NKEBI NKE 1 • ỌRỤ 1:1–6:7
“Unu Emeela Ka Ihe Unu Na-akụzi Gbasaa Ebe Niile Na Jeruselem”
Ozugbo a wụkwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ na Pentikọst afọ 33 O.N.K., ha malitere ikwusasi ozi ọma Alaeze Chineke ike. Ná nkebi a, anyị ga-eleba anya n’otú ọgbakọ Ndị Kraịst si malite, n’ozi ọma kpọtụrụ akpọtụ e kwusara na Jeruselem, nakwa n’obi ike ndịozi Jizọs nwere n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ.