Nkebi nke 22
Ndịozi Kwusara Ozi Ọma n’Atụghị Egwu
Ọgbakọ Ndị Kraịst toro n’ike n’ike n’agbanyeghị mkpagbu
MGBE Jizọs lara eluigwe, abalị iri agaa, ihe dị ka otu narị ndị na-eso ụzọ ya na iri abụọ zukọrọ na Jeruselem n’ụbọchị ndị Juu na-eme Ememme Pentikọst, n’afọ 33 O.A. Na mberede, ụzụ yiri nke oké ifufe jupụtara n’ụlọ ahụ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere ikwu okwu n’asụsụ ndị ha na-amaghị n’ụzọ ọrụ ebube. Olee ihe mere ihe ndị ahụ dị ịtụnanya ji na-eme? Ọ bụ n’ihi na Chineke enyela ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ.
Ìgwè mmadụ gbakọrọ n’èzí n’ihi na ndị mmadụ si ọtụtụ ebe bịa ememme ahụ. O juru ha anya ịnụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-asụ asụsụ ha nke ọma! Mgbe Pita na-akọwa ihe merenụ, o kwuru ihe Joel onye amụma dere, ya bụ na Chineke ‘ga-awụpụ’ mmụọ ya, nke ga-eme ka ndị a wụkwasịrị ya nweta onyinye ọrụ ebube. (Joel 2:28, 29) Ike ahụ mmụọ nsọ kpara mere ka o doo anya na e nweela mgbanwe dị ukwuu, ya bụ na Chineke anaghịzi eji Izrel arụ ọrụ kama ọ bụzi ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ e hiwere ọhụrụ. Ndị chọrọ ife Chineke ezi ofufe kwesịrị ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst.
Ma, ndị iro ndị na-eso ụzọ Jizọs kpagbusiri ha ike ma tụọ ha mkpọrọ. Ma n’abalị, mmụọ ozi Jehova kpọpụtara ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ụlọ mkpọrọ ma gwa ha nọgide na-ekwusa ozi ọma. Mgbe chi bọrọ, ha mere otú ahụ. Ha banyere n’ụlọ nsọ, malite ikwusa ozi ọma banyere Jizọs. Iwe were ndị okpukpe na-emegide ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Ndịozi ahụ zara ha n’atụghị egwu, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ Ndịozi 5:28, 29.
Mkpagbu ha kara njọ. Ụfọdụ ndị Juu boro onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Stivin ebubo na o kwuluru Chineke ma jiri nkume tụgbuo ya. Otu nwa okorobịa, bụ́ onye Tasọs aha ya bụ Sọl, hụrụ mgbe a na-egbu Stivin ma kwadoo ogbugbu ya. Ọ gawaziri Damaskọs ịnwụchi onye ọ bụla na-eso ụzọ Kraịst. Mgbe Sọl nọ n’ụzọ, ìhè si n’eluigwe nwuo gburugburu ya, otu olu agwa ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” Ìhè ahụ mere ka Sọl kpuo ìsì, ya ajụọ, sị: “Ị̀ bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zara ya, sị: “Abụ m Jizọs.”—Ọrụ Ndịozi 9:3-5.
Ka abalị atọ gachara, Jizọs zipụrụ otu onye na-eso ụzọ ya aha ya bụ Ananayas ka ọ gaa mee ka Sọl hụwa ụzọ. E mere Sọl baptizim, ya amalite ikwusa ozi ọma banyere Jizọs n’atụghị egwu. A kpọwaziri Sọl Pọl onyeozi, ọ ghọkwara onye na-anụ ọkụ n’obi n’ọgbakọ Ndị Kraịst.
Ọ bụ naanị ndị Juu na ndị Sameria ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-ekwusara ozi ọma Alaeze Chineke. Otu mmụọ ozi bịakwutere ọchịagha ndị Rom bụ́ Kọniliọs, onye na-atụ egwu Chineke, ma gwa ya ka o zie ozi ka a gaa kpọọ Pita onyeozi. Pita kpọọrọ ndị ọzọ gaa kwusaara Kọniliọs na ezinụlọ ya ozi ọma. Ka Pita kpụ okwu n’ọnụ, mmụọ nsọ dakwasịrị ndị Jentaịl ahụ kwere ekwe, onyeozi ahụ ekwuo ka e mee ha baptizim n’aha Jizọs. E megheere ndị si ná mba niile ụzọ ugbu a inweta ndụ ebighị ebi. Ọgbakọ ahụ dị njikere ikwusa ozi ọma n’ebe niile.
—O si n’Ọrụ Ndịozi 1:1–11:21.
◼ Gịnị mere n’Ememme Pentikọst?
◼ Olee ihe ndị mmegide mere n’ihi ozi ọma ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwusa?
◼ Olee otú e si megheere ndị si ná mba niile ụzọ inweta ndụ ebighị ebi?
Chaatị dị na peeji nke 25]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi ●
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe