Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lv isi 5 p. 50-61
  • Otú Anyị Ga-esi Anọpụ Iche n’Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Anyị Ga-esi Anọpụ Iche n’Ụwa
  • “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỊKWADOSI ALAEZE CHINEKE IKE NA ỊNỌPỤ ICHE
  • IGUZOGIDE “MMỤỌ NKE ỤWA”
  • IYI UWE NA IJI EJIJI KWESỊRỊ EKWESỊ
  • ILEGIDE ANYA “OTU EBE”
  • ỊCHỊRỊ “EKIKE AGHA ZURU EZU”
  • DỊRỊ NJIKERE ỊGBACHITERE IHE I KWEERE
  • Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Na-anọpụ Iche n’Ụbọchị Ikpeazụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ndị Lanarịrị Agaghị Abụ “Akụkụ nke Ụwa”
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-echebara Ákwà Anyị na Ejiji Anyị Echiche
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
lv isi 5 p. 50-61
Ebe ndị enyi bụ́ ndị kraist na-ese foto

ISI NKE ISE

Otú Anyị Ga-esi Anọpụ Iche n’Ụwa

“Unu abụghị nke ụwa.”—JỌN 15:19.

1. N’abalị ikpeazụ mgbe Jizọs bụ mmadụ n’ụwa, gịnị ka o kwusiri okwu ya ike?

N’ABALỊ ikpeazụ mgbe Jizọs bụ mmadụ n’ụwa, o gosiri na o bu ndị na-eso ụzọ ya n’obi, chọọkwa ka ọ dịrị ha mma n’ọdịnihu. O kpedịrị ya n’ekpere, sị Nna ya: “Ihe m na-arịọ gị abụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:15, 16) N’arịrịọ a Jizọs si n’ala ala obi ya rịọ Nna ya, o gosiri na ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya nke ukwuu, gosikwa na okwu ahụ o bu ụzọ gwa ụfọdụ n’ime ha n’abalị ahụ dị mkpa, nke bụ́: “Unu abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19) O doro anya na ọ dị Jizọs oké mkpa ka ndị na-eso ụzọ ya nọpụ iche n’ụwa!

2. Gịnị bụ “ụwa” ahụ Jizọs kwuru okwu ya?

2 “Ụwa” ahụ Jizọs kwuru okwu ya bụ ụmụ mmadụ niile ha na Chineke na-adịghị ná mma, bụ́ ndị Setan na-achị. Ha bụkwa ndị mmụọ mpako na nke ịchọ ọdịmma onwe onye naanị, nke si n’aka Setan, mere ka ha bụrụ ohu. (Jọn 14:30; Ndị Efesọs 2:2; 1 Jọn 5:19) N’ezie, “ịbụ enyi ụwa [ahụ] bụ ịbụ onye iro Chineke.” (Jems 4:4) Ma, olee otú ndị niile chọrọ ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke ga-esi nọrọ n’ụwa ma nọpụ iche? Anyị ga-atụle ụzọ ise, ya bụ, site n’ịkwadosi Alaeze Chineke nke dị n’aka Kraịst ike n’etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa, site n’iguzogide mmụọ nke ụwa, site n’iyi uwe kwesịrị ekwesị na iji ejiji kwesịrị ekwesị, site n’ilegide anya n’otu ebe, nakwa site n’iyiri ihe agha ime mmụọ anyị.

ỊKWADOSI ALAEZE CHINEKE IKE NA ỊNỌPỤ ICHE

3. (a) Olee otú Jizọs si lee ndọrọ ndọrọ ọchịchị e nwere n’oge ya anya? (b) Olee ihe mere a ga-eji kwuo na ndị na-eso ụzọ Jizọs e tere mmanụ bụ ndị nnọchiteanya? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

3 Kama itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke oge ya, Jizọs lekwasịrị anya n’ikwusa banyere Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe nke ọ ga-abụ Eze ya n’ọdịnihu. (Daniel 7:13, 14; Luk 4:43; 17:20, 21) Ya mere, mgbe Jizọs nọ n’ihu onye Rom bụ́ Gọvanọ Pọntiọs Paịlet, ọ sịrị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) Ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ṅomiri ihe nlereanya ya site n’ịkwadosi Kraịst na Alaeze ya ike, sitekwa n’ikwusara ụwa Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Pọl onyeozi dere, si: “Ya mere, anyị bụ ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst, dị ka à ga-asị na Chineke na-arịọsi arịrịọ ike site n’ọnụ anyị. Dị ka ndị nọ n’ọnọdụ Kraịst, anyị na-arịọ, sị: ‘Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma.’”a—2 Ndị Kọrịnt 5:20.

4. Olee otú ezi Ndị Kraịst niile sirila gosi na ha na-akwadosi Alaeze Chineke ike? (Gụọ igbe dị na peeji nke 52.)

4 Ebe ọ bụ na ndị nnọchiteanya na-anọchite anya ọchịchị mba ọzọ ma ọ bụ obodo ọzọ, ha anaghị etinye aka n’ihe a na-eme n’obodo ebe ha na-eje ozi; ha na-anọpụ iche. Otú ọ dị, ndị nnọchiteanya na-akwado ọchịchị obodo nke ha na-anọchite anya ya. Otú ahụ ka ndị na-eso ụzọ Kraịst e tere mmanụ na-eme, bụ́ ndị ‘ikike ha nwere dị ka ndị amaala dị n’eluigwe.’ (Ndị Filipaị 3:20) N’eziokwu, n’ihi ịnụ ọkụ n’obi ha ji na-ekwusa Alaeze Chineke, ha enyerela ọtụtụ nde “atụrụ ọzọ” nke Kraịst aka ‘ka ha na Chineke dị ná mma.’ (Jọn 10:16; Matiu 25:31-40) E nwere ike ikwu na atụrụ ọzọ ahụ bụ ndị ozi Kraịst n’ịkwado ụmụnna Jizọs e tere mmanụ. Dị ka otu ìgwè atụrụ dị n’otu nke na-ekwusa Alaeze Mesaya ahụ, ìgwè abụọ ahụ anaghị etinye aka ma otu ma otu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa.—Aịzaya 2:2-4.

5. Olee otú ọgbakọ Ndị Kraịst si dị iche n’Izrel oge ochie, oleekwa otú Ndị Kraịst si egosi na ha dị iche?

5 Ihe mere ezi Ndị Kraịst ji anọpụ iche abụghị naanị n’ihi na ha na-akwadosi Kraịst ike. Anyị adịghị ka ndị Izrel oge ochie, bụ́ ndị nwere ala Chineke nyere ha, kama, anyị bụ òtù ụmụnna nọ n’ụwa dum. (Matiu 28:19; 1 Pita 2:9) Ya mere, ọ bụrụ na anyị ana-akwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n’ebe anyị bi, anyị agaghị enweli nkwuwa okwu n’ikwusa ozi Alaeze ahụ, anyị ga-emebikwa ịdị n’otu Ndị Kraịst anyị. (1 Ndị Kọrịnt 1:10) Ihe ọzọkwa bụ na n’oge agha, ọ ga-eme ka anyị na-alụso ndị kwere ekwe ibe anyị ọgụ, bụ́ ndị e nyere anyị iwu ka anyị hụ n’anya. (Jọn 13:34, 35; 1 Jọn 3:10-12) Ọ bụ ya bụ isi ihe mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ịlụ agha. Ọ gwadịrị ha ka ha na-ahụ ndị iro ha n’anya.—Matiu 5:44; 26:52; gụọ igbe dị na peeji nke 55, bụ́: “Àna M Anọpụ Iche?”

6. Olee otú nrara ị raara onwe gị nye Chineke si emetụta mmekọrịta gị na Siza?

6 Ebe anyị bụ ezi Ndị Kraịst, anyị raara ndụ anyị nye Chineke, ọ bụghị mmadụ ọ bụla, òtù ụmụ mmadụ, ma ọ bụ mba ọ bụla. Ndị Kọrịnt nke Mbụ 6:19, 20 sịrị: “Ọ bụghịkwa unu nwe onwe unu, n’ihi na e ji ihe dị oké ọnụ ahịa zụta unu.” (1 Ndị Kọrịnt 6:19, 20) N’ihi ya, ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-enye “Siza” ihe ruuru ya, ya bụ, nsọpụrụ, ụtụ isi, na nrubeisi a kpaara ókè, ha na-enye “Chineke ihe Chineke.” (Mak 12:17; Ndị Rom 13:1-7) Ihe ndị ahụ ha na-enye Chineke bụ ma ofufe ha, ma iji mkpụrụ obi ha dum hụ ya n’anya, ma iji obi ha dum na-erubere ya isi. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ha na-adị njikere ịnwụ n’ihi Chineke.—Luk 4:8; 10:27; Ọrụ 5:29; Ndị Rom 14:8.

NDỊ KRAỊST OGE MBỤ NỌPỤRỤ ICHE

Akụkọ ihe mere eme na-egosi nnọọ na Ndị Kraịst oge mbụ etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa n’agha. Akwụkwọ bụ́ “Mmalite nke Iso Ụzọ Kraịst” (nke dị n’asụsụ Bekee) sịrị: “Ndị mbụ soro ụzọ Kraịst kpachapụrụ anya nke ọma ka itinye aka ọ bụla n’ọchịchị ghara ịgụ ha agụụ.” Akwụkwọ ọzọ kwuru ihe yiri ya, sị: “A na-aghọtahiekarị Ndị Kraịst oge mbụ, ndị na-achị ndị mba ọzọ eleghị ha anya ọma. . . . Ndị Kraịst ekweghị eme ihe ụfọdụ a chọrọ ka ụmụ amaala Rom na-eme. . . . Ha anaghị ekwe anara ọkwá ọchịchị.”

Otu ọkà mmụta okpukpe bụ́ Peter Meinhold kwuru banyere Ndị Kraịst oge mbụ na ịbụ onye agha, sị: “Ndị mmadụ ghọtara na ọ gaghị ekwe mmadụ omume ịbụ Onye Kraịst ma bụrụ onye agha.” N’ihe otu onye nke na-ede ihe banyere okpukpe bụ́ Jonathan Dymond dere, nke ọ kpọrọ “Ịchọpụta Ma Agha Ọ̀ Dabara Adaba n’Ụkpụrụ Ndị Kraịst,” o kwuru na ruo ọtụtụ afọ mgbe ọnwụ Jizọs gachara, ndị na-eso ụzọ Ya “ekweghị aga [agha]; n’agbanyeghị ihe ga-esi na ya pụta, ma ọ̀ bụ nkọcha, ịtụ mkpọrọ, ma ọ bụ ọnwụ.” Dymond kwukwara, sị: “Ihe ndị a bụ eziokwu doro anya.” Onye ọzọ na-ede banyere okpukpe dere, sị: “Ọ bụ naanị mgbe e metọrọ Iso Ụzọ Kraịst” ka Ndị Kraịst malitere ịbụ ndị agha.

IGUZOGIDE “MMỤỌ NKE ỤWA”

7, 8. Gịnị bụ “mmụọ nke ụwa,” oleekwa otú mmụọ ahụ si ‘arụ ọrụ’ n’ime mmadụ?

7 Ụzọ ọzọ Ndị Kraịst si anọpụ iche n’ụwa bụ site n’iguzogide mmụọ ya na-adịghị mma. Pọl dere, sị: “Anyị natara, ọ bụghị mmụọ nke ụwa, kama mmụọ nke si na Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 2:12) Ọ gwara ndị Efesọs, sị: “Unu jere ije na ha n’otu mgbe dị ka . . . ụwa a si dị, dị ka onye na-achị ikike nke ikuku si chọọ, bụ́ mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.”—Ndị Efesọs 2:2, 3.

8 “Ikuku” nke ụwa a, ma ọ bụ mmụọ ya, bụ ikike a na-adịghị ahụ anya nke na-eme ka ndị mmadụ na-enupụrụ Chineke isi, na-emekwa ka ha na-eso “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya.” (1 Jọn 2:16; 1 Timoti 6:9, 10) Ihe mere “ikike” nke mmụọ a ji na-akpa ike bụ na ọ na-amasị anụ ahụ́ na-eme mmehie. Ọ dị aghụghọ, sie ike nguzogide, jupụtakwa ebe niile dị ka ikuku. Ihe ọzọkwa bụ na ọ “na-arụ ọrụ” n’ime mmadụ site n’ime ka onye ahụ jiri nwayọọ nwayọọ na-amụta àgwà ndị na-adịghị Chineke mma, dị ka ịchọ ọdịmma onwe onye, mpako, oké ọchịchọ, mmadụ inwe ọchịchọ ime ihe ọ bụla masịrị ya nakwa nnupụisi.b E kwuo ya ná nkenke, mmụọ nke ụwa na-eji nwayọọ nwayọọ eme ka mmadụ na-azụlite àgwà Ekwensu n’obi ya.—Jọn 8:44; Ọrụ 13:10; 1 Jọn 3:8, 10.

9. Olee ụzọ ụfọdụ mmụọ nke ụwa nwere ike isi bata n’uche anyị nakwa n’obi anyị?

9 Mmụọ nke ụwa ò nwere ike ịgbanye mgbọrọgwụ n’obi gị nakwa n’uche gị? Ee, ọ ga-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na ị kwụsị iche nche. (Ilu 4:23) Ọ na-ejikarị nwayọọ nwayọọ amalite ịkpa ike, ikekwe site n’aka ndị enyi ndị nwere ike iyi ezigbo mmadụ, ma n’ezie, ha ahụghị Jehova n’anya. (Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrịnt 15:33) I nwekwara ike inweta mmụọ ahụ na-adịghị mma site n’ịgụ akwụkwọ na-ekwesịghị ekwesị, ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Ịntanet, ịgụ ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ dere n’Ịntanet, ntụrụndụ na-adịghị mma, na egwuregwu a na-asọ oké mpi na ha—n’ezie, site n’aka onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla nke na-egosi echiche Setan ma ọ bụ ụwa ya.

10. Olee otú anyị ga-esi eguzogide mmụọ nke ụwa?

10 Olee otú anyị ga-esi eguzogide mmụọ nke ụwa a dị aghụghọ, ma nọrọ n’ịhụnanya Chineke? Ọ bụ naanị site n’iji ndokwa niile Jehova mere maka ofufe ya kpọrọ ihe, nakwa site n’ikpe ekpere mgbe niile ka o nye anyị mmụọ nsọ. Jehova ka ma Ekwensu ma ụwa ọjọọ nke Setan na-achị. (1 Jọn 4:4) Ya mere, ọ dị oké mkpa ka anyị na-ekpeku Jehova ekpere mgbe niile!

ÀNA M ANỌPỤ ICHE?

Ebe otu nwa akwụkwọ na-akọwara onye nkuzi ya ihe ndị o kweere

Ụkpụrụ: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.”—Jọn 18:36.

Ajụjụ ụfọdụ ị ga-ajụ onwe gị

  • Olee otú m ga-esi akọwara mmadụ na ikele ọkọlọtọ bụ ikpere arụsị?c—Ọpụpụ 20:4, 5; 1 Jọn 5:21.

  • Mgbe m na-akọwa ihe mere na agaghị m eso mee ememme ụfọdụ nke mba, olee otú m ga-esi akwanyere ndị mụ na ha na-anọghị n’otu okpukpe ùgwù?—1 Pita 3:15.

  • Olee ihe ndị mere m ji kpebie na agaghị m akwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla ma ọ bụkwanụ rụọ ụdị ọrụ agha ọ bụla?—Jọn 13:34; 1 Jọn 3:10-12.

IYI UWE NA IJI EJIJI KWESỊRỊ EKWESỊ

11. Olee otú mmụọ nke ụwa sirila bata n’ejiji?

11 Ihe a na-ahụ anya nke na-egosi ụdị mmụọ na-achị mmadụ bụ uwe ya, ejiji ya, na ịdị ọcha ya. N’ọtụtụ mba, ọtụtụ ndị anaghị eji ejiji kwesịrị ekwesị, nke mere ka otu onye nke na-ekwu okwu na televishọn kwuo na mgbe na-adịghị anya, ọ ga-esi ike ịmata ndị bụ́ ndị akwụna. Otu ihe e dere n’akwụkwọ akụkọ sịrị na ọbụna ụmụ agbọghọ ndị na-erubeghị afọ iri na ụma amụtala ụdị ejiji a, ya bụ, “ọ na-afọ nke nta ka ha gbara ọtọ, ha na-emebigakwa ihe ókè.” Ejiji ọzọ na-ewu ewu bụ iji ejiji ka ndị ara, nke na-egosi mmụọ nke nnupụisi nakwa mmadụ akwanyereghị onwe ya na ndị ọzọ ùgwù.

12, 13. Olee ụkpụrụ ndị anyị kwesịrị iso n’iyi uwe na n’iji ejiji?

12 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị kwesịrị ịdị mma n’anya, nke pụtara iji ezigbo ejiji kwesịrị ekwesị, nakwa nke kwesịrị ihe anyị na-eme. Ejiji anyị na-eji mgbe niile kwesịrị igosi “imeru ihe n’ókè na uche zuru okè,” nke kwesịrị onye ọ bụla ‘na-ekwupụta na ya na-asọpụrụ Chineke’ ma na-arụ “ezi ọrụ,” ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ̀ bụ nwaanyị. N’ezie, ihe kacha anyị mkpa abụghị ime ka ndị mmadụ lewe anyị, kama ọ bụ ka anyị ‘nọrọ n’ịhụnanya Chineke.’ (1 Timoti 2:9, 10; Jud 21) N’ezie, anyị chọrọ ka ezigbo ejiji anyị bụrụ “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi . . . , nke bara uru nke ukwuu n’anya Chineke.”—1 Pita 3:3, 4.

13 Ka anyị burukwa n’obi na ụdị uwe anyị na-eyi na ụdị ejiji anyị na-eji nwere ike imetụta otú ndị ọzọ si ele ezi ofufe anya. Okwu Grik e si sụgharịta “imeru ihe n’ókè,” mgbe a na-ekwu banyere omume ọma, pụtara nsọpụrụ, ịtụ egwu, na ịkwanyere echiche nke ndị ọzọ ùgwù. N’ihi ya, anyị kwesịrị ichebara akọnuche ndị ọzọ echiche karịa ikike anyị chere na anyị nwere iji ejiji masịrị anyị. Nke ka nke, anyị kwesịrị iwetara Jehova na ndị ya otuto, meekwa ka ndị mmadụ mata na anyị bụ ndị ozi Chineke, ‘na-eme ihe niile iji nye Chineke otuto.’—1 Ndị Kọrịnt 4:9; 10:31; 2 Ndị Kọrịnt 6:3, 4; 7:1.

Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ yi uwe dị mma ná anya na-ezi ozi ọma

Ejiji m ọ̀ na-ewetara Jehova otuto?

14. N’ihe banyere iji ejiji na ịdị ọcha, olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

14 Uwe anyị, ejiji anyị, na ịdị ọcha anyị dị mkpa mgbe anyị nọ n’ozi ọma ma ọ bụ na-aga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ejiji m na ịdị ọcha m ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ na-ele m anya ọjọọ? Ọ̀ na-emenye ndị ọzọ ihere? M̀ na-ewere ikike m nwere iji ejiji masịrị m dị ka ihe dị mkpa karịa iru eru inwe ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ?’—Abụ Ọma 68:6; Ndị Filipaị 4:5; 1 Pita 5:6.

15. Gịnị mere Okwu Chineke enyeghị anyị iwu niile banyere otú anyị ga-esi na-eyi uwe, otú ejiji anyị ga na-adị, na otú anyị ga-esi na-edebe onwe anyị ọcha?

15 Baịbụl enyeghị Ndị Kraịst iwu niile banyere ụdị uwe ha ga na-eyi, otú ejiji ha ga na-adị, na otú ha ga-esi na-edebe onwe ha ọcha. Jehova achọghị ịnapụ anyị ikike anyị nwere ịhọrọ ihe anyị ga-eme ma ọ bụ iji ọgụgụ isi anyị na-eche echiche. Kama nke ahụ, ọ chọrọ ka anyị bụrụ ndị tozuru okè, ndị na-echebara ụkpụrụ Baịbụl echiche, nakwa ndị “zụworo ikike nghọta ha azụ, site n’iji ya eme ihe, ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” (Ndị Hibru 5:14) Nke ka nke, ọ chọrọ ka ịhụnanya na-eduzi anyị, ya bụ, ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. (Mak 12:30, 31) N’ime ohere ahụ o nyere anyị, e nwere ụzọ dị nnọọ iche iche anyị ga-esi na-eyi uwe, na-ejikwa ejiji. E nwere ike ịhụ nke a n’etiti ndị Jehova yi uwe dị iche iche, ndị na-enwekwa ọṅụ, n’agbanyeghị ebe ha zukọtara n’ụwa.

ILEGIDE ANYA “OTU EBE”

16. Olee otú mmụọ nke ụwa si emegide ozizi Jizọs, oleekwa ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

16 Mmụọ nke ụwa dị aghụghọ, ọ na-emekwa ka ọtụtụ nde mmadụ na-atụkwasị ego na ihe onwunwe obi iji nweta obi ụtọ. Otú ọ dị, Jizọs sịrị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) Ọ bụ ezie na Jizọs akwadoghị ka mmadụ na-ata onwe ya ahụhụ, ọ kụziri na “ndị maara mkpa ime mmụọ ha” na ndị legidere anya “otu ebe,” ya bụ, ndị nwere ezi obi ma lekwasị anya ná mmekọrịta ha na Chineke, ga-enweta ndụ na ezigbo obi ụtọ. (Matiu 5:3; 6:22, 23) Jụọ onwe gị, sị: ‘N’eziokwu, m̀ kwetara ihe Jizọs kụziri, ka “nna ụgha” ọ̀ na-emegharị m anya? (Jọn 8:44) Gịnị ka ihe m na-ekwu, ihe mgbaru ọsọ m, ihe m na-ebute ụzọ, na otú m si ebi ndụ na-egosi?’—Luk 6:45; 21:34-36; 2 Jọn 6.

17. Kwuo ụfọdụ n’ime uru ndị na-elegide anya otu ebe na-erite.

17 Jizọs sịrị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Matiu 11:19) Chee echiche banyere ụfọdụ n’ime uru ndị na-elegide anya otu ebe na-erite. Ha na-enweta ezigbo ume n’ozi Alaeze. (Matiu 11:29, 30) Ha na-ezere nchegbu na-enweghị isi na ọdụ, si otú ahụ na-ezere iche oké echiche na inwe obi mgbawa. (1 Timoti 6:9, 10) Ebe ọ bụ na afọ juru ha n’ihi inwe ihe ndị dị mkpa ná ndụ, ha na-enwekwu oge ha na ndị ezinụlọ ha na Ndị Kraịst ibe ha ga-eji na-anọrị. O nwere ike ime ka ha na-ehikwu ụra nke ọma. (Ekliziastis 5:12) Ha na-enweta ọṅụ ka ukwuu a na-enweta n’inye ihe. Ha na-enye ihe n’ụzọ ọ bụla kwere ha omume. (Ọrụ 20:35) Ha “na-ejupụta n’olileanya,” nweekwa obi iru ala na afọ ojuju. (Ndị Rom 15:13; Matiu 6:31, 32) Ngọzi ndị a enweghị atụ n’ezie!

ỊCHỊRỊ “EKIKE AGHA ZURU EZU”

18. Olee otú Baịbụl si kọwaa onye iro anyị, atụmatụ ya, na ụdị mgba anyị na-agba?

18 A na-echebekwa ndị nọgidere n’ịhụnanya Chineke ka Setan ghara ime ka ha kwụsị ife Chineke. Setan chọrọ ime ka Ndị Kraịst ghara inweta ndụ ebighị ebi, ọ bụghị naanị obi ụtọ. (1 Pita 5:8) Pọl sịrị: “Anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị, megide ikike, megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Okwu ahụ bụ́ “mgba” pụtara na ọgụ anyị na-alụ abụghị ọgụ a na-anọ n’ebe dị anya alụ, ya bụ, nke a na-anọ n’ebe zoro ezo alụ, kama ọ bụ ọgụ i jide m, mụ ejide gị. Ihe ọzọkwa bụ na okwu ndị ahụ bụ́ “ọchịchị,” “ikike,” na “ndị na-achị ụwa” gosiri na ọgụ ndị mmụọ ọjọọ na-alụso anyị bụ nke e leziri nnọọ anya hazie.

19. Kọwaa ekike agha ime mmụọ Onye Kraịst nwere.

19 Otú ọ dị, anyị ga-enweli mmeri n’agbanyeghị na anyị bụ ndị na-ezughị okè, ndị na-adịghịkwa ike. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ site n’ịchịrị “ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke.” (Ndị Efesọs 6:13) Ndị Efesọs 6:14-18 kọwara ekike agha ahụ, sị: “Ya mere, guzosienụ ike, werenụ eziokwu kee úkwù unu, yirinụ ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume, yirikwanụ akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo n’ụkwụ unu. Karịsịa ihe niile, burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe, nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ. Narakwanụ okpu agha [ma ọ bụ olileanya] bụ́ nzọpụta, na mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke, ka unu ji ụdị ikpe ekpere ọ bụla na ụdị ịrịọsi arịrịọ ike ọ bụla na-anọgide n’ekpere n’oge niile n’ime mmụọ nsọ.”

20. Olee otú ọgụ anyị na-alụ si dị iche na nke ndị agha nkịtị?

20 Ebe ọ bụ Chineke nyere anyị ekike agha ime mmụọ ahụ, o nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ichebe anyị, ma ọ bụrụ na anyị eyiri ya mgbe niile. Ndị Kraịst adịghị ka ndị agha nkịtị, bụ́ ndị na-eme ha lụchaa agha, ha echere ruo mgbe ọzọ agha ga-ada, kama ha nọ n’ọgụ ọnwụ na ndụ nke na-agaghị akwụsị akwụsị ruo mgbe Chineke ga-ebibi ụwa Setan, tụbakwa ndị mmụọ ọjọọ niile n’ime abis. (Mkpughe 12:17; 20:1-3) N’ihi ya, adala mbà ma ọ bụrụ na gị na adịghị ike na ọchịchọ na-ezighị ezi na-alụ ọgụ, n’ihi na anyị niile ‘ga-etipụta ahụ́ anyị ọnyá’ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ mgbe niile. (1 Ndị Kọrịnt 9:27) N’eziokwu, ọ bụ mgbe anyị kwụsịrị ịgba mgba ka anyị ga-aba ná nsogbu!

21. Gịnị naanị ga-eme ka anyị merie n’agha ime mmụọ anyị na-alụ?

21 Ọzọkwa, anyị agaghị enweli mmeri n’ọgụ a ma anyị dabere n’ike aka anyị. Ọ bụ ya mere Pọl ji chetara anyị na ọ dị mkpa ka anyị na-ekpeku Jehova ekpere “n’oge niile n’ime mmụọ nsọ.” Anyị kwesịkwara ige Jehova ntị site n’ịmụ Okwu ya, na anyị na “ndị agha” ibe anyị ịna-akpakọrịta mgbe niile, n’ihi na anyị anaghị alụ ọgụ a naanị anyị! (Faịlimọn 2; Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ bụghị naanị na ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ụzọ ndị a niile ga-enwe mmeri, kamakwa, ha ga-enwe ike ịgbachitere ihe ha kweere ma ọ bụrụ na a jụọ ha ajụjụ.

DỊRỊ NJIKERE ỊGBACHITERE IHE I KWEERE

22, 23. (a) Gịnị mere anyị ga-eji dị njikere mgbe niile ịgbachitere ihe anyị kweere, olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’Isi nke Isii?

22 Jizọs sịrị: “Unu abụghị nke ụwa . . . , ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.” (Jọn 15:19) Ya mere, Ndị Kraịst aghaghị ịdị njikere mgbe niile ịgbachitere ihe ha kweere, jirikwa obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù na-eme otú ahụ. (1 Pita 3:15) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ ghọtara ihe mere Ndịàmà Jehova ji eme ihe dị iche mgbe ụfọdụ n’ihe ndị ọzọ na-eme? Ọ bụrụ na ihe ịma aka dị otú ahụ abịara m, obi ọ̀ ga-esi m ike na ihe Baịbụl na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwuru ziri ezi? (Matiu 24:45; Jọn 17:17) N’ihe banyere ime ihe ziri ezi n’anya Jehova, m̀ ga-adị njikere ịdị iche ma jiri ya na-akpa nganga?’—Abụ Ọma 34:2; Matiu 10:32, 33.

23 Ma, a na-esikarị ụzọ aghụghọ dị iche iche ele ọchịchọ anyị nwere ịnọpụ iche n’ụwa ule. Dị ka ihe atụ, anyị kwuru na mbụ na Ekwensu na-agbalị iji ntụrụndụ ụwa araba ndị ohu Jehova n’ụwa. Olee otú anyị ga-esi na-ahọrọ ntụrụndụ dị mma nke ga-eme ka anyị nweta ume nakwa akọnuche dị ọcha? Ọ bụ ihe anyị ga-atụle n’Isi nke Isii.

a Kemgbe Pentikọst nke afọ 33 O.A., Kraịst bụ Eze na-achị ọgbakọ Ndị Kraịst e tere mmanụ dị n’ụwa. (Ndị Kọlọsi 1:13) N’afọ 1914, e nyere Kraịst ikike ịchị “alaeze nke ụwa.” Ya mere, Ndị Kraịst e tere mmanụ bụkwa ndị nnọchiteanya nke Alaeze Mesaya ahụ ugbu a.—Mkpughe 11:15.

b Gụọ Reasoning From the Scriptures, peeji nke 389-393, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

c Gụọ isiokwu dị na peeji 212-215.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya