ISI NKE 37
Icheta Jehova na Ọkpara Ya
KA E were ya na mmadụ nyere gị otu onyinye pụrụ iche. Gịnị ka ị ga-eme?— Ihe ị ga-eme ọ̀ bụ nanị ịsị ya i meela mgbe ahụ chefuo onye ahụ nyere gị ihe ahụ kpam kpam? Ka ị̀ ga na-echeta onye ahụ, na-echetakwa ihe o meere gị?—
Jehova Chineke nyere anyị onyinye pụrụ iche. O zitere Ọkpara ya n’ụwa ka ọ nwụọ maka anyị. Ị̀ ma ihe mere Jizọs ga-eji nwụọ maka anyị?— Nke a bụ ihe dị oké mkpa nke anyị kwesịrị ịghọta.
Dị ka anyị mụrụ n’Isi nke 23, Adam mehiere mgbe o mebiri iwu zuru okè nke Chineke. Anyị ketakwara mmehie site n’aka Adam, bụ́ nna anyị nile. Ya mere, gịnị ka i chere dị anyị mkpa?— Ọ dị anyị mkpa inwe nna ọhụrụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, onye biri ndụ zuru okè n’ụwa. Ònye ka i chere nwere ike ịbụrụ anyị ụdị nna ahụ?— Jizọs nwere ike ịbụ ya.
Jehova zitere Jizọs n’ụwa ka o nwee ike ịghọrọ anyị nna n’ọnọdụ Adam. Bible na-ekwu, sị: “‘Nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ.’ Adam ikpeazụ ghọrọ mmụọ na-enye ndụ.” Ònye bụ Adam mbụ?— Ee, ọ bụ onye ahụ Chineke ji ájá sitere n’ala kee. Ònye bụ Adam nke abụọ?— Ọ bụ Jizọs. Bible gosiri nke a mgbe o kwuru, sị: “Nwoke mbụ ahụ [bụ́ Adam] sitere n’ala, bụrụkwa onye e ji ájá uzuzu mee; nwoke nke abụọ [bụ́ Jizọs] sitere n’eluigwe.”—1 Ndị Kọrint 15:45, 47; Jenesis 2:7.
Ebe ọ bụ na Chineke si n’eluigwe were ndụ Jizọs tinye n’ime akpa nwa nke nwanyị ahụ bụ́ Meri, Jizọs eketaghị mmehie ọ bụla site n’aka Adam. Ọ bụ ya mere Jizọs ji bụrụ mmadụ zuru okè. (Luk 1:30-35) Ọ bụkwa ya mere otu mmụọ ozi ji gwa ndị ọzụzụ atụrụ n’oge a mụrụ Jizọs, sị: “A mụụrụ unu onye nzọpụta taa.” (Luk 2:11) Ma iji bụrụ Onye Nzọpụta anyị, gịnị ka ọ dị mkpa ka nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jizọs buru ụzọ mee?— Ọ dị mkpa ka o tolite ma ghọọ nwoke tozuru okè, dị nnọọ ka Adam. Mgbe ahụ Jizọs ga-enwe ike ịghọ ‘Adam nke abụọ.’
Jizọs, bụ́ Onye Nzọpụta anyị, ga-aghọkwa “Nna [anyị] Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi.” A kpọkwara ya nke ahụ n’ime Bible. (Aịsaịa 9:6, 7) Ee, Jizọs ahụ zuru okè pụrụ ịghọ nna anyị n’ọnọdụ Adam, bụ́ onye ghọrọ onye na-ezughị okè mgbe o mehiere. Ya mere, anyị pụrụ ịhọrọ ‘Adam nke abụọ’ ka ọ bụrụ nna anyị. N’ezie, Jizọs n’onwe ya bụ Ọkpara Jehova Chineke.
Olee otú Adam na Jizọs si yie, gịnịkwa mere o ji dị oké mkpa na ha yiri?
Site n’ịbịa mara banyere Jizọs, anyị pụrụ ịnakwere ya dị ka Onye Nzọpụta anyị. Ì chetara ihe ọ dị mkpa ka a zọpụta anyị na ya?— Ee, ọ bụ site ná mmehie na ọnwụ ndị anyị ketara site n’aka Adam. A na-akpọ ndụ mmadụ zuru okè nke Jizọs chụrụ n’àjà maka anyị ihe mgbapụta. Jehova nyere ihe mgbapụta ahụ ka e wee nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị.—Matiu 20:28; Ndị Rom 5:8; 6:23.
N’ezie, anyị achọghị ichefu ihe Chineke na Ọkpara ya mewooro anyị, ka ànyị chọrọ?— Jizọs gosiri ụmụazụ ya otu ụzọ pụrụ iche nke pụrụ inyere anyị aka icheta ihe o mere. Ka anyị kwuo banyere ya.
Ka e were ya na ị nọ n’ọnụ ụlọ ahụ nke dị n’elu otu ụlọ elu dị na Jeruselem. Ọ bụ n’abalị. Jizọs na ndịozi ya nọ gburugburu otu tebụl. Anụ atụrụ a hụrụ n’ọkụ, achịcha ndị dị mbadamba, na mmanya na-acha ọbara ọbara dị n’elu tebụl ahụ. Ha na-eri nri pụrụ iche. Ị̀ ma ihe kpatara ya?—
Nri a bụ iji chetara ha ihe Jehova mere ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ mgbe ndị ya, bụ́ ụmụ Izrel, bụ ndị ohu n’Ijipt. N’oge ahụ Jehova gwara ndị ya, sị: ‘Gbuonụ otu atụrụ maka ezinụlọ ọ bụla, teekwanụ ọbara ya n’awara ụzọ nke ụlọ unu.’ Ọ sịziri: ‘Baanụ n’ime ụlọ unu, riekwanụ anụ atụrụ ahụ.’
Olee otú ọbara nwa atụrụ ahụ si chebe ndị Izrel?
Ụmụ Izrel mere ya. N’otu abalị ahụkwa, mmụọ ozi Chineke gabigara n’ala Ijipt. N’ihe ka n’ọtụtụ ụlọ, mmụọ ozi ahụ gburu nwa e bu ụzọ mụọ. Ma mgbe mmụọ ozi ahụ hụrụ ọbara nwa atụrụ n’awara ụzọ, ọ na-agafere ụlọ ahụ. N’ụlọ ndị ahụ, ọ dịghị nwatakịrị ọ bụla nwụrụnụ. N’ihi ihe mmụọ ozi Jehova mere, egwu tụrụ Fero, bụ́ eze Ijipt. Ya mere, Fero gwara ụmụ Izrel, sị: ‘Unu nweere onwe unu ịla. Sinụ n’Ijipt pụọ!’ Mgbe o kwuru nke ahụ, ha kwakọtara ngwongwo ha nile dọkwasị ha n’azụ kamel nakwa n’azụ ịnyịnya ibu ha pụọ.
Jehova achọghị ka ndị ya chefuo otú o si mee ka ha nwere onwe ha. Ya mere, ọ sịrị: ‘Otu ugboro n’afọ, unu aghaghị iri ụdị nri a unu riri n’abalị a.’ Ha kpọrọ nri a pụrụ iche Ememe Ngabiga. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Ọ bụ n’ihi na mmụọ ozi Chineke “gabigara” ụlọ ndị ahụ e tere ọbara na ha.—Ọpụpụ 12:1-13, 24-27, 31.
Jizọs na ndịozi ya nọ na-eche banyere nke a mgbe ha na-eri nri Ememe Ngabiga ahụ. Mgbe e mesịrị, Jizọs mere otu ihe dị oké mkpa. Otú ọ dị, tupu o mee ya, a chụpụrụ onyeozi ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi, bụ́ Judas. Jizọs wereziiri otu n’ime achịcha ndị ahụ fọdụrụ afọdụ, kpee ekpere, nyawaa ya, nye ya ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị ha: “Naranụ, rie.” Mgbe ahụ, ọ gwara ha sị: ‘Achịcha a na-anọchite anya ahụ́ m nke m ga-enye mgbe m ga-anwụ n’ihi unu.’
E mesịa, Jizọs buuru otu iko mmanya na-acha ọbara ọbara. Mgbe o kpesịrị ekpere ọzọ iji nye ekele, o bugharịrị ya n’etiti ha, sị: “Ṅụọnụ, unu nile.” Ọ sịkwara ha: ‘Mmanya a na-anọchite anya ọbara m. N’oge na-adịghị anya aga m awụpụ ọbara m iji mee ka unu nwere onwe unu pụọ ná mmehie unu. Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.’—Matiu 26:26-28; 1 Ndị Kọrint 11:23-26.
Gịnị ka ọbara Jizọs, nke Jizọs ji tụnyere mmanya, pụrụ imere anyị?
Ị̀ rịbara àmà na Jizọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịnọgide na-eme nke a iji na-echeta ya?— Ha agakwaghị na-eri nri Ememe Ngabiga. Kama nke ahụ, ha ga na-eri nri a pụrụ iche otu ugboro n’afọ iji cheta Jizọs na ọnwụ ya. A na-akpọ nri a Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Taa, anyị na-akpọkarị ya Ememe Ncheta. N’ihi gịnị?— N’ihi na ọ na-echetara anyị ihe Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, meere anyị.
Achịcha ahụ kwesịrị ime ka anyị na-eche echiche banyere ahụ́ Jizọs. Ọ dị njikere iji ahụ́ ya ahụ chụọ àjà ka anyị wee nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. Gịnịkwanụ maka mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara?— Nke ahụ kwesịrị ichetara anyị uru ọbara Jizọs bara. Ọ dị oké ọnụ ahịa karịa ọbara atụrụ ahụ e ji mee ihe n’Ememe Ngabiga n’Ijipt. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Bible na-ekwu na ọbara Jizọs pụrụ ime ka a gbaghara anyị mmehie anyị. Mgbe a gbaghakwaara anyị mmehie anyị nile, anyị agakwaghị na-arịa ọrịa, na-aka nká, ma na-anwụ anwụ. Anyị kwesịrị ịdị na-eche echiche banyere nke a mgbe anyị na-aga Ememe Ncheta.
Ọ̀ bụ mmadụ nile kwesịrị ịta achịcha na ịṅụ mmanya ahụ n’Ememe Ncheta?— Jizọs gwara ndị na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya ahụ, sị: ‘Unu ga-ekere òkè n’alaeze m ma soro m nọrọ n’ocheeze n’eluigwe.’ (Luk 22:19, 20, 30) Nke a pụtara na ha ga-eje eluigwe iji soro Jizọs bụrụ eze. Ya mere, ọ bụ nanị ndị nwere olileanya nke iso Jizọs chịa n’eluigwe kwesịrị ịta achịcha na ịṅụ mmanya ahụ.
Ma ọbụna ndị na-adịghị ata achịcha ahụ ma ọ bụ na-aṅụ mmanya ahụ kwesịrị ịga Ememe Ncheta. Ị̀ ma ihe kpatara ya?— Ọ bụ n’ihi na Jizọs nyere ndụ ya n’ihi anyị kwa. Site n’ịga Ememe Ncheta, anyị na-egosi na anyị echefubeghị nke ahụ. Anyị na-echeta onyinye pụrụ iche Chineke nyere anyị.
Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi mkpa àjà mgbapụta Jizọs dị na-agụnye 1 Ndị Kọrint 5:7; Ndị Efesọs 1:7; 1 Timoti 2:5, 6; nakwa 1 Pita 1:18, 19.