ISI NKE 46
Mmiri Ebibie Otu Ụwa—Ọ̀ Ga-eme Ọzọ?
Ị̀ NỤTỤWO ka mmadụ na-ekwu okwu banyere ọgwụgwụ ụwa?— Taa ọtụtụ ndị na-ekwu banyere ya. Ụfọdụ ndị na-eche na a ga-ebibi ụwa site n’agha ụmụ mmadụ ga-eji bọmbụ nuklia lụọ. Ị̀ na-eche na Chineke ga-ebibi ụwa anyị mara mma nakwa mbara igwe anyị mara mma na kpakpando ya ndị na-egbuke egbuke?—
Dị ka anyị mụrụ, Bible na-agwa anyị banyere ọgwụgwụ ụwa. Bible na-ekwu, sị: “Ụwa na-agabiga.” (1 Jọn 2:17) Ì chere na ọgwụgwụ ụwa ga-apụta ibibi elu ala?— Ee e, Bible na-ekwu na Chineke kere elu ala ‘ka e wee biri n’ime ya,’ ee, ka ndị mmadụ biri n’ime ya ma nweta obi ụtọ site n’ibi n’ime ya. (Aịsaịa 45:18) Abụ Ọma 37:29 na-ekwu, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” N’ihi nke a, Bible na-ekwukwa na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 104:5; Eklisiastis 1:4.
Ya mere, ọ bụrụ na ọgwụgwụ ụwa apụtaghị na a ga-ebibi elu ala, gịnị ka ọ pụtara?— Anyị pụrụ ịchọpụta ihe ọ pụtara ma ọ bụrụ na anyị eleruo anya nke ọma n’ihe mere n’oge Noa. Bible na-akọwa, sị: “Ụwa nke oge ahụ bịara ná mbibi mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya.”—2 Pita 3:6.
Ọ̀ dị onye ọ bụla dị ndụ gabiga ọgwụgwụ ụwa ahụ n’oge Iju Mmiri ahụ, n’oge Noa?— Bible na-ekwu na Chineke “chebere Noa, onye na-ekwusa ezi omume, ya na mmadụ asaa ndị ọzọ mgbe o wetara iju mmiri n’elu ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 2:5.
Olee ụwa nke e bibiri n’oge Noa?
Ya bụrụ otú ahụ, oleezi ụwa nke bịara ná njedebe? Ọ̀ bụ elu ala, ka ọ̀ bụ ndị ajọ mmadụ?— Bible na-ekwu na ọ bụ “ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” Rịbakwa ama na a kpọrọ Noa ‘onye na-eme nkwusa.’ Gịnị ka i chere ọ na-ekwusa?— Noa nọ na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ọgwụgwụ “ụwa nke oge ahụ.”
Mgbe Jizọs kwuru banyere oké Iju Mmiri ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị mmadụ nọ na-eme tupu ọgwụgwụ ahụ abịa. Lee ihe ọ gwara ha: “N’ụbọchị ndị bu iju mmiri ahụ ụzọ, [ndị mmadụ nọ] na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.” Jizọs kwuziri na ndị mmadụ ga na-eme ihe ndị dị otú ahụ tupu ụwa a abịa ná njedebe ya.—Matiu 24:37-39.
Ihe Jizọs kwuru na-egosi na anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ihe ndị mmadụ nọ na-eme tupu Iju Mmiri ahụ abịa. Site n’ịgụ Isi nke 10 nke akwụkwọ a, ì chetara ihe ha mere?— Ụfọdụ ndị ikom nọ na-emegbu ndị na-adịghị ike, na-emekwa ihe ike. Ma Jizọs kwuru na ọtụtụ ndị ọzọ egeghị ntị ma ọlị mgbe Chineke zipụrụ Noa ka o kwusaara ha ozi ọma.
Ya mere, o ruru otu oge, Jehova wee gwa Noa na Ya gaje iji iju mmiri bibie ndị ajọ mmadụ ahụ. Mmiri ga-ekpuchi elu ala nile, ọbụna ugwu nile. Jehova gwara Noa ka o wuo otu nnukwute ụgbọ. O yiri nnukwute igbe dị ogologo, dị ka ị pụrụ ịhụ ma ị sapeta ihe osise dị na peeji nke 238.
Chineke gwara Noa ka o wuo ụgbọ ahụ ka o buo ibu nke na ọ ga-abata ya na ezinụlọ ya na ọtụtụ ụmụ anụmanụ, n’enweghị ihe ọ bụla ga-eme ha n’ime ya. Noa na ezinụlọ ya rụsiri ọrụ ike. Ha gbuturu osisi ndị buru ibu, jirikwa osisi ndị ahụ malite iwu ụgbọ ahụ. Nke a were ọtụtụ afọ n’ihi na ụgbọ ahụ buru nnukwute ibu.
Ì chetara ihe ọzọ Noa nọ na-eme n’afọ ahụ nile ọ nọ na-ewu ụgbọ ahụ?— Ọ nọ na-eme nkwusa, na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere Iju Mmiri ahụ na-abịanụ. Ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime ha gere ntị? Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha gere ntị ma e wezụga ezinụlọ Noa. Ndị ọzọ nọ na-emere onwe ha ihe ndị ọzọ. Ì chetara ihe Jizọs sị na ha nọ na-eme?— Ha nọ na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-alụkwa di na nwunye. Ha echeghị na ha bụ ndị ajọ mmadụ, ha ewepụtaghịkwa oge ṅaa Noa ntị. Ya mere, ka anyị lee ihe mere ha.
Mgbe Noa na ezinụlọ ya banyesịrị n’ime ụgbọ ahụ, Jehova mechiri ụzọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị nọ n’èzí ekwetaghị na a ga-enwe Iju Mmiri. Ma, na mberede, mmiri malitere izo site n’eluigwe! Ọ bụghị mmiri ozuzo nkịtị. Ọ bụ oké mmiri ozuzo! N’oge na-adịghị anya, mmiri ahụ ghọrọ nnukwute osimiri, na-emekwa oké mkpọtụ. Ọ kwaturu nnukwu osisi dị iche iche, kwapụkwa nnukwute nkume dị iche iche dị ka a ga-asị na ha bụ ụmụ obere okwute. Gịnịkwanụ banyere ndị na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ?— Jizọs sịrị: “Iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.” Ndị nile na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ nwụrụ. N’ihi gịnị?— Dị ka Jizọs kwuru, “ha amaghịkwa.” Ha egeghị ntị!—Matiu 24:39; Jenesis 6:5-7.
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịdị na-eche echiche nanị banyere ikpori ndụ?
Ọ dị mma, cheta na Jizọs kwuru na ihe mere ndị ahụ bụ ihe mmụta nye anyị taa. Olee ihe anyị pụrụ ịmụta na ya?— E bibiri ndị mmadụ, ọ bụghị nanị n’ihi na ha bụ ndị ajọ mmadụ kama n’ihi na ọtụtụ n’ime ha ji ọrụ n’aka nke na ha enweghị ohere ịmụ banyere Chineke na banyere ihe ọ gaje ime. Ọ dị mkpa ka anyị kpachara anya ka anyị ghara ịdị ka ha, ọ̀ bụ na ọ dịghị?—
Ì chere na Chineke ga-eji iju mmiri bibie ụwa ọzọ?— Ee e, Chineke kwere nkwa na ya agaghị eji ya bibie ụwa ọzọ. Ọ sịrị: “Eke na ogwurugwu m ka m tinyeworo n’igwe ojii, ọ ga-aghọkwa ihe ịrịba ama.” Jehova kwuru na eke na ogwurugwu ga-abụ ihe ịrịba ama na “mmiri agaghị aghọkwa iju mmiri ọzọ ibibi anụ ahụ́ nile.”—Jenesis 9:11-17.
Ya mere, anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke agaghị eji iju mmiri bibie ụwa ọzọ. Ma, dị ka anyị hụworo, Bible kwuru okwu banyere ọgwụgwụ ụwa. Mgbe Chineke ga-ebibi ụwa a, olee ndị ọ ga-edebe ndụ?— Ọ̀ ga-abụ ndị nwere mmasị n’ihe ndị ọzọ nke na ọ dịghị mgbe ha chọrọ ịmụ banyere Chineke? Ọ̀ ga-abụ ndị ji ọrụ n’aka mgbe nile nke na ha enweghị ohere iji mụọ Bible? Gịnị ka i chere?—
Anyị chọrọ iso ná ndị Chineke ga-edebe ndụ, ọ̀ bụ na anyị achọghị?— Ọ́ gaghị abụ ihe magburu onwe ya ma ọ bụrụ na ezinụlọ anyị ga-enwe ike ịdị ka nke Noa ka Chineke wee zọpụta anyị nile?— Ọ bụrụ na anyị ga-adị ndụ gafere ọgwụgwụ ụwa, ọ dị anyị mkpa ịghọta otú Chineke ga-esi bibie ya ma weta ụwa ọhụrụ ya nke ezi omume. Ka anyị lee otú ọ ga-esi mee nke a.
Bible nyere anyị azịza ya na Daniel isi 2, amaokwu 44. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ekwu banyere oge anyị mgbe ọ sịrị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze [ma ọ bụ, ọchịchị] bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”
Ị̀ ghọtara ya?— Bible na-ekwu na ọchịchị Chineke ga-ebibi ọchịchị nile dị n’ụwa. N’ihi gịnị?— N’ihi na ha adịghị erubere Onye ahụ Chineke mere Eze isi. Ònyekwanụ bụ onye ahụ?— Ee, ọ bụ Jizọs Kraịst!
Jizọs Kraịst, Eze Chineke họpụtara, ga-ebibi ụwa a n’Amagedọn
Jehova Chineke nwere ikike ikpebi ụdị ọchịchị kwesịrị ịdị na-achị, ọ họrọwokwa Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ịbụ Eze. N’isi nso Onye Ọchịchị nke Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-ebute ụzọ n’ibibi ọchịchị nile nke ụwa a. Ná Mkpughe isi 19, amaokwu 11 ruo nke 16, Bible na-akọwa otú ọ ga-adị mgbe ọ ga na-eme otú ahụ, ọbụna dị ka ihe osise a na-egosi. N’ime Bible, a kpọrọ agha Chineke ga-eji bibie ọchịchị nile nke ụwa Ha-Magedọn, ma ọ bụ Amagedọn.
Ugbu a, Chineke na-ekwu na Alaeze ya ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ. Ma, ọ̀ sịrị anyị bibie ha?— Ee e, n’ime Bible, a kpọrọ Amagedọn “agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Mkpughe 16:14, 16) Ee, Amagedọn bụ agha Chineke, ọ ga-ejikwa Jizọs Kraịst mee ihe dị ka onye ndú nke usuu ndị agha nke eluigwe n’agha ahụ. Agha Amagedọn ọ̀ dị nso? Ka anyị lee otú anyị pụrụ isi chọpụta.
Ka anyị gụkọọ banyere mgbe Chineke ga-ekpochapụ ndị ajọ mmadụ nile ma zọpụta ndị na-ejere ya ozi, n’Ilu 2:21, 22; Aịsaịa 26:20, 21; Jeremaịa 25:31-33; nakwa na Matiu 24:21, 22.