NKEBI NKE 7
Otú Obi Na-adị Gị
N’ime ihe ndị a e dere, olee nke kacha kọwaa ụdị onye ị bụ?
□ Ọ na-esiri m ike ijide onwe m.
□ Ọ dịghị uru m bara—o nweghị ihe m ma eme.
□ Obi na-ajọkarị m njọ. Anaghị m enwe obi ụtọ.
□ Ana m echekarị banyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m.
□ Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka mụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m nwewe mmekọahụ.
Ọ bụrụ na e nwere nke ị zara n’ihe ndị ahụ e dere, adala mbà! Isi nke 26 ruo nke 29 ga-enyere gị aka ịmụta ijide onwe gị ka ị ghara ime ihe ọ bụla batara gị n’obi.
[Foto juru ihu peeji nke 216 na nke 217]