ISI MBỤ
Ozi Jehova Maka Oge Gara Aga Nakwa Ugbu A
1, 2. Olee otú ụfọdụ ndị siworo chọọ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ndị zoro ezo, ma gịnị pụrụ inyere gị aka inweta obi ụtọ ná ndụ?
KEMGBE ọtụtụ afọ, ọtụtụ ndị anọwo na-enwe olileanya ịchọta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ndị dị n’ime ala. Ị̀ gụtụla akụkọ banyere ndị na-eme nchọpụta, na ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie, tinyere ndị ọzọ ndị chọrọ ụdị akụ̀ ndị ahụ? Ọ bụ ezie na e nwere ike ị gaghị aga chọwa akụ̀ dị otú ahụ n’onwe gị, ọ́ bụrụkwanụ na ị hụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa? Obi ga-atọgbu gị atọgbu ma ọ bụrụ na akụ̀ ahụ ga-enwe ike ime ka ndụ gị ka mma ma ọ bụ mee ka i nwekwuo obi ụtọ na afọ ojuju ná ndụ!
2 Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ adịghị aga chọwa akụ̀ dị oké ọnụ ahịa, kama ha na-achọ inweta obi ụtọ site n’ịchụ ego, ịgbalị inwe ezi ahụ́ ike, na ịgbalị ime ka alụmdi na nwunye ha bụrụ nke na-enye obi ụtọ. Ihe ndị a bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ndị a na-adịghị enweta site n’igwu ala. Ọ dịghịkwa map nkịtị nke na-egosi ebe a pụrụ igwute ha. Dịkwa ka ị maara, mmadụ aghaghị itinye mgbalị iji nweta ha. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ji enwe ekele mgbe e nyere ha ezigbo ndụmọdụ banyere otú ha ga-esi ruo ihe mgbaru ọsọ ha ma nwekwuo ihe ịga nke ọma na obi ụtọ ná ndụ.
3, 4. Olee ebe ị pụrụ inweta ndụmọdụ bara uru banyere otú e si ebi ndụ?
3 Ị pụrụ inweta ezigbo ndụmọdụ, ee, nduzi nke nyewooro ndị ọzọ aka inwekwu obi ụtọ. Dị ka ọtụtụ ndị chọpụtaworo, Baịbụl na-enye ndụmọdụ kasị mma banyere otú e si ebi ndụ. Charles Dickens, bụ́ onye England na-ede akwụkwọ, dere banyere Baịbụl, sị: ‘Ọ bụ akwụkwọ kasị mma n’akwụkwọ niile e bipụtatụworo ma ọ bụ nke a ga-ebipụta n’ụwa . . . n’ihi na ọ na-akụzi ihe ndị kasị mma bụ́ ndị pụrụ iduzi mmadụ ọ bụla.’
4 Okwu ahụ abụghịrị ndị niile weere Baịbụl dị ka akwụkwọ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke ihe ijuanya. Ma eleghị anya, i kweere okwu ahụ na-emesi obi ike nke anyị na-agụ na 2 Timoti 3:16, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume.” E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, Baịbụl nwere ihe ọmụma bara uru nke pụrụ ịkụziri ndị mmadụ ụzọ isi na-ebi ndụ n’agbanyeghị nsogbu ndị jupụtara n’ụwa taa. Ndị ji Baịbụl eduzi ihe ha na-eme pụrụ inwe ezi obi ụtọ na afọ ojuju ná ndụ karị.
5-7. Olee akụkụ Baịbụl ndị ị pụrụ ịga na ha iji nweta nduzi bara uru?
5 Otú ọ dị, olee akụkụ Baịbụl ndị na-agbata gị n’uche dị ka ebe ị pụrụ inweta ụdị ndụmọdụ ahụ? Uche ụfọdụ ndị pụrụ ịga n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, bụ́ ebe Jizọs nyere ndụmọdụ ndị dị irè banyere akụkụ dịgasị iche iche nke ndụ a na-ebi kwa ụbọchị. Uche ndị ọzọ ga-agbaga n’akwụkwọ dị iche iche Pọl onyeozi dere. Onye ọ bụla pụkwara inweta ndụmọdụ bara uru n’Abụ Ọma nakwa n’Ilu—akwụkwọ ndị jupụtara n’amamihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na, dabere n’ọnọdụ gị ma ọ bụ nsogbu ndị i nwere, akwụkwọ ọ bụla dị n’ime Baịbụl bara uru, ọbụna akwụkwọ Baịbụl ndị bụ́ akụkọ, dị ka ihe atụ, malite n’akwụkwọ Jọshụa ruo n’Esta. Ihe mmụta ndị bụ́ ihe ịdọ aka ná ntị dị n’akụkọ ndị e dere na ha maka onye ọ bụla chọrọ inweta obi ụtọ n’ijere Chineke ozi. (1 Ndị Kọrịnt 10:11) N’ezie, akwụkwọ ndị ahụ na-enye ndụmọdụ ndị pụrụ iduzi gị n’ihe ndị ị na-eme nakwa n’ime ka ihe gaziere gị ná ndụ. Cheta okwu a nke bụ́ eziokwu: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.”—Ndị Rom 15:4; Jọshụa 1:8; 1 Ihe E Mere 28:8, 9.
6 Otú ọ dị, e nwere otu akụkụ Baịbụl nke ọtụtụ ndị na-adịghị agụkebe, bụ́ ebe anyị pụrụ ịchọta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụ akwụkwọ iri na abụọ, nke ndị ụfọdụ na-akpọ Obere Ndị Amụma. N’ihe ka n’ọtụtụ Baịbụl, a na-enweta ha ma a gafesịa akwụkwọ Baịbụl ndị ka ha buo ibu, ya bụ, Ezikiel na Daniel. A na-enweta ha tupu e ruo n’Oziọma Matiu. (N’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ Baịbụl, usoro e ji depụta akwụkwọ iri na abụọ a bụ: Hosia, Joel, Emọs, Obedaya, Jona, Maịka, Nehọm, Habakọk, Zefanaya, Hagaị, Zekaraya, na Malakaị.) Dị ka anyị hụworo, e dere Baịbụl site n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bakwara uru maka iji ya na-ezi ihe na iji ya na-egosi ndị mmadụ ụzọ isi na-ebi ndụ. Nke a ọ̀ gụnyere Akwụkwọ ndị a?
7 N’ezie, ọ gụnyere ha! N’eziokwu, akwụkwọ ndị ahụ ụfọdụ ndị na-akpọ akwụkwọ Obere Ndị Amụma nwere akụ̀ dị oké ọnụ ahịa bụ́ ndị bara ezigbo uru maka igosi anyị otú e si adị ndụ taa. Iji ghọta ihe mere ụfọdụ ndị ji eleghara akwụkwọ ndị a anya, cheedị echiche ihe a na-akpọ akwụkwọ iri na abụọ ahụ n’ọtụtụ asụsụ: Obere Ndị Amụma. Ihe a a na-akpọ akwụkwọ ndị a ọ̀ pụrụ imetụta otú ndị mmadụ si ele ha anya? Ọ̀ pụrụ ịbụ na o metụtawo otú i si ele ha anya?
“OBERE NDỊ AMỤMA” AHỤ HÀ DỊ OBERE N’EZIOKWU?
8. (a) Olee otu ụzọ dị mkpa Chineke siworo na-enye anyị nduzi? (b) Gịnị ka a na-akpọ akwụkwọ iri na abụọ ahụ anyị na-ekwu okwu ha, ma olee echiche aha ahụ na-enye?
8 Pọl onyeozi malitere akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru site n’ikwu, sị: “Chineke, onye si n’ọtụtụ ụzọ gwa nna nna anyị hà okwu ọtụtụ mgbe n’ogologo oge gara aga site n’ọnụ ndị amụma, agwawo anyị okwu n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a site n’ọnụ Ọkpara ya.” (Ndị Hibru 1:1, 2) Ebe Chineke si n’ọnụ ndị amụma bụ́ mmadụ na-ezi ozi ya, anyị ekwesịghị iwere onye ọ bụla n’ime ndị amụma ahụ dị ka onye dị “obere” ma ọ bụ were ihe ha dere dị ka “obere” ihe. Ka o sina dị, aha bụ́ “Obere Ndị Amụma” emewo ka ụfọdụ ndị were ihe e dere n’ime akwụkwọ ndị ahụ dị ka obere ihe nakwa ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Ndị ọzọ ekpebiwo na ozi ndị dị n’akwụkwọ ndị a adịrughị mkpa ka ndị dị n’akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl. Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na ihe mere e ji akpọ akwụkwọ iri na abụọ ndị a “Obere Ndị Amụma”a dị ka ọ dị n’ọtụtụ asụsụ bụ naanị n’ihi na ha aharughị ka ụfọdụ ndị ọzọ.
9. Gịnị mere na ọ bụghị otú akwụkwọ Baịbụl hà na-egosi otú ọ baruru uru?
9 Ọ bụrụ na otu akwụkwọ Baịbụl dị ntakịrị, ọ bụghị ihe na-egosi otú ọ dịruru mkpa ma ọ bụ uru ọ baara gị. Akwụkwọ Rut etorughị ogologo ka akwụkwọ ndị bu ya ụzọ na ndị na-esote ya, ma, lee ihe ọmụma na-emetụ n’ahụ́ nke dị n’ime ya! Ntakịrị akwụkwọ ahụ na-emesi ike mkpa ọ dị ka anyị raparasie ike n’ezi ofufe. Ọ na-egosi na Chineke ji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe nke ukwuu, ọ kọkwaara anyị irighiri ihe ndị dị oké mkpa banyere usoro ọmụmụ Jizọs. (Rut 4:17-22) E nwere ihe atụ ọzọ ná ngwụcha ngwụcha Baịbụl. N’ebe ahụ ka ị ga-ahụ akwụkwọ Jud. Ọ dị nnọọ ntakịrị nke na n’ime Baịbụl ụfọdụ, o rughị otu peeji. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere oké ihe ọmụma na nduzi bara oké uru n’ime ya, ya bụ, otú Chineke si mesoo ndị mmụọ ọjọọ, ịdọ aka ná ntị banyere ndị ọjọọ ndị na-abata n’ọgbakọ, na agbamume o nyere ka anyị gbasie mgba ike maka okwukwe ahụ! Ị pụkwara ijide n’aka na ihe e dere n’akwụkwọ ndị ahụ a na-akpọ akwụkwọ Obere Ndị Amụma adịghị obere, ha abụghịkwa ndị na-abachaghị uru, ọ bụ ezie na akwụkwọ ndị ahụ dị ntakịrị.
OLEE OTÚ HA SI BỤRỤ AKWỤKWỌ AMỤMA?
10, 11. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị pụrụ iche banyere okwu bụ́ “ndị amụma”? (b) Dị ka Baịbụl na-egosi, olee ndị bụ ndị amụma, gịnịkwa ka ha mere?
10 Ihe ọzọ a ga-atụle bụ okwu ndị bụ́ “ndị amụma” na “amụma.” Okwu ndị a pụrụ ichetara anyị banyere ibu amụma ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọtụtụ ndị na-eche na onye amụma bụ naanị onye na-ekwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu—ma eleghị anya jiri okwu ndị dị omimi, ndị ga-achọ ka a kọwaa ha akọwa, na-ekwu ha. Nke a na-emetụta otú ụfọdụ ndị si ele akwụkwọ iri na abụọ ahụ anya.
11 N’eziokwu, ka ị na-agụ akwụkwọ iri na abụọ a, ị ga-achọpụta ozugbo na amụma jupụtara na ha, ọtụtụ n’ime ha bụkwa banyere ọbịbịa nke oké ụbọchị Jehova. Nke ahụ kwekọrọ n’ihe bụ́ isi okwu ahụ bụ́ “onye amụma” pụtara. Onye amụma bụ onye ya na Chineke na-emekọrịta ihe n’ụzọ chiri anya, bụrụkwa onye ọ na-esikarị n’aka ya ekpughe ihe ga-eme n’ọdịnihu. Malite n’Inọk, ọtụtụ ndị amụma e kwuru banyere ha n’ime Baịbụl kwuru ihe ga-eme n’ọdịnihu.—1 Samuel 3:1, 11-14; 1 Ndị Eze 17:1; Jeremaya 23:18; Ọrụ 3:18; Jud 14, 15.
12. Olee otú ị pụrụ isi gosi na ịbụ onye amụma abụghị naanị ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu?
12 Otú ọ dị, anyị kwesịrị iburu n’uche na ọrụ ndị amụma Jehova abụghị naanị ikwu ihe Chineke kwuru nke ga-eme n’ọdịnihu. Ọtụtụ mgbe, Chineke ji ndị amụma mere ọnụ na-ekwuchitere ya n’ịgwa ndị mmadụ uche ya. Dị ka ihe atụ, e nwere ike anyị agaghị eche banyere Ebreham, Aịzik, na Jekọb dị ka ndị kwuru ihe ga-eme n’ọdịnihu, ma Abụ Ọma 105:9-15 gụnyere ha ná ndị amụma. Mgbe ụfọdụ, Chineke ji ha kpughee ihe ga-eme n’ọdịnihu, dị ka mgbe Jekọb gọziri ụmụ ya ndị ikom. Ndị nna ochie ahụ bụkwa ndị amụma n’ihi na ha gwara ezinụlọ ha ihe Jehova kwuru banyere òkè ha ga-ekere n’imezu nzube Chineke. (Jenesis 20:7; 49:1-28) Ihe ọzọ na-egosi na okwu Baịbụl ahụ bụ́ “onye amụma” nwere ọtụtụ ihe ọ pụtara bụ eziokwu ahụ bụ́ na Erọn jere ozi dị ka onye amụma Mozis. Erọn rụrụ ọrụ dị ka onye amụma site n’ịbụ onye na-ekwuchitere Mozis, ma ọ bụ “ọnụ” ya.—Ọpụpụ 4:16; 7:1, 2; Luk 1:17, 76.
13, 14. (a) Nye ihe atụ iji gosi na ọ bụghị naanị amụma ka ndị amụma buru. (b) Olee otú ọ ga-esi bara gị uru ịmara na ihe ndị amụma ahụ mere abụghị naanị ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu?
13 Cheekwa echiche banyere ndị amụma bụ́ Samuel na Netan. (2 Samuel 12:25; Ọrụ 3:24; 13:20) Jehova si n’ọnụ ha abụọ kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu. O mekwara ka ha rụọ ọrụ dị ka ndị amụma n’ụzọ ndị ọzọ. Dị ka onye amụma, Samuel gbara ndị Izrel ume ka ha kwụsị ife arụsị ma maliteghachi ofufe dị ọcha. O kwupụtakwara ikpe Chineke mara Eze Sọl, bụ́ nke na-akụziri anyị na Jehova ji nrubeisi kpọrọ ihe karịa iji ihe onwunwe achụrụ ya àjà. Ee, ọrụ Samuel dị ka onye amụma gụnyere ikwupụta echiche Chineke banyere ụzọ e kwesịrị isi na-ebi ndụ. (1 Samuel 7:3, 4; 15:22) Netan onye amụma buru amụma na Sọlọmọn ga-ewu ụlọ nsọ nakwa na a ga-eme ka alaeze ya guzosie ike. (2 Samuel 7:2, 11-16) Ma Netan rụkwara ọrụ dị ka onye amụma mgbe o kpughere mmehie Devid na Bat-shiba mere nakwa ihe ọjọọ Devid mere Yuraya. Ọ̀ dị onye ga-echezọ otú Netan si mee ka a mara iko Devid kwara? O nyere ihe atụ banyere otu ọgaranya nke weere naanị otu nwa atụrụ nke otu ogbenye nwere, nke ọ hụkwara n’anya. Netan sokwa hazie ezi ofufe n’ụlọ nsọ Chineke.—2 Samuel 12:1-7; 2 Ihe E Mere 29:25.
14 Isi ihe a na-ekwu bụ na anyị ekwesịghị iwere ozi ndị e dekọrọ n’akwụkwọ amụma ndị a naanị dị ka ozi amụma ndị na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. N’ime ha, e dekọkwara ihe dị iche iche Chineke kwuru banyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, gụnyere ihe ndị magburu onwe ha bụ́ ndị na-eme ka anyị mata otú ndị Chineke n’oge ahụ kwesịrị isi bie ndụ, na otú anyị onwe anyị taa kwesịrị isi na-ebi ndụ. N’ezie, obi siri anyị ike na ihe ndị dị n’ime Baịbụl, gụnyere akwụkwọ iri na abụọ ndị a, bara ezigbo uru, bụrụkwa ihe ndị a pụrụ itinye n’ọrụ. Ha na-enyere ndị mmadụ aka ịhụ ụzọ kasị mma isi na-ebi ndụ. Akwụkwọ ndị a e dere site n’ike mmụọ nsọ na-enye anyị nduzi bara uru, ndị pụrụ inyere anyị aka ‘ka anyị na-ebi ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.’—Taịtọs 2:12.
ỤZỌ ISI RITE URU
15, 16. (a) Olee ihe atụ ụfọdụ ndị dị n’akwụkwọ “Obere Ndị Amụma” ahụ? (b) Olee nkọwa ndị bụ́ amụma ndị dị n’akwụkwọ ndị ahụ?
15 E nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi rite uru n’ịgụ Okwu Chineke e dere site n’ike mmụọ nsọ. Akwụkwọ Baịbụl ụfọdụ na-akọrọ anyị ihe mere n’otu oge. Ụfọdụ bụ uri, nke ọ bụla bara uru n’ụdị nke ya. N’akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ, e ji ihe atụ ma ọ bụ ihe nnọchianya mee ihe n’ụzọ pụtara ìhè, dị ka ọ dị n’akwụkwọ iri na abụọ a. Dị ka ihe atụ, Jizọs ji ihe e kwuru n’akwụkwọ Jona mee ihe mgbe O kwuru, sị: “Ọgbọ ọjọọ nke na-akwa iko na-achọ ihe ịrịba ama, ma ọ dịghị ihe ịrịba ama a ga-enye ya ma ọ́ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona onye amụma. N’ihi na dị nnọọ ka Jona nọrọ n’afọ nnukwu azụ̀ ụbọchị atọ, ehihie na abalị, otú ahụ ka Nwa nke mmadụ ga-anọ n’ime ala ụbọchị atọ, ehihie na abalị. Ndị ikom Ninive ga-ebili n’oge ikpe, ha na ọgbọ a, ha ga-amakwa ya ikpe; n’ihi na ha chegharịrị n’ihe Jona kwusara, ma, lee! e nwere onye ka Jona n’ebe a.”—Matiu 12:39-41.
16 O doro anya na Jizọs ewereghị akwụkwọ Jona naanị dị ka akụkọ banyere otú Chineke si meso Jona, na ọrụ onye amụma ahụ rụrụ na Ninive nakwa ihe mere mgbe Jona kwusara ozi ịdọ aka ná ntị nke Chineke. Jizọs ghọtara na ọrụ Jona onye amụma rụrụ bụ ihe atụ nke na-arụtụ aka n’ebe Jizọs Kraịst nọ, n’ọnwụ ọ ga-anwụ nakwa ná mkpọlite a ga-akpọlite ya n’ụbọchị nke atọ. Ọzọkwa, ihe ndị Ninive mere mere ka a hụ ihe dị iche—ihe dị iche n’omume nke ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu n’ihe banyere ozi ọma Jizọs kwusara nakwa n’ọrụ ndị ọ rụrụ. (Matiu 16:4) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, anyị ghọtara na ihe dị n’ime akwụkwọ iri na abụọ ndị a bụ nkọwa ndị bụ́ amụma ndị kwuru banyere otú Chineke si emeso ndị ya n’oge a. Ịmụ ihe ndị a na-akpali mmasị, bụrụkwa ihe bara uru.b
17. Olee otú akwụkwọ a i ji n’aka si tụlee akwụkwọ iri na abụọ ahụ?
17 Otú ọ dị, ihe e mere n’akwụkwọ a i ji n’aka abụghị ịkọwa ihe ihe atụ ndị dị n’akwụkwọ Jona ma ọ bụ n’akwụkwọ iri na otu ndị nke ọzọ pụtara. Ihe e mere abụghịkwa ịkọwa ha n’amaokwu n’amaokwu. Kama nke ahụ, e lekwasịrị anya karịsịa n’ihe anyị na-amụta n’akwụkwọ ndị a, bụ́ ihe ndị anyị pụrụ iji na-ebi ndụ kwa ụbọchị. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ndụmọdụ ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị bara uru nke Jehova na-enye m n’akwụkwọ iri na abụọ ndị a? Olee otú akwụkwọ ndị a pụrụ isi nyere m aka ‘ibi ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a’? Gịnị ka ha na-akụziri m banyere ibi ndụ dị ka Onye Kraịst, omume ọma, ndụ ezinụlọ, nakwa ụdị àgwà dị iche iche n’ụbọchị ndị a dị oké egwu, ebe ọ bụ na “ụbọchị Jehova na-abịa, n’ihi na ọ dị nso”?’ (Taịtọs 2:12; Joel 2:1; 2 Timoti 3:1) Ka ị na-enweta azịza ndị na-eju afọ, o yiri ka ị̀ ga-ahụ amaokwu ndị ị ga-ewere dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa, bụ́ amaokwu ndị ị na-ejitụbeghị mee ihe mgbe ị na-akọrọ ndị ọzọ ndụmọdụ ndị dị n’ime Baịbụl. N’ụzọ dị otú a, akụkụ Baịbụl magburu onwe ha ndị ị maara ga-ebuwanye ibu.—Luk 24:45.
18. Olee otú e si hazie akwụkwọ a, oleekwa otú ị pụrụ isi rite uru na nke a?
18 E kewara isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a ụzọ anọ. Gbalịa ka ị mata isi ihe dị ná nkebi nke ọ bụla mgbe ị na-amalite ịgụ ya. Na nke ọ bụla n’ime isi iri na atọ na-esonụ, ị ga-ahụ igbe abụọ e tinyere iji nyere gị aka icheta ihe ị mụrụ. Ajụjụ ndị dị n’igbe ndị ahụ ga-enyere gị aka ịtụgharị uche n’ihe ị gụrụ, nyekwara gị aka iche echiche n’uru ọ bara, tinyere ụzọ ị pụrụ isi tinye ya n’ọrụ. Igbe nke mbụ dị n’ihe dị ka n’ọkara isiakwụkwọ nke ọ bụla. Ọ bụrụ na ị gụrute n’ebe igbe ahụ dị, tụlee ajụjụ ndị dị na ya. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ịkụbanye ihe ndị ị ka mụpụrụ n’ime obi gị. (Matiu 13:8, 9, 23; 15:10; Luk 2:19; 8:15) Igbe nke abụọ ga-enyere gị aka ịtụgharị uche n’ihe ị gụrụ n’akụkụ ikpeazụ nke isiokwu nke ọ bụla nakwa ịhụ na ọ bamiri n’uche gị. Ya mere, wepụta oge tụlee igbe ndị a. N’ezie, ha pụrụ inyere gị aka ịghọta ụzọ ndị pụtara ìhè ị pụrụ isi rite uru n’ihe ị na-agụ.
19. Gịnị bụ ihe mbụ i kwesịrị iburu n’uche banyere akwụkwọ iri na abụọ ahụ?
19 Ka i wee jikere maka ịmụ akwụkwọ a, jụọ onwe gị ihe ị maara banyere ihe ndị dị na nke ọ bụla n’ime akwụkwọ iri na abụọ ndị a. Olee ndị Chineke si n’aka ha zie ozi ndị a, oleekwa ụdị mmadụ ha bụ? Olee oge ha dịrị ndụ, olee ihe na-eme mgbe ha jere ozi? (Oge ndị ahụ e depụtara na peeji nke iri abụọ na nke iri abụọ na otu ga-enyere gị aka nke ukwuu; na-ele anya na ya ugboro ugboro ka ị na-amụ malite n’Isi nke Abụọ.) Gịnị kpọmkwem bụ ozi ha kwusara, gịnịkwa ka ozi ha pụtara n’oge ahụ, oleekwa otú ịmata ihe ndị a ga-esi nyere gị aka ịghọta ihe ha na-ekwu banyere ya n’oge ahụ? Isi nke Abụọ ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ndị a bụ́ isi.
a Akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ Encyclopædia Judaica kwuru na aha a “yiri ka ò sitere n’aha Latin dị ná nsụgharị Baịbụl Vulgate (Prophetae Minores). Nkọwaaha bụ́ ‘obere,’ nke dị n’aha ahụ bụ́ ‘Obere Ndị Amụma,’ adịghị egosi otú akwụkwọ iri na abụọ ahụ ndị amụma dere dịruru mkpa ma e jiri ha tụnyere akwụkwọ Aịzaya, Jeremaya, na Ezikiel. Kama nke ahụ, ọ na-egosi otú ha hà ntakịrị ma e jiri akwụkwọ iri na abụọ ahụ tụnyere ha.”—Mpịakọta nke 12, peeji nke 49.
b Dị ka ihe atụ, lee ebe a tụlere Hagaị n’Ụlọ Nche nke January 1, 1997, peeji nke 6-22, nakwa ebe a tụlere Zekaraya n’Ụlọ Nche nke January 1, 1996, peeji nke 8-22.