Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jl ihe ọmụmụ 9
  • Olee Otú Kacha Mma Anyị Ga-esi Na-akwadebe Ọmụmụ Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Kacha Mma Anyị Ga-esi Na-akwadebe Ọmụmụ Ihe?
  • Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-eto Jehova n’Ọgbakọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ka Anyị Na-agba Ibe Anyị Ume n’Ọmụmụ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Kwadebe Maka Nzukọ Ọgbakọ Nile ma Nụ Ụtọ Ha
    Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Otú E Kwesịrị Isi Akwadebe Nzukọ Ije Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
jl ihe ọmụmụ 9

ISI NKE 9

Olee Otú Kacha Mma Anyị Ga-esi Na-akwadebe Ọmụmụ Ihe?

Onyeàmà Jehova na-akwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe

Kambodia

Onyeàmà Jehova na-akwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe
Nwanna nwaanyị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe

Yukren

Ọ bụrụ na gị na Onyeàmà Jehova na-amụ Baịbụl, anyị ma na ị na-ebu ụzọ mụọ ihe unu chọrọ ịmụ. Ka i nwee ike ịghọta ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe anyị, ọ dịkwa mma ka ị na-eme otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe tupu anyị agawa, ọ ga-abara anyị ezigbote uru.

Kpebie mgbe ị ga-amụ ihe na ebe ị ga-anọ amụ ya. Olee mgbe obi gị na-aka adị n’ihe ị na-amụ? Ọ̀ bụ n’isi ụtụtụ tupu ị gawa ọrụ ka ọ̀ bụ n’abalị mgbe ụmụ gị labara? Ọ bụrụgodị na ọ na-esiri gị ike ịmụte ihe aka, kpebie nkeji ole ị ga-eji na-amụ ihe, hụkwa na i ji nkeji ole ahụ na-amụ ya. Nọrọ ebe ụzụ na-adịghị, gbanyụọkwa redio, televishọn, na ekwentị gị ka ha ghara ịdọpụ gị uche. Ọ bụrụ na i kpee ekpere tupu ị mụwa ihe, ọ ga-eme ka obi gị dịrị n’ihe ị na-amụ. Ị gaghịkwa na-eche gbasara nsogbu dịịrị gị.​—⁠Ndị Filipaị 4:​6, 7.

Kaa ihe n’azịza ya, jikerekwa ịza ajụjụ. Buru ụzọ ghọta ihe isiokwu ị chọrọ ịmụ na-ekwu. Chebara ya echiche. Chọpụta ihe jikọrọ isiokwu ahụ na isiokwu nta ndị dị na ya. Leruo foto ndị e sere na ya anya. Chebarakwa ajụjụ ndị a jụrụ ná ngwụcha isiokwu ahụ echiche. I mechazie, gụọ paragraf nke ọ bụla, leekwa ma ị̀ ga-azali ajụjụ paragraf ahụ. Gụọ amaokwu Baịbụl ndị dị na ya, chebakwara otú ha si daba n’isiokwu ị na-amụ echiche. (Ọrụ Ndịozi 17:11) Ọ bụrụ na ị chọta ebe azịza ajụjụ paragraf ahụ dị, kaa ya ihe. I nwere ike kaa okwu ole na ole dị ebe ahụ ihe, ka ọ ga-abụ i lee ya anya, gị echeta azịza ahụ. I ruzie n’ọmụmụ ihe, i nwere ike welie aka ma a jụọ ajụjụ ahụ. A kpọzie gị, gị azaa ya ná nkenke.

Ọ bụrụ na ị na-amụ isiokwu a ga-amụ n’izu ọ bụla, a ga-enwe ihe ọhụrụ ị ga-amụta na Baịbụl. Nwayọọ nwayọọ otú ahụ, ị ga-eji Okwu Chineke kwajuo ‘ụlọ akụ̀’ gị.​—⁠Matiu 13:​51, 52.

  • Olee otú ị ga-esi na-akwadebe ọmụmụ ihe tupu ị gawa?

  • Gịnị ka i nwere ike ime iji hụ na ị zara ajụjụ n’ọmụmụ ihe?

IHE ỌZỌ Ị GA-EME

Jiri otú a e kwuru n’isiokwu a kwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ma ọ bụ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ a ga-enwe n’izu a. Gwa onye gị na ya na-amụ ihe ka o nyere gị aka ka ị kwadebe ajụjụ ị ga-aza n’ọmụmụ ihe a ga-enwe n’izu a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya