ISI NKE ASATỌ
“Ọ Bụ Nke A Mere E Ji Zite M”
1-4. (a) Olee otú Jizọs si jiri nkà zie nwaanyị Sameria ihe, gịnịkwa ka ọ rụpụtara? (b) Olee ihe ndịozi ya mere?
JIZỌS na ndịozi ya ejewo ije ọtụtụ awa. Ha ji ụkwụ na-agbago ebe ugwu. Ha si Judia na-aga Galili. Ha si ụzọ kasị nso nke gafere Sameria, nke ga-ewe ihe dị ka ụbọchị atọ. Mgbe o ruwere etiti ehihie, ha rutere obodo nta a na-akpọ Saịka, bụ́ ebe ha kwụsịrị ka ha tụrụ ndụ.
2 Mgbe ndịozi Jizọs gawara ịzụta ihe oriri, ọ nọ na-ezu ike n’akụkụ olulu mmiri nke dị ná mpụga obodo ahụ. Otu nwaanyị bịara isere mmiri. Jizọs pụrụ ileghara nwaanyị ahụ anya ma a sị na ọ chọrọ. ‘Ike gwụrụ ya na njem o mere.’ (Jọn 4:6) Ọ gaghị eju onye ọ bụla anya ma a sị na o mere ka ọ hụghị nwaanyị Sameria ahụ ma gba ya nkịtị. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Anọ n’akwụkwọ a, ikekwe, nwaanyị ahụ tụrụ anya na onye Juu ọ bụla ga-elelị ya. Ma, Jizọs malitere ịgwa nwaanyị ahụ okwu.
3 O ji ihe atụ malite ịgwa ya okwu, bụ́ ihe atụ nke metụtara ihe nwaanyị ahụ na-eme kwa ụbọchị, ọbụnadị ihe ọ nọ na-eme mgbe ahụ. Ọ bịara ebe ahụ isere mmiri; Jizọs kwuru banyere mmiri na-enye ndụ nke ga-eme ka akpịrị kwụsị ịkpọ ya nkụ n’ụzọ ime mmụọ. Ọtụtụ ugboro, nwaanyị ahụ kwuru ihe ndị pụrụ ime ka a rụwa ụka.a Jizọs ji akọ zere ihe ndị ahụ ma nọgide na-ekwu ihe o bu n’uche. O lekwasịrị anya n’ihe ime mmụọ, ya bụ, ofufe dị ọcha nakwa Jehova bụ́ Chineke. Okwu ya kpara ike dị ukwuu, n’ihi na nwaanyị ahụ kọọrọ ya ndị ikom obodo ya, ha onwe ha kwa wee chọọ ige Jizọs ntị.—Jọn 4:3-42.
4 Mgbe ndịozi Jizọs lọtara, olee otú obi dị ha n’àmà dị ịtụnanya ọ nọ na-agba n’ebe ahụ? Ha egositụdịghị na ọ masịrị ha. O juru ha anya na Jizọs na-agwa nwaanyị a okwu. O yikwara ka ha atụpụrụghị nwaanyị ahụ ọnụ. Mgbe nwaanyị ahụ lawara, ha nọ na-arịọ Jizọs ka o rie ihe oriri ha wetara. Otú ọ dị, Jizọs sịrị ha: “M nwere ihe oriri m ga-eri nke unu na-amaghị.” O juru ha anya, ha wee chee ná mmalite na ọ na-ekwu banyere ihe oriri nkịtị. Mgbe ahụ, ọ kọwara, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:32, 34) Jizọs si otú a kụziere ha na ọrụ bụ́ isi ná ndụ ya dị ya mkpa karịa iri ihe. Ọ chọrọ ka ha si otú ahụ lee ya anya. Gịnị bụ ọrụ ahụ?
5. Olee ọrụ bụ́ isi Jizọs rụrụ, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’Isi nke Asatọ a?
5 Otu mgbe, Jizọs sịrị: ‘Aghaghị m izisa ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.’ (Luk 4:43) Ee, e zitere Jizọs ka o kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke, kụziekwa ya.b Ndị na-eso ụzọ Jizọs taa nwekwara otu ọrụ ahụ ịrụ. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị tụlee ihe mere Jizọs ji kwusaa ozi ọma, ụdị ozi ọma o kwusara, na otú o si lee ọrụ ya anya.
Ihe Mere Jizọs Ji Kwusaa Ozi Ọma
6, 7. Olee otú Jizọs chọrọ ka “onye ọ bụla bụ́ onye na-ezi ihe n’ihu ọha” si na-ele izisara ndị ọzọ ozi ọma anya? Nye ihe atụ.
6 Ka anyị tụlee otú Jizọs si lee eziokwu ọ kụziri anya; mgbe ahụ, anyị ga-atụle otú o si lee ndị ọ kụziiri ihe anya. Jizọs ji ihe atụ doro anya gosi otú o si lee ịgwa ndị ọzọ eziokwu ndị Jehova kụziiri ya anya. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla bụ́ onye na-ezi ihe n’ihu ọha, mgbe e ziri ya ihe banyere alaeze eluigwe, yiri nwoke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye na-esi n’ụlọ akụ̀ ya ewepụta ihe ndị dị ọhụrụ na ndị mere ochie.” (Matiu 13:52) Gịnị mere onyeisi ezinụlọ a e ji mee ihe atụ ji esi n’ụlọ akụ̀ ya ewepụta ihe dị iche iche?
7 Ihe onyeisi ezinụlọ ahụ na-eme abụghị igosi ihe o nwere, dị ka Eze Hezekaya oge ochie mere otu mgbe, bụ́ nke buteere ya nsogbu. (2 Ndị Eze 20:13-20) Gịnị kpaliri onyeisi ezinụlọ ahụ ime otú ahụ? Tụlee otu ihe atụ: Ị gara n’ụlọ onye nkụzi a na-akwanyere ùgwù. Ya emeghee ebe ọ na-edebe akwụkwọ, wepụta akwụkwọ ozi abụọ. Otu achagharịala n’ihi na ọ nọteela aka. Ma nke ọzọ ka dịtụ ọhụrụ. Ha abụọ bụ akwụkwọ ozi nna ya detaara ya. Nna ya detaara ya otu ọtụtụ iri afọ gara aga mgbe onye nkụzi ahụ ka bụ nwata. Ma ọ dịchabeghị anya o detaara ya nke ọzọ. Ọ mụmụrụ ọnụ ọchị mgbe ọ na-akọrọ gị otú akwụkwọ ozi ndị ahụ si dị ya mkpa na otú ndụmọdụ e dere na ha si gbanwee ndụ ya nakwa otú ha pụrụ isi nyere gị aka. O doro anya na onye nkụzi ahụ ji akwụkwọ ozi ndị ahụ kpọrọ ihe. O jighị ha egwuri egwu. (Luk 6:45) O gosiri gị akwụkwọ ozi ndị ahụ, ọ bụghị iji nyaa isi ma ọ bụ iji nweta ihe ọ bụla, kama ọ bụ maka abamuru gị na iji mee ka ị mara na ha bara uru.
8. Gịnị mere o ji bụrụ na anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji were eziokwu ndị anyị na-amụta n’Okwu Chineke dị ka akụ̀?
8 Ọ bụ ihe yiri nke ahụ mere Onye Ozizi Ukwu ahụ bụ́ Jizọs ji gwa ndị ọzọ eziokwu Chineke. Eziokwu ahụ bụụrụ ya akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ọ hụrụ ya n’anya, ọ na-anụkwa ya ọkụ n’obi ịgwa ndị ọzọ banyere ya. Ọ chọrọ ka ndị niile na-eso ụzọ ya, ya bụ, “onye ọ bụla bụ́ onye na-ezi ihe n’ihu ọha,” si otú ahụ na-ele ya anya. Ọ̀ bụ otú ahụ ka anyị si ele eziokwu ahụ anya? Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji hụ eziokwu niile anyị na-amụta n’Okwu Chineke n’anya. Okwu niile nke eziokwu kwesịrị ịdị anyị oké mkpa, ma ọ̀ bụ nke anyị kweere mgbe dị anya gara aga ma ọ bụ nke e mekwuru ka o doo anya n’oge na-adịbeghị anya. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu okwu, nọgidekwa na-ahụ ihe Jehova na-akụziri anyị n’anya, anyị ga-egosipụta ịhụnanya ahụ, dị ka Jizọs mere.
9. (a) Olee otú Jizọs si lee ndị ọ kụziiri ihe anya? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie àgwà Jizọs kpasoro ndị mmadụ?
9 Jizọs hụkwara ndị ọ kụziiri ihe n’anya, dị ka anyị ga-atụle nke ọma ná Nkebi nke Atọ. E buru amụma na Mesaya “ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere.” (Abụ Ọma 72:13) N’ezie, ihe banyere ndị mmadụ metụrụ Jizọs n’obi. Echiche ndị kpaliri ha ime ihe ndị ha mere metụrụ ya n’obi; ibu arọ ndị na-anyịgbu ha na ihe ndị gbochiri ha ịghọta eziokwu metụkwara ya n’obi. (Matiu 11:28; 16:13; 23:13, 15) Dị ka ihe atụ, cheta nwaanyị Sameria ahụ. O doro anya na obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu na Jizọs gosiri mmasị n’ebe ọ nọ. Nghọta Jizọs ghọtara ọnọdụ nwaanyị ahụ mere ka o kweta na ọ bụ onye amụma, meekwa ka ọ kọọrọ ndị ọzọ banyere Jizọs. (Jọn 4:16-19, 39) N’ezie, ndị na-eso ụzọ Jizọs taa apụghị ịhụ ihe dị n’obi ndị ha na-ekwusara ozi ọma. Ma, anyị pụrụ inwe mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ, dị ka Jizọs nwere; anyị pụrụ igosi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi; anyị pụkwara ime ka okwu anyị daba n’ihe na-amasị ha, nsogbu ha, na mkpa ha.
Ụdị Ozi Ọma Jizọs Kwusara
10, 11. (a) Olee ụdị ozi ọma Jizọs kwusara? (b) Olee ihe mere Alaeze Chineke ji dị mkpa?
10 Olee ụdị ozi ọma Jizọs kwusara? Ọ bụrụ na ị chọọ ịmata azịza ya site n’inyocha ihe ọtụtụ chọọchị ndị sịrị na ha bụ ndị nnọchianya ya na-akụzi, ị pụrụ iche na ozi ọma o kwusara bụ otú obodo ga-esi dị mma. Ma ọ bụkwanụ ị pụrụ iche na ọ kpọsara mgbanwe ọchịchị ma ọ bụkwanụ na nzọpụta nke onwe ya dị ya mkpa karịa ihe niile ọzọ. Otú ọ dị, dị ka e kwuru na mbụ, Jizọs kwuru hoo haa, sị: ‘Aghaghị m izisa ozi ọma alaeze Chineke.’ Gịnị kpọmkwem ka nke ahụ pụtara?
11 Cheta na Jizọs nọ anọ n’eluigwe n’oge mbụ Setan kwuru na otú Jehova si achị ezighị ezi. Ọ ghaghị ịbụ na o wutere Jizọs nke ukwuu ịhụ ka e kwutọrọ Nna ya bụ́ onye ezi omume, bokwa Ya ebubo na ọ bụ Onye Ọchịchị nke na-ekpe ikpe na-ezighị ezi, nke na-egbochi ndị O kere eke inweta ihe ọma. Ọ ghaghị ịbụ na o wutere Ọkpara Chineke nke ukwuu mgbe Adam na Iv, bụ́ ndị ga-abụ nne na nna ụmụ mmadụ, gere ntị ná nkwutọ Setan. Ọkpara ahụ hụrụ na nnupụisi ahụ mere ka ezinụlọ ụmụ mmadụ bute mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Ma, ọ ghaghị ịbụ na obi tọrọ ya ụtọ ịmara na otu ụbọchị, Nna ya ga-edozi ihe niile.
12, 13. Olee ikpe na-ezighị ezi Alaeze Chineke ga-edozi, oleekwa otú Jizọs si mee ka Alaeze Chineke bụrụ ihe bụ́ isi n’ozi ya?
12 Olee ihe iseokwu kasị mkpa ka e dozie? E kwesịrị ka e doo aha Jehova nsọ, wepụ nkọcha niile Setan na ndị niile na-akwado ya na-akọcha ya. E kwesịrị igosi na otú Jehova si achị ziri ezi. Jizọs ghọtara ihe iseokwu ndị a dị mkpa nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ. N’ekpere nlereanya o kpere, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha buru ụzọ rịọ ka e doo aha Nna ya nsọ. Ihe sochiri nke ahụ bụ ka Alaeze Nna ya bịa, nakwa ka uche Chineke mee n’ụwa. (Matiu 6:9, 10) N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke, nke Kraịst bụ Onye Ọchịchị ya, ga-ekpochapụ usoro ihe rụrụ arụ nke Setan n’ụwa a, meekwa ka o doo anya mgbe niile na ọchịchị Jehova bụ nke ezi omume.—Daniel 2:44.
13 Ọ bụ Alaeze ahụ bụ isiokwu ozi Jizọs. Ihe niile o kwuru na ihe niile o mere mere ka ihe Alaeze ahụ bụ doo anya, gosikwa otú Alaeze ahụ ga-esi mezuo nzube Jehova. Jizọs ekweghị ka ihe ọ bụla dọpụ uche ya n’ọrụ ya nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. N’oge ya, e nwere okwu ndị metụtara ọha na eze nakwa ikpe na-ezighị ezi juru ebe niile bụ́ ndị e kwesịrị ilebara anya ngwa ngwa. N’agbanyeghị ihe ndị a, o legidere anya n’ozi ọ na-ezisa nakwa n’ọrụ ọ na-arụ. Otú ahụ Jizọs si legide anya n’ọrụ ya ò gosiri na ọ dịghị echebara ndị ọzọ echiche, na ihe banyere ndị ọzọ adịghị emetụ ya n’obi, nakwa na otú o si eme ihe gbụrụ ndị mmadụ? Ọ dịghị ma ọlị!
14, 15. (a) Olee otú Jizọs si gosi na ya “ka Sọlọmọn”? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’ihe anyị na-ekwusa?
14 Dị ka ị pụrụ ịhụ na nkebi nke a, Jizọs mere ka ihe ọ na-ezi tọọ ụtọ ma na-adọrọ mmasị. O kwuru okwu na-eru ndị mmadụ n’obi. Nke a pụrụ ichetara anyị onye ama-mihe bụ́ Eze Sọlọmọn, onye gbara mbọ ịchọta okwu dị ụtọ, okwu ziri ezi bụ́ eziokwu, iji dee echiche niile Jehova si n’ike mmụọ nsọ kpalie ya ka o dee. (Ekliziastis 12:10) Jehova mere ka nwoke ahụ na-ezughị okè nwee “obi nwere nghọta dị ukwuu,” nke nyeere ya aka ikwu banyere ọtụtụ ihe, ma nnụnụ ma azụ̀ ma osisi ma anụ ọhịa. Ndị mmadụ si n’ebe ndị dị anya gaa igere okwu Sọlọmọn. (1 Ndị Eze 4:29-34) Ma, Jizọs “ka Sọlọmọn.” (Matiu 12:42) Ọ ka ya mara ihe, kakwa ya nwee “obi nwere nghọta dị ukwuu.” Jizọs ji ihe ọmụma dị ukwuu o nwere banyere Okwu Chineke na nke o nwere banyere nnụnụ, anụmanụ, azụ̀, ọrụ ubi, ihu ígwé, ihe ndị na-eme mgbe ahụ, akụkọ ihe mere eme, na ihe ndị metụtara ọha na eze, zie ndị mmadụ ihe. Ma, ọ dịghị mgbe Jizọs ji ihe ọ maara nyaa isi ka ndị ọzọ wee hụ ya. O mere ka ozi ya doo anya, dịkwa mfe nghọta. Ka a sịkwa ihe mere o ji na-atọ ndị mmadụ ụtọ igere okwu ya!—Mak 12:37; Luk 19:48.
15 Ndị Kraịst na-agbalị iso nduzi Jizọs. Anyị enweghị oké amamihe na ihe ọmụma o nwere. Ma, anyị niile nwetụrụ ihe ọmụma na ahụmahụ anyị pụrụ iji mee ka ndị ọzọ mara eziokwu nke Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, ndị mụrụ ụmụ pụrụ iji ihe ndị ha maara banyere ịzụ ụmụ gosi na Jehova hụrụ ụmụ Ya n’anya. Ndị ọzọ pụrụ iji ihe atụ ndị metụtara ọrụ ego, ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ ihe ndị ha maara banyere ndị mmadụ na ihe ndị na-eme ugbu a. Ma, anyị na-akpachara anya ka ihe ọ bụla ghara ịdọpụ uche anyị n’ozi anyị, ya bụ, ozi ọma Alaeze Chineke.—1 Timoti 4:16.
Otú Jizọs Si Lee Ozi Ya Anya
16, 17. (a) Olee otú Jizọs si lee ozi ya anya? (b) Olee otú Jizọs si gosi na ọ bụ ozi ya ka o lekwasịrị anya ná ndụ ya?
16 Jizọs weere ozi ya dị ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ọ tọrọ ya ụtọ inyere ndị mmadụ aka ịghọta ụdị onye Nna ya nke bi n’eluigwe bụ n’ezie, ka ozizi na ọdịnala ụmụ mmadụ chepụtara ghara igbochi ndị mmadụ ịghọta Onye ọ bụ. Ọ masịrị Jizọs inyere ndị mmadụ aka ka ha na Jehova dị ná mma, ka ha nweekwa olileanya ndụ ebighị ebi. Ọ tọkwara ya ụtọ iji ozi ọma kasie ndị mmadụ obi, meekwa ka ha nwee obi ụtọ. Olee otú o si gosi na ọ bụ otú a ka ọ dị ya n’obi? Tụlee ụzọ atọ ndị a.
17 Nke mbụ, Jizọs mere ka ozi ya bụrụ isi ihe o lekwasịrị anya ná ndụ ya. Ikwusa Alaeze Chineke bụ aka ọrụ ya, ọrụ bụ́ isi ọ na-arụ, isi ihe dị ya mkpa. Ọ bụ ya mere Jizọs ji were amamihe mee ka otú o si bie ndụ ya dị mfe, dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Ise. Dị ka ọ dụrụ ndị ọzọ ọdụ ka ha mee, o legidere anya n’ihe kasị mkpa. O nweghị ọtụtụ ihe ọ ga-akwụrụ ụgwọ, ma ọ bụ ọtụtụ ihe ọ ga-elekọta anya, rụzie ma ọ bụ gbanwee mgbe oge na-aga, bụ́ ndị pụrụ ịdọpụ uche ya. O mere ka otú o si bie ndụ ya dị mfe nke na ọ dịghị ihe na-enweghị isi dọpụrụ uche ya n’ozi ya.—Matiu 6:22; 8:20.
18. Olee otú Jizọs si jiri ike ya niile jee ozi ya?
18 Nke abụọ, Jizọs ji ike ya niile jee ozi ya. O tinyere ume dị ukwuu n’ozi ahụ, jiri ụkwụ ya gaa ọtụtụ narị kilomita gburugburu Palestaịn, na-achọgharị ndị ọ ga-ezi ozi ọma. Ọ gwara ha okwu n’ụlọ ha, n’èzí, n’ámá obodo, nakwa n’ọma ahịa. Ọ gwara ha okwu ọbụna mgbe ezumike, nri, na mmiri dị ya mkpa, ma ọ bụ mgbe ọ chọrọ ka ya na ezigbo ndị enyi ya zurutụ ike. Ọbụna mgbe ọ na-anwụ, ọ nọgidere na-ezi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke!—Luk 23:39-43.
19, 20. Olee ihe atụ Jizọs ji gosi na ọrụ nkwusa bụ ọrụ e kwesịrị ịrụ ngwa ngwa?
19 Nke atọ, Jizọs weere ozi ya dị ka ọrụ o kwesịrị ịrụ ngwa ngwa. Cheta ụka ya na nwaanyị Sameria kparịtara n’akụkụ olulu mmiri nke dị ná mpụga obodo nta bụ́ Saịka. Ikekwe, ndịozi Jizọs aghọtaghị n’oge ahụ na ọ dị mkpa izi ndị ọzọ ozi ọma ngwa ngwa. Jizọs sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu asịghị na a ka nwere ọnwa anọ tupu owuwe ihe ubi eruo? Lee! Ana m asị unu: Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.”—Jọn 4:35.
20 Jizọs ji oge ha nọ mgbe ahụ mee ihe atụ ahụ. Ihe àmà na-egosi na ọnwa ha nọ bụ Kislev (agbata November na December). Owuwe ihe ubi ọka bali ga-abụ n’ọnwa anọ na-abịa abịa, n’ihe dị ka oge Ememme Ngabiga, n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan. Ya mere, oge ahụ abụghị oge ọ ga-adị onye ọrụ ubi ngwa ngwa iwewe ihe ubi. Owuwe ihe ubi ka dị ezigbo anya. Ma olee banyere iwe ndị mmadụ dị ka ihe ubi? N’ezie, ọtụtụ ndị dị njikere ige ntị, ịmụta ihe, ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst na inweta olileanya magburu onwe ya nke Jehova setịpụụrụ ha. Ọ dị ka à ga-asị na Jizọs lepụrụ anya hụ ubi ihe atụ ahụ, na mkpụrụ ya achaala nke ọma, ikuku ana-ebugharịkwa ha, nke na-egosi na oge eruola ka a ghọọ ha.c Oge ha eruola. Ọ bụkwa ọrụ e kwesịrị ịrụ ngwa ngwa! Ya mere, mgbe ndị otu obodo nwara ime ka Jizọs nọgide n’obodo ha, ọ sịrị ha: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.”—Luk 4:43.
21. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs?
21 Anyị pụrụ iṅomi Jizọs n’ụzọ atọ a niile anyị tụlere ugbu a. Anyị pụrụ ime ka ozi Ndị Kraịst bụrụ ihe bụ́ isi ná ndụ anyị. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ inwe ihe anyị na-aghaghị imere ezinụlọ anyị, nweekwa ọrụ ego anyị na-arụ, anyị pụrụ igosi na anyị na-ebute ozi anyị ụzọ site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejechi ya anya, dị ka Jizọs mere. (Matiu 6:33; 1 Timoti 5:8) Anyị pụrụ iji ike anyị niile jee ozi, were oge anyị, ume anyị, na ihe ndị anyị nwere na-akwado ya. (Luk 13:24) Anyị pụrụ iburu n’uche mgbe niile na ọrụ anyị bụ ọrụ e kwesịrị ịrụ ngwa ngwa. (2 Timoti 4:2) Anyị kwesịrị iwere ohere ọ bụla anyị nwere na-ekwusa ozi ọma!
22. Gịnị ka a ga-atụle n’Isi nke Itoolu?
22 Jizọs gosikwara na ya hụrụ na ọrụ ahụ dị mkpa site n’ịhụ na ọrụ ahụ ga na-aga n’ihu mgbe ọ nwụsịrị. O nyefere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ikwusa ozi ọma na izi ihe ka ha na-arụ. A ga-atụle ọrụ a o nyere ha n’Isi nke Itoolu.
a Dị ka ihe atụ, mgbe nwaanyị ahụ jụrụ ya ihe mere ya onwe ya bụ́ onye Juu ji na-agwa ya onwe ya bụ́ nwaanyị Sameria okwu, nwaanyị ahụ welitere okwu mba abụọ ahụ nọ na-ese kemgbe ọtụtụ narị afọ. (Jọn 4:9) O kwukwara na ndị Sameria si n’agbụrụ Jekọb. Ma, ndị Juu n’oge ahụ adịghị achọ iji ntị anụ nke ahụ. (Jọn 4:12) Ha na-akpọ ndị Sameria ndị Kuta iji gosi na ọ bụ ndị si esi bịa mụrụ ha.
b Nkwusa pụtara ịkpọsa ozi, ma ọ bụ izisa ozi. Ya na ịkụzi ihe yitewere. Ma, ịkụzi ihe pụtara izisa ozi nke ọma nakwa ka o doo anya karị. Ịkụzi ihe nke ọma gụnyere ịchọ ụzọ dị iche iche a ga-esi ruo n’obi ndị a na-akụziri ihe iji kpalie ha ime ihe ha na-anụ.
c Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru banyere amaokwu a, sị: “Mgbe ọka [bali] kara, ọ naghịzi acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Ọ na-acha anwụ anwụ, ma ọ bụ chatụwa odo odo, nke na-egosi na oge eruola ka a ghọọ ya.”