NKEBI NKE 7 • Ọrụ 18:23–21:17
“Izi . . . Ihe N’ihu Ọha Nakwa N’ụlọ N’ụlọ”
Gịnị mere anyị ji kwesị ịdị umeala n’obi ma na-agbanwe otú anyị si akụziri ndị dị iche iche ihe? Olee ụzọ bụ́ isi anyị si ekwusa ozi ọma? Olee otú anyị ga-esi egosi na ime uche Chineke dị anyị mkpa karịa ime ihe dị anyịnwa mma? Akụkọ na-atọ ụtọ e dere banyere njem nke atọ, bụ́kwanụ nke ikpeazụ, Pọl mere gaa kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a dị mkpa.