NKEBI NKE 2
Mgbanwe Ị Na-enwe n’Ahụ́ Gị
Otú ahụ́ gị si agbanwe ọ̀ na-ewe gị iwe?
□ Ee □ Ee e
Mgbanwe ị na-enwe n’ahụ́ gị ọ̀ na-agbagwoju gị anya, mee ka ahụ́ ghara iru gị ala ma ọ bụ ka ụjọ tụwa gị?
□ Ee □ Ee e
Ị̀ na-eche banyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị mgbe niile?
□ Ee □ Ee e
N’ajụjụ ndị ahụ, ọ bụrụ na e nwere nke ọ bụla ị zara “ee,” enyela onwe gị nsogbu—ọ pụtaghị na o nwere ihe na-eme gị! N’eziokwu, mgbanwe ndị ahụ ị na-ahụ n’ahụ́ gị ugbu a nwere ike mee ka obi tọọ gị ụtọ mgbe ụfọdụ, meekwa ka obi jọọ gị njọ mgbe ụfọdụ. N’agbanyeghị na ị chọrọ ịbụ dimkpa, ụjọ nwere ike ịtụwa gị ugbu a o ruru n’omume! Isi nke 6 ruo nke 8 ga-enyere gị aka imeri nsogbu ahụ.
[Foto juru ihu peeji nke 56 na nke 57]