Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 2 p. 14-23
  • “Ụzọ na Eziokwu na Ndụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ụzọ na Eziokwu na Ndụ”
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Na-arụ Ọrụ Dị Mkpa ná Nzube Jehova
  • Naanị Ọkpara ahụ Maara Nna Ya n’Ụzọ Zuru Ezu
  • “Ọ Bụ M Bụ Ụzọ”
  • “Ọ Bụ M Bụ . . . Eziokwu”
  • “Ọ Bụ M Bụ . . . Ndụ”
  • Olee Ihe Ị Ga-eme Ugbu A?
  • Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Na-eso “Kraịst”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • ‘Ọkpara ahụ Chọrọ Ikpughe Nna Ya’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Jizọs Ọ̀ Bụ Ọkpara Chineke n’Eziokwu?
    Teta!—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 2 p. 14-23

ISI NKE ABỤỌ

“Ụzọ na Eziokwu na Ndụ”

Ihe Osise dị na peeji nke 14

“Bụrụ onye na-eso ụzọ m”

1, 2. Gịnị mere anyị enweghị ike ịbịakwute Jehova n’onwe anyị, gịnịkwa ka Jizọs Kraịst meere anyị na nke a?

Ọ̀ DỊTỤLA mgbe i furu ụzọ? Ị pụrụ icheta mgbe ị na-aga ileta enyi gị ma ọ bụ onye ikwu gị, ya abụrụ na ị maghị ụzọ. Ka ị nọ na-aga n’okporo ụzọ nke na-edoghị gị anya, ị̀ kwụsịrị jụọ mmadụ ka ọ gwa gị ụzọ ị ga-eso? Chee echiche otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na, kama naanị ịgwa gị ụzọ ị ga-eso, otu onye nke nwere obiọma asị gị: “Soro m. M ga-eduga gị ebe ị na-aga.” Obi ga-eru gị nnọọ ala!

2 A pụrụ ikwu na Jizọs Kraịst na-emere anyị ihe dị otú ahụ. Anyị enweghị ike ịbịakwute Chineke n’onwe anyị. Mmehie e ketara eketa na ezughị okè mere ka mmadụ niile fuo ụzọ, “bụrụkwa ndị e kewapụrụ ná ndụ nke si n’aka Chineke.” (Ndị Efesọs 4:17, 18) Enyemaka dị anyị mkpa iji chọta ụzọ. Ọ bụghị naanị ndụmọdụ na ntụziaka ka Jizọs, bụ́ Onye Nlereanya anyị nke nwere obiọma, na-enye anyị; ọ na-enye anyị ihe karịrị nke ahụ. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Mbụ, Jizọs na-akpọ onye ọ bụla n’ime anyị òkù, sị: ‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m.’ (Mak 10:21) Ma, o mekwara ka anyị nwee ihe dị mkpa mere anyị ga-eji za òkù ahụ. Jizọs kwuru otu mgbe, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere o ji bụrụ naanị site n’Ọkpara ahụ ka anyị pụrụ ịbịakwute Nna ya. Anyị ga-eburu ihe ndị a n’obi wee tụlee otú Jizọs si bụrụ “ụzọ na eziokwu na ndụ” n’ezie.

Ọ Na-arụ Ọrụ Dị Mkpa ná Nzube Jehova

3. Gịnị mere o ji bụrụ Jizọs ka anyị ga-esi n’aka ya bịakwute Chineke?

3 Ihe mbụ bụ́ isi mere o ji bụrụ Jizọs ka anyị ga-esi n’aka ya bịakwute Chineke bụ na Jehova họọrọ inye Ọkpara ya ọrụ ahụ dị mkpa.a Nna ya mere ka ọ bụrụ onye bụ́ isi nke ga-emezu nzube Ya niile. (2 Ndị Kọrint 1:20; Ndị Kọlọsị 1:18-20) Iji ghọta ọrụ dị mkpa Ọkpara ahụ na-arụ, ọ dị mkpa ka anyị tụlee ihe mere n’ogige Iden, bụ́ ebe di na nwunye mbụ sooro Setan nupụrụ Jehova isi.—Jenesis 2:16, 17; 3:1-6.

4. Olee ihe iseokwu nke isi ahụ e nupụrụ n’Iden kpatara, oleekwa ihe Jehova kpebiri ime iji dozie ihe iseokwu ahụ?

4 Isi ahụ e nupụrụ n’Iden kpatara ihe iseokwu nke metụtara ndị niile Chineke kere: Jehova Chineke ọ̀ na-achịzi ndị o kere achịzi? Iji dozie ihe iseokwu a dị mkpa, Jehova kpebiri na nwa ya nke zuru okè bụ́ mmụọ ga-aga n’ụwa. Ọrụ nwa ya nke a ga-arụ bụ ọrụ dị oké mkpa—ọ ga-enye ndụ ya ka o wee gosi na ọ bụ Jehova ka o ruuru ịchị achị. Ọ ga-enyekwa ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta iji zọpụta ụmụ mmadụ. Ọ bụrụ na nwa ya ahụ ọ họọrọ ekwesị ntụkwasị obi ruo n’ọnwụ, ọ ga-eme ka o kwe omume ịgwọta nsogbu niile nnupụisi Setan kpatara. (Hibru 2:14, 15; 1 Jọn 3:8) Ma Jehova nwere nde kwuru nde ụmụ zuru okè ndị bụ́ mmụọ. (Daniel 7:9, 10) Olee nwa ya nke ọ họọrọ ka ọ rụọ ọrụ a kasị mkpa? Jehova họọrọ “Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,” bụ́ onye e mesịrị mara dị ka Jizọs Kraịst.—Jọn 3:16.

5, 6. Olee otú Jehova si gosi na o nwere obi ike n’ebe Ọkpara ya nọ, gịnịkwa mere o ji nwee obi ike a?

5 Ò kwesịrị iju anyị anya na ọ bụ ya ka Jehova họọrọ? O kwesịghị ma ọlị! Nna ahụ nwere obi ike dị ukwuu n’ebe Ọkpara ọ mụrụ naanị ya nọ. Ọtụtụ narị afọ tupu Ọkpara ya abịa n’ụwa, Jehova buru amụma na Ọkpara ya ga-eguzosi ike n’ebe ọ nọ n’agbanyeghị ụdị ahụhụ niile ọ ga-ata. (Aịzaya 53:3-7, 10-12; Ọrụ 8:32-35) Tụlegodị ihe nke ahụ pụtara. Dị ka ndị niile ọzọ e kere eke ndị nwere ọgụgụ isi, Ọkpara ahụ nweere onwe ya ime nhọrọ, iji aka ya họrọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Ma, obi siri Jehova ike nke na o buru amụma na Ọkpara ya ga-ekwesị ntụkwasị obi. Gịnị mere obi ji sie ya ike otú a? E kwuo ya ná mkpirikpi, ọ bụ n’ihi ihe Ọ maara. Jehova maara Ọkpara ya nke ọma. Ọ makwaara na Ọkpara ya chọsiri ike ime Ya obi ụtọ. (Jọn 8:29; 14:31) Ọkpara ahụ hụrụ Nna ya n’anya, Jehova hụkwara Ọkpara ya n’anya. (Jọn 3:35) Ịhụnanya ahụ Nna ahụ na Ọkpara ya hụrụ ibe ha mere ka ha dị n’otu ma tụkwasị ibe ha obi nke na a pụghị ikewa ha ekewa.—Ndị Kọlọsi 3:14.

6 N’ihi ọrụ dị mkpa Ọkpara ahụ na-arụ, na obi ike Nna ya nwere n’ebe ọ nọ, nakwa ịhụnanya nke jikọrọ Nna ahụ na Ọkpara ya, ọ̀ bụ ihe ijuanya na ọ bụ naanị site na Jizọs ka a pụrụ ịgakwuru Chineke? Ma, o nwere ihe ọzọ mere o ji bụrụ naanị Ọkpara ahụ pụrụ iduga anyị n’ebe Nna ya nọ.

Naanị Ọkpara ahụ Maara Nna Ya n’Ụzọ Zuru Ezu

7, 8. Olee ihe mere Jizọs ji kwuo n’ụzọ ziri ezi na ọ dịghị onye maara Nna ya n’ụzọ zuru ezu “ma e wezụga Ọkpara ya”?

7 E nwere ihe ndị ọ dị mkpa ka anyị mee iji gakwuru Jehova. (Abụ Ọma 15:1-5) Ọ̀ dị onye maara ihe a ga-eme iji debe ụkpụrụ Chineke na iji mee ihe na-amasị Ya karịa ka Ọkpara ya maara? Jizọs sịrị: “Nna m enyefewo m ihe niile n’aka, ọ dịghịkwa onye maara Ọkpara ahụ n’ụzọ zuru ezu ma e wezụga Nna ya, ọ dịghịkwa onye maara Nna m n’ụzọ zuru ezu ma e wezụga Ọkpara ya na onye ọ bụla Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.” (Matiu 11:27) Ka anyị hụ ihe mere o ji bụrụ na Jizọs ekwubigaghị okwu ókè nakwa na ihe o kwuru ziri ezi mgbe ọ sịrị na ọ dịghị onye maara Nna ya n’ụzọ zuru ezu “ma e wezụga Ọkpara ya.”

8 Dị ka “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke,” Ọkpara ahụ na Nna ya nwere mmekọrịta pụrụ iche. (Ndị Kọlọsi 1:15) Chegodị echiche otú Nna ahụ na Ọkpara ya si kpachie anya n’ime ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ mgbe ọ bụ naanị ha abụọ nọ—mgbe a malitere ike ihe ruo mgbe e kere ndị ọzọ bụ́ mmụọ. (Jọn 1:3; Ndị Kọlọsi 1:16, 17) Chegodị echiche banyere ohere magburu onwe ya Ọkpara ahụ nwere mgbe ya na Nna ya nọ. Ọ nọ na-aghọta echiche Nna ya n’ihe dị iche iche, na-amụta uche Ya, ụkpụrụ Ya, na ụzọ Ya. N’ezie, ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ịsị na Jizọs maara Nna ya karịa ka onye ọ bụla ọzọ maara. N’eziokwu, mmekọrịta a chiri anya mere ka Jizọs nwee ike ikpughe onye Nna ya bụ n’ụzọ ọ na-enweghị onye ọzọ pụrụ ime otú ahụ.

9, 10. (a) Olee ụzọ dị iche iche Jizọs si kpughee onye Nna ya bụ? (b) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?

9 Ihe niile Jizọs ziri gosiri na ọ maara nke ọma otú Jehova si eche echiche na mmetụta Ọ na-enwe nakwa ihe Ọ chọrọ n’aka ndị na-efe Ya ofufe.b E nwekwara ụzọ ọzọ dị mkpa Jizọs si kpughee onye Nna ya bụ. Ọ sịrị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) Jizọs ṅomiri Nna ya n’ụzọ zuru okè n’ihe niile o kwuru nakwa n’ihe niile o mere. Ya mere, mgbe anyị gụrụ banyere Jizọs n’ime Baịbụl—okwu dị ike na okwu ọma ndị o kwuru mgbe ọ na-ezi ihe, obi ebere nke kpaliri ya ịgwọ ndị ọzọ, ọmịiko nke mere ka anya mmiri gbaa ya—anyị pụrụ iji anya nke uche anyị hụ ka Jehova na-ekwu ma na-eme ihe ndị ahụ. (Matiu 7:28, 29; Mak 1:40-42; Jọn 11:32-36) Ihe Ọkpara ahụ kwuru na ihe ndị o mere kpughere ụzọ Nna ya na uche Nna ya n’ụzọ zuru okè. (Jọn 5:19; 8:28; 12:49, 50) Ya mere, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, ọ dị mkpa ka anyị na-ege ntị n’ihe Jizọs ziri, na-esokwa ihe nlereanya ya.—Jọn 14:23.

10 Ebe ọ bụ na Jizọs maara Jehova nke ọma, na-eṅomikwa ya n’ụzọ zuru okè, ọ bụghị ihe ijuanya na Jehova kpebiri na ọ bụ Ọkpara ya bụ ụzọ a ga-esi bịakwute Nna ya. Ebe ọ bụ na anyị aghọtawo ihe mere o ji bụrụ naanị site na Jizọs ka anyị pụrụ ịbịakwute Jehova, ka anyị tụlezie ihe okwu ahụ Jizọs kwuru pụtara, ya bụ, “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”—Jọn 14:6.

“Ọ Bụ M Bụ Ụzọ”

11. (a) Gịnị mere o ji bụrụ naanị site na Jizọs ka anyị na Chineke pụrụ inwe ezi mmekọrịta? (b) Olee otú okwu ndị ahụ e dere na Jọn 14:6 si mee ka o doo anya na ọnọdụ Jizọs nwere pụrụ iche? (Lee ihe e dere n’ala ala peeji.)

11 Anyị amụtaworị na anyị apụghị ịgakwuru Chineke ma ọ bụrụ na anyị esiteghị na Jizọs. Tụlee kpọmkwem ihe nke a pụtaara anyị. Ọ bụ Jizọs bụ “ụzọ” n’ihi na ọ bụ naanị site na ya ka anyị na Chineke pụrụ inwe ezi mmekọrịta. Gịnị mere o ji bụrụ otú ahụ? Jizọs nyere ndụ ya ka ọ bụrụ àjà mgbapụta site n’ikwesị ntụkwasị obi ruo n’ọnwụ. (Matiu 20:28) A sị na ọ chụghị àjà ahụ, ọ gaghị ekwe anyị omume ịgakwuru Jehova. Mmehie na-eme ka e nwee ihe mgbochi n’etiti ụmụ mmadụ na Chineke, n’ihi na Jehova dị nsọ, ọ pụghịkwa ịnabata mmehie. (Aịzaya 6:3; 59:2) Ma, àjà ahụ Jizọs chụrụ wepụrụ ihe mgbochi ahụ; ọ ghọrọ ihe na-ekpuchi mmehie. (Hibru 10:12; 1 Jọn 1:7) Ọ bụrụ na anyị anabata ndokwa ahụ Chineke mere site na Kraịst ma nwee okwukwe na ya, anyị na Jehova ga-adị ná mma. O nwetụdịghị ụzọ ọzọ ‘anyị na Chineke ga-esi dị ná mma.’c—Ndị Rom 5:6-11.

12. Olee ihe ndị mere o ji bụrụ Jizọs bụ “ụzọ”?

12 Ọ bụ Jizọs bụ “ụzọ” n’ihe banyere ekpere. Ọ bụ naanị site na Jizọs ka anyị pụrụ ịgakwuru Jehova n’ekpere wee nwee obi ike na ọ ga-anụ arịrịọ si anyị n’obi. (1 Jọn 5:13, 14) Jizọs n’onwe ya sịrị: “Ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m. . . . Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka e wee mee ka ọṅụ unu zuo ezu.” (Jọn 16:23, 24) Ọ bụ ya mere o ji kwesị ekwesị na ọ bụ n’aha Jizọs ka anyị pụrụ ịgakwuru Jehova n’ekpere wee kpọọ Ya “Nna anyị.” (Matiu 6:9) Ihe ọzọkwa mere Jizọs ji bụrụ “ụzọ” bụ ihe nlereanya o setịpụrụ. Dị ka e kwuru na mbụ, Jizọs ṅomiri Nna ya n’ụzọ zuru okè. Ya mere, ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ gosiri anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ ka anyị wee mee Jehova obi ụtọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgakwuru Jehova, anyị aghaghị iso nzọụkwụ Jizọs.—1 Pita 2:21.

“Ọ Bụ M Bụ . . . Eziokwu”

13, 14. (a) Olee otú o si bụrụ na Jizọs na-ekwu eziokwu? (b) Ka Jizọs wee bụrụ “eziokwu,” gịnị ka ọ na-aghaghị ime, n’ihi gịnịkwa?

13 Jizọs kwuru eziokwu mgbe niile banyere amụma ndị Nna ya buru. (Jọn 8:40, 45, 46) Ọ dịghị mgbe a hụrụ aghụghọ n’ọnụ Jizọs. (1 Pita 2:22) Ọbụna ndị na-emegide ya kwetara na ọ na-ezi “ụzọ Chineke n’eziokwu.” (Mak 12:13, 14) Otú ọ dị, mgbe Jizọs sịrị “Ọ bụ m bụ . . . eziokwu,” ihe ọ na-ekwu apụtaghị naanị na o mere ka a mara ihe bụ́ eziokwu mgbe ọ na-ekwu okwu, mgbe ọ na-ezisa oziọma, na mgbe ọ na-ezi ihe. Ihe nke a pụtara karịrị nnọọ okwu ọnụ.

14 Cheta na ọtụtụ narị afọ tupu Mesaya, ma ọ bụ Kraịst, abịa, Jehova ji mmụọ nsọ kpalie ndị so dee Baịbụl ka ha dee ọtụtụ amụma banyere ya. Amụma ndị a kwuru ọtụtụ ihe banyere ndụ ya, ozi ya, na ọnwụ ya. Iwu Mozis nwekwara onyinyo, ma ọ bụ ihe atụ ndị e ji buo amụma, bụ́ ndị tụrụ aka n’ebe Mesaya nọ. (Ndị Hibru 10:1) Jizọs ọ̀ ga-ekwesị ntụkwasị obi ruo n’ọnwụ, si otú a mezuo ihe niile e buru n’amụma banyere ya? Ọ bụ naanị ime otú a ga-egosi na Jehova bụ Chineke nke na-ebu amụma ziri ezi. Ọ bụ Jizọs ka ọ dịịrị ibu nnukwu ibu ọrụ a. Site n’otú Jizọs si bie ndụ—ihe niile o kwuru na ihe niile o mere—o gosiri na ihe atụ ndị ahụ e ji buo amụma bụ eziokwu. (2 Ndị Kọrịnt 1:20) Ya mere, ọ bụ Jizọs bụ “eziokwu.” A pụrụ ikwu na ọbịbịa Jizọs mere ka ihe Jehova buru n’amụma ghọọ eziokwu.—Jọn 1:17; Ndị Kọlọsi 2:16, 17.

“Ọ Bụ M Bụ . . . Ndụ”

15. Gịnị ka inwe okwukwe n’Ọkpara ahụ pụtara, ime otú ahụ pụkwara iduga na gịnị?

15 Ọ bụ Jizọs bụ “ndụ,” n’ihi na ọ bụ naanị site na ya ka anyị pụrụ inweta ndụ—ya bụ, “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:19) Baịbụl sịrị: “Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ, kama ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.” (Jọn 3:36) Gịnị ka inwe okwukwe n’Ọkpara Chineke pụtara? Ihe ọ pụtara bụ na obi siri anyị ike na anyị apụghị inweta ndụ ma e wezụga ya. Ihe ọzọ ọ pụtara bụ na anyị na-esite n’ọrụ egosi na anyị nwere okwukwe, nọgidekwa na-amụta ihe site n’aka Jizọs, na-emekwa ihe niile anyị nwere ike ime iji na-eso ozizi ya na ihe nlereanya ya. (Jems 2:26) Ya mere, inwe okwukwe n’Ọkpara Chineke na-eduga ná ndụ ebighị ebi—“ìgwè atụrụ nta” bụ́ Ndị Kraịst e tere mmanụ ga-enweta ndụ anwụghị anwụ dị ka ndị bụ́ mmụọ n’eluigwe, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” enweta ndụ zuru okè dị ka ụmụ mmadụ n’ime paradaịs nke ga-adị n’ụwa.—Luk 12:32; 23:43; Mkpughe 7:9-17; Jọn 10:16.

16, 17. (a) Olee otú Jizọs ga-esi ghọọrọ ọbụna ndị nwụrụla anwụ “ndụ”? (b) Olee obi ike anyị pụrụ inwe?

16 Olee maka ndị nwụrụla anwụ? Jizọs bụkwaara ha “ndụ.” N’oge na-adịghị anya tupu Jizọs akpọlite Lazarọs n’ọnwụ, ọ gwara Mata, nwanne Lazarọs, sị: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:25) Jehova nyere Ọkpara ya “mkpịsị ugodi nke ọnwụ na nke Hedis,” ya bụ, ikike ime ka ndị mmadụ si n’ọnwụ bilie. (Mkpughe 1:17, 18) Jizọs ahụ e mere ka ọ dị ebube ga-eji mkpịsị ugodi ndị ahụ kpọghee ọnụ ụzọ Hedis, si otú ahụ tọhapụ ndị niile a kpọchibidoro n’ili ụmụ mmadụ.—Jọn 5:28, 29.

17 Jizọs sịrị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.” Okwu a nke dị nkenke o kwuru na-egosi ihe mere o ji bie ndụ ma jee ozi n’ụwa. Taa, okwu ndị ahụ baara anyị uru nke ukwuu. Cheta na mgbe Jizọs kwusịrị nke ahụ, ọ sịrị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Okwu a Jizọs kwuru dị mkpa taa dị ka ọ dị n’oge ahụ o kwuru ya. Ya mere, anyị pụrụ inwe obi ike dị ukwuu na ọ bụrụ na anyị esoro Jizọs, ọ dịghị mgbe anyị ga-efu ụzọ. Ọ bụ naanị ya onwe ya ga-egosi anyị ụzọ anyị ga-esi gakwuru ‘Nna ya.’

Olee Ihe Ị Ga-eme Ugbu A?

18. Gịnị ka ịbụ ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs pụtara?

18 Ebe ọ bụ na ọrụ Jizọs na-arụ dị mkpa, ebe ọ bụkwa na ọ maara Nna ya nke ọma, anyị kwesịrị isoro Ọkpara ahụ. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Mbụ, ịbụ ezi ndị na-eso Jizọs chọrọ ọrụ, ọ bụghị naanị okwu ọnụ ma ọ bụ mmetụta efu. Iso Kraịst pụtara ime ka ndụ anyị kwekọọ n’ozizi ya nakwa n’ihe nlereanya ya. (Jọn 13:15) Akwụkwọ a ị na-agụ ugbu a ga-enyere gị aka ime otú ahụ.

19, 20. Gịnị bụ ihe dị n’ime akwụkwọ a nke ga-enyere gị aka ná mgbalị ị na-eme iso Kraịst?

19 Malite n’Isi nke Atọ, anyị ga-eji nlezianya tụlee ndụ Jizọs na ozi ya. E kebiri isiakwụkwọ ndị a ụzọ atọ. Ihe mbụ anyị ga-atụletụ bụ àgwà ya na ụzọ ya. Ihe nke abụọ anyị ga-eleba anya bụ ihe nlereanya o setịpụrụ n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ezisa ozi ọma ma na-ezi ihe. Ihe nke atọ anyị ga-atụlezi bụ otú o si gosi ịhụnanya. Malite n’Isi nke atọ, e nwere igbe izi ihe a kpọrọ “Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?” E dere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’ime ha na ajụjụ ndị dị n’ime ha iji nyere anyị aka ịtụgharị uche n’otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’okwu nakwa n’omume.

20 Site n’enyemaka Jehova Chineke, ị gaghị efu ụzọ, wee bụrụ onye e kewapụrụ n’ebe ọ nọ n’ihi mmehie e ketara eketa. N’agbanyeghị na o furu Jehova ihe dị ukwuu, ịhụnanya o nwere mere ka o zite Ọkpara ya ka o gosi anyị ụzọ anyị na Chineke ga-esi nwee ezi mmekọrịta. (1 Jọn 4:9, 10) Ka ị bụrụ onye a kpaliri, ee, onye o metụrụ n’obi, ime ihe n’ihi ịhụnanya ahụ dị ukwuu site n’ịnabata na ịza òkù ahụ Jizọs kpọrọ, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.”—Jọn 1:43.

a Ọrụ Ọkpara ahụ na-arụ dị mkpa nke na Baịbụl nyere ya ọtụtụ aha na utu aha ndị buru amụma banyere ya.—Lee igbe dị na peeji nke iri abụọ na atọ.

b Dị ka ihe atụ, lee okwu Jizọs ndị e dere na Matiu 10:29-31; 18:12-14, 21-35; 22:36-40.

c Na Jọn 14:6, nkebi ahịrịokwu bụ́ “ọ bụ m” na-eme ka o doo anya na ọnọdụ Jizọs nwere pụrụ iche, na ọ bụ ya bụ ụzọ, naanị onye a ga-esite na ya gakwuru Nna ya.

Ụfọdụ Aha E Turu Jizọs Kraịst

Amen (nke pụtara “ka ọ dị otú ahụ” ma ọ bụ “kpọmkwem”). Ọ bụ site na ya ka nkwa niile Chineke kwere na-emezu n’ezie.—2 Ndị Kọrịnt 1:19, 20.

Nna Mgbe Ebighị Ebi. Jehova enyewo ya ikike inye ụmụ mmadụ olileanya ndụ ebighị ebi dị ka ndị zuru okè n’ụwa.—Aịzaya 9:6.

Nnukwu Onye Nchụàjà. Ọ pụrụ ịsachapụ anyị mmehie ma tọhapụ anyị n’ọnwụ nke mmehie kpataara anyị.—Ndị Hibru 3:1; 9:13, 14, 25, 26.

Eze nke Ndị Eze. Ebe ọ bụ na Jizọs bụ Eze nke Chineke họpụtara n’eluigwe, ọ karịrị onye ọchịchị ọ bụla nọ n’ụwa.—Mkpughe 17:14.

Onyeisi Udo. Ebe Jizọs bụ Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke, ọ ga-eme ka e nwee udo nke na-agaghị agwụ agwụ n’ụwa dum.—Aịzaya 9:6.

Onye Ndụmọdụ Dị Ebube. Ndụmọdụ Jizọs bara uru, zuokwa okè mgbe niile. Ịgbaso ya na-eduga ná nzọpụta.—Aịzaya 9:6; Jọn 6:68.

Okwu Ahụ. Ọ bụ Ọnụ Na-ekwuru Jehova.—Jọn 1:1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya