NKEBI NKE 8
Ntụrụndụ
Ugboro ole ka ị na-enwe ntụrụndụ ndị dị ka mmega ahụ́, ige egwú, ile fim, ile TV ma ọ bụ igwu egwuregwu kọmputa?
□ Ọ na-ara ahụ́
□ Otu ugboro n’ụbọchị
□ Ọtụtụ ugboro n’ụbọchị
Ole ndị na-akacha ekpebi ụdị ntụrụndụ ị na-ahọrọ?
□ Ndị ọgbọ gị
□ Papa gị ma ọ bụ mama gị
□ Ndị na-akpọsa ngwá ahịa
O yiri ka gị na ndị ọgbọ gị ùnu nwere ọtụtụ ntụrụndụ unu ga-ahọrọ karịa ọgbọ ọ bụla ọzọ e nwetụrụla. Ma awa i nwere n’ụbọchị ebughị ibu. Ụdị ntụrụndụ ị họọrọ ga-emetụtakwa echiche gị na àgwà gị. N’ihi ya, awa ole ka i kwesịrị iji enwe ntụrụndụ? Oleekwa otú ị ga-esi mara nke ị ga-ahọrọ? Isi nke 30 ruo nke 33 ga-enyere gị aka ileru ntụrụndụ ị na-ahọrọ anya nke ọma.
[Foto juru ihu peeji nke 244 na nke 245]