NKEBI NKE ABỤỌ
‘Izi Ihe na Ikwusa Ozi Ọma’
Jizọs kwara nkà. Ọ rụrụ ọrụ ebube. Ọ gwọrọ ọrịa, rụọkwa ọrụ ndị ọzọ. Ma, ndị mmadụ adịghị akpọ ya Ọkwá Nkà, Onye Ọrụ Ebube, Ọgwọ Ọrịa, ma ọ bụ ihe yiri ya. Ihe ha na-akpọ ya bụ Onye Ozizi. N’ezie, ọrụ bụ́ isi ọ rụrụ ná ndụ ya bụ ‘izi ihe na ikwusa ozi ọma.’ (Matiu 4:23) Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị nwere otu ọrụ ahụ ịrụ. Ná nkebi nke a, anyị ga-atụle ihe nlereanya ya, nke na-egosi anyị otú anyị ga-esi rụọ ọrụ ahụ.