Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fg ihe ọmụmụ 3 ajụjụ 1-4
  • Ozi Ọma Ahụ Ò Si n’Aka Chineke n’Eziokwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ọma Ahụ Ò Si n’Aka Chineke n’Eziokwu?
  • Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Mụta Ihe n’Aka Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Baịbụl Bụ Okwu Chineke Gwara Anyị
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Baịbụl Bụ Akwụkwọ Si n’Aka Chineke
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Akwụkwọ Ozi nke Si n’Aka Chineke Na-ahu n’Anya
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
fg ihe ọmụmụ 3 ajụjụ 1-4

ISI NKE 3

Ozi Ọma Ahụ Ò Si n’Aka Chineke n’Eziokwu?

1. Uche ònye ka e dere na Baịbụl?

Ụdị Baịbụl dị iche iche, ma ndị ọgbara ọhụrụ ma ndị ochie

Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ihe a o kwuru bụ ozi ọma. (Abụ Ọma 37:29) Baịbụl nwere akwụkwọ iri isii na isii. Chineke ji ihe dị ka iri ndị ikom anọ dee ha. Ọ bụ Mozis dere ise ndị mbụ (ya bụ, Jenesis ruo Diuterọnọmi). O dere ha n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga. Jọn onyeozi dere nke ikpeazụ (ya bụ, Mkpughe), ọ karịakwala otu puku afọ na narị itoolu kemgbe o dere ya. Ma, uche ònye ka ndị dere Baịbụl dere? Chineke ji mmụọ nsọ ya gwa ha ihe ha dere. (2 Samuel 23:2) Ha dere uche ya, ọ bụghị nke hanwa. N’ihi ya, ọ bụ uche Jehova ka e dere na Baịbụl.​—Gụọ 2 Timoti 3:16; 2 Pita 1:20, 21.

Lee vidio bụ́ Uche Ònye Ka E Dere na Baịbụl?

2. Olee otú anyị si mara na Baịbụl bụ Okwu Chineke?

Baịbụl kwuo ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọ na-emecha mee. Ọ bụ ya mere anyị ji mara na ọ bụ Okwu Chineke. O nweghị mmadụ ọ bụla ga-ekwu ihe ga-eme echi, ya emee otú ahụ o kwuru ya. (Jọshụa 23:14) Ọ bụ naanị Chineke onye Pụrụ Ime Ihe Niile nwere ike ịgwa ụmụ mmadụ ihe ga-eme echi.​—Gụọ Aịzaya 42:9; 46:10.

Baịbụl bụ akwụkwọ pụrụ iche. E bipụtala ya n’ọtụtụ narị asụsụ, kesakwaara ndị mmadụ ọtụtụ ijeri. Ọ bụ eziokwu na o teela e dere Baịbụl, ihe o kwuru na ihe ụfọdụ sayensị kwuru bụ otu. Ihe ọzọ bụ na mmadụ iri anọ ahụ dere ya ekwughị ihe megidere ihe ibe ha kwuru.a Ihe Baịbụl kwuru gbasara ịhụnanya abụghị ihe mmadụ nkịtị ga-ekwuli. Ọ bụ naanị Chineke, onye hụrụ anyị n’anya, ga-ekwuli ụdị ihe ahụ. Baịbụl nwekwara ike ịgbanwe ndị ọjọọ, ha aghọọ ndị ezigbo mmadụ. Ọ bụ ihe a niile mere ọtụtụ nde mmadụ ji kwetasie ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke.​—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

Lee vidio bụ́ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu?

3. Gịnị ka Baịbụl na-ekwu?

Paradaịs, Iju Mmiri oge Noa, ebe Mozis bu iwu iri, na ebe Jizọs na-akụzi ihe.

Otu n’ime ozi ọma ndị ị ga-agụta na Baịbụl bụ na Chineke na-echere ụmụ mmadụ echiche ọma. Baịbụl gwara anyị ihe mere anyị ebighị na paradaịs ahụ Chineke tinyere nwoke mbụ na nwaanyị mbụ. O kwukwara ihe Chineke ga-eme iji hụ na e weghachiri paradaịs ahụ.​—Gụọ Mkpughe 21:4, 5.

Na Baịbụl, e dekwara iwu na ndụmọdụ ndị Chineke nyere ụmụ mmadụ. Baịbụl kọkwaara anyị otú Chineke na ụmụ mmadụ si jee. Akụkọ ndị ahụ na-eme ka anyị ghọta àgwà ụfọdụ Chineke nwere. N’ihi ya, Baịbụl nwere ike inyere gị aka ịmara onye Chineke bụ. O kwuru ihe i nwere ike ime ka gị na ya bụrụ enyi.​—Gụọ Abụ Ọma 19:7, 11; Jems 2:23; 4:8.

4. Olee otú ị ga-esi ghọta ihe e dere na Baịbụl?

Broshọ a ga-enyere gị aka ịghọta ihe ndị e kwuru na Baịbụl. Ọ ga-agwa gị amaokwu Baịbụl ndị kọwara ihe a na-ekwu. Ị gụọ ha, ‘ị ga-aghọta ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu.’ Ị manụ na ọ bụ otú ahụ ka Jizọs si kụziere ndị mmadụ ihe mgbe ọ bịara n’ụwa.​—Gụọ Luk 24:27, 45.

Ozi ọma si n’aka Chineke enweghị atụ. Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka ọ na-amasị. O nwedịrị ndị ọ na-ewe ezigbo iwe. Ma, ekwela ka nke ahụ kụda gị mmụọ. Ihe ga-eme ka i nweta ndụ ebighị ebi bụ ịmara onye Chineke bụ.​—Gụọ Jọn 17:3.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?, isi nke 2.

a Gụọ broshọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya