ISI NKE ITOOLU
Imeso Ndị Ọzọ Otú Chineke Chọrọ
1-3. (a) Olee ihe ọtụtụ Ndị Kraịst pụrụ iche banyere Taya oge ochie? (b) Kọwaa ụfọdụ ihe Eze Haịram na Izrel mekọrọ. (ch) Olee ihe anyị ga-atụle banyere Taya?
GỊNỊ na-agbata gị n’uche ma e kwute okwu obodo Taya oge ochie? Uche ọtụtụ Ndị Kraịst ga-agbaga n’otú amụma e buru si mezuo mgbe Alegzanda Onye Ukwu kpokọọrọ mkpọmkpọ ihe ndị si ná mpaghara obodo Taya ahụ e bibiri ebibi, nke dị n’elu ala, ma jiri ya rụọ ụzọ wee gafere ná mpaghara ọhụrụ nke obodo Taya, bụ́ agwaetiti ma bibie ya. (Ezikiel 26:4, 12; Zekaraya 9:3, 4) Otú ọ dị, ikwute okwu Taya ọ̀ ga-eme ka i chewe echiche banyere otú i kwesịrị isi na-emeso ụmụnna gị ndị gị na ha na-efekọ ofufe ma ọ bụ ndị ọzọ, na otú ị na-ekwesịghị isi na-emeso ha?
2 Gịnị mere e ji bibie Taya? “N’ihi nnupụisi atọ nke Taya nupụrụ, . . . n’ihi na ọ kpọọrọ ìgwè ndị a dọọrọ n’agha kpọnye Idọm nakwa n’ihi na ha echetaghị ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne. M ga-emekwa ka ọkụ gbaa mgbidi Taya.” (Emọs 1:9, 10) Tupu mgbe ahụ, Eze Haịram nke Taya gosiri Devid obiọma, ma bunye ya ihe e ji wuo ụlọ nsọ Sọlọmọn. Sọlọmọn na Haịram gbara ndụ, Sọlọmọn nyekwara ya obodo ụfọdụ na Galili. Haịram kpọrọ Sọlọmọn “nwanne m.” (1 Ndị Eze 5:1-18; 9:10-13, 26-28; 2 Samuel 5:11) Mgbe Taya ‘na-echetaghị ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne’ ma ree ụfọdụ n’ime ndị Chineke ka ha bụrụ ohu, Jehova hụrụ ihe Taya mere.
3 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ikpe Chineke kpere ndị Kenan bi na Taya maka iji obi ọjọọ mesoo ndị ya ihe? Otu ihe mmụta nke gbara ọkpụrụkpụ bụ n’ihe banyere otú anyị si emeso ụmụnna anyị ndị anyị na ha na-efekọ ofufe. N’isiokwu ndị bu ụzọ n’akwụkwọ a, anyị si n’ọnụ ndị amụma iri na abụọ ahụ nweta ndụmọdụ ụfọdụ banyere imeso ndị ọzọ ihe, dị ka ihe atụ, ime ihe ziri ezi n’achụmnta ego anyị nakwa ịbụ ndị omume ha dị ọcha. Otú ọ dị, akwụkwọ iri na abụọ a nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-egosi otú Chineke chọrọ ka anyị si na-emeso ndị ọzọ ihe.
AṄỤRỊLA ỌṄỤ MGBE ONYE ỌZỌ NỌ NÁ NSOGBU
4. Olee otú ndị Idọm si bụrụ “ụmụnne” Izrel, ma olee otú ha si mesoo “ụmụnne” ha?
4 Ị pụrụ ịmụta ihe ná nkatọ Chineke katọrọ Idọm, bụ́ mba dị nso n’Izrel: “I kwesịghị ịnọ na-ekiri ihe mere n’ụbọchị nwanne gị, ya bụ, n’ụbọchị ihe ọjọọ dakwasịrị ya; i kwesịghịkwa ịṅụrị ọṅụ n’ihe mere ụmụ Juda n’ụbọchị a lara ha n’iyi.” (Obedaya 12) Ọ pụrụ ịbụ na ndị Taya bụ “ụmụnne” Izrel n’ihi na ha na-azụkọrịta ahịa. Ma ndị Idọm bụ “ụmụnne” Izrel n’ezie n’ihi na ha bụ ụmụ Ịsọ, bụ́ ejima Jekọb. Ọbụna Jehova kpọrọ ndị Idọm “ụmụnne” ndị Izrel. (Diuterọnọmi 2:1-4) N’ihi ya, ọṅụ ndị Idọm ṅụrịrị mgbe ndị Babịlọn wetaara ndị Juu ọdachi gosiri na ha kpọrọ ha asị n’ezie.—Ezikiel 25:12-14.
5. N’ọnọdụ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ igosi ụdị mmụọ ndị Idọm gosiri?
5 O doro anya na Chineke akwadoghị otú ahụ ndị Idọm si mesoo ụmụnne ha, bụ́ ndị Juu. Otú ọ dị, anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee otú Chineke ga-esi ele otú m si emeso ụmụnna m anya?’ Otu ebe anyị kwesịrị ichebara echiche bụ otú anyị si ele nwanna anya ma ọ bụ na-emeso ya mgbe ihe na-agazighịrị ya. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwanna mejọrọ gị ma ọ bụ na ya na otu onye n’ime ndị ikwu gị nwere nghọtahie. Ọ bụrụ na i ‘nwere ihe mere ị ga-eji mee mkpesa,’ ị̀ ga-eburu iwe n’obi, jụ ichefu okwu ahụ ma ọ bụ ghara ime mgbalị idozi okwu ahụ? (Ndị Kọlọsi 3:13; Jọshụa 22:9-30; Matiu 5:23, 24) Ime otú ahụ pụrụ imetụta otú i si emeso nwanna ahụ; e nwere ike ị gaghịzi na-emesapụrụ ya ihu, i nwere ike na-ezere ya ma ọ bụkwanụ na-ekwu okwu ọjọọ banyere ya. Ka anyị nye ihe atụ ọzọ. Ka e were ya na nwanna ahụ mesịrị mehie, ma eleghị anya ruo n’ókè nke na ndị okenye ọgbakọ dụrụ ya ọdụ ma ọ bụ dọọ ya aka ná ntị. (Ndị Galeshia 6:1) Ị̀ ga-enwe ụdị mmụọ ndị Idọm nwere ma ṅụrịa ọṅụ n’ihi nsogbu ahụ nwanna ahụ nọ na ya? Olee ihe Chineke ga-achọ ka i mee?
6. N’ụzọ dị iche n’ihe e kwuru na Zekaraya 7:10, gịnị ka Maịka 7:18, na-atụ aro ka anyị na-eme?
6 Jehova mere ka Zekaraya kwupụta ihe Ọ chọrọ nke bụ́ ka anyị ghara ‘ịkpa nkata n’obi anyị ime ibe anyị ihe ọjọọ.’ (Zekaraya 7:9, 10; 8:17) Ndụmọdụ a dị mkpa karịsịa mgbe anyị chere na nwanna akpasuwo anyị iwe ma ọ bụ mejọọ onye ezinụlọ anyị. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ dị mfe ‘ịkpa nkata n’ime obi anyị ime ihe ọjọọ’ ma mepụta ya n’omume. N’aka nke ọzọ, Chineke chọrọ ka anyị ṅomie ihe nlereanya dị mma o setịpụụrụ anyị. Cheta na Maịka dere na Jehova ‘na-agbaghara njehie, na-agbaghakwara mmebi iwu.’a (Maịka 7:18) Olee otú anyị pụrụ isi tinye nke ahụ n’ọrụ n’ụzọ dị irè?
7. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kpebie ichefu ihe ọjọọ e mere anyị?
7 Ihe e mere anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị pụrụ iwute anyị. Ma n’ezie, olee otú ọ dịruru njọ? Baịbụl kwuru ihe ndị a ga-eme iji dozie esemokwu, ọbụna mgbe e mejọrọ nwanna. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ mgbe, ọ na-akasị mma ileghara mmehie ma ọ bụ mmejọ ahụ anya, ‘ịgbaghara mmebi iwu’ ahụ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Nke a ọ̀ pụrụ ịbụ otu n’ime ugboro iri asaa na asaa ahụ m kwesịrị ịgbaghara ya? Ọ́ gaghị aka mma ma m chefuo ya?’ (Matiu 18:15-17, 21, 22) Ọ bụrụgodị na ihe ahụ o mere gị yiri nnukwu ihe ugbu a, ọ̀ ka ga-adị otú ahụ otu puku afọ site ugbu a? Mụta otu ihe dị mkpa n’ihe e kwuru n’Eklisiastis 5:20 banyere otú ihe oriri na ihe ọṅụṅụ nke onye ọrụ si atọ ya ụtọ: “Ọ gaghị echeta ụbọchị ndụ ya mgbe niile, n’ihi na ezi Chineke na-eme ka obi ya jupụta n’aṅụrị.” Ka onye ahụ ji obi ụtọ tinye uche ya ná ndụ ọ na-ekpori mgbe ahụ, ọ na-echefu nsogbu ndị ọ na-enwe ná ndụ kwa ụbọchị. Ànyị pụrụ iṅomi àgwà ahụ? Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ọṅụ ndị anyị na-enweta n’òtù ụmụnna anyị bụ́ Ndị Kraịst, ọ pụrụ ime ka anyị chefuo okwu ndị na-adịghị oké mkpa, okwu ndị anyị na-agaghị echeta n’ime ụwa ọhụrụ. Nke ahụ dị nnọọ iche n’ịṅụrị ọṅụ mgbe onye ọzọ nọ ná nsogbu ma ọ bụ ịnọ na-echeta ihe ọjọọ e mere anyị.
Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ gị, gịnị ka ị ga-ezere?
NA-AGWA NDỊ ỌZỌ EZIOKWU
8. Olee ihe ịma aka anyị na-enwe n’ihe banyere ikwu eziokwu?
8 Akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere mekwara ka ọ pụta ìhè otú Chineke chọruru ka anyị na-ekwu eziokwu n’ihe niile anyị na-eme. N’ezie, anyị na-agbalịsi ike ịgwa ndị ọzọ “eziokwu nke ozi ọma ahụ.” (Ndị Kọlọsi 1:5; 2 Ndị Kọrịnt 4:2; 1 Timoti 2:4, 7) Otú ọ dị, ebe ọ pụrụ isiri anyị ike karị ikwu eziokwu bụ mgbe anyị na ndị ezinụlọ anyị na ụmụnna anyị, ndị anyị na ha na-efekọ ofufe, na-enwe mkparịta ụka kwa ụbọchị banyere ihe dịgasị iche iche. N’ihi gịnị?
9. Olee mgbe ọ pụrụ ịdị anyị ka ọ̀ bụ anyị kwuo ihe na-abụchaghị eziokwu, ma gịnị ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
9 Olee onye n’ime anyị na-ekwutụbeghị ihe na-adịghị mma ma ọ bụ mee ihe na-adịghị mma, e wee mesịa gwa ya ihe ahụ? Ma eleghị anya, o mere anyị ihere ma ọ̀ bụkwanụ, obi anyị matụrụ anyị ikpe. Nke ahụ pụrụ ime ka mmadụ gọwa agọ ma ọ bụ nyewe “nkọwa” nke ga-agbagọ eziokwu iji gosi na ihe o mere adịchaghị njọ ma ọ bụ mee ka ihe o mere yie ihe ziri ezi. Ma ọ bụkwanụ, mgbe anyị nwetara onwe anyị n’ọnọdụ na-emenye ihere, anyị pụrụ ịma ụma hapụ ikwu ụfọdụ ihe, kwuo ya otú ọ ga-agbanwetụ ihe mere. Ya mere, ihe anyị kwuru nwere ike ịbụ eziokwu ma e lee ya anya n’elu elu, ma ọ na-eme ka a hụ okwu ahụ otú dị nnọọ iche n’otú o si mee. Ọ bụ ezie na nke a nwere ike ọ bụghị ịgha ụgha doro anya dị ka ọtụtụ ndị n’ụwa na-agha taa, ọ̀ bụ ‘ịgwa onye agbata obi gị, ma ọ bụ nwanna gị eziokwu’? (Ndị Efesọs 4:15, 25; 1 Timoti 4:1, 2) Olee otú i chere na ọ ga-adị Chineke mgbe Onye Kraịst si otú ahụ kwuo ihe ọ maara n’ime obi ya na ọ ga-eduhie ụmụnna ikweta ihe na-abụchaghị eziokwu, ihe na-ezighị ezi?
10. Olee otú ndị amụma ahụ si kọwaa ihe ọtụtụ ndị na-eme n’Izrel na Juda oge ochie?
10 Ndị amụma ahụ maara na ọbụna ndị nwoke na ndị nwaanyị raara onwe ha nye Jehova na-eleghara ihe Ọ chọrọ ka ha mee anya mgbe ụfọdụ. Hosia kwuru ihe bụ́ echiche Chineke banyere ụfọdụ ndị n’oge ya, sị: “A ga-ebukọrọ ihe niile ha nwere, n’ihi na ha emehiewo m! Abụ m onye mgbapụta ha, ma ha onwe ha aghagidewo m ụgha.” E wezụga ịghagide Jehova ụgha doro anya, ụfọdụ malitere “ịbụ ọnụ na ịghọ aghụghọ,” ma eleghị anya, gbanwee ihe bụ́ eziokwu iji duhie ndị ọzọ. (Hosia 4:1, 2; 7:1-3, 13; 10:4; 12:1) Hosia nọ n’alaeze ebe ugwu ahụ, bụ́ Sameria, dee ihe ndị ahụ. Ihe ọ̀ ka mma na Juda? Maịka na-agwa anyị, sị: “Ndị ọgaranya ya ejupụtawo n’ime ihe ike, ndị bi na ya ekwuwokwa okwu ụgha, ire dị ha n’ọnụ na-aghọkwa aghụghọ.” (Maịka 6:12) Anyị kwesịrị ịghọta otú ndị amụma ahụ si katọọ “ịghọ aghụghọ” na ndị “ire dị ha n’ọnụ na-aghọkwa aghụghọ.” Ya mere, ọbụna Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-agaghị ama ụma ghaa ụgha, pụrụ ịjụ onwe ha, sị: ‘M̀ pụrụ ịghọ aghụghọ ma ọ bụ nwee ire na-aghọ aghụghọ mgbe ụfọdụ? Olee ihe Chineke chọrọ ka m mee na nke a?’
11. Gịnị ka ndị amụma ahụ kwuru na Chineke chọrọ ka anyị na-eme ma a bịa n’okwu ọnụ anyị?
11 Ọ dị mma ịmara na Chineke sikwa n’ọnụ ndị amụma ahụ mee ka anyị mara n’ụzọ doro anya àgwà ọma ndị ọ chọrọ ka anyị nwee. Zekaraya 8:16 na-ekwu, sị: “‘Ihe ndị a ka unu ga na-eme: Na-agwanụ ibe unu eziokwu. Na-ekpenụ ikpe n’eziokwu, na-ekpekwanụ ikpe udo n’ọnụ ụzọ ámá unu.” N’oge Zekaraya, ọnụ ụzọ ámá bụ ebe ọhaneze na-anọ na ebe ndị okenye na-anọ ekpe ikpe. (Rut 4:1; Nehemaya 8:1) Ma, Zekaraya ekwughị na ọ bụ naanị n’ụdị oge a ka mmadụ kwesịrị ịdị na-ekwu eziokwu. Anyị kwesịrị ịdị na-ekwu eziokwu mgbe anyị nọ n’ihu ọha, ma a gbakwara anyị ume, sị: “Na-agwanụ ibe unu eziokwu.” Nke ahụ gụnyere mgbe anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị nọ n’ụlọ anyị na-akparịta ụka naanị anyị. Otú ahụ ka ọ dịkwa ná mkparịta ụka anyị na ụmụnna anyị na-enwe kwa ụbọchị, ma ọ̀ bụ ihu n’ihu, ma ọ̀ bụ na telifon, ma ọ̀ bụkwanụ n’ụzọ ọ bụla ọzọ. Ha nwere ezi ihe mere ha ga-eji tụọ anya na ihe anyị na-agwa ha bụ eziokwu. Ndị Kraịst kwesịrị ịgwasi ụmụ ha ike na ọ dị mkpa izere okwu ụgha. N’ụzọ dị otú ahụ, ka ndị na-eto eto na-etolite, ha ga-amara na Chineke chọrọ ka ha zere inwe ire na-aghọ aghụghọ nakwa ka ha na-ekwu eziokwu n’ezie.—Zefanaya 3:13.
12. Olee ihe ndị dị mkpa anyị pụrụ ịmụta n’akwụkwọ ndị amụma ahụ?
12 Onye na-eto eto ma ọ bụ okenye nke na-ekwu eziokwu mgbe niile na-eme ihe kwekọrọ n’agbamume Zekaraya nyere, nke bụ́: “Hụnụ eziokwu na udo n’anya.” (Zekaraya 8:19) Rịbakwa ama otú Malakaị si kọwaa ihe Jehova hụrụ n’ebe Ọkpara ya nọ: “Iwu nke eziokwu dị n’ọnụ ya, ọ dịghịkwa ajọ omume a hụrụ n’egbugbere ọnụ ya. O so m na-eje ije n’udo nakwa n’ịkwụwa aka ọtọ.” (Malakaị 2:6) Ọ́ bụghị otu ihe ahụ ka Jehova chọrọ n’aka anyị? Cheta na anyị nwere Okwu ya dum, tinyere ihe ndị amụma iri na abụọ ahụ dere nakwa ihe niile anyị pụrụ ịmụta na ha.
ZERE IME IHE IKE N’IHE NIILE Ị NA-EME
13. Olee nsogbu ọzọ dịnụ nke Maịka 6:12 mere ka anyị mara?
13 Maịka 6:12 na-agwa anyị na otu ụzọ ndị Chineke n’oge ochie si megbuo ndị ọzọ bụ na ha ‘kwuru okwu ụgha, nakwa na ire dị ha n’ọnụ na-aghọ aghụghọ.’ Ka o sina dị, amaokwu ahụ kwuru ihe ọzọ dị njọ ha na-eme. O kwuru na ‘ndị ọgaranya ahụ jupụtara n’ime ihe ike.’ N’ụzọ dị aṅaa, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta na ya?
14, 15. Olee ihe a maara banyere mba ndị gbara ndị Chineke gburugburu n’ihe banyere ime ike?
14 Tụlee ihe e ji mara ụfọdụ n’ime mba ndị nọ ndị Chineke nso. Ọ bụ n’ebe ugwu, n’akụkụ ọwụwa anyanwụ, ka Asiria na Ninive bụ́ isi obodo ya dị, nke Nehọm dere banyere ya, sị: “Ahụhụ ga-adịrị obodo na-awụfu ọbara. O jupụtara nnọọ n’aghụghọ na ịpụnara mmadụ ihe. Anụ oriri ya adịghị agwụ agwụ!” (Nehọm 3:1) A ma ndị Asiria ama na ha na-eji obi ọjọọ alụ agha ma na-emekpọ ndị ha dọọrọ n’agha ọnụ—ha na-akpọ ụfọdụ n’ime ha ọkụ ma ọ bụ gbaa ha akpụkpọ ná ndụ ma na-arụkpọ ndị ọzọ anya ma ọ bụ bepụ ha imi, ntị, ma ọ bụ mkpịsị aka. Akwụkwọ bụ́ Gods, Graves, and Scholars, na-ekwu, sị: “Ihe ụmụ mmadụ ji echeta Ninive bụ igbu mmadụ, ịkwakọrọ ihe ndị mmadụ, mmegbu, na imekpọ ndị na-adịghị ike ọnụ; site n’agha ma ọ bụ site n’ụdị ime ihe ike niile.” Anyị nwere onye ji anya ya hụ ihe ike ahụ (nakwa ma eleghị anya, onye so mee ya). Mgbe eze na-achị Ninive nụrụ ozi Jona, o kwuru banyere ndị ya, sị: “Ka ha yiri ákwà iru uju, ma mmadụ ma anụ ụlọ; ka ha kpọkusie Chineke ike, ka onye ọ bụla hapụkwa ụzọ ọjọọ ya na ihe ike ọ na-eme.”—Jona 3:6-8.b
15 Ọ bụghị naanị Asiria na-eme ihe ike jọgburu onwe ya. Idọm, nke dị na ndịda site na Juda, n’akụkụ ọwụwa anyanwụ, aghaghịkwa ịnata ntaramahụhụ. N’ihi gịnị? “Idọm ga-aghọkwa ala ịkpa nke tọgbọrọ n’efu, n’ihi ihe ike ha mesoro ụmụ Juda, bụ́ ndị ha nọ n’ala ha wụfuo ọbara na-emeghị ihe ọjọọ.” (Joel 3:19) Ndị Idọm hà gere ntị na ndụmọdụ ahụ ma kwụsị ime ihe ike? Mgbe ihe dị ka narị afọ abụọ gasịrị, Obedaya dere, sị: “Ụjọ ga-ejidekwa ndị dike gị, gị Timan [bụ́ obodo ndị Idọm], . . . N’ihi imeso nwanne gị bụ́ Jekọb ihe ike, . . . a ga-ebipụkwa gị ruo mgbe ebighị ebi.” (Obedaya 9, 10) Olee banyere ndị Chineke?
16. Olee nsogbu dị n’oge Emọs na Habakọk nke ha mere ka anyị mara banyere ya?
16 Emọs kọwara otú ọnọdụ dị na Sameria, bụ́ isi obodo alaeze ebe ugwu Izrel, sị: “‘Hụkwanụ ọgba aghara jupụtara n’ime ya na nrigbu a na-erigbu ndị mmadụ n’ime ya. Ha amaghị otú e si eme ihe ziri ezi,’ ka Jehova kwuru, ‘bụ́ ndị na-eme ka ụlọ elu ha jupụta n’ime ihe ike na ibukọrọ ihe ndị mmadụ.’” (Emọs 3:9, 10) I nwere ike iche na ọ gaghị adị otú ahụ na Juda, bụ́ ebe ụlọ nsọ Jehova dị. Ma Habakọk, bụ́ onye biri na Juda, jụrụ Chineke, sị: “Ruo ole mgbe ka m ga na-akpọku gị ka i nyere m aka napụta m n’ihe ike, ma ị dịghị azọpụta m? Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ihe ọjọọ, gịnịkwa mere i ji na-ele nsogbu n’anya n’anya? Gịnị mere e ji na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ, na-emekwa ihe ike n’ihu m?”—Habakọk 1:2, 3; 2:12.
17. Gịnị pụrụ ịbụ ihe kpatara ndị Chineke ji mewe ihe ike?
17 Ọ̀ ga-abụ na ihe mere ime ihe ike ji jupụta n’etiti ndị Chineke bụ na ha kwere ka otú ndị Asiria, ndị Idọm, ma ọ bụ mba ndị ọzọ si ele ime ihe ike anya gbanwee otú ha si ele ya anya? Sọlọmọn dọrọ aka ná ntị na ụdị ihe ahụ nwere ike ime, sị: “Enwerela onye na-eme ihe ike anyaụfụ, ahọrọkwala ụzọ ya ọ bụla.” (Ilu 3:31; 24:1) Ka oge na-aga, Jeremaya kpọrọ okwu aha, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru: ‘Unu amụtala ụzọ mba dị iche iche ma ọlị.’”—Jeremaya 10:2; Diuterọnọmi 18:9.
Ọtụtụ ihe nkiri na egwuregwu vidio na-eme ka ndị na-eto eto na-eche na o nweghị ihe ọjọọ dị n’ime ihe ike
18, 19. (a) A sị na Habakọk dị ndụ taa, olee otú ihe ike ndị a na-eme taa gaara adị ya? (b) Olee ihe i chere banyere ihe ike a na-eme n’oge anyị a?
18 A sị na Habakọk dị ndụ taa, ọ̀ bụ na ụdị ihe ike a na-eme n’oge anyị a agaghị awụ ya akpata oyi n’ahụ́? Ọtụtụ ndị na-amalite mgbe ha bụ nwata mewe ihe ike. A na-egosi ime ihe ike n’ihe nkiri ndị na-amasị ụmụaka—ebe otu onye na-agbalị ịkụgbu onye ọzọ, ịtụ ya bọmbụ, ma ọ bụkwanụ igbu ya. N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ ndị na-eto eto na-amalitezi ime egwuregwu vidio ndị ha na-emeri na ha site n’ịgbagbu ndị iro ha, ịtụ ha bọmbụ, ma ọ bụ igbukpọ ha. Ụfọdụ ndị pụrụ ikwu, sị: “Ọ bụ egwuregwu nkịtị.” Ma, egwuregwu ndị a na-eme ihe ike na ha, bụ́ ndị e ji kọmputa eme n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe ndị a na-akwụ ụgwọ, na-eme ka uche ndị na-eme ha dịrị n’ime ihe ike wee si otú ahụ na-agbanwe echiche ha banyere ime ihe ike. Lee ka ndụmọdụ a e ji ike mmụọ nsọ dee si bụrụ eziokwu: “Onye na-eme ihe ike ga-arata mmadụ ibe ya, meekwa ya ka o soro ụzọ na-adịghị mma”!—Ilu 16:29.
19 Ọ bụ ezie na a manyere Habakọk ịnọ na-ele nsogbu nakwa ‘ihe ike a na-eme n’ihu’ ya n’anya n’anya, o wutere ya. Ị pụziri ịjụ, sị: ‘Ahụ́ ọ̀ ga-eru Habakọk ala iso m nọrọ na-ekiri ihe ndị m na-ekiri na telivishọn?’ Jụọkwa, sị, ‘Ọ̀ ga-ewepụta oge na-ekiri ihe ha sị na ọ bụ egwuregwu ndị a na-eme ihe ike na ha, nke ndị so na-eme ha ọbụna na-eyi ihe nchebe dị nnọọ ka ndị ji mma agha na-alụ ọgụ n’ámá egwuregwu n’oge ochie?’ Ihe na-atọgbu ụfọdụ ndị atọgbu n’egwuregwu ụfọdụ bụ ọgụ ndị na-eme egwuregwu ahụ na-alụ n’ime ebe ahụ a na-eme egwuregwu ma ọ bụ nke ndị na-akwado ha na-alụ. N’ebe ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-ele ihe nkiri na vidio ndị a na-eme ihe ike na ha, bụ́ ndị na-egosi ebe a na-alụ agha ma ọ bụ na-agba karat. A pụrụ iwere nke a dị ka akụkọ ihe mere eme ma ọ bụ igosi omenala mba n’oge ochie. Ma nke ahụ ò mere ka ime ihe ike zie ezi?—Ilu 4:17.
20. Ụdị ime ihe ike dị aṅaa ka Malakaị kọwara otú Jehova si ele ya anya?
20 Malakaị welitere okwu ọzọ yiri ya mgbe ọ na-akọwa otú Jehova si ele aghụghọ ndị Juu ụfọdụ na-aghọ nwunye ha anya. “‘Ọ kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị,’ ka Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru; ‘kpọọkwa onye ji ime ihe ike kpuchie uwe ya.’” (Malakaị 2:16) A ghọtawo okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “ji ime ihe ike kpuchie uwe ya” n’ụzọ dịgasị iche iche. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta weere ya na ọ pụtara ọbara ite mmadụ n’uwe mgbe ọ na-emeso onye ọzọ ihe ike. Nke ọ bụla ọ bụ, o doro anya na Malakaị na-akatọ mmadụ iti nwunye ya ma ọ bụ di ya ihe. Ee, Malakaị welitere okwu banyere ime ihe ike n’ime ezinụlọ ma gosi na Chineke kpọrọ ya asị.
21. N’ebe dịgasị aṅaa ka Ndị Kraịst na-aghaghị izere ime ihe ike?
21 A gaghị anabata ime ihe ike n’ebe obibi Onye Kraịst, ma ọ bụ site n’iti ihe ma ọ bụ n’okwu ọnụ, dịkwa ka a na-agaghị anabata ime ya n’ihu ọha; Chineke na-ahụcha ha niile. (Eklisiastis 5:8) Ọ bụ ezie na ihe Malakaị kwuru okwu ya bụ mmadụ imeso nwunye ya ihe ike, ọ dịghị ihe e kwuru n’ime Baịbụl nke na-egosi na mmadụ imeso ya ụmụaka ma ọ bụ nne na nna mere agadi adịchaghị njọ. A gaghịkwa anabata ya ma nwunye meso ya di ya, ụmụ ya, ma ọ bụ ndị mụrụ ya. N’ezie, n’ezinụlọ nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè, e nwere mgbe udo na-agaghị adịcha, nke a ga na-akpatakwa ahụ́ mgbakasị na iwe mgbe ụfọdụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Baịbụl na-adụ anyị ọdụ, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela; unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.”—Ndị Efesọs 4:26; 6:4; Abụ Ọma 4:4; Ndị Kọlọsi 3:19.
22. Olee otú anyị si mara na a pụrụ izere ime ihe ike, ọ bụrụgodị na ọtụtụ n’ime ndị gbara anyị gburugburu na-eme ihe ike?
22 Ụfọdụ ndị pụrụ ịchọwa ụzọ ha ga-esi gosi na ihe ike ha na-eme adịchaghị njọ, site n’ikwu, sị, ‘Ihe mere m ji na-eme ihe ike bụ n’ihi na m toro n’ezinụlọ a na-eme ihe ike na ya,’ ma ọ bụkwanụ, ‘Ndị si obodo anyị na-ewekarị iwe ọkụ ma na-alụkarị ọgụ.’ Otú ọ dị, mgbe Maịka katọrọ ‘ndị ọgaranya jupụtara n’ime ihe ike,’ ọ sịghị na ha apụghị ime ihe ọ bụla iji kwụsị ya n’ihi na ha toro n’etiti ndị na-eme ihe ike. (Maịka 6:12) Noa dịrị ndụ mgbe ụwa “jupụtara n’ime ihe ike,” ime ihe ike gbakwara ụmụ ya gburugburu mgbe ha na-etolite. Hà mụtara ime ihe ike? Ọ dịghị ma ọlị! “Ihe Noa masịrị Jehova.” Ụmụ ya ṅomikwara ya, e wee chebe ha ndụ mgbe Iju Mmiri ahụ bịara.—Jenesis 6:8, 11-13; Abụ Ọma 11:5.
23, 24. (a) Gịnị na-enyere anyị aka izere ịbụ ndị a maara dị ka ndị na-eme ihe ike? (b) Olee echiche Jehova banyere ndị na-emeso ndị ọzọ ihe otú ọ chọrọ?
23 N’ụwa niile, a ma Ndịàmà Jehova ama na ha bụ ndị udo, ọ bụghị ndị na-eme ihe ike. Ha na-asọpụrụ iwu ndị ọchịchị nyere banyere ime ihe ike, na-edebekwa ya. (Ndị Rom 13:1-4) Ha agbalịsiwo ike ‘ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,’ ha na-agbalịkwa ịchụso udo. (Aịzaya 2:4) Ha na-agbalị iyiri “mmadụ ọhụrụ ahụ,” bụ́ ihe na-enye aka izere ime ihe ike. (Ndị Efesọs 4:22-26) Ha na-agbasokwa ezi ihe nlereanya nke ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-adịghị ‘eti mmadụ ihe’ ma n’okwu ọnụ ma n’aka.—1 Timoti 3:3; Taịtọs 1:7.
24 N’ezie, anyị pụrụ—anyị aghaghịkwa—imeso ndị ọzọ otú Chineke chọrọ. Hosia kwuru, sị: “Ònye maara ihe, ka o wee ghọta ihe ndị a? Ònye nwere uche, ka o wee mara ha? N’ihi na ụzọ Jehova ziri ezi, ọ bụ ndị ezi omume ga na-eje ije na ya; ma ndị na-emebi iwu ga-asụ ngọngọ na ya.”—Hosia 14:9.
a Okwu a sụgharịrị ịbụ “na-agbaghakwara mmebi iwu” pụtara ‘ịgafere mmebi iwu’ ma e kwuo ya otú e si dee ya n’asụsụ Hibru. N’ihe banyere ‘ịgafere mmebi iwu,’ otu ọkà mmụta kwuru na e nwetara okwu Hibru ahụ nke na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ site ‘n’omume nke onye njem, bụ́ onye na-agafere gawa ebe ọ na-aga n’ahụghị ihe ọ na-achọghị ile anya. Ihe a na-ekwu [abụghị na Chineke adịghị ahụ mmehie] kama na ọ naghị arịba ya ama n’ọnọdụ ụfọdụ ka o wee nye ntaramahụhụ; na ọ dịghị enye ntaramahụhụ, kama ọ na-agbaghara.’
b Calah (Nimrud), bụ́ obodo Ashurnasirpal wughachiri, dị n’ebe dị ihe dị ka kilomita iri atọ na ise n’ebe ndịda, n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Ninive. N’ụlọ a na-edebe ihe ochie na Britain, e nwere ahụ́ mgbidi ndị e si Calah bute, bụ́ ndị anyị na-agụ banyere ha, sị: “Ashurnasirpal gosiri n’ụzọ zuru ezu otú o si eji obi ọjọọ na obi ịta mmiri ebu agha. A kwụgburu ndị a dọọrọ n’agha n’elu osisi ma ọ bụ kpọgide ha n’osisi ndị dị ná mgbidi nke obodo ndị ha nọchibidoro . . . ; a gbara ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa akpụkpọ ná ndụ.”—Akwụkwọ bụ́ Archaeology of the Bible.