Nkebi nke 7
Chineke Napụtara Ụmụ Izrel
Jehova tiri Ijipt ihe otiti, Mozis dupụtakwara ụmụ Izrel n’ala ahụ. Chineke si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel Iwu
ỤMỤ Izrel biri ọtụtụ afọ n’Ijipt, ihe gaziiri ha, ha amụbaakwa. Ma, Fero ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị Ijipt. Ọ bụ onye ọchịchị obi tara mmiri nke tụrụ ụjọ na ụmụ Izrel na-amụba n’ike n’ike. N’ihi ya, o mere ha ndị ohu ma nye iwu ka a tụba nwa nwoke ọ bụla ndị Izrel mụrụ ọhụrụ n’Osimiri Naịl. Ma otu nwaanyị obi kara chebere nwa ya nwoke ọ mụrụ ọhụrụ. O tinyere ya n’ime nkata ma zoo ya n’etiti ahịhịa amị. Ada Fero hụrụ nwa ọhụrụ ahụ, gụọ ya Mozis, ma zụọ ya n’ezinụlọ eze Ijipt.
Mgbe Mozis dị iri afọ anọ, ọ banyere ná nsogbu ka ọ na-achọ ịnapụta onye Izrel bụ́ ohu n’aka onye Ijipt bụ́ onyeisi ọrụ. Mozis gbagara n’ala dị anya, ma biri n’ebe ahụ. Mgbe Mozis dị iri afọ asatọ, Jehova zighachiri ya Ijipt ka ọ gaa gwa Fero ka ọ hapụ ndị Chineke ka ha laa.
Fero jụwapụrụ isi. N’ihi ya, Chineke tiri ndị Ijipt ihe otiti iri. Mgbe ọ bụla a chọrọ iti Ijipt ihe otiti, Mozis na-aga gwa Fero ihe ọ ga-eme iji zere ihe otiti ahụ, ma Fero kpọrọ ekwo nkụ. Ọ chọghịdị iji ntị anụ ihe Mozis na Chineke ya bụ́ Jehova na-agwa ya. N’ikpeazụ, ihe otiti nke iri gburu nwa mbụ ọ bụla a mụrụ n’ala ahụ—ma e wezụga n’ezinụlọ ndị gere Jehova ntị tee ọbara nwa atụrụ ha gburu n’ọnụ ụzọ ha. Mmụọ ozi Chineke nke gara igbu nwa mbụ ọ bụla gafere ụlọ ndị ahụ e tere ọbara. Ụmụ Izrel mechara mewe ememme kwa afọ iji cheta nnapụta ahụ dị egwu a napụtara ha. A kpọrọ ya Ememme Ngabiga.
Mgbe Fero hụrụ na ọkpara ya anwụọla, o nyere Mozis na ụmụ Izrel niile iwu ka ha si n’Ijipt pụọ. Ha haziri ìgwè mmadụ ahụ ozugbo ka ha si n’Ijipt pụọ. Ma Fero gbanwere obi ya. O ji ọtụtụ ndị agha na ụgbọ ịnyịnya chụrụ ha gawa. Ụmụ Izrel yiri ka hà atọla mgbe ha ruru n’akụkụ Oké Osimiri Uhie. Ma Jehova kewara Oké Osimiri Uhie ahụ abụọ, mee ka ụmụ Izrel si n’ala akọrọ gafere, n’etiti mmiri ahụ nke yiri mgbidi n’akụkụ ha abụọ! Mgbe ndị Ijipt chụụrụ ha bata n’ime mmiri ahụ, Chineke mere ka mmiri ahụ daa ka mgbidi ma rie Fero na ndị agha ya.
Mgbe e mechara, Jehova na ụmụ Izrel gbara ndụ mgbe ha mara ụlọikwuu ha n’akụkụ Ugwu Saịnaị. Chineke si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel iwu ndị ga-eduzi ma chebe ha n’ihe ọ bụla ha na-eme. Ọ bụrụhaala na ụmụ Izrel erubere Chineke isi ma kwe ka ọ chịwa ha, Jehova ga-anọnyere ha ma si n’aka ha gọzie mba ndị ọzọ.
Ma, ọtụtụ n’ime ụmụ Izrel kpasuru Chineke iwe n’ihi enweghị okwukwe ha. N’ihi ya, Jehova mere ka ọgbọ ahụ wagharịa iri afọ anọ n’ala ịkpa. Ma Mozis họpụtara Jọshụa bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi ka ọ nọchie ya. N’ikpeazụ, ụmụ Izrel jikeere ịba n’ala ahụ Chineke kwere Ebreham ná nkwa.
—O si n’Ọpụpụ; Levitikọs; Ọnụ Ọgụgụ; Diuterọnọmi; Abụ Ọma 136:10-15; Ọrụ Ndịozi 7:17-36.
◼ Olee otú Jehova si jiri Mozis napụta ụmụ Izrel?
◼ Gịnị mere ụmụ Izrel ji mee Ememme Ngabiga?
◼ Olee otú Jehova si napụta ụmụ Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt?
Igbe dị na peeji nke 10]
IWU KACHANỤ
N’ihe dị ka narị iwu isii e si n’aka Mozis nye, o nwere ike ịbụ na ndị a kacha mara bụ Iwu Iri ahụ e dere n’Ọpụpụ 20:1-17. Ma, mgbe a jụrụ Jizọs Kraịst nke kacha n’Iwu niile Chineke nyere, ọ sịrị na ọ bụ: “Jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”—Mak 12:28-30; Diuterọnọmi 6:5.
[Chaatị dị na peeji nke 10]
Jenesis
● Ọpụpụ
● Levitikọs
● Ọnụ Ọgụgụ
● Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti