Abụ nke 86
Ndị Inyom Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Ụmụnna Nwaanyị
1. Sera na Esta, Meri, Rut, na ndị ọzọ,
Ha niile bụ ezigbo nd’inyom fere Jaa.
Mkpa ha bụ ịsọpụrụ Chineke.
Ha fere Chineke; a’yị ma aha ha.
Ọ dị ndị ọzọ mer’uche Jehova
A n’akpọghị aha ha, ha nwekwar’okwukwe.
2. Ezi ụmụ nwaanyị ndị a n’echetar’anyị
Àgw’ọma ’madụ dum kwesịrị inwe,
Dị k’ob’ike, ịdị mma na obiọma.
’Madụ niile kwesịrị iṅomi ha.
Nd’inyom n’eṅomi ha n’ọgbakọ,
Ozi unu bar’uru, ọ n’enye unu ọṅụ.
3. Ụmụnna nwaanyị niile nọ n’ọgbakọ,
Unu ji obi unu dum n’arụsi ọrụ ike.
Unu dị obi umeala, n’erubekw’isi.
Jaa hụr’unu n’anya; unu atụl’egwu.
Ka Jehova Chinek’anyị mee ka
Okwukwe unu si’ike; ụgw’ọr’unu dị nso.
(Gụọkwa Fil. 4:3; 1 Tim. 2:9, 10; 1 Pita 3:4, 5.)