Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yp1 isi 26 p. 183-187
  • Gịnị Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ?
  • Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mata Ihe Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ
  • Jiri Ihe I Kweere Na-eme Ọnụ
  • Kpebisie Ike na Ị Gaghị Akwa Iko!
  • Mara Ihe
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwa M Ka Mụ na Ya Mewe Enyi Maka Mmekọahụ?
    Teta!—2007
  • Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo ná Mma?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Inwe Mmekọahụ Ọ̀ Ga-eme Ka Anyị Dịkwuo Ná Mma?
    Teta!—2010
  • Na-agwa Ụmụ Gị Okwu Banyere Mmekọahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
yp1 isi 26 p. 183-187

ISI NKE 26

Gịnị Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ?

“Ndị na-eto eto na-eme enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị naanị ka ha mara ma onye ahụ ọ̀ ga-ekwe ka ha nwee mmekọahụ, nakwa ka ha chọpụta mmadụ ole ha na ha nwere ike inwe mmekọahụ.”—Penny.

“Ụmụ okorobịa anaghị ezo ọnụ ekwu ya. Ha na-etu ọnụ na ha nwere enyi nwaanyị, ha na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ ana-enwekwa mmekọahụ.”—Edward.

TAA, ọtụtụ ndị na-eto eto na-etu ọnụ na ha na mmadụ nwere mmekọahụ n’agbanyeghị na o nweghị ihe jikọrọ ha na onye ahụ. Ụfọdụ nwere ndị ha na-agakwuru ka ha na ha nwee mmekọahụ n’enyeghị onwe ha “nsogbu” maka ihe gbasara ịhụnanya nwoke na nwaanyị.

Ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ ime otú ahụ! (Jeremaya 17:9) Edward ahụ e dere ihe o kwuru ná mmalite sịrị: “Ọtụtụ ụmụ agbọghọ agwala m ka mụ na ha nwee mmekọahụ. Imeri ọnwụnwa ahụ bụ ihe kacha siere m ike kemgbe m bụ Onye Kraịst. Ọ na-esiri m ike ịsị mba!” Mmadụ gwa gị ka gị na ya nwee mmekọahụ, olee ihe Baịbụl kwuru i kwesịrị icheta?

Mata Ihe Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ

Ịkwa iko bụ mmehie dị oké njọ nke na ndị na-eme ya “agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) Ọ bụ mmehie, ma mmadụ abụọ ahụ hà sịrị na ha hụrụ ibe ha n’anya ma ọ bụ na o nweghị ihe jikọrọ ha. Ihe ga-enyere gị aka imeri ụdị ọnwụnwa ahụ bụ ile ịkwa iko anya otú Jehova si ele ya.

“Obi siri m ike na ọ bụ ibi ndụ otú Jehova chọrọ kacha mma.”—Karen, bi na Kanada.

“Cheta na i nwere papa na mama, nwee ndị enyi, nakwa ndị gị na ha nọ n’otu ọgbakọ. Ị ga-emechu ha niile ihu ma ị kwaa iko!”—Pita, bi na Briten.

Ọ bụrụ na ị na-ele ịkwa iko anya otú Jehova si ele ya, ị ga-enwe ike ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị,’ ọ bụrụgodị na ọ na-agụ gị agụụ.—Abụ Ọma 97:10.

Ebe i nwere ike ịgụ: Jenesis 39:7-9. Ghọta na Josef ji obi ike merie ọnwụnwa a nwara ya ka ọ kwaa iko. Ghọtakwa ihe nyeere ya aka imeri ya.

Jiri Ihe I Kweere Na-eme Ọnụ

Ndị na-eto eto na-ejikarị ihe ha kweere eme ọnụ. Ọ bụụrụ gị ihe ùgwù ịna-akpa àgwà gosiri na iwu Chineke dị mma. Ka otú i si ele ịkwa iko anya ghara ịna-eme gị ihere.

“Mee ka o doo anya ozugbo na ị naghị eme omume rụrụ arụ.”—Allen, bi na Jamanị.

“Ụmụ okorobịa mụ na ha gakọrọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ma onye m bụ, ha makwa na ịgbalị inweta m bụ igbu oge.”—Vicky, bi n’Amerịka.

Ịnọsi ike n’ihe i kweere na-egosi na ị ghọwala Onye Kraịst tozuru okè.—1 Ndị Kọrịnt 14:20.

Ebe i nwere ike ịgụ: Ilu 27:11. Ghọta na omume ọma gị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa!

Kpebisie Ike na Ị Gaghị Akwa Iko!

Ọ dị mkpa ka ị sị mba. Ma ụfọdụ nwere ike iche na ihe mere i ji jụ bụ ka a sị na ị chọghị.

“Ihe niile ị na-eme, ma ejiji gị ma okwu gị ma ụdị ndị gị na ha na-akparịta ụka ma otú i si emeso ndị mmadụ, kwesịrị igosi na ị chọghị ịkwa iko.”—Joy, bi na Naịjirịa.

“I kwesịrị ime ka o doo anya na o nweghị ihe ga-eme ka i kwe. Anatala ụmụ okorobịa na-achụ gị ihe ọ bụla. Ha nwere ike iji ya nweta gị, ka à ga-asị na i ji ha ụgwọ.”—Lara, bi na Briten.

Jehova ga-enyere gị aka ma i kpebisie ike na ị gaghị akwa iko. Ihe Jehova meere Devid mere ka Devid kwuo banyere ya, sị: “Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe.”—Abụ Ọma 18:25.

Ebe i nwere ike ịgụ: 2 Ihe E Mere 16:9. Ghọta na Jehova chọsiri ike inyere ndị chọrọ ime ihe ziri ezi aka.

Mara Ihe

Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Olee otú ị ga-esi mee ya? Ọ bụ igosi na ị ma ihe!

“Zere ndị na-ekwukarị banyere ụdị ihe ahụ.”—Neomi, bi na Japan.

“Ọ bụghị onye ọ bụla ị hụrụ ka i kwesịrị inye adres gị ma ọ bụ nọmba ekwe ntị gị.”—Diana, bi na Briten.

Chee echiche banyere okwu gị, omume gị, na ndị gị na ha na-akpa, na ebe ndị ị na-agakarị. Jụzie onwe gị, sị, ‘Ò nwere otú ọ bụla m si eme ka ndị ọzọ chewe na m chọrọ ka mụ na ha nwee mmekọahụ?’

Ebe i nwere ike ịgụ: Jenesis 34:1, 2. Ị ga-ahụ otú otu nwa agbọghọ aha ya bụ Daịna si baa ná nsogbu n’ihi na ọ gara ebe ọ na-ekwesịghị ịga.

Cheta na ịkwa iko abụghị ihe egwuregwu n’anya Jehova Chineke; i kwesịghị iwere ya ka ihe egwuregwu. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ziri ezi, ị ga-eji akọnuche dị ọcha na-ejere Chineke ozi, ị gaghịkwa ere ùgwù gị. Dị ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Carly si kwuo, “gịnị mere ị ga-eji kwe ka onye ọzọ jiri gị gboo onwe ya agụụ mmekọahụ na-agụ ya? Lezie anya ka ị ghara imebi ihe ị tara ahụhụ nweta!”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Olee ụdị ụmụ agbọghọ ụmụ okorobịa kwuru na-amasị ha n’eziokwu? O nwere ike iju gị anya ma ị chọpụta!

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Gbalịsienụ ike ka Chineke wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.’—2 Pita 3:14.

NDỤMỌDỤ

Mee ka àgwà gị ka mma. (1 Pita 3:3, 4) Ọ bụrụ na ị na-akpa àgwà ọma, ndị ị ga-emeta enyi ga-abụ ndị na-akpakwa àgwà ọma.

Ị̀ MA NA . . . ?

Jehova chọrọ ka i nwee mmekọahụ otú kwesịrị ekwesị, ya bụ, mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ ga-eme gị obi ụtọ mgbe ahụ. Obi agaghị ekoro gị n’elu, ị gaghịkwa akwa mmakwaara, bụ́ nsogbu ịkwa iko na-akpatakarị.

IHE M GA-EME!

Otú m nwere ike isi gbaara ịkwa iko ọsọ otú ahụ Josef mere bụ ․․․․․

Ihe m ga-eme iji zere nzuzu Daịna zuzuru bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịna-agụsi gị ike ka i nwee mmekọahụ tupu ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, gịnị mere na i kwesịghị ime ya?

● Gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ gwa gị ka i nwee mmekọahụ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 185]

“Emela anya ụra! Mgbe otu nwa okorobịa konyere m aka n’olu, agwara m ya, sị, ‘Wepụ aka gị n’olu m!’ M gbarụrụ ihu, si ebe ahụ pụọ.”—Ellen

[Foto dị na peeji nke 187]

Ị kwaa iko, i reela ùgwù gị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya