenly Kingdom with the 144,000

Ndị nile a kpọlitere n’ọnwụ hà ga-ebi na Paradaịs n’ụwa?— Ee e, ọ bụghị ha nile ga-ebi na ya. Ị̀ ma ihe mere na ọ bụghị ha nile ga-ebi na ya?— Ọ bụ n’ihi na a ga-akpọlite ụfọdụ n’ọnwụ iso Jizọs biri n’eluigwe. Ha ga-eso ya na-achị dị ka ndị eze n’ụwa Paradaịs. Ka anyị lee otú anyị si mara nke a.

N’abalị ahụ bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndịozi ya, sị: ‘N’ụlọ Nna m n’eluigwe, e nwere ọtụtụ ebe a ga-ebi ebi, m na-agakwa ịkwadebere unu ebe.’ Jizọs kweziri ha nkwa, sị: “M ga-abịa ọzọ, mụ onwe m ga-anabatakwa unu n’ebe obibi m, ka unu wee nọrọkwa n’ebe m nọ.”—Jọn 14:2, 3.

Ebee ka Jizọs gara mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ?— Ee, ọ laghachiri n’eluigwe ka ya na Nna ya nọrọ. (Jọn 17:4, 5) Ya mere, Jizọs kwere ndịozi ya nakwa ụmụazụ ya ndị ọzọ nkwa na ya ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha wee nwee ike iso ya nọrọ n’eluigwe. Gịnị ka ha na Jizọs ga na-eme ebe ahụ?— Bible na-ekwu na ndị na-eso ụzọ ya ndị nwere òkè ná “mbilite n’ọnwụ mbụ” ga-ebi n’eluigwe ma soro ya chịa ụwa “dị ka ndị eze ruo otu puku afọ ahụ.”—Mkpughe 5:10; 20:6; 2 Timoti 2:12.

Mmadụ ole ga-enwe òkè ná “mbilite n’ọnwụ mbụ ahụ” ma soro Jizọs chịa dị ka ndị eze?— Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu atụla egwu, ìgwè atụrụ nta, n’ihi na Nna unu akwadowo inye unu alaeze.” (Luk 12:32) Ọnụ ọgụgụ “ìgwè atụrụ nta” a a ga-akpọlite n’ọnwụ isoro Jizọs nọrọ n’Alaeze eluigwe ya, bụ ọnụ ọgụgụ a kapịrị ọnụ. Bible na-egosi na a ga-esi n’ụwa kpọlite “narị puku na iri puku anọ na anọ” n’ọnwụ.— Mkpughe 14:1, 3.

[Foto ndị dị na peeji nke 190]

Ebee ka ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-ebi, gịnịkwa ka ha ga-eme?

Mmadụ ole ga-ebi na Paradaịs n’elu ala?— Bible ekwughị. Ma Chineke gwara Adam na Iv mgbe ha nọ n’ogige Iden ka ha mụọ ụmụ jupụta ụwa. N’ezie, ha emeghị ya. Ma Chineke ga-ahụ na e mezuru nzube ya nke bụ́ ime ka ụwa jupụta ná ndị ezi mmadụ.—Jenesis 1:28; Aịsaịa 45:18; 55:11.

Cheedị echiche otú ọ ga-esi bụrụ ihe magburu onwe ya ibi na Paradaịs! Ụwa dum ga-adịzi ka ogige. Ọ ga-ejupụta ná nnụnụ na anụmanụ, osisi na ụdị okooko osisi dị iche iche ga-emekwa ka ọ maa mma. Ọ dịghị onye ga na-enwe ihe mgbu n’ihi na ọ na-arịa ọrịa, ọ dịghịkwa onye ga-anwụ. Mmadụ nile ga-abụ enyi. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime Paradaịs, ugbu a bụ oge iji kwadebe maka ya.

Gụkwuo ihe banyere nzube Chineke maka ụwa, n’Ilu 2:21, 22; Eklisiastis 1:4; Aịsaịa 2:4; 11:6-9; 35:5, 6; nakwa 65:21-24.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya