Ihe Dị Ụmụaka Mkpa Inweta n’Aka Ndị Mụrụ Ha
NDỊ nne na nna nile na-ekere òkè n’otu ihe omume nke karịrị nghọta ụmụ mmadụ. Onye ọ bụla n’ime ha na-atụnye otu akụkụ nke onwe ya na ya. N’ihi ya, ihe na-etolite n’ime akpa nwa nke nne bụ onye dị ndụ nke akụkụ ahụ́ ya nile zuru ezu. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe a mụrụ nwa ọhụrụ, ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ “ọrụ ebube nke ịmụ nwa.”
N’eziokwu, ịmụ ụmụ bụ nanị mmalite nke ibu ọrụ nke ndị nne na nna. Ná mmalite, ụmụ ọhụrụ na-adabere, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kpam kpam, ná nlekọta nke ndị mụrụ ha, ma ka ha na-etolitekwu, ha na-achọ ihe karịrị nlekọta nkịtị. Enyemaka dị ha mkpa iji tolite nke ọma n’uche, n’ụzọ mmetụta uche, n’ụzọ omume, nakwa n’ụzọ ime mmụọ.
Iji tolite nke ọma, ịhụnanya nke ndị nne na nna dị ụmụaka mkpa karịsịa. Ọ bụ ezie na iji ọnụ na-ekwupụta ịhụnanya ha nwere n’ebe ha nọ dị mkpa, ọ dị mkpa ka ha na-egosipụtakwa nke a n’omume. Ee, ihe nlereanya dị mma nke ndị nne na nna dị ụmụaka mkpa. Nduzi n’ihe banyere omume nakwa ụkpụrụ ndị ha ga-eji na-ebi ndụ dị ha mkpa. Ihe ndị a dịkwa ha mkpa malite n’oge ha dị ntakịrị. Ihe ndị na-agbari obi pụrụ ime, ha na-emekwa, mgbe ụmụaka na-enwetaghị enyemaka dị ha mkpa n’oge.
Ụkpụrụ ndị dị n’ime Bible bụ ụkpụrụ kasị mma a pụrụ ịchọta ebe ọ bụla. Ntụziaka nke dabeere na Bible bara uru n’ụzọ na-enweghị atụ. Site n’inye ha ntụziaka dị otú ahụ, ụmụaka na-abịa ghọta na ihe a na-agwa ha abụghị ihe mmadụ kwuru, kama ọ bụ ihe Onye Okike ha, bụ́ Nna ha nke eluigwe, kwuru. Nke a na-eme ka ha were ndụmọdụ ahụ dị ka nke dị oké mkpa.
Bible na-agba ndị nne na nna ume ka ha na-arụsi ọrụ ike iji kụbanye ụkpụrụ ndị kwesịrị ekwesị n’uche ụmụ ha. Otú ọ dị, ka ụmụaka na-etolite, ọtụtụ mgbe ọ na-esiri ndị nne na nna ike iso ha na-ekwurịta ihe ndị kasị mkpa. E mere akwụkwọ a bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ iji nye aka gbochie ọnọdụ dị otú a. Ọ ga-eme ka gị na ụmụ gị nwee ihe ime mmụọ unu ga na-agụkọ ọnụ. Tụkwasị na nke ahụ, o kwesịrị ịkpalite nkwurịta okwu n’etiti ndị na-eto eto na ndị na-agụrụ ha akwụkwọ a.
Ị ga-achọpụta na akwụkwọ a chọrọ ka ụmụaka na-aza ajụjụ ụfọdụ. E nwere ọtụtụ ajụjụ ndị dị n’ebe ndị kwesịrị ekwesị n’akwụkwọ a. Mgbe i rutere n’ajụjụ ndị a, ị ga-ahụ otu akara ùhiè (—). Nke a bụ ihe na-echetara gị ka ị kwụsịtụ ma gbaa nwatakịrị ahụ ume ka o kwuo uche ya. Ụmụaka na-enwe mmasị ịdị na-etinye ọnụ. Ọ bụrụ na ha adịghị etinye ọnụ, n’egbughị oge ha ga-akwụsị inwe mmasị.
Otú ọ dị, nke ka mkpa bụ na ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ịmata ihe dị nwatakịrị ahụ n’obi. N’eziokwu, nwatakịrị nwere ike ịza ihe na-ezighị ezi. Ma ihe ndị e dere mgbe ajụjụ nke ọ bụla gasịrị bụ iji nyere nwatakịrị ahụ aka ịzụlite ikike iche echiche nke dị mma.
Otu ihe pụrụ iche n’akwụkwọ a bụ ihe osise karịrị 230 ndị dị n’ime ya. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihe osise ndị a nwere okwu nkọwa ndị chọrọ ka nwatakịrị ahụ kwuo ihe o chere banyere ha dabere n’ihe ọ na-ahụ na ihe ọ gụworo. Ya mere, soro nwatakịrị ahụ tụlee ihe osise ndị ahụ. Ha pụrụ ịbụ ngwá ọrụ dị mma iji zie ihe, nke pụrụ ime ka ihe mmụta dị na ha bamie abamie n’ime obi ya.
Mgbe nwatakịrị mụtara ịgụ ihe, gbaa ya ume ịdị na-agụrụ gị akwụkwọ a nakwa ịdị na-agụpụtara ya onwe ya. Ka ọ na-agụkwu ya, otú a ka ndụmọdụ mara mma ndị dị n’ime ya ga na-abamikwu n’uche ya nakwa n’obi ya. Ma iji mee ka nkekọ ịhụnanya na nkwanye ùgwù nke dị n’etiti gị na nwa gị sikwuo ike, gbalịsie ike ka unu na-agụkọ akwụkwọ a ọnụ, na-agụchikwa ya anya.
N’ụzọ yiri ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche n’ime iri afọ ole na ole gara aga, a na-eme ka ụmụaka na-ahụ ma na-etinye aka ná mmekọahụ rụrụ arụ, mgbaasị, na omume ndị ọzọ jọgburu onwe ha. Ya mere, nchebe dị ha mkpa, bụ́ ihe akwụkwọ a na-enye aka eme ka ha nweta n’ụzọ ùgwù dị na ya nakwa n’ezoghị ọnụ. Ma, ọ dị mkpa karịsịa ka a dọrọ uche ụmụaka gaa n’ebe Isi Iyi nke amamihe nile nọ, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, Jehova Chineke. Nke a bụ ihe Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, mere mgbe nile. Anyị na-enwe olileanya n’ezie na akwụkwọ a ga-enyere gị na ezinụlọ gị aka ịkpụzi ndụ unu iji na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ, n’ụzọ ga-ewetara unu ngọzi ebighị ebi.