Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 26 p. 30
  • Ụwa Ga-aghọ Paradaịs!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa Ga-aghọ Paradaịs!
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • “Ozi Obi Ụtọ” Sitere n’Apọkalips
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Mgbapụta Ná Mkpughe Nke Jisọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 26 p. 30

Nkebi nke 26

Ụwa Ga-aghọ Paradaịs!

Jehova ga-eji Alaeze ya dị n’aka Kraịst doo aha ya nsọ, gosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị, ma wepụ ihe ọjọọ niile

MKPUGHE, bụ́ akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl, na-eme ka ụmụ mmadụ nwee olileanya. Ọ bụ Jọn onyeozi dere ya. N’akwụkwọ Mkpughe, e gosiri ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu iji mezuo nzube Jehova.

N’ọhụụ nke mbụ, Jizọs, bụ́ onye a kpọlitere n’ọnwụ, jara ọgbakọ ụfọdụ mma ma gbazie ha. Ọhụụ nke ọzọ na-egosi ocheeze Chineke dị n’eluigwe, bụ́ ebe ndị mmụọ ozi na-eto ya.

Ka nzube Chineke na-emezu, Nwa Atụrụ ahụ bụ́ Jizọs Kraịst natara akwụkwọ mpịakọta e ji ihe asaa a kara akara mechie. Mgbe e meghere ihe anọ ndị mbụ e ji kaa akwụkwọ ahụ akara, ndị ịnyịnya anọ e ji mee ihe atụ pụtara n’ụwa. Onye nke mbụ bụ Jizọs. Ọ nọ n’elu ịnyịnya ọcha, o kpukwa okpueze. Ndị nke ọzọ nọ n’elu ịnyịnya ndị na-acha iche iche. Ha na-anọchite anya agha, ụnwụ nri, na ọrịa na-efe efe, bụ́ ihe ndị na-eme n’oge ikpeazụ nke usoro ihe a. Mgbe e meghere ihe nke asaa e ji kaa akwụkwọ ahụ akara, a fụrụ opi ihe atụ asaa, nke na-egosi na a kpọsara ikpe Chineke. Ihe ndị a mere ka e nwee ihe otiti ihe atụ asaa, ma ọ bụ ihe ndị gosiri na iwe ji Chineke.

Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe. E ji nwa nwoke a mụrụ ọhụrụ mee ihe atụ ya. Agha dara n’eluigwe, a chụdakwara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. Otu oké olu kwuru, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa.” Ekwensu na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.—Mkpughe 12:12.

Jọn hụrụ Jizọs n’eluigwe, bụ́ onye nwa atụrụ na-anọchi anya ya, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ bụ́ ndị e si n’etiti ụmụ mmadụ zụta. Ha ‘ga-eso Jizọs chịa dị ka ndị eze.’ N’ihi ya, akwụkwọ Mkpughe mere ka a mata na ndị ọzọ a so ná mkpụrụ ahụ ga-adị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.—Mkpughe 14:1; 20:6.

Ndị eze ụwa na-ezukọta maka Amagedọn, bụ́ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” Ha na-alụso Jizọs, bụ́ onye nọ n’elu ịnyịnya ọcha ahụ, ọgụ. Ọ bụ ya na-edu ìgwè ndị agha nọ n’eluigwe. Ọ ga-ebibi ndị eze niile nke ụwa. A ga-eke Setan agbụ. Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-achịkwa ụwa ruo “otu puku afọ.” Mgbe otu puku afọ ahụ gachara, a ga-egbu Setan.—Mkpughe 16:14; 20:4.

Olee uru ụmụ mmadụ na-erube isi ga-erite n’Ọchịchị Otu Puku Afọ nke Kraịst na ndị ga-eso ya chịa? Jọn dere, sị: “[Jehova] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” (Mkpughe 21:4) Ụwa ga-aghọ Paradaịs!

N’ihi ya, akwụkwọ Mkpughe mere ka ihe Baịbụl na-ekwu zuo ezuo. Alaeze Mesaya ga-edo aha Jehova nsọ ma mee ka o doo anya ruo mgbe ebighị ebi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị.

—O si n’akwụkwọ Mkpughe.

◼ Olee ihe ndị ịnyịnya ahụ e ji mee ihe atụ pụtara?

◼ Olee ihe ndị merenụ ka nzube Chineke na-emezu?

◼ Gịnị bụ Amagedọn, oleekwa ihe ọ ga-arụ?

Igbe dị na peeji nke 30]

“BABỊLỌN UKWU AHỤ”

Akwụkwọ Mkpughe mere ka a mata na okpukpe ụgha niile, ya bụ, okpukpe niile na-emegide ezi Chineke, bụ “oké nwaanyị akwụna.” A kpọrọ ya “Babịlọn Ukwu ahụ,” ya na ndị eze ụwa na-akwakwa iko. Akwụkwọ Mkpughe kwuru na mgbe oge Jehova Chineke ruru, ndị eze ụwa ga-alụso nwaanyị ahụ na-akwa iko ọgụ ma gbuo ya.—Mkpughe 17:1-5, 16, 17.

[Chaatị dị na peeji nke 30]

Jenesis

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa

Ndị Ikpe

Rut

1 Samuel

2 Samuel

1 Ndị Eze

2 Ndị Eze

1 Ihe E Mere

2  Ihe E Mere

Ezra

Nehemaya

Esta

Job

Abụ Ọma

Ilu

Ekliziastis

Abụ Sọlọmọn

Matiu

Mak

Luk

Jọn

Ọrụ Ndịozi

Ndị Rom

1 Ndị Kọrịnt

2 Ndị Kọrịnt

Ndị Galeshia

Ndị Efesọs

Ndị Filipaị

Ndị Kọlọsi

1 Ndị Tesalonaịka

2 Ndị Tesalonaịka

1 Timoti

2 Timoti

Taịtọs

Faịlimọn

Ndị Hibru

Jems

1 Pita

2 Pita

1 Jọn

2 Jọn

3 Jọn

Jud

● Mkpughe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya